Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Jun 2013

Ànyị Kwesịrị Ikpegara Ndị Senti Ekpere?

Ànyị Kwesịrị Ikpegara Ndị Senti Ekpere?

Ò NWERE onye n’ime anyị nsogbu na-abịatụbereghị, ya achọọ onye ga-enyere ya aka? Ọ bụ ụdị nsogbu bịaara anyị ga-eme ka anyị mara onye anyị ga-agakwuru. Onye anyị ga-agakwuru nwere ike ịbụ enyi anyị nke ga-emetara anyị ebere, nke makwaara nsogbu ahụ anyị nwere. Ihe mere anyị ga-eji agakwuru ya bụ na anyị ma na o nwere ọmịiko nakwa na ọ ma nsogbu ahụ anyị na ya na-alụ.

Ụfọdụ ndị na-eme ụdị ihe a ma ha kpewa ekpere. Kama ikpegara Chineke bụ́ onye dị elu ekpere, ahụ́ na-aka eru ha ala ịrịọ ndị senti arịrịọ. Ha chere na ebe ọ bụ na ndị senti ebiela n’ụwa, nweekwa ụdị nsogbu ndị mmadụ na-enwe, ha ga-aka emetara ha ebere. Dị ka ihe atụ, ọ na-abụ ihe dị ezigbo mkpa funahụ ụfọdụ ndị, ha ekpegara onye a kpọrọ Senti Antoni onye Padua ekpere ka o nyere ha aka. A sịrị na ọ bụ ya na-ahụ maka ihe furu efu ma ọ bụ ihe e zuru ezu. Ọ bụrụ na ha chọrọ ikpe ekpere maka anụmanụ na-arịa ọrịa, ha nwere ike ikpegara ya senti a na-akpọ Senti Fransis onye Asisi. Ndị ike ụwa gwụrụ na-ekpegakwara onye a kpọrọ Senti Jud Tadiọs ekpere.

Ma, olee otú anyị ga-esi amata ma Akwụkwọ Nsọ ò kwuru na ọ dị mma ka anyị na-ekpegara ndị senti ekpere? Ebe ọ bụ Chineke ka anyị na-ekpegara ekpere, anyị kwesịrị ịchọpụta ma ọ̀ na-anụ ekpere anyị? Anyị kwesịkwara ịjụ, sị: Ekpere a na-ekpegara ndị senti ọ̀ na-adị Chineke mma, ka ọ̀ na-ewe ya iwe?

IHE BAỊBỤL KWURU BANYERE IKPEGARA NDỊ SENTI EKPERE

Ihe mere ndị mmadụ ji malite ikpegara ndị senti ekpere bụ maka na chọọchị Katọlik na-akụziri ndị mmadụ na ndị senti na-arịọchitere ụmụ mmadụ arịrịọ n’ihu Chineke. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru na nke a pụtara “onye nọ ná mkpa isi n’aka onye ya na Chineke dị ná mma rịọta Chineke ihe dị ya mkpa.” N’ihi ya, onye na-ekpegara ndị senti ekpere bu n’obi na ya ga-esi n’aka ha nweta ihe ọma n’ihi na o chere na ndị senti na Chineke dị n’ezigbo mma.

Ihe a ha na-eme ò si na Baịbụl? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o dere mere ndị mmadụ ji ekpegara ndị senti ekpere. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Eji m aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa ịhụnanya nke sitere na mmụọ nsọ na-agba unu ume, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpekusi Chineke ekpere ike n’ihi m.” (Ndị Rom 15:30) Ihe Pọl na-ekwu ọ̀ bụ ka Ndị Kraịst ibe ya na-arịọchitere ya arịrịọ n’ihu Chineke? Mbanụ. Ọ bụrụ na e nwere onye ga-arịọchitere ibe ya arịrịọ, ọ bụ Pọl kwesịrị ịrịọchitere ha n’ihi na ọ bụ onyeozi Kraịst. N’ihi ya, ihe Pọl na-ekwu bụ na Onye Kraịst nwere ike ịgwa Onye Kraịst ibe ya ka o kpeere ya ekpere. Ma, mmadụ ikpegara onye e chere na ọ nọ n’eluigwe ekpere ka ọ rịọchitere ya Chineke arịrịọ dị iche n’ihe ahụ Pọl kwuru. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

 N’oziọma Jọn, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Jizọs kwukwara, sị: “Nke a ga-eme ka Nna m nye ụnụ ihe ọbụla ụnụ rịọrọ ya n’aha m.” (Jọn 15:16, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Jizọs ekwughị ka anyị na-ekpegara yanwa ekpere, ya bụ, anyị kpegara ya ekpere, ya arịọziere anyị Chineke arịrịọ. Kama, o kwuru na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị ga-ekpegara Chineke ekpere naanị n’aha yanwa bụ́ Jizọs.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara ya ka ọ kụziere ha otú e si ekpe ekpere, ọ sịrị ha: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa.’” (Luk 11:2) Ị̀ hụrụ na ihe Jizọs kwuru bụ na “mgbe ọ bụla,” ma ọ bụ oge ọ bụla, anyị na-ekpe ekpere, ọ bụ naanị Chineke ka anyị ga-ekpegara ya, ọ bụghị Jizọs ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ? Ebe ọ bụ na Jizọs tara ụkwa jaa ezé ebe a, ọ̀ bụ na o doghị anya na ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere n’aha Jizọs Kraịst kama isi n’aka ndị senti ma ọ bụ n’aka onye ọzọ rịọ Chineke arịrịọ?

Ikpe ekpere bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke. N’ihi ya, onye kpegaara onye ọzọ ekpere na-efe onye ahụ ofufe, onye mekwara otú ahụ na-enupụrụ Chineke isi. (Jọn 4:23, 24; Mkpughe 19:9, 10) Ọ bụ ya mere o ji bụrụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere.

ỤJỌ Ò KWESỊRỊ ỊTỤ GỊ ỊGWA CHINEKE OKWU?

N’oge Jizọs nọ n’elu ugwu kụziere ndị mmadụ ihe, o mere otu ihe atụ. N’ihe atụ ahụ, o kwuru banyere nwatakịrị nke rịọrọ nna ya achịcha ma ọ bụ azụ̀. Nna ya ọ̀ ga-ahapụ inye ya achịcha ma nye ya nkume, ma ọ bụkwanụ hapụ inye ya azụ̀ ma nye ya agwọ? (Matiu 7:9, 10) O nweghị nna hụrụ nwa ya n’anya ga-eme otú ahụ.

Chineke chọrọ ka anyị na-agwa ya ihe dị anyị n’obi otú nna nke hụrụ nwa ya n’anya na-achọ ka nwa ya na-agwa ya ihe dị ya n’obi

Ka anyị mee ihe atụ ọzọ yiri nke ahụ. Were ya na ị bụ nna ma ọ bụ nne, ya abụrụ na o nwere ihe dị mkpa nwa gị chọrọ ịrịọ gị. Gị na nwa gị ahụ dịkwanụ n’ezigbo mma, ị na-egekwa ya ntị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ịgwa gị okwu. N’agbanyeghị otú a gị na ya si dị ná mma, ọ bịara na-atụ egwu ịgwa gị okwu, ya agwa onye ọzọ ka ọ bịa rịọ gị ihe ọ chọrọ. Olee otú obi ga-adị gị? Ọ bụrụkwanụ na mgbe ọ bụla ọ chọrọ ịgwa gị okwu, ya agwa onye ọzọ ka o kwuchite ọnụ ya, o yikwanụghị ka ò nwere mgbe ọ ga-akwụsị ime otú ahụ, obi ọ̀ ga-adị gị mma? O doro anya na ọ gaghị adị gị mma. Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-achọ ka ụmụ ha na-abịakwute ha, ha na-achọkwa ka obi ruo ụmụ ha ala mgbe ha na-arịọ ha ihe ọ bụla ha chọrọ ka ha meere ha.

Mgbe Jizọs na-akọwa ihe mere o ji mee ihe atụ ahụ, ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya ihe ọma karị!” (Matiu 7:11) O doro anya na ọ na-agụsi nne ma ọ bụ nna agụụ ike imere nwa ya ihe ọma. Otú ahụkwa ka ọ dị Nna anyị nke eluigwe, ọ na-akadị agụsi ya agụụ ike imere anyị ihe anyị na-arịọ ya.

Chineke chọrọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere n’onwe anyị, ọ bụrụgodị na mmehie anyị mere na-enye anyị nsogbu n’obi. O nweghị onye ọ bụla o nyefere ọrụ ịnụ ekpere anyị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Kama ịtụwa anya ka ndị senti ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ na-arịọchitere anyị arịrịọ, anyị kwesịrị iwere Jehova Chineke ka ezigbo enyi anyị nke anyị nwere ike ịgakwuru mgbe ọ bụla.

Nna anyị nke eluigwe hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. Ọ chọrọ inyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị nọ ná nsogbu. Ọ gwakwara anyị ka anyị bịa ya nso. (Jems 4:8) Obi dị anyị ụtọ na Chineke chọrọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere n’ihi na ọ bụ Nna anyị, bụrụkwa “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.