Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mee 2013

 IHE NDỊ NA-EME KA E NWEE OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ

Otú I Kwesịrị Isi Na-emeso Ụmụ Di Gị Ma Ọ Bụ Ụmụ Nwunye Gị Ihe

Otú I Kwesịrị Isi Na-emeso Ụmụ Di Gị Ma Ọ Bụ Ụmụ Nwunye Gị Ihe

MARGARET, * BỤ́ NWAANYỊ BI N’ỌSTRELIA, NKE DI YA MỤBURU ỤMỤ TUPU YA ALỤỌ YA, SỊRỊ: “Nwaanyị di m lụburu gwara ụmụ ya ka ha ghara ime ihe ọ bụla m gwara ha mee, ọ sọgodị ya ya bụrụ na m gwara ha saa ezé.” Margaret chere na ihe ahụ nwaanyị ahụ gwara ụmụ ya seere yanwa bụ́ Margaret na di ya okwu.

E nwere nsogbu ndị a na-enwe n’ezinụlọ ma ọ bụrụ na nwoke mụburu ụmụ tupu ya alụgharịa nwaanyị ma ọ bụ na nwaanyị ọ lụrụ kpọ ụmụ lọta n’ụlọ ya. * Ụfọdụ n’ime ha bụ otú nne ma ọ bụ nna ụmụ ahụ ga-esi na-abịa eleta ụmụ ya, ihe a ga-eme ụmụaka ahụ ma ha mee ihe ọjọọ, na otú a ga na-esi akpa afọ ha. Ihe ọzọkwa bụ na o nwere ike isiri ụfọdụ ndị ikwu na ibe nwoke ahụ ike ịhụ nwunye ọhụrụ ya na ụmụ ya n’anya. O nwekwara ike isiri ụfọdụ ndị ikwu na ibe nwaanyị ahụ ike ịhụ di ọhụrụ ya na ụmụ ya n’anya. Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru bụ́ ndị nwere ike inyere ndị nwere ụdị nsogbu a aka.

OTÚ Ị GA-ESI NA-EMESO NNE MA Ọ BỤ NNA ỤMỤ AHỤ IHE

Otu nwaanyị bi na Namibia aha ya bụ Judith nke di ya mụburu ụmụ tupu ya alụọ ya, sịrị: “O nwere mgbe nne ụmụ di m gwara ha na ihe m bụ bụ naanị nwunye nna ha, na nwa ọ bụla mụ na nna ha mụrụ abụghị nwanne ha. Ihe a o kwuru gbawara m obi n’ihi na m weere ụmụaka ahụ ka ụmụ m.”

Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na nwoke mụburu ụmụ tupu ya alụgharịa nwaanyị, nwunye mbụ ya nwere ike ịkpatara ya na nwunye ya nsogbu. Ha kwukwara na  ọ bụrụ na nwaanyị kpọ ụmụ lọta n’ụlọ di ya, di mbụ ya nwekwara ike ịkpatara ya na di ya nsogbu. Ọ na-abụkarị nwunye nwoke ahụ na nne ụmụaka ahụ na-aka ese okwu. Gịnị ga-enyere di na nwunye aka ma ụdị ihe a mee?

Ihe ga-enyere di na nwunye aka: Kpebienụ ihe unu chọrọ n’ezinụlọ unu. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e nwee ihe ga-ejikọtakwa ụmụaka ahụ na nne ha ma ọ bụ nna ha, obi ga na-agbawa ụmụaka ahụ. * O nweghị ihe ị ga-eme ka ụmụaka chefuo ‘nna ma ọ bụ nne mụrụ ha.’ (Ilu 23:22, 25) Ma, ọ bụrụ na i kwe ka nne ma ọ bụ nna ụmụaka ahụ tụwa ihe ga-eme n’ezinụlọ gị, iwe ga na-ewe di gị ma ọ bụ nwunye gị. N’agbanyeghị na unu na nne ma ọ bụ nna ụmụaka ahụ ka ga na-emekọrịtatụ ihe, kpebienụ ihe unu chọrọ ka ọ na-eme n’ezinụlọ gị na ihe unu na-achọghị ka ọ na-eme, ka ọ ghara ịkpata nsogbu n’ezinụlọ unu.

IHE GA-ENYERE NNE MA Ọ BỤ NNA ỤMỤ AHỤ AKA

  • Mgbe ọ bụla gị na nne ma ọ bụ nna ụmụaka ahụ na-ekwurịta okwu, ka ihe unu ga-ekwu bụrụ gbasara ụmụaka ahụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ya ka ọ gwa unu oge ọ ga na-akpọ unu ma ọ bụ ụmụaka ahụ na fon. Inwe oge ọ ga-eji na-akpọ unu ka mma karịa ịkpọ mgbe ọ bụla masịrị ya ma ọ bụkwanụ n’ime abalị.

  • Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị ebighị, i nwere ike ịna-akpọ ha na fon ma ọ bụ na-edegara ha akwụkwọ ozi ma ọ bụ na-eji ekwentị ma ọ bụ kọmputa ezigara ha ozi. (Diuterọnọmi 6:6, 7) Ụfọdụ na-ejidị ọkpọka kọmputa agwa ụmụ ha okwu bụ́ nke na-eme ka ha na ha na-ahụ ihu na ihu mgbe ha na-ekwurịta okwu. Ime ihe ndị a ga-eme ka ị mata ihe na-eme ná ndụ ụmụ gị, i nwekwara ike inyere ha aka karịadị otú ị tụrụ anya ya.

IHE GA-ENYERE NWUNYE NNA ỤMỤ AHỤ AKA

  • Ka ihe gbasara nne ụmụ ahụ ‘na-emetụ gị n’obi.’ Otú ị ga-esi eme ya bụ ime ka o doo ya anya na ị bịaghị ịnọchi ya, na ọ bụ ya ka bụ nne ha. (1 Pita 3:8) Na-agwa ya otú ụmụ ya na-eme, karịchaa, ebe ndị ha na-emezi emezi. (Ilu 16:24) Gwa ya ka ọ kọọrọ gị otú ọ chọrọ ka i si na-enyekwuru ụmụaka ya aka, keleekwa ya ma o kwuchaa.

  • Gị na ụmụaka ahụ na mama ha nọrọ, emela ihe ga-eme ka mama ha chewe na ị na-anara ya ụmụ ya. Otu nwaanyị bi n’Amerịka nke aha ya bụ Beverly kwuru, sị: “Ụmụ di m kwuru na ha ga na-akpọ m mama. Mụ na di m kwetara ka ha na-akpọ m ya n’ụlọ anyị. Ma, ọ bụrụ na ha nọ n’ihu mama ha ma ọ bụ n’ihu onye ezinụlọ mama ha, ha agaghị akpọ m ya. Mụ na mama ha bịaziri dịwa ná mma mgbe ha mewere ihe a anyị gwara ha. Mụ na mama ha gbakọdịrị aka nyere ụmụaka ahụ aka mgbe ndị nkụzi ha nyere ha ihe omume ụfọdụ ha ga-eme.”

Ụmụ obere ihe ị na-eme nwere ike inyere ụmụ gị aka karịa otú i chere

IHE GA-ENYERE MA ONYE MỤRỤ ỤMỤ AHỤ MA NDỊ HA NA ỤMỤ AHỤ BI AKA

    Iji olu ọma agwa onye di gị lụburu okwu ga-eme ka gị na ya dịrị ná mma

  • Ọ bụrụ na gị na ụmụ ahụ bi, ekwula okwu ọjọọ gbasara nne ha ma ọ bụ nna ha n’ebe ha nwere ike ịnụ ya. Ọ bụrụkwa na ọ bụ gị bụ nne ha ma ọ bụ nna ha, ekwula okwu ọjọọ banyere onye ahụ ya na ụmụ ahụ bi n’ebe ha ga-anụ ya. Ọ bụrụ na ị kpachaghị anya, okwu ọjọọ nwere ike ịdapụta gị n’ọnụ, ọ ga-emekwa ka obi jọọ nwa ahụ njọ. Ị maghịkwa mgbe nwa ahụ ga-akọrọ onye ọzọ ihe ahụ i kwuru ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-etinye ya nnu na ose. (Ekliziastis 10:20) Ọ bụrụkwa na nwata agwa gị na mama ya ma ọ bụ papa ya ma ọ bụkwanụ onye ya na ya bi kwuru okwu ọjọọ gbasara gị, chọọ ihe ị ga-ekwu ka obi ruo nwa ahụ ala. I nwere ike ịgwa ya, sị: “Hapụwa. Ọ ga-abụ na mama  gị na-ewere m iwe. Ọ na-abụ ụfọdụ ndị wewe iwe, ha ekwuo ihe na-adịchaghị mma.”

  • Ọ bụrụ na aka nne ha ma ọ bụ nna ha ji na-azụ ha dị mma, werekwa ya na-azụ ha. Ọ bụrụ na ị gaghị esi otú ahụ na-azụ ha, gwa ha ihe kpatara ya. Ma, ekwula ya ka à ga-asị na nne ha ma ọ bụ nna ha amaghị otú e si azụ nwa. Chebagodịrị ihe atụ a echiche:

    Nwunye Nna Okorie: Okorie, gaa gbasaa tọwel ahụ n’èzí.

