Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Julaị 2013

 IHE NDỊ NA-EME KA E NWEE OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ

Ihe Ị Ga-eme Ka Gị na Onye Ị Lụgharịrị Biri n’Udo

Ihe Ị Ga-eme Ka Gị na Onye Ị Lụgharịrị Biri n’Udo

HERMAN: * “Ọrịa kansa gburu nwunye m mụ na ya biri afọ iri atọ na anọ. M mechara lụọ nwaanyị ọzọ aha ya bụ Linda. Linda kwuru na m na-ejikarị ya atụnyere nwunye m mbụ. Nke ka njọ bụ na ndị enyi m na-ekwukarị okwu ọma banyere nwunye m mbụ ahụ. Nke a na-ewekwa Linda iwe.”

LINDA: “Mgbe mụ na Herman lụrụ, m chere na ya na ndị ọzọ agaghị ahụ m n’anya otú ha hụrụ nwunye ya mbụ. Mmadụ niile hụrụ nwaanyị ahụ n’anya, ha sịrị na ọ na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ, na-akpakwa àgwà ọma. Mgbe ụfọdụ, m na-eche ma Herman ọ̀ ga-ahụlikwa m n’anya otú ọ hụrụ nwunye mbụ ya ahụ.”

Linda na di mbụ ya gbara alụkwaghịm. Obi dị ya na Herman ụtọ na ha lụrụ. Ma, ha abụọ kwetara na ọ bụrụ na mmadụ alụgharịa onye ọzọ, e nwere nsogbu ndị ha ga na-enwe bụ́ ndị ha na onye mbụ ha lụrụ na-enweghị. *

Ọ bụrụ na ị lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye, olee otú obi dị gị ugbu a? Otu nwaanyị aha ya bụ Tamara, bụ́ onye lụgharịrị di afọ atọ ya na di mbụ ya gbachara alụkwaghịm, sịrị: “Oge mbụ mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ọ ga na-eche na ya na onye ahụ ga-ebi ebighị ebi. Ma ọ bụrụ na ọ lụgharịa onye ọzọ, ọ gakwaghị na-eche otú ahụ n’ihi na ihe ga na-agbata ya n’obi mgbe niile bụ na ya na onye nke mbụ ebighị ebighị ebi.”

N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye na-enwe obi ụtọ kemgbe ha lụrụ. Ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ebi n’udo. Gị na onye nke gị nwekwara ike ibi n’udo. Olee ihe ndị nwere ike inyere unu aka? Ka anyị leba anya ná nsogbu atọ ndị lụgharịrị  di ma ọ bụ nwunye na-enwekarị na otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere ha aka imeri ha. *

NSOGBU NKE MBỤ: Ọ NA-ESIRI GỊ IKE IWEPỤ OBI N’ONYE MBỤ Ị LỤRỤ.

Otu nwaanyị aha ya bụ Ellen, bụ́ onye bi na Saụt Afrịka, sịrị: “Obi m anaghị ekwe apụ apụ n’otú mụ na di mbụ m si bie, nke ka nke, mgbe mụ na di m nke ugbu a gara ebe ụfọdụ mụ na di mbụ m garala ezumike. Mgbe ụfọdụ, m na-abịazi jiri di m tụnyewere di m mbụ.” Ma, ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị alụbuola di ma ọ bụ nwunye, o nwere ike ịna-ewe gị iwe ma ọ bụrụ na ọ na-ekwukarị okwu banyere onye ọ lụburu.

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka unu dịkwuo ná mma

IHE GA-ENYERE UNU AKA: I kwesịghị ịtụwa anya na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-echefucha onye mbụ ọ lụrụ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha biri ọtụtụ afọ. Gịnwakwa ekwesịghị ịtụwa anya na ị ga-echefucha onye mbụ ị lụrụ. Ụfọdụ kwudịrị na o nweela mgbe ha chọrọ ịkpọ di ha ma ọ bụ nwunye ha aha, ha akpọọ ya aha onye ha lụburu. Olee ihe ị ga-eme ma i nwee ụdị nsogbu a ma ọ bụ nke yiri ya? Baịbụl sịrị: “Ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi.”—1 Pita 3:8.

Ekwela ka ekworo mee ka ị gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ọ ghara ikwute okwu onye ọ lụburu. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ikwu banyere otú ya na onye ọ lụburu si bie, meda obi gee ya ntị. Ọ dịghị mma ya kwutụhaala obere ihe, gị asị na o ji gị atụnyere onye ahụ. Otu nwoke aha ya bụ Ian, bụ́ onye lụgharịrị nwaanyị afọ iri gara aga, sịrị: “Nwunye m aha ya bụ Kaitlyn anaghị ewere ya na m mere ihe ọjọọ ma m kwute okwu nwunye mbụ m. Kama, ọ na-ewere ya na ọ bụ otú yanwa ga-esi aghọtakwu onye m bụ.” I nwedịrị ike ịchọpụta na nke a ga-eme ka gị na ya dịkwuo ná mma.

Obi gị kwesịrị ịdị n’àgwà ọma onye gị na ya bi ugbu a nwere. N’eziokwu, di ma ọ bụ nwunye mbụ gị nwere ike inwe àgwà ụfọdụ onye nke ugbu a na-enweghị. Ma e nwekwara ike inwe ebe onye nke ugbu a ka ya mma. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka ị gbalịa mee ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-adịkwu ná mma, ọ bụghị ‘iji ya na-atụnyere onye ọzọ.’ Kama nke ahụ, na-echeta ihe ndị mere i ji hụ ya n’anya ma na-agbalị ka ihe ndị ahụ na-eme gị obi ụtọ. (Ndị Galeshia 6:4) Otu nwoke aha ya bụ Edmond, bụ́ onye lụrụla nwaanyị ugboro abụọ, sịrị: “Onye nwere enyi abụọ ga-achọpụta na àgwà enyi ya abụọ ahụ abụghị otu. Otú ahụ ka ọ dịkwa di na nwunye. Àgwà onye gị na ya bi ugbu a ga-adịtụ iche n’àgwà onye nke mbụ.”

Olee otú ị ga-esi mee ka ihe ọma ndị ị na-echeta mere mgbe gị na onye ị lụburu bi ghara ịkpatara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nsogbu? Otu nwoke aha ya bụ Jared sịrị: “O nwere mgbe m gwara nwunye m na m nwere ike iji otú mụ na nwunye mbụ m si bie tụnyere ọmarịcha akwụkwọ mụ na nwunye m ahụ dere. Na ọ na-abụ m nọtụ, mụ ewere akwụkwọ ahụ gụọ ma cheta ihe ọma ndị mere mgbe ahụ. Ma ihe e dere n’akwụkwọ ahụ aghọọla ihe mgbe ochie.” Jared sịkwara na ‘ya na nwunye ya na-edezi akwụkwọ ọhụrụ ugbu a, na ọ bụ ihe ndị ha na-ede n’akwụkwọ a na-emezi ya obi ụtọ.’

MEGODỊ IHE A: Jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ̀ na-ewute ya ma i kwute okwu onye ị lụburu. Chọpụta oge ọ ga-akacha mma ka ị ghara ikwute okwu di ma ọ bụ nwunye mbụ gị ahụ.

NSOGBU NKE ABỤỌ: Ọ NA-ESIRI GỊ NA NDỊ ENYI I NWEBURU IKE ỊKPA.

Otu nwoke aha ya bụ Javier, bụ́ onye lụgharịrị nwaanyị afọ isii ya na nwunye mbụ ya gbachara alụkwaghịm, sịrị: “Obere oge mụ na nwunye m lụchara, nwunye m kwuru na ndị enyi m na-atụchakarị ya.” Otu nwoke aha ya bụ Leo nwekwara nsogbu nke ya. Ọ sịrị, “Ụfọdụ ndị na-anọ n’ihu m gwa nwunye m na ha hụrụ di mbụ ya n’anya, na ọ na-ewutekwa ha na ya na ya ebizighị.”

IHE I NWERE IKE IME: Ọ dị mma ka ị chọpụta ihe mere ndị enyi gị ma ọ bụ ndị enyi nwunye gị ma ọ bụ di gị ji ekwu ihe ha na-ekwu. Ian ahụ e kwuburu okwu ya sịrị: “Echere m na mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị ndị enyi onye lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye mfe iso enyi ha ahụ na-akpakọrịta n’ihi na ha amatabeghị onye ahụ ọ lụrụ.” N’ihi ya, gbalịa ka ị “na-adị nwayọọ n’ụzọ zuru ezu n’ebe mmadụ niile nọ.” (Taịtọs 3:2) Na-enwere ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị ndidi. Unu nwekwara ike imete ndị enyi ọhụrụ ugbu a. Javier ahụ e kwuburu okwu ya sịrị na ka oge na-aga, ihe bịaziri na-adabara ndị enyi ya ahụ na nwunye ya. Javier sịkwara: “Mụ na nwunye m metekwara ndị enyi ọhụrụ, nke ahụ nyeere anyị aka.”

Chọpụta otú obi na-adị onye ị lụrụ ma gị na ndị enyi gị ochie nọrọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na ndị enyi gị ekwute okwu di gị ma ọ bụ nwunye mbụ gị, jiri akọ  mee ka ihe unu na-ekwu bụrụ ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-etinye ọnụ na ya, ka ọ ghara iche na ọ bịara nke ya iche. Otu Ilu e dere na Baịbụl kwuru, sị: “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.”—Ilu 12:18.

MEGODỊ IHE A: Chọpụta nnọkọ ma ọ bụ ememme ụfọdụ na-agaghị adị di gị ma ọ bụ nwunye gị mma. Tupu oge nnọkọ ahụ ma ọ bụ ememme ahụ eruo, kwurịtanụ ihe unu ga-agwa ndị enyi unu ma ha kwuo gbasara onye mbụ ị lụrụ.

NSOGBU NKE ATỌ: Ọ NA-ESIRI GỊ IKE ỊTỤKWASỊ DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ OBI N’IHI NA ONYE MBỤ Ị LỤRỤ KWARA IKO.

Otu nwoke aha ya bụ Andrew, bụ́ onye nwunye mbụ ya hapụrụ, sịrị: “Ụjọ na-atụbu m na onye ọzọ m ga-alụ nwere ike ime m ihe onye nke mbụ mere.” O mechara lụọ Riley bụ́ onye ya na ya bi ugbu a. Riley alụbuola di. Andrew sịrị: “Ihe na-echukarị m ụra bụ ma m̀ ga-abụli ezigbo di ka di mbụ Riley. O nwedịrị mgbe m nọ na-eche na ọ ga-ahapụ m gaa lụọ onye ọzọ maka na o nwere ike iche na mụ amaghị otú e si alụ nwaanyị.”

IHE I NWERE IKE IME: Na-akọrọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe na-enye gị nsogbu n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.” (Ilu 15:22) Andrew na Riley mechara tụkwasị ibe ha obi n’ihi na ha malitere ịgbarịta izu, ya bụ, onye nke ọ bụla n’ime ha malitere ịkọrọ ibe ya ihe dị ya n’obi. Andrew kwuru, sị: “M gwara Riley na agaghị m agba ya alụkwaghịm ma anyị nwee nsogbu, Riley gwakwara m otu ihe ahụ. M ji nwayọọ nwayọọ tụkwasịzie ya obi m niile.”

Ọ bụrụ na onye di gị ma ọ bụ nwunye gị lụburu kwara iko, mee ihe niile i nwere ike ime ka ọ tụkwasị gị obi. Dị ka ihe atụ, Michel na Sabine bụ di na nwunye ugbu a. Tupu ha alụọ, Michel lụburu nwunye, ya na ya agbaa alụkwaghịm. Sabine lụbukwara di, ya na di ya agbaakwa alụkwaghịm. Michel na Sabine kwekọrịtara na mgbe ọ bụla onye nke ọ bụla n’ime ha hụrụ onye ọ lụburu ma ọ bụkwanụ ya na ya ekwurịta okwu, na ha ga-agwa ibe ha. Sabine sịrị: “Ihe a anyị kwuru na anyị ga na-eme mere ka anyị ghara ịna-enyo ibe anyị enyo, meekwa ka ahụ́ ruo anyị ala.—Ndị Efesọs 4:25.

MEGODỊ IHE A: Kwụsịlata otú gị na nwaanyị na-abụghị nwunye gị ma ọ bụ nwoke na-abụghị di gị si ekwurịta okwu ihu na ihu ma ọ bụ na fon ma ọ bụkwanụ na kọmputa.

Ọtụtụ ndị lụgharịrị nwunye ma ọ bụ di na onye ha lụgharịrị bi n’udo ugbu a. Gị na onye nke gị nwekwara ike ibi n’udo. A sị ka e kwuwe, ị matakwuola ihe ugbu a karịa mgbe ahụ gị na onye nke mbụ bi. Andrew ahụ e kwuburu okwu ya sịrị: “Kemgbe afọ iri na atọ mụ na Riley lụrụ, ahụ́ eruola m ala. Mụ na ya dị n’ezigbo mma. Anyị achọkwanụghị ihe ga-eme ka anyị kewaa.”

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 5 Nke bụ́ eziokwu bụ na otú obi na-adị ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ na-adị iche n’otú ọ na-adị ndị nke ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha gbara alụkwaghịm. N’agbanyeghị otú gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị si tọsaa, isiokwu a ga-enyere gị na onye ị lụgharịrị aka ibi n’udo.

^ para. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ụfọdụ nsogbu di ma ọ bụ nwunye na-enwe n’ịzụ ụmụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha mụrụ tupu ha alụọ, gụọ isiokwu bụ́ “Secrets of Successful Stepfamilies [Ihe Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Ebe Di na Nwunye Na-azụ Nwa Otu Onye n’Ime Ha Mụrụ],” nke gbara na Teta! (Bekee) April 2012. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Olee àgwà ọma ụfọdụ di m ma ọ bụ nwunye m na-akpa bụ́ ndị kacha amasị m?

  • Ọ bụrụ na e kwuwe okwu kwute onye mbụ m lụrụ, olee ihe m nwere ike ikwu ka obi ruo nwunye m ma ọ bụ di m ala nakwa ka ọ mata na ejighị m ya egwuri egwu?