Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2013

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere e ji kpọọ obodo Ninive oge ochie “obodo na-awụfu ọbara”?

Ihe a tụrụ atụ ná mgbidi nke gosiri ebe ndị agha bu isi ndị iro ha na-edokọta otu ebe

Ninive bụ isi obodo nke alaeze Asiria. Ọ bụ nnukwu obodo nke ọmarịcha obí eze na ụlọ arụsị dị iche iche dị na ya. Okporo ámá ya sara mbara, e wusikwara mgbidi e ji gbaa ya gburugburu ike. Otu onye amụma Hibru aha ya bụ Nehọm kpọrọ obodo a “obodo na-awụfu ọbara.”—Nehọm 3:1.

Ihe a Nehọm kpọrọ obodo a bụ ihe ọ bụ n’eziokwu n’ihi na ihe ndị a tụrụ atụ n’obodo Ninive n’obí eze Asiria, bụ́ Senakerib, gosiri na obi fere ndị Asiria azụ. Otu n’ime ihe ndị ahụ a tụrụ atụ gosiri ebe ndị Asiria jigidere otu onye mkpọrọ n’ala ma na-adọpụta ya ire n’ọnụ. Ihe ndị e dere na nkume kwuru na ndị Asiria na-amanye ụdọ ná nkò ma were nkò ahụ konye n’imi ma ọ bụ n’egbugbere ọnụ nke ndị ha ji eji ma jirizie ụdọ ahụ dọrọ ha na-aga. A na-ejide ndị eze gbupụ ha isi ma were isi ha nyawa ndị ozi ha e ji eji n’olu.

Otu ọkà mmụta n’ihe gbasara ndị Asiria oge ochie nke aha ya bụ Archibald Henry Sayce kọrọ otú ndị Asiria si emekpọ obodo ha meriri ọnụ. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụla ọchịagha ha lụrụ agha merie, a na-edokọta isi ndị o gburu egbu n’otu ebe; a na-akpọ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ọkụ ná ndụ ma ọ bụkwanụ hapụ ha ndụ ka e mee ha nke ka njọ. A na-akpọgide ndị ikom n’osisi, gbaa ha akpụkpọ ná ndụ, rụkpọọ ha anya, ma ọ bụ gbupụ ha ụkwụ na aka ma chapụ ha ntị na imi.”

Gịnị mere ndị Juu ji arụ ihe nrụbichi, ma ọ bụ obere mgbidi, gburugburu elu ụlọ ha?

Chineke nyere ndị Juu iwu, sị: “Ọ bụrụ na ị na-ewu ụlọ ọhụrụ, rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ gị, ka i wee ghara ime ka ikpe ọbara ma ụlọ gị n’ihi na mmadụ nwere ike isi na ya dapụ.” (Diuterọnọmi 22:8) Ịrụ obere mgbidi a n’elu ụlọ ha dị ezigbo mkpa n’ihi na ndị Juu oge ochie na-anọkarị n’elu ụlọ eme ọtụtụ ihe.

Elu ụlọ ndị Juu na-adịkarị larịị. Ha na-anọkarị ebe ahụ anyaratụ anwụ, anara ikuku, ma ọ bụ rụọ ọrụ ndị ọzọ a na-arụ n’ụlọ. Ebe ahụ na-atọkwa ha ụtọ ịnọ na ya ehi ụra n’oge ọkọchị. (1 Samuel 9:26) Onye ọrụ ubi na-anọ n’elu ụlọ agba ọka ndị ọ ghọtara n’ubi n’anwụ tupu ya egwerie ha ma ọ bụkwanụ nọrọ na ya gbaa mkpụrụ vaịn ya na mkpụrụ fig ya n’anwụ.—Jọshụa 2:6.

A na-anọkwa n’elu ụlọ efe Chineke ma ọ bụkwanụ arụsị. (Nehemaya 8:16-18; Jeremaya 19:13) Pita onyeozi gbagooro n’elu ụlọ n’otu ehihie ịga kpee ekpere. (Ọrụ Ndịozi 10:9-16) Ọ bụrụ na osisi vaịn toro n’elu ụlọ ahụ ma ọ bụ na a tụrụ ya igu nkwụ nke mere ka e nwee ndò na ya, elu ụlọ ahụ na-adị mma ịnọ na ya zuru ike.

Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere mba Izrel kwuru na ndị Izrel na-enwe steepụ ma ọ bụ ubube ha ji arịgo n’elu ụlọ ha. Steepụ ahụ ma ọ bụ ubube ahụ “na-adị n’èzí, n’ogige ụlọ ha.” N’ihi ya, onye bi n’ụlọ nwere ike isi n’elu ụlọ rịtuo n’ebughị ụzọ banye n’ime ụlọ. Nke a na-eme ka anyị ghọta ihe mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya “ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata iburu ngwongwo n’ụlọ ya” mgbe a na-abịa ibibi obodo ha, kama ka ọ gbapụ ngwa ngwa.—Matiu 24:17.