    Okorie: N’ụlọ mama m, anyị na-achịsa ya n’ala, mama m achịrị ya gaa gbasaa.

    Nwunye Nna Okorie (n’iwe): Mechie ọnụ. Ihe ahụ mama gị na-eme bụ ịzụtọ gị azụtọ.

    Ma í cheghị na ọ ka mma ka o si otú a kwuo ya?

    Nwunye Nna Okorie (n’olu ọma): Anụla m ihe i kwuru. Ma n’ụlọ anyị ebe a, onye ọ bụla na-eji aka ya agbasa tọwel ya n’èzí.

  • Edunyela ụmụaka ahụ ozi ga-eme ka ha ghara inwe ohere ma ọ bụkwanụ ghara ịnọ n’ụlọ n’oge ha na nne ha ma ọ bụ nna ha ga-eji anọrị. (Matiu 7:12) Ọ bụrụ na o nwere ihe ga-eme ka ha ghara ịnọ n’oge ahụ, buru ụzọ gwa nne ha ma ọ bụ nna ha agwa tupu gị edunyewe ha ozi ahụ.

MEGODỊ IHE A: Gbalịa mee ihe ndị a mgbe ọ bụla ọzọ gị na nne ma ọ bụ nna ụmụaka gị na ha bi hụrụ:

  1. Lee ya anya n’ihu ma mụmụọrọ ya ọnụ ọchị. Amarala ya ọsụ, arọkwala ya anya.

  2. Kelee ya nke ọma. Ọ bụrụ na i kwesịrị ịkpọ ya aha ya ma ọ bụ Deede ma ọ bụ Daada, kpọọ ya ya.

  3. Ọ bụrụ na gị na ya na ndị ọzọ nọ, na-ekwunyere ya okwu, ka ọ ghara ịdị ya ka ọ̀ bịara nke ya iche.

OTÚ UNU GA-ESI NA-EMESO ỤMỤ DI GỊ MA Ọ BỤ ỤMỤ NWUNYE GỊ TOROLA ETO IHE

Otu akwụkwọ kọrọ banyere otu nwaanyị nke kwuru na di ya na-adụnyere ụmụ di ya ndị torola eto úkwù mgbe ọ bụla ya na ha na-ese okwu. Nwaanyị ahụ kwuru na di ya achọkwanụghị ikweta na ụmụ ya ahụ na-akparị ya. Nwaanyị ahụ sịrị: “Ụdị ihe a mee, iwe na-ewe m ozugbo.” Olee ihe nwaanyị a na di ya ga-eme ka ụmụ ya ma ọ bụ ụmụ di ya ndị torola eto ghara ime ka ya na di ya na-ese okwu?

Ihe ga-enyere di na nwunye aka: Na-emeterenụ ibe unu ebere. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ụjọ nwere ike ịna-atụ ụmụ ahụ torola eto na nna ha ma ọ bụ nne ha agakwaghị ahụ ha n’anya. Ma ọ bụkwanụ ha nwere ike iche na ọ bụrụ na ha na nwunye nna ha ma ọ bụ di mama ha adịrị ná mma, ihe ọ pụtara bụ na ha ahụghịzi nne ma ọ bụ nna mụrụ ha n’anya. Ihe ọzọkwa bụ na onye nke mụrụ ụmụ ahụ ga na-eche na ọ bụrụ na ya abaara ụmụ ya mba, ụmụ ahụ ga-agbawara ya ọsọ.

Hapụ ụmụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ha si n’obi ha hụ gị n’anya. Ọ dịghị mma ịmanye mmadụ amanye ka ọ hụ gị n’anya. (Abụ Sọlọmọn 8:4) N’ihi ya, atụla anya na gị na ụmụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ga na-akpachi anya otú ị chọrọ.

Ọ bụrụgodị na e mejọrọ gị, ọ bụghị ihe niile dị gị n’obi ka ị ga-ekwu. (Ilu 29:11) Ọ bụrụ na o siiri gị ike ijide onwe gị, kpee ụdị ekpere a Devid bụ́ eze Izrel kpere: “Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche; nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.”—Abụ Ọma 141:3.

