Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2013

Ahụhụ Niile Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya

Ahụhụ Niile Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya

Olee otú obi ga-adị gị ma a sị na o nwekwaghị onye na-ata ahụhụ n’ụwa, e nweghịkwa mpụ, agha, ọrịa, na ọdachi ndị na-emere onwe ha? Weregodị ya na ụbọchị ọ bụla i tetara n’ụra, obi agaghị ekoro gị n’elu n’ihi na ị ma na ihe ị ga-eri agaghị akọ gị, marakwa na o nweghị onye ga-emegbu gị ma ọ bụ kpọọ gị asị. Ma, ihe a niile ọ̀ dị gị ka ihe na-enweghị ike ime eme? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mmadụ ma ọ bụ òtù ọ bụla ga-emeli ihe ndị a. Ma, Chineke ekwela nkwa na ya ga-ewepụ ihe niile na-akpatara ndị mmadụ ahụhụ, ma ihe niile ahụ e kwuru okwu ha n’isiokwu bu nke a ụzọ. Lee nkwa ndị Chineke kwere n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl:

A GA-ENWE EZIGBO ỌCHỊCHỊ

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke nke ga-esi n’eluigwe na-achị. Ọ bụ Jizọs Kraịst ka Chineke họpụtara ka ọ bụrụ eze Alaeze a. Ọ ga-anọchikwa ndị ọchịchị niile e nwere n’ụwa, meekwa ka uche Chineke mezuo ma n’eluigwe ma n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) Ọchịchị ụmụ mmadụ agaghị anọchi ọchịchị a n’ihi na ọ bụ ‘alaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.’ Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee udo n’ụwa ruo mgbe ebighi ebi.—2 Pita 1:11.

OKPUKPE ỤGHA AGAKWAGHỊ ADỊ

‘Setan na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere, ọ bụghị oké ihe ma ọ bụrụ na ndị ozi ya na-eme onwe ha ka ha yie ndị ozi nke ezi omume. Ma ọgwụgwụ ha ga-abụ dị ka ọrụ ha si dị.’—2 Ndị Kọrịnt 11:14, 15.

A ga-eme ka o doo onye ukwu na onye nta anya na okpukpe ụgha bụ ngwá ọrụ Ekwensu, meekwa ka okpukpe niile na-akpata ịkpọasị ma na-eme ka ndị mmadụ na-egburịta ibe ha gharazie ịdị. Nke a ga-eme ka ndị niile hụrụ “ezi Chineke” n’anya nwee “otu okwukwe” ma na-efe ya “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” Nke a ga-emekwa ka udo dịrị n’ụwa, ndị mmadụ adịrịkwa n’otu.—1 Ndị Tesalonaịka 1:9; Ndị Efesọs 4:5; Jọn 4:23.

MMADỤ NIILE GA-EZU OKÈ

“Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Jehova Chineke ga-eme ka ihe a Baịbụl kwuru mezuo n’ihi ọnwụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, nwụụrụ ụmụ  mmadụ. (Jọn 3:16) Mgbe Jizọs ga-achịwa ụwa, a ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè. Ụmụ mmadụ agakwaghị ata ahụhụ ọ bụla n’ihi na “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha” ma hichapụ “anya mmiri niile n’anya ha.” N’oge na-adịghị anya, ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata ga-akwụsị. Ụmụ mmadụ ga-ezukwa okè n’ihi na “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ AGAKWAGHỊ ANỌ

“[Jizọs Kraịst] wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, wee kee ya agbụ ruo otu puku afọ. Ọ tụbakwara ya n’ime abis ahụ, mechie ya ma kaa ya akara mgbe ọ tụbasịrị ya, ka o wee ghara iduhie mba niile ọzọ.”—Mkpughe 20:2, 3.

Ike niile Setan na-akpa ga-akwụsị mgbe a ga-ejide ya na ndị mmụọ ọjọọ ya, kee ha agbụ ma tụba ha n’ime “abis.” Nke a pụtara na ha agakwaghị akpa ike ọ bụla. Ha agakwaghị na-etinye aka n’ihe ụmụ mmadụ na-eme. Ụmụ mmadụ ga-ekuru ume ndụ n’ụwa mgbe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agakwaghị anọ.

‘OGE IKPEAZỤ A’ GA-AGWỤ

‘Oge ikpeazụ a’ ga-agwụ mgbe e nwechara ihe Jizọs kpọrọ “oké mkpagbu.” Jizọs sịrị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.”—Matiu 24:21.

Mkpagbu ahụ ga-abụ oké mkpagbu n’ihi na n’oge ahụ, a ga-enwe ụdị nsogbu ndị a na-enwetụbeghị n’ụwa. Oké mkpagbu ahụ ga-akwụsị n’oge a ga-alụ ‘agha nke oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ Aha ọtụtụ ndị na-akpọ agha a bụ Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16.

Ndị nọ n’ebe niile n’ụwa, bụ́ ndị ihe ọma na-adị mma, na-atụ anya oge Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ka anyị leba anya n’ihe ọma a ga-emere ha mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa a.

CHINEKE GA-EMERE ANYỊ ỌTỤTỤ IHE ỌMA

“Oké ìgwè mmadụ” ga-anọ ndụ mgbe udo ga-adị n’ebe niile n’ụwa: Baịbụl kwuru na e nwere “oké ìgwè mmadụ” a na-amaghị ole ha dị, bụ́ ndị ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta” ma banye n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume. (Mkpughe 7:9, 10, 14; 2 Pita 3:13) Ha ga-ekwu na nzọpụta ha si n’aka Jizọs Kraịst, onye bụ́ “Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa.”—Jọn 1:29.

Ihe Chineke ga-akụziri ụmụ mmadụ ga-abara ha ezigbo uru: N’ụwa ọhụrụ, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịzaya 11:9) Ihe ndị so n’ihe Chineke ga-akụziri ụmụ mmadụ bụ otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo ma na-elekọta ụwa. Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.”—Aịzaya 48:17.

A ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’ọnwụ: N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ kpọlitere enyi ya Lazarọs n’ọnwụ. (Jọn 11:1, 5, 38-44) Ihe a o mere na-egosi anyị ihe ọ ka ga-eme n’ebe niile n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa.—Jọn 5:28, 29.

Ndị mmadụ ga-ebi n’udo ma na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi: Mgbe Kraịst ga-achịwa ụwa, ajọ omume agakwaghị adị. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na Jizọs ma ihe dị onye ọ bụla n’obi. Nke a ga-eme ka o nwee ike ikpe ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe otú kwesịrị ekwesị. Ọ gaghị ekwe ka ndị na-ekweghị agbanwe omume ọjọọ ha biri n’ụwa ezi omume nke Chineke.—Abụ Ọma 37:9, 10; Aịzaya 11:3, 4; 65:20; Matiu 9:4.

Anyị elebala anya n’ihe ọma ole na ole Baịbụl buru n’amụma na ha ga-eme n’ọdịnihu. Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, ‘udo ga-ezu ebe niile,’ udo ga-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:11, 29) Ihe niile na-akpatara ndị mmadụ nsogbu na ahụhụ agakwaghị adị. Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị a ga-eme n’ihi na Chineke sịrị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ. . . . Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:5.