Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mach 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: OLEE URU MBILITE N’ỌNWỤ JIZỌS BAARA GỊ?

À Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ n’Eziokwu?

À Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ n’Eziokwu?

ENWERE otu nwoke Gris nke dịrị ndụ puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. Aha ya bụ Hirọdọtọs. Ọ kọrọ otu ihe ndị Ijipt na-eme n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ ndị ọgaranya mewe oriri, ozugbo ndị mmadụ richara nri e siiri ha, otu nwoke na-eburu obere igbe ozu, nke obere ozu a tụrụ atụ dị n’ime ya, na-agagharị ma na-egosi ya ndị niile bịara oriri ahụ. Ya gosi ha ya, ya asị ha, ‘Rienụ, ṅụọnụ ma legodịnụ ihe a m bu n’aka, n’ihi na otú a ka unu ga-adị ma unu nwụọ.’”

Ọ bụghị naanị ndị Ijipt si otú a ele ọnwụ na ndụ anya. Taa, ndị mmadụ na-ekwukarị na ọ bụ “nke onye riri ka o bu ala mmụọ.” Ha chere na ebe ọ bụ na mmadụ nwụọ nke ya agaala, na ọ kaara mmadụ mma ikpori ndụ otú ọ bụla ọ chọrọ. Ha chekwara na ọ baghị uru mmadụ ịgbalịwa ka o mee ezi ihe. Ha na-asị na ndụ anyị dị ugbu a enweghị isi n’ihi na mmadụ nwụọ, nke ya agaala. Pọl onyeozi kwukwara na ndị na-ekwetaghị na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ na-asị na “ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ‘ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.’”—1 Ndị Kọrịnt 15:32.

Ma Pọl ekwetaghị na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na nke ya agaala. O doro ya anya na o nwere mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. N’oge ahụ, ha nwekwara ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe mere obi ji sie Pọl ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ bụ na e si n’ọnwụ kpọlite * Kraịst Jizọs. N’eziokwu, ọ bụ mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka ndị mbụ soro ụzọ Jizọs nwee okwukwe na Chineke.

Ma olee uru mbilite n’ọnwụ Jizọs baara anyị? Oleedị otú anyị si mara na a kpọlitere ya n’ọnwụ n’eziokwu? Ka anyị hụ otú Pọl si mee ka nke a doo anya n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bi na Kọrịnt.

 IHE GAARA EME MA A SỊ NA A KPỌLITEGHỊ KRAỊST

Ụfọdụ Ndị Kraịst bi n’obodo Kọrịnt n’oge ochie amaghị ma à kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu ma ọ bụ na a kpọliteghị ya. Ụfọdụ ekwetadịghị na e nwere ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọnwụ. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ha, o mere ka ha mata otú imi na anya gaara adị Ndị Kraịst ma a sị na e nweghị mbilite n’ọnwụ. O dere, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị, a kpọliteghị Kraịst. Ma ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst, ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ihe efu n’ezie, okwukwe anyị bụkwa ihe efu. Ọ pụtakwara na anyị bụ ndị àmà ụgha nke Chineke . . . Okwukwe unu abaghị uru; unu ka nọ ná mmehie unu. . . . Ndị dara n’ụra ọnwụ n’ime Kraịst lakwara n’iyi.”—1 Ndị Kọrịnt 15:13-18.

“Ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe . . . Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu Jems, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndịozi niile; ma n’ikpeazụ, n’ime ha niile, ọ pụtara n’ihu m.”—1 Ndị Kọrịnt 15:6-8

Ihe mbụ Pọl kwuru bụ na ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ihe ọ pụtara bụ na a kpọliteghị Kraịst n’ọnwụ. Ọ bụrụ n’eziokwu na a kpọliteghị Kraịst, gịnị gaara eme? Ọ gaara abụ na ozi ọma ha na-ekwusa bụ ihe efu, bụrụkwa okpookpo asị. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst, ihe ọ pụtara bụ na ihe ụfọdụ dị mkpa Baịbụl kwuru banyere ọchịchị Chineke, aha ya, Alaeze ya, na nzọpụta a ga-azọpụta ụmụ mmadụ enweghị nke bụ́ eziokwu. Ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst n’ọnwụ, ozi ọma Pọl na ndịozi Jizọs ndị ọzọ kwusara furu ọhịa.

Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst n’ọnwụ, ihe niile Ndị Kraịst kweere bụ ihe efu, bụrụkwa ụgha. Ihe ọ pụtakwara bụ na Pọl na ndị ọzọ ghara ụgha mgbe ha kwuru na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ha ghagidekwara Jehova Chineke ụgha, bụ́ onye ha sịrị na ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Nke kadị njọ bụ na ihe ọ pụtara bụ na ihe ahụ ha kwuru, nke bụ́ na Kraịst “nwụrụ maka mmehie anyị” bụkwa ụgha n’ihi na ọ bụrụ na a kpọliteghị onye ahụ a kpọrọ Onye nzọpụta n’ọnwụ, ọ gaghị azọpụtali ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrịnt 15:3) Ọ pụtakwara na olileanya Ndị Kraịst niile nwụrụ anwụ nwere, nke bụ́ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, enweghị isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị nke nwụrụ n’ihi okwukwe ha.

Pọl mechara kwuo, sị: “Ọ bụrụ naanị ná ndụ a ka anyị nwere olileanya na Kraịst, anyị bụ ndị e kwesịrị imere ebere karịa mmadụ niile.” (1 Ndị Kọrịnt 15:19) Ma Pọl ma Ndị Kraịst ndị ọzọ tara ahụhụ, a kpagbuo ha, mesie ha ike, ha edie ihe isi ike, ha ekweta ka e gbuo ha kama ha ga-emebi iwu Chineke. Ihe mere ha ji die ihe niile a bụ na ha kweere na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ. Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, mbọ niile ha gbara furu ọhịa.

IHE MERE Ị GA-EJI KWERE NA A GA-AKPỌLITE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ N’ỌNWỤ

Pọl kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ maara na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji gwa Ndị Kọrịnt ihe ndị gosiri na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ọ sịrị na “Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; nakwa na e liri ya, ee, na a kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru; na ọ pụtakwara n’ihu Sifas, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ.” * Pọl kwukwara, sị: “Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha ka nọ ruo ugbu a, ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu Jems, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndịozi niile; ma n’ikpeazụ, n’ime ha niile, ọ pụtara n’ihu m.”—1 Ndị Kọrịnt 15:3-8.

Pọl gwara Ndị Kọrịnt hoo haa na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị, e lie ya, kpọlitekwa ya n’ọnwụ. Gịnị mere obi ji sie Pọl ike na ihe ọ gwara ha bụ eziokwu? Otu ihe mere ya bụ na e nwere ọtụtụ ndị ji anya ha hụ Kraịst mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Mgbe a kpọlitere Jizọs, ọ pụtara n’ihu ọtụtụ ndị, pụtakwa n’ihu Pọl. Ọ pụtara ma n’ihu mmadụ ole na ole  ma n’ihu ihe dị ka narị mmadụ ise. O doro anya na tupu Jizọs apụta n’ihu ha, ọtụtụ n’ime ha ekwetabughị na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. (Luk 24:1-11) Ọtụtụ n’ime ndị ahụ hụrụ Jizọs ka dị ndụ n’oge Pọl. Onye chọrọ ịma ma ihe Pọl na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu nwekwara ike ịga jụọ ha. (1 Ndị Kọrịnt 15:6) Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ hụrụ Jizọs mgbe ahụ, ndị mmadụ nwere ike ịsị na ihe ha kwuru abụghị eziokwu, ma o siri ike ikwu na ihe ihe dị ka narị mmadụ ise kwuru abụghị eziokwu.

Ị̀ hụrụ na mgbe Pọl na-ekwu banyere ọnwụ Jizọs, olili ya, na mbilite n’ọnwụ ya, o kwuru na ha niile mere “dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo” nakwa “dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru”? Ihe ndị ahụ merenụ gosiri na amụma ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaya mezuru ma si otú ahụ gosi na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.