Ọ bụrụ na ebe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kpebiri ibi bụ n’ụlọ ebe a nọ mụọ ụmụ ahụ unu na ha bi, ị ga-achọpụta na ha ejighị ụlọ ahụ na ihe ndị dị n’ime ya egwu egwu. Gbalịa ka ị ghara ịgbanwe ọtụtụ ihe n’ụlọ  ahụ, karịchaa, n’ime ụlọ ha. Ma ọ bụrụ na ibi n’ụlọ ahụ ga-akpatara unu nsogbu, unu nwere ike ịkwaga ebe ọzọ.

MEGODỊ IHE A: Ọ bụrụ na ụmụ di gị ma ọ bụ ụmụ nwunye gị na-akparịkarị gị, kọọrọ ya di gị ma ọ bụ nwunye gị, geekwa ntị nke ọma n’ihe ọ ga-agwa gị. Amanyela ya ka ọ baara ụmụ ya mba. Ihe ka mkpa bụ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị gbalịa ghọta ibe unu. Unu nwehaala ‘otu obi’ mgbe ọ bụla ụdị ihe ahụ mere, ọ ga-adịrị unu mfe ịgbakọ aka ọnụ mee ka ihe ka mma.—2 Ndị Kọrịnt 13:11.

Gbalịa ka ị hụ ụmụaka niile nọ n’ezinụlọ unu n’anya

OTÚ UNU GA-ESI NA-EMESO NDỊ IKWU NA IBE UNU IHE

Otu nwaanyị bi na Kanada aha ya bụ Marion kwuru, sị: “Papa m na mama m na-enyekarị nwa m ihe, ma ha anaghị enye ụmụ di m. Ihe anyị na-emezi bụ ịchọta ihe anyị ga-azụtara ha, ma ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-enwe ego anyị ga-eji azụtara ha ihe.”

Ihe ga-enyere di na nwunye aka: Ka ezinụlọ ọhụrụ unu bụrụ ihe kacha unu mkpa. Gwa ndị ikwu na ibe gị na ị chọghị ihe ọ bụla ga-ekewa gị na ndị ezinụlọ ọhụrụ gị a. (1 Timoti 5:8) Ọ bụ eziokwu na i kwesịghị ịtụ anya ka ndị ikwu na ibe gị niile hụ ndị ezinụlọ ọhụrụ gị a n’anya, gwa ha na ị chọrọ ka ha were onye ọ bụla n’ime ha otú ha si were ibe ya. Gwa ha na ọ na-ewute ụmụaka ma ọ bụrụ na e nye ụmụaka ibe ha ihe, e nyeghị ha.

Hapụ ụmụ di gị ma ọ bụ ụmụ nwunye gị ka ha na nne na nna mama ha ma ọ bụkwanụ nne na nna papa ha na-emekọrịta ihe. Otu nwaanyị bi n’Ịngland aha ya bụ Susan kwuru, sị: “M lụgharịrị di otu afọ na ọnwa isii di m mbụ nwụrụ. Ma o siiri nne na nna di mbụ m ike ịnabata di ọhụrụ m. Ma, ihe bịara ka mma mgbe anyị na ha mekọwakwuru ihe ọnụ nakwa mgbe m hapụrụ ụmụ mụ na di m mbụ ka ha na-akpọ ha na fon ma na-ekele ha maka otú ha si na-enyere anyị aka.”

MEGODỊ IHE A: Chọpụta enyi unu ma ọ bụkwanụ onye ikwu unu nke kacha enye gị nsogbu kemgbe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị lụrụ. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịtazie ihe unu ga-eme ka unu na onye ahụ dịkwuo ná mma.

O doro anya na ọ bụrụ na nwoke mụburu ụmụ tupu ya alụgharịa nwaanyị ma ọ bụ na nwaanyị ọ lụrụ kpọ ụmụ lọta n’ụlọ ya, ụfọdụ ndị ikwu na ibe ha nwere ike ịna-akpatara ha nsogbu n’ezinụlọ ọhụrụ ha. Ma, ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, Chineke ga-agọzi ezinụlọ gị n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.”—Ilu 24:3.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 4 Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ ị ga-eme ma ọ bụrụ na i nwere ụdị nsogbu a, gụọ isiokwu ndị bidoro Teta! (Bekee) April 2012. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 8 Ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ụmụaka ahụ na-akparị unu ma ọ bụkwanụ kwuo na ya ga-emesi unu ike, unu enyela ya ohere otú unu gaara enye ya.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Olee ihe m ga-eme ka mụ na onye di m ma ọ bụ nwunye m lụburu ghara ịna-ese okwu?

  • Olee ihe anyị ga-eme ka ndị ikwu na ibe anyị ghara ịkpata nsogbu n’ezinụlọ anyị n’amaghị ama?