Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  2009-11-01

Echiche Ụgha nke 4: Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu

Echiche Ụgha nke 4: Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu

Olee ebe echiche ụgha a si?

“Mmadụ nwere ike iche na ọ bụ nnọọ na narị afọ nke anọ ka a malitere izi ozizi Atọ n’Ime Otu. E nwere ike ikwu na nke a bụ eziokwu . . . Ozizi ‘Chukwu atọ dị n’ime otu Chukwu’ agbanyechaghị mgbọrọgwụ tupu ngwụcha narị afọ nke anọ, o dokwara anya na Ndị Kraịst anabatachaghị ya ná ndụ ha nakwa n’ozizi ha tupu mgbe ahụ.”—New Catholic Encyclopedia (1967), Nke 14, peeji nke 299.

“E nwere Nzukọ Nicaea na May 20, 325 [Oge Anyị]. Constantine n’onwe ya nọ n’isi oche, jiri ịnụ ọkụ n’obi duzie nkwurịta okwu ahụ, ma jiri aka ya tụpụta . . . ụkpụrụ ahụ dị mkpa nke gosiri ihe jikọrọ Kraịst na Chineke nke dị n’ozizi nzukọ ahụ wepụtara, nke bụ́ na ‘ya na Nna ahụ bụ otu.’ . . . N’ihi ụjọ ndị bishọp ahụ tụrụ eze ukwu ahụ, ha bịanyere aka n’ozizi ahụ, ma e wezụga naanị mmadụ abụọ, n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha achọtụghị ime otú ahụ.”—Encyclopædia Britannica (1970), Nke 6, peeji nke 386.

Gịnị ka Baịbụl kwuru?

“Ma Stivin, n’ihi na o jupụtara na Mmụọ Nsọ, lere anya n’eluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jizọs ka o guzoro n’aka nri Chineke. Ọ gwara ndị Juu ahụ okwu sị, ‘Lee! Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Jisọs Onye nzọpụta ka o guzo n’aka nri Chineke!’”—Ọrụ 7:55, 56, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Olee ihe ọhụụ a na-egosi? Ebe Stivin jupụtara na mmụọ nsọ, ọ hụrụ Jizọs ka o “guzoro n’aka nri Chineke.” Ya mere, o doro anya na Jizọs aghọghachighị Chineke mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ ma laghachi n’eluigwe, kama nke ahụ, ọ bụ mmụọ dị iche n’ebe Chineke nọ. Ebe ahụ ekwughị na e nwere onye nke atọ nọ n’akụkụ Chineke. N’agbanyeghị mbọ niile a gbara inweta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kwadoro ozizi Atọ n’Ime Otu, otu ụkọchukwu òtù Dominic bụ́ Marie-Émile Boismard dere n’akwụkwọ ya bụ́ À l’aube du christianisme—La naissance des dogmes (Mmalite Iso Ụzọ Kraịst—Mmalite Ozizi Dị Iche Iche), sị: “Ọ dịghị ebe a ga-agụta n’Agba Ọhụrụ . . . na e nwere chi atọ n’otu Chineke.”

Ihe mere e ji malite ozizi ahụ Constantine tụpụtara bụ iji kwụsị esemokwu e nwere na Chọọchị na narị afọ nke anọ. Ma, ọ kpatara nnọọ ajụjụ ọzọ bụ́: Meri, bụ́ nwaanyị mụrụ Jizọs, ọ̀ bụ “Nne nke Chukwu”?

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Matiu 26:39; Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrịnt 15:27, 28; Ndị Kọlọsi 1:15, 16

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Ọ bụ ná ngwụcha narị afọ nke anọ ka a malitere izi ozizi Atọ n’Ime Otu

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Ònye Bụ Chineke?

Chineke ò nwere aha? Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ ya n’obi?