N’agbanyeghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nakwa ihe ndị hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya kwuru, e nwere ndị na-ekwetaghị na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, a ka nwekwara ha n’oge anyị a. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị kwuru na ndị na-eso ụzọ Jizọs bịara zuru ozu ya ma gwawazie ndị mmadụ na a kpọlitela ya n’ọnwụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs enweghị ike ịga zuru ozu ya ebe ọ bụ na ndị agha Rom guzo n’ihu ili Jizọs na-eche ili ahụ nche. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụghị Jizọs ka ndị ahụ sịrị na ha hụrụ Jizọs hụrụ, kama na ọ bụ ọhụụ ka ha hụrụ ma ọ bụkwanụ na anya ha nọ na-emegharị ha anya. Ma o nweghị ike ịbụ ọhụụ ka ha hụrụ ebe ọ bụ na Jizọs pụtara n’ihu ọtụtụ ndị n’oge dị iche iche. Ihe ọzọkwa bụ na a sị na ọ bụ ọhụụ ka ha hụrụ, olee otú onye a hụrụ n’ọhụụ ga-esi mịa azụ̀ n’ọkụ ma nye ndị mmadụ ka ha taa otú ahụ Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya na Galili mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ? (Jọn 21:9-14) Onye mmadụ hụrụ n’ọhụụ ò nwere ike ịgwa ndị mmadụ ka ha bịa metụ ya aka?—Luk 24:36-39.

Ndị ọzọ na-ekwukwa na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ, kama na ndị na-eso ụzọ ya ghara ụgha sị na  a kpọlitela ya. Ma olee uru ịgha ụgha na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ga-abara ha ebe ọ bụ na a na-akwa ha emo, na-ata ha ahụhụ, ma na-egbu ha maka na ha na-ekwusa na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ? Olee otú ha ga-esi ghawa ụwa ebe ha ma na ọ ga-etinye ha ná nsogbu? Ihe ọzọ anyị kwesịkwara iburu n’obi bụ na ọ bụ na Jeruselem, n’ihu ndị iro ha, ka ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ịkọrọ ndị mmadụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. A sị na ọ bụ ụgha ka ha na-agha, ha agaraghị agha ya n’ihu ndị iro ha n’ihi na ndị iro ha ahụ na-achọdị ihe ha ga-akụdo aka memilaa ha.

Ọ bụ mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike ịkọrọ ndị mmadụ banyere Jizọs n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ a na-emegide ha. Mbilite n’ọnwụ Jizọs so n’ihe dị mkpa Ndị Kraịst kweere. Ihe mere Ndị Kraịst oge mbụ ji kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ha abụghị ka ha kọọrọ ndị mmadụ banyere otu onye nkụzi ụbụrụ na-aghọ nkọ nke e gburu egbu. Kama nke ahụ, ha kọọrọ ndị mmadụ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’ihi na mbilite n’ọnwụ ya gosiri na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, bụrụkwa onye dị ike. O gosikwara na Jizọs bụ onye dị adị, nke na-enyere ha aka ma na-edu ha. Mbilite n’ọnwụ Jizọs na-egosikwa na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ma ha nwụọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ, a gaghị enwe ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị agaghịkwa ama onye ọ bụ ma ọ bụ nụ banyere ya.

Ma, olee uru mbilite n’ọnwụ Jizọs baara anyị taa?

^ para. 5 Na Baịbụl, otú e si dee okwu Grik ahụ a sụgharịrị “mbilite n’ọnwụ” bụ “iguzo ọtọ ọzọ.” Ihe ọ pụtara bụ na a ga-eme ka onye nwụrụ anwụ dịghachi ndụ ọzọ ma bụrụ onye ọ bụbu tupu ya anwụọ, marakwa ihe niile ọ ma tupu ya anwụọ.

^ para. 13 Ọ bụ eziokwu na ndịozi Jizọs fọrọ mmadụ iri na otu mgbe Judas nwụrụ, a ka nọ na-akpọ ha “ndị ozi iri na abụọ” ma ọ bụ “ndịozi.”—Jọn 20:24.