Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mach 2013

 AKỤKỌ NDỤ

“M Hụrụ, ma Aghọtaghị M”

“M Hụrụ, ma Aghọtaghị M”

A mụrụ m n’afọ 1973. Ma mgbe m dị afọ abụọ, ọ dị ihe mere otu ụbọchị nke mere ka mama m chewe na ọ ga-abụrịrị na m nwere nsogbu. Ka mama m ku m n’aka, otu ihe dị arọ dapụnahụrụ otu enyi ya. Ihe ahụ dapụnahụrụ ya mere oké ụzụ. Mama m chọpụtara na mụ akụjaghị. Mgbe m dị afọ atọ, ekwuwebedịghị m okwu. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị dọkịta gwara ndị ezinụlọ anyị otu ihe wụrụ ha akpata oyi n’ahụ́. Ha kwuru na m bụ onye ogbi.

Mgbe m ka dị obere, papa m na mama m gbara alụkwaghịm, mama m azụwazie mụ na ụmụnne m ndị tọrọ m. Ụmụnne m ahụ dị atọ, ụmụ nwoke abụọ na otu nwaanyị. Na Frans n’oge ahụ, a naghị akụzichara ndị ogbi ihe otú e si akụziri ha taa. N’oge ahụ, otú e si akụziri ha ihe mgbe ụfọdụ na-eme ka ha tagbuo onwe ha n’ahụhụ. Ma kemgbe m dị obere, e nwere ihe ọma meere m nke na-emereghị ọtụtụ ndị ogbi ibe m. Ka m kọọ ihe ọ bụ.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ ise

N’oge ahụ, ọtụtụ ndị nkụzi na-amanye ụmụaka ndị dara ogbi ka ha na-ekwu okwu. Ha na-amanyekwa ha ka ha na-ele onye nkụzi anya n’ọnụ mgbe onye nkụzi na-ekwu okwu ka ha nwee ike ịghọta ihe ọ na-ekwu. N’ebe anyị bi na Frans, e nyedịrị iwu ka a ghara iji asụsụ ndị ogbi na-akụziri ndị ogbi ihe n’ụlọ akwụkwọ. A na-ekela ụfọdụ ụmụaka ndị ogbi aka n’azụ n’oge a na-akụziri ha ihe na klas.

Mgbe m na-eto, otu ọkachamara nke na-akụziri ndị ogbi otú e si ekwu okwu na-akụziri m ihe ọtụtụ awa n’izu ọ bụla. Ọ na-ejide m aka n’agba ma ọ bụ n’isi ma manye m ka m na-ekwughachi ihe m na-anaghị anụ. Mụ na ụmụaka ndị ọzọ anaghị ekwurịta okwu. Atagburu m onwe m n’ahụhụ n’oge ahụ.

Mgbe m dị afọ isii, a kpọgara m n’ụlọ akwụkwọ ndị ogbi. Mụ na ndị ogbi ibe m bi ebi n’ebe ahụ. Ihe a bụ nke mbụ m na-ahụ ụmụaka ndị ogbi ndị ọzọ. N’ụlọ akwụkwọ a, ndị nkụzi anaghịkwa ekwe ka anyị na-asụ asụsụ ndị ogbi. O nwehaala otú anyị si megharịa aka ma ọ bụ ihu, ndị nkụzi na-akụ anyị ihe ma ọ bụ ha efopụ ntutu isi anyị. Ma anyị na-eji aka agwa ibe anyị okwu na nzuzo. Otú anyị si eme ya bụ na anyị na-echepụta otú anyị ga-esi na-agwa ibe anyị okwu ndị ọzọ aghara ịma ihe anyị na-ekwu. Ọ bụ otú a ka mụ na ụmụaka ndị ọzọ si malite ịkparịta ụka. Nke a mere ka m nwee obi ụtọ ruo afọ anọ.

Ma mgbe m dị afọ iri, a kpọgara m n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. Ụlọ akwụkwọ a bụ nke ụmụaka ndị na-anụ ihe. Nke a gbawara m obi! Echere m na ụmụaka ndị ogbi ndị ọzọ anwụchaala, na ọ bụzi naanị m fọrọ n’ụwa. Ndị ezinụlọ anyị ekweghị amụ asụsụ ndị ogbi, ha ekweghịkwa ka mụ na ụmụaka ndị ogbi na-akpa n’ihi na ndị dọkịta gwara ha na ọ bụrụ na ha amụọ asụsụ ndị ogbi ma ọ bụ kwe ka mụ na ụmụaka ndị ogbi na-akpa, ọ ga-eme ka m ghara ịmụta ikwu okwu. M ka na-echeta otu ụbọchị anyị gara n’ọfịs dọkịta na-akụziri ụmụaka ndị  ogbi otú e si ekwu okwu. Ahụrụ m otu akwụkwọ ndị ogbi n’elu tebụl ya. Mgbe m hụrụ ihe e sere n’ihu ya, m tụrụ akwụkwọ ahụ aka ma kwuo, sị, “M chọrọ akwụkwọ a!” Dọkịta ahụ zoro akwụkwọ ahụ ozugbo. *

OTÚ M SI MALITE ỊMỤ BAỊBỤL

Mama m gbalịrị ịkụziri mụ na ụmụnne m Baịbụl. Ọ na-akpọ anyị aga ọmụmụ ihe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova aha ya bụ Merignak. Ọgbakọ a dị nso n’obodo Bọdoo. Ebe m ka bụ nwata, anaghị m aghọtacha ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Ma, e nwere ndị na-anọ m n’akụkụ ma jiri akwụkwọ na-edere m ihe a na-amụ. Otú ha si hụ m n’anya na-emetụ m n’obi. Mama m na-amụrụ m Baịbụl n’ụlọ, ma anaghị m aghọtacha ihe ọ na-akụziri m. Ọ dị m otú ahụ ọ dị Daniel onye amụma. Mgbe mmụọ ozi gwachara Daniel ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, Daniel sịrị: “Mụ onwe m nụrụ ma aghọtaghị m.” (Daniel 12:8) Ma nke m bụ na “Mụ onwe m hụrụ, ma aghọtaghị m.”

N’agbanyeghị nke ahụ, eji m nwayọọ nwayọọ mụta ihe ụfọdụ Baịbụl na-akụzi. Ejighị m ihe ọ bụla m mụtara egwuri egwu, m na-agbalịkwa ime ya eme. Otú ọzọ m si mụta ihe bụ na m na-eleru àgwà ndị ọzọ na-akpa anya. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị ka anyị na-enwe ndidi. (Jems 5:7, 8) Ma, aghọtaghị m ihe inwe ndidi pụtara. Ma, ka m na-ahụ otú Ndị Kraịst ibe m si enwe ndidi, m bịaziri ghọta ihe ọ pụtara. N’eziokwu, ọgbakọ Ndịàmà Jehova nyeere m ezigbo aka.

MGBE IHE NDỊ M NA-ATỤGHỊ ANYA HA MERE

Stéphane nyeere m aka ịghọta Baịbụl

Otu ụbọchị mgbe m ka na-eto eto, ahụrụ m ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ogbi ka ha nọ n’okporo ụzọ jiri asụsụ ndị ogbi na-ekwurịta okwu. M na-ezoro ezoro pụọ ka mụ na ha na-akpa. Ọ bụ otú ahụ ka m si malite ịmụ asụsụ ndị ogbi nke Frans. M nọkwa na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Mgbe ọ bụla m gara ọmụmụ ihe ahụ, otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Stéphane na-enyere m ezigbo aka. O mere ihe niile o nwere ike ime ka mụ na ya na-akparịta ụka. Mụ na ya bịara bụrụ ezigbo enyi. Ma, ihe m na-atụghị anya ya meziri m. Ndị ọchịchị tụrụ Stéphane mkpọrọ n’ihi na ọ jụrụ ịbụ onye agha. Ihe a merenụ gbawara m obi! Ebe ọ bụ na Stéphane anọghịzi, ike ịga ọmụmụ ihe gwụrụ m, mụ ana-aga mgbe masịrị m.

Mgbe ọnwa iri na otu gachara, Stéphane si n’ụlọ mkpọrọ lọta. Ọ tụrụ m n’anya ịhụ ka Stéphane jizi asụsụ ndị ogbi na-akụziri m ihe. Oleezi otú o si mụta asụsụ a? Ọ mụtara ya n’oge ahụ ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. M hụrụ otú o si efegharị aka na otú o si eme ihu ma ọ gwawa m okwu, obi atọkwuo m ụtọ, mụ amara na mụ alaferela.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI BỊARA DOO M ANYA

Stéphane malitere ịmụrụ m Baịbụl. Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe ndị a kụziiri m n’oge gara aga bidoro ido m anya. Mgbe m dị obere, ọ na-amasị m ikiri ọmarịcha foto ndị e sere n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. M na-eleru ha anya ka m ghọta ihe mere e ji see ha, ka m ghara ichefu ha. Ana m anụ banyere Ebreham, “mkpụrụ” ya, nakwa “oké ìgwè mmadụ” ahụ. Ma ọ bụ mgbe e ji asụsụ ndị ogbi kụziere m ihe ha pụtara ka m bịara ghọta ha nke ọma. (Jenesis 22:15-18; Mkpughe 7:9) O doro anya na ọ bụ asụsụ ndị ogbi bụ asụsụ na-eru m n’obi.

Ugbu a m ghọtawara ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe, ihe a na-akụzi na ya bịara na-eru m n’obi, mụ ana-achọ ka m mụtakwuo ihe. Stéphane nyeere m aka ịmụtakwu Baịbụl. N’afọ 1992, enyefere m Jehova Chineke onwe m, e meekwa m baptizim. N’agbanyeghị na mụ emewala nke ọma, ihere ka na-eme m, mụ na ndị ọzọ ikwurịta okwu na-esikwara m ike, n’ihi na nke ahụ amabeghị m ahụ́.

MBỌ M GBARA KA M KWỤSỊ IME IHERE

Mụ na ụfọdụ ndị ogbi bịaziri soro otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Pesak na-amụ ihe. Pesak dị  n’obodo Bọdoo. Nke ahụ nyeere m ezigbo aka, meekwa ka m na-efe Chineke nke ọma. N’agbanyeghị na mụ na ndị ọzọ ikwu okwu na-esiri m ike, ndị enyi m ndị nke na-anụ ihe na-agba mbọ ka ha hụ na m ghọtara ihe niile a na-ekwu n’ọmụmụ ihe. Otu di na nwunye aha ha bụ Gilles na Elodie gbalịrị ka mụ na ha na-ekwurịta okwu. Ha na-akpọkarị m ka m bịa rie ihe ma ọ bụ ṅụọ kọfị n’ụlọ ha ma anyị gbasaa ọmụmụ ihe. Nke a mere ka mụ na ha dịrị na mma. Obi na-atọ m ụtọ na mụ na ndị na-efe Chineke na-akpa.

Ebe m ji asụsụ ndị ogbi nke Frans na-akụzi ihe n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova

Ọ bụ n’ọgbakọ anyị a ka m hụrụ otu ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Vanessa. Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Ọ bụ ya mere m ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ dịtụghị mgbe o chere na ogbi m dara ga-eme ka mụ na ya ghara ịna-ekwurịta okwu, kama o weere ya na ọ ga-eme ka ya mụta asụsụ ndị ogbi. Vanessa bịara rie m obi, anyị lụkwara n’afọ 2005. Ọ bụ eziokwu na ọ na-esitụrụ m ike ịgwa ndị ọzọ okwu, Vanessa enyerela m aka ka m kwụsị ime ihere. Obi dị m ụtọ na ọ na-enyere m aka ka m rụọ ọrụ ndị dịịrị m.

IHE ỌMA ỌZỌ JEHOVA MEERE M

N’afọ ahụ anyị lụrụ, ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Luvie, ná mba Frans, kpọrọ m ka m bịa otu ọnwa ka ha kụziere m otú e si asụgharị asụsụ ndị ogbi. Ọ dịbeghị oké anya ụlọ ọrụ a malitere ịsụgharị akwụkwọ anyị ka ha dịrị na diiviidi n’asụsụ ndị ogbi nke Frans. Ma ebe ọ bụ na ha nwere ọtụtụ ọrụ ha ga-arụ, ha chọkwuru ndị ga-enyere ha aka.

Nwunye m Vanessa na-enyere m ezigbo aka

Mụ na nwunye m weere ya na ọkpụkpọ a kpọrọ m bịa rụọ ọrụ n’ụlọ ọrụ a bụ ihe ọma Jehova Chineke meere m. Ma, ụjọ tụkwara anyị. Oleekwanụ ihe ga-eme ndị ogbi ahụ anyị na ha nọ ma anyị pụọ? Oleekwanụ ihe anyị ga-eme ụlọ anyị? Vanessa ọ̀ ga-enwetali ọrụ n’obodo ahụ? Ọ tụrụ anyị n’anya na Jehova gbooro anyị mkpa ndị ahụ. O doro m anya na Jehova hụrụ anyị na ndị ogbi n’anya.

ỤMỤNNA ANYỊ DỊ N’OTU NA-ENYERE M AKA

Ebe ọ bụ na esorola m sụgharịa akwụkwọ n’asụsụ ndị ogbi, amarala m mbọ niile a na-agba ime ka ndị ogbi mata Chineke. Obi na-atọkwa m ụtọ ịhụ na ọtụtụ ndị mụ na ha so na-arụ ọrụ na-agbalị ka mụ na ha na-ekwurịta okwu. Ihe ole na ole ha mụtara n’asụsụ ndị ogbi na otú ha si eji ihe ndị ahụ ha mụtara na-agwa m okwu na-eme m obi ụtọ. Nke ahụ na-eme ka m ghara ile onwe m anya ka onye a jụrụ ajụ. Otú a ha si hụ m n’anya gosiri na Ndịàmà Jehova dị n’otu.—Abụ Ọma 133:1.

Ebe m na-arụ ọrụ ná Ngalaba Nsụgharị n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova

Ana m ekele Jehova na o jirila ọgbakọ Ndịàmà Jehova nyere m ezigbo aka. O nweghị mgbe m na-achọ onye ga-enyere m aka achọ. Obi dịkwa m ụtọ na enyerela m ndị ogbi ibe m aka ịmata Jehova, nakwa ka ha na ya dịrị ná mma. Ana m atụsi anya ike ịhụ mgbe a na-agaghịkwa enwe ihe ga-eme ka mmadụ na ibe ya ghara ịna-ekwurịta okwu nke ọma, nakwa mgbe mmadụ niile ga na-asụ “asụsụ dị ọcha,” nke bụ́ eziokwu banyere Jehova Chineke na uche ya. N’oge ahụ, mmadụ niile ga na-asụ ya ka otu ezinụlọ.—Zefanaya 3:9.

^ para. 9 Ọ bụ n’afọ 1991 ka gọọmenti mba Frans nyere ikike ka e jiri asụsụ ndị ogbi na-akụziri ụmụaka ndị ogbi ihe n’ụlọ akwụkwọ.