Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  2009-11-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Mgbe Ahụ́ Na-adịghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị

Mgbe Ahụ́ Na-adịghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị

Kemgbe a chọpụtara na m na-arịa ọrịa oké ike ọgwụgwụ, ọ bụ naanị di m na-arụ ọrụ ego. Ma, ọ natụghị akọrọ m otú o si akwụ ụgwọ ihe ndị anyị na-emefu. Gịnị mere o ji agbachi m nkịtị otú ahụ? Ọ ga-abụrịrị na ego akọla anyị nke na ọ maara na m mata, obi ga-amapụ m.—Nancy. *

ALỤMDI na nwunye adịghị mfe, ma mgbe di ma ọ bụ nwunye rịawara ọrịa na-anaghị ala ala, ahụ́ agbasie onye nke ọzọ ike, nsogbu nwere ike ịrị elu. * Ị̀ na-elekọta di ma ọ bụ nwunye gị ahụ́ na-adịghị? Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ dị nke ọ bụla n’ajụjụ ndị na-esonụ na-enye gị nsogbu n’obi: ‘Olee ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na ọrịa di m ma ọ bụ nwunye m aka njọ? Ruo ole mgbe ka m ga na-elekọta di m ma ọ bụ nwunye m ma na-esi nri, na-ehicha ụlọ, na-arụkwa ọrụ ego? Olee ihe mere obi m ji ama m ikpe na ahụ́ dị m ebe di m ma ọ bụ nwunye m na-arịa ọrịa?’

Ya bụrụkwanụ gị ka ahụ́ na-adịghị, i nwere ike ịnọ na-ajụ onwe gị, sị: ‘Olee otú m nwere ike isi kwanyere onwe m ùgwù mgbe m na-enweghị ike iburu ibu dịịrị m? Di m ma ọ bụ nwunye m ọ̀ na-ewesa m iwe n’ihi na ahụ́ adịghị m? Ọ̀ pụtara na ọ dịkwaghị mgbe anyị ga-enwe obi ụtọ ọzọ dị ka di na nwunye?’

Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ alụmdi na nwunye etisaala n’ihi ọrịa na-anaghị ala ala. Ma, nke ahụ apụtaghị na alụmdi na nwunye gị ga-etisarịrị.

Ọtụtụ di na nwunye ka bi, ọbụna na-enwe obi ụtọ, n’agbanyeghị na otu n’ime ha na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala. Weregodị Yoshiaki na Kazuko dị ka ihe atụ. Ahụ́ Yoshiaki merụrụ n’ọkpụkpụ azụ ya mere ka ọ ghara inwe ike imegharịtụdị ahụ́ ma mmadụ enyereghị ya aka. Kazuko kwuru, sị: “Di m chọrọ enyemaka n’ihe niile. Olu, ubu na ogwe aka m na-egbu m mgbu n’ihi ilekọta ya, ana m agakwa anara ọgwụ n’ụlọ ọgwụ ebe a na-agba ọkpụkpụ. Mgbe mgbe, m na-eche na ọrụ ilekọta onye ọrịa na-agwụ ike.” Ma, n’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, Kazuko kwuru, sị: “Mụ na di m ahụkwuola onwe anyị n’anya.”

Oleezi ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ n’ụdị ọnọdụ ahụ? Otu n’ime ha bụ na ndị ka na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju n’alụmdi na nwunye ha n’agbanyeghị ọrịa na-anaghị ala ala na-ewere ọrịa ahụ dị ka ihe na-arịa ha abụọ, ọ bụghị naanị  otu onye. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye arịawa ọrịa, ọ na-emetụta onye ibe ya, ya bụrụgodị na ọ naghị emetụta ha n’otu ụzọ. A kọwara nke a na Jenesis 2:24, bụ́ ebe kwuru, sị: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ N’ihi ya, mgbe di ma ọ bụ nwunye rịawara ọrịa na-anaghị ala ala, ọ dị oké mkpa ka ha abụọ jikọọ aka lụso nsogbu ahụ ọgụ.

Nnyocha ndị e mere gosikwara na