Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE FEBỤWARỊ 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA MOZIS?

Ònye Bụ Mozis?

Ònye Bụ Mozis?

Gịnị na-agbata gị n’obi ma ị nụ aha ahụ bụ́ Mozis? Ọ̀ bụ  . . .

  • nwa ọhụrụ nne ya nyiwere n’ime nkata ma dọsa ya n’akụkụ Osimiri Naịl?

  • nwata nwoke ada Fero zụrụ n’obí eze nke na-echefughị na ya bụ onye Izrel?

  • nwoke nọ n’obodo Midian zụọ atụrụ afọ iri anọ?

  • nwoke ya na Jehova * kparịtara ụka n’ihu osisi ogwu nke na-enwu ọkụ?

  • nwoke obi kara nke gara n’ihu eze Ijipt ma gwa ya ka ọ hapụ ụmụ Izrel na-agbara ya ohu ka ha laa?

  • nwoke Chineke dunyere ka ọ gaa gwa eze Ijipt Ihe Otiti Iri a ga-eti ndị Ijipt mgbe eze ahụ mara Chineke aka?

  • nwoke du ndị Izrel si n’Ijipt pụta?

  • nwoke Chineke si n’aka ya kewaa Osimiri Uhie?

  • nwoke Chineke si n’aka ya nye ụmụ Izrel Iwu Iri?

IHE niile a mere ná ndụ Mozis. Ka a sịkwa ihe mere Ndị Kraịst, ndị Juu, na ndị Alakụba ji akwanyere ya ezigbo ùgwù!

O doro anya na Mozis bụ onye amụma nke ‘rụrụ ọrụ dị ike.’ (Diuterọnọmi 34:10-12) O kwere ka Chineke were ya rụọ ọtụtụ ọrụ dị egwu. Ma nke a apụtaghị na Mozis karịrị ụmụ mmadụ ndị ọzọ. Mozis nwere “ụdị mmetụta anyị na-enwe” otú ahụ Ịlaịja onye amụma nwekwara. Ọ bụ ya na Ịlaịja ka Pita, Jems, na Jọn hụrụ n’ọhụụ n’oge Jizọs nwoghara n’otu ugwu. (Jems 5:17; Matiu 17:1-9) Ọtụtụ n’ime nsogbu ndị na-abịara anyị taa bịakwaara Mozis. Ma o merichara ha.

Ị̀ ga-achọ ịmata otú o si merie nsogbu ndị bịaara ya? Ka anyị leba anya n’àgwà ọma atọ ndị Mozis nwere na ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.

^ para. 7 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.