Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Septemba 2013

Ọ̀ Bụ n’Oge A Na-ewu Ụlọ Elu Bebel Ka Asụsụ Ndị Anyị Na-asụ Malitere?

Ọ̀ Bụ n’Oge A Na-ewu Ụlọ Elu Bebel Ka Asụsụ Ndị Anyị Na-asụ Malitere?

“Jehova wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa dum, ha wee kwụsị iwu obodo ahụ. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya Bebel, n’ihi na n’ebe ahụ ka Jehova ghagburu asụsụ ụwa dum, Jehova mekwara ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’ebe niile n’elu ụwa.”—Jenesis 11:8, 9.

IHE a Baịbụl kọrọ ò mere eme n’eziokwu? Ndị mmadụ hà malitere ịsụ asụsụ dị iche iche otu mgbe otú a Baịbụl kwuru? Ọ na-abụ ụfọdụ ndị nụ ihe a Baịbụl kwuru banyere otú asụsụ dị iche iche ndị mmadụ na-asụ si malite ma zuo ebe niile, ha amaa ọsụ. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru na “ihe a sịrị mere mgbe e wuru ụlọ elu Bebel bụ akụkọ kacha bụrụ akụkọ na-enweghị isi a kọtụrụla.” Otu onye nkụzi ndị Juu kwudịrị na akụkọ a “bụ akụkọ ndị ọ na-enweghị ihe ha ma kọrọ mgbe ha chọrọ igosi otú mba dị iche iche si malite.”

Gịnị mere na ndị mmadụ ekwetaghị ihe ahụ Baịbụl kwuru? Ọ bụ maka na ọ dị iche n’ihe ụfọdụ ndị na-ekwu banyere otú asụsụ ndị mmadụ na-asụ si malite. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na asụsụ dị iche iche ndị mmadụ na-asụ amaliteghị otu ugboro, kama na asụsụ ndị ahụ si “n’otu asụsụ” malite, e sizie n’otu asụsụ ahụ nwee ọtụtụ asụsụ. Ndị ọzọ na-ekwu na nke ọ bụla n’ime asụsụ ndị mbụ ụmụ mmadụ sụrụ bidoro n’onwe ya. Ma, ha kwuru na mgbe asụsụ ndị ahụ malitere, otú ụmụ mmadụ si ekwu okwu yiri ebe ụmụ anụmanụ na-ebe ubé, nwayọọ nwayọọ, ha ekwuwezie ihe mmadụ na-aghọta nke ọma. Ihe niile a ha na-ekwu emeela ka ọtụtụ ndị kweta ihe otu ọkachamara aha ya bụ W. T. Fitch dere n’akwụkwọ ya. Ọ sịrị: “Anyị amatabeghị nke bụ́ eziokwu.”

Olee ihe ndị na-eme nchọpụta na ndị na-amụ gbasara ihe mgbe ochie chọpụtarala gbasara otú asụsụ ndị mmadụ na-asụ si malite? Ihe ha chọpụtara ò gosiri na e nwere nke bụ́ eziokwu n’ihe ndị ahụ ndị mmadụ na-ekwu? Ka ihe ha chọpụtara ò gosiri na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu? Ka anyị burugodị ụzọ leruo ihe Baịbụl kwuru anya.

EBE O MERE NA MGBE O MERE

Baịbụl kwuru na ọ bụ “n’ala Shaịna” ka a ghagburu asụsụ ụmụ mmadụ, ụmụ mmadụ agbasazie n’ebe dị  iche iche n’ụwa. E mechaziri kpọwa ebe ahụ Babịlonia. (Jenesis 11:2) Olee mgbe ihe ahụ mere? Baịbụl kwuru na ọ bụ n’oge Pileg “ka e kewara ụwa,” ya bụ, ụmụ mmadụ. A mụrụ Pileg ihe dị ka narị afọ abụọ na iri ise tupu a mụọ Ebreham. N’ihi ya, ihe ndị ahụ merenụ na Bebel mere n’ihe dị ka puku afọ anọ na narị afọ abụọ gara aga.—Jenesis 10:25; 11:18-26.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ọ bụ n’otu asụsụ ka e si nweta asụsụ niile ndị mmadụ na-asụ n’oge a. Ha kwuru na ọ bụ n’ihe foro obere ka ọ bụrụ otu narị puku afọ gara aga ka a sụrụ asụsụ ahụ e si na ya nweta asụsụ ndị mmadụ na-asụ n’oge a. * Ndị ọzọ kwuru na asụsụ ndị mmadụ na-asụ taa si n’asụsụ ole na ole ndị mmadụ sụrụ n’ihe dị ka puku afọ isii gara aga. Olee otú ndị na-amụ banyere asụsụ si mata otú asụsụ ndị a sụburu n’oge gboo si malite? Magazin a na-akpọ Economist sịrị na “a na-enyo otú ha si mata ya enyo.” Ọ sịrị na “ndị ọkà mmụta enweghị ihe ndị e dere n’oge ochie ha ga-eji amata asụsụ ndị mmadụ sụrụ n’oge gboo.” Magazin ahụ kwukwara ihe mere otu ọkà mmụta ji kwuo na ụmụ mmadụ ji nwayọọ nwayọọ mụta asụsụ dị iche iche ha na-asụ. Ọ sịrị na ihe ọkà mmụta ahụ kwuru bụ “ihe o chepụtara n’echiche nke onwe ya.”

Ma, e nwere ihe “ndị e dere n’oge ochie a ga-eji amata asụsụ ndị mmadụ sụrụ n’oge gboo.” Gịnị ka ihe ndị ahụ bụ? Oleekwa ihe ha na-egosi anyị banyere otú asụsụ ụmụ mmadụ si malite? Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Naanị asụsụ kacha ochie e dere ede nke mmadụ ga-atụ anya ịhụ bụ nke e dere n’ihe dị ka puku afọ anọ ma ọ bụ puku afọ ise gara aga. O nweghị nke mere ochie karịa ya.” Olee ebe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ‘asụsụ ahụ kacha ochie e dere ede’? Ọ bụ n’ebe ndịda Mesopotemia nke bụ́ ebe obodo Shaịna oge ochie dị. * N’ihi ya, ihe a ha hụrụ gosiri na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu.

NDỊ MMADỤ ANAGHỊ ECHE ECHICHE OTÚ ỤZỌ N’IHI NA ASỤSỤ HA ABỤGHỊ OTU

Baịbụl kwuru na Chineke ‘ghagburu asụsụ ndị mmadụ na Bebel ka ha ghara ịnụ [ma ọ bụ ịghọta] asụsụ ibe ha.’ (Jenesis 11:7) Nke a mere ka ‘ha kwụsị iwu obodo ahụ’ ma “si n’ebe ahụ gbasaa n’ebe niile n’elu ụwa.” (Jenesis 11:8, 9) N’ihi ya, Baịbụl ekwughị na asụsụ niile ndị mmadụ na-asụ si “n’otu asụsụ.” Kama, o kwuru na asụsụ dị iche iche pụtara ná mberede. Nke ọ bụla n’ime ha nwekwara okwu niile ga-eme ka ndị na-asụ ya ghọta ihe ibe ha na-ekwu. Asụsụ nke ọ bụla n’ime ha dịkwa iche n’ibe ya.

Oleekwanụ maka asụsụ dị iche iche a na-asụ taa? Hà yiri ibe ha, ka hà dị ezigbo iche n’ibe ha? Otu ọkà mmụta sayensị aha ya bụ Lera Boroditsky kwuru, sị: “Ndị na-amụ gbasara asụsụ amụọla asụsụ dị iche iche a na-asụ n’ụwa (ya bụ, ihe dị ka puku asụsụ asaa, ma, ọ bụ naanị ole na ole n’ime ha ka ha lerurula anya nke ọma). Ha chọpụtara na e nwere ọtụtụ ihe dị iche n’asụsụ ndị ahụ.” Ọ bụ eziokwu na asụsụ ndị a na-asụ n’otu mba nwere ike iyi ibe ha, ma ha dị ezigbo iche n’asụsụ ndị a na-asụ ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, e nwere okwu ụfọdụ n’asụsụ Igbo yiri okwu ụfọdụ n’asụsụ Efịk, ma asụsụ abụọ a dị ezigbo iche n’asụsụ Bekee ma ọ bụ asụsụ French.

Ọ bụ asụsụ ndị mmadụ na-asụ na-eme ka ha na-eche echiche otú ha si eche. O sokwa n’ihe mere ha ji aghọta ihe otú ha si aghọta ya ma ọ bụkwanụ akọwa ihe otú ha si akọwa ya. Dị ka ihe atụ, onye Igbo ga-asị mmadụ, “Lee ihe dị gị n’aka nri.” Ma n’asụsụ ọzọ, mmadụ nwere ike ịsị, “Lee ihe dị gị n’aka ndịda ebe ọwụwa anyanwụ.”  Ọdịiche ndị a dị n’asụsụ dị iche iche nwere ike ime ka mmadụ ghara ịghọta ibe ya. Ọ bụ ya mere ndị ahụ na-arụ ụlọ elu na Bebel ji kwụsị ọrụ ahụ.

ỤMỤ MMADỤ HÀ BU ỤZỌ NA-EBE UBÉ KA ANỤMANỤ TUPU HA EKWUWE OKWU KA MMADỤ?

Asụsụ mbụ ụmụ mmadụ sụrụ ọ̀ bụ asụsụ mmadụ ga-aghọtali ka ọ̀ bụ nke dị ka ubé ụmụ anụmanụ? Baịbụl kwuru na nwoke mbụ, bụ́ Adam, ji aka ya chepụta aha ọ gụrụ anụmanụ niile na nnụnụ niile. (Jenesis 2:20) Ọ bụkwa Adam chepụtara ihe ọ gwara nwunye ya mgbe ọ hụrụ ya. Nwunye ya jikwa ọnụ ya kwuo ihe Chineke nyere ha n’iwu na ihe ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha enupụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:23; 3:1-3) Ihe ndị a na-egosi na asụsụ mbụ ụmụ mmadụ sụrụ nwere okwu niile mmadụ na ibe ya ga-eji akparịta ụka ma kwuo otú obi dị ha.

Asụsụ ahụ a ghagburu na Bebel mere ka ndị na-arụ ụlọ ahụ ghara ịrụkọtali ọrụ ọnụ n’ihi na ha enwezighị ike ịghọta ihe ibe ha na-ekwu. Ma, asụsụ ọhụrụ ndị ha maliteziri ịsụ nwekwara okwu niile dị mkpa mmadụ na ibe ya ga-eji akparịta ụka. Narị afọ ole na ole a ghagbuchara asụsụ ụmụ mmadụ na Bebel, ndị mmadụ rụrụ ọtụtụ obodo ndị mmadụ bijuru ma nwee ndị na-alụrụ ha agha. Ha na ndị si mba ọzọ malitekwara ịzụkọrịta ahịa. (Jenesis 13:12; 14:1-11; 37:25) Hà ga-emeli ihe ndị a niile ma a sị na asụsụ ha enweghị mkpụrụ okwu zuru ezu ndị mmadụ ga-aghọta nke ọma? Ihe ndị a Baịbụl kwuru gosiri na asụsụ mbụ ụmụ mmadụ sụrụ na ndị nke ha malitere ịsụ na Bebel abụghị mmadụ ibe ubé na iti mkpu ka anụmanụ, kama ha bụ asụsụ nwere okwu niile ga-eme ka mmadụ ghọta ihe ibe ya na-ekwu.

Ihe ndị ọkachamara chọpụtara n’oge a gosiri na nke a bụ eziokwu. Otu akwụkwọ na-ekwu gbasara asụsụ ụmụ mmadụ kwuru na “o nweghị obodo e lebarala asụsụ ha anya nke na-enweghị okwu niile mmadụ nwere ike iji gwa ibe ya okwu, ma obodo ndị nke a sịrị na ha mepere emepe ma ndị nke a sịrị na ha emepeghị emepe.” Otu ọkà mmụta aha ya bụ Steven Pinker kwukwara ihe yiri ya n’akwụkwọ o dere. Ọ sịrị: ‘E nwetụbeghị mgbe mmadụ na-ebe ubé ka anụmanụ tupu ya asụwa asụsụ ka mmadụ.’

IHE GA-EME ASỤSỤ N’ỌDỊNIHU

Anyị ahụla na e nwere ihe ndị e dere n’oge ochie e ji amata asụsụ ndị mmadụ sụrụ n’oge gboo, hụkwa ebe a hụrụ ihe ndị ahụ na afọ ole ha nọrọla. Anyị ahụkwala na e nwere ezigbo ọdịiche dị n’asụsụ dị iche iche ndị mmadụ na-asụ, hụkwa na asụsụ ndị a sụrụ n’oge ochie nwere okwu niile mere ka ndị sụrụ ha nwee ike ịkparịta ụka nke ọma. Ugbu a anyị lebarala ihe ndị a anya, gịnị ka anyị kwesịziri ikwu? Ọtụtụ ndị ekwuola na ihe Baịbụl kwuru mere na Bebel bụ eziokwu.

Baịbụl gwara anyị na Jehova Chineke ghagburu asụsụ ụmụ mmadụ na Bebel maka na ha nupụụrụ ya isi. (Jenesis 11:4-7) Ma, o kwere nkwa na ya “ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha, ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.” (Zefanaya 3:9) ‘Asụsụ a dị ọcha’ bụ eziokwu niile dị n’Okwu Chineke. Taa, eziokwu a na-eme ka ndị si n’ebe niile n’ụwa dịrị n’otu. Nke a na-egosikwa na n’ọdịnihu, Chineke ga-agbanwe ihe o mere na Bebel. Ọ ga-eme ka mmadụ niile sụwa naanị otu asụsụ. Otu asụsụ ga-eme ka ụmụ mmadụ dịrịkwuo n’otu n’ebe niile n’ụwa.

^ para. 8 Ọtụtụ n’ime ndị na-ekwu ihe a kweere na e keghị ụmụ mmadụ eke, kama na ha si n’enwe pụta. Ọ bụ ya mere ha ji ekwu ihe a ha na-ekwu. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ma ihe a ha kweere ọ̀ bụ eziokwu, gụọ Ụlọ Nche Jenụwarị 1, 2008, peeji nke 14-17. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 9 Ndị na-egwupụta ihe ndị dị n’ala ahụla ọtụtụ ụlọ arụsị ndị buru ibu n’ala ma pịọ ọnụ n’elu. Ọ bụ n’ala Shaịna ka ha hụrụ ha. Baịbụl kwuru na ndị ahụ wuru ụlọ elu na Bebel kpụrụ brik ma jiri ya rụọ ụlọ ahụ, ha ejighị nkume. O kwukwara na ha ji bitumen mere ụrọ. (Jenesis 11:3, 4) Akwụkwọ ahụ e ji eme nnyocha kwuru na nkume ‘dị ụkọ na Mesopotamia ma ọ bụkwanụ na o nwedịghị nke dị adị.’ Ma, bitumen juru eju n’ebe ahụ.