Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Febụwarị 2013

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Olee otú Ekwensu si malite ịdị?

Ọ bụghị Chineke kere Ekwensu ka ọ bụrụ Ekwensu. Mgbe Chineke kere ya, ọ bụ mmụọ ozi. Ọ bụ ya mechaziri jiri aka ya ghọọ Ekwensu ma ọ bụkwanụ Setan. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o nwere mgbe Ekwensu na-efe Chineke ma na-akwụwa aka ya ọtọ. Nke a na-egosi na Ekwensu bụbu otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke kere nke na-erubere Chineke isi.—Gụọ Ezikiel 28:15.

Oleekwanụ otú mmụọ ozi ga-esi aghọ Ekwensu?

Mmụọ ozi ahụ ghọrọ Ekwensu gbara Chineke mgba okpuru ma mee ka Adam na Iv soro ya nupụrụ Chineke isi. O si otú ahụ mee onwe ya Setan, nke pụtara “Onye na-eguzogide” Chineke.—Gụọ Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9.

Mmụọ ozi ahụ nke ghọrọ Ekwensu nweere onwe ya ikpebi ma ọ̀ ga-erubere Chineke isi ma ọ̀ ga-enupụrụ ya isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ndị mmụọ ozi ndị ọzọ Chineke kere ma ụmụ mmadụ. Ma, ọ bịaziri gụwa Setan agụụ ka e fewe ya ofufe. Kama ime ihe dị Chineke mma, ihe ka Setan mkpa bụ ka a na-asọpụrụ ya.—Gụọ Matiu 4:8, 9; Jems 1:13, 14.

Olee otú Ekwensu si na-eduhie ndị mmadụ kemgbe ahụ? Ànyị kwesịrị ịtụ ya ụjọ? I nwere ike isi na Baịbụl mata azịza nke ajụjụ ndị a.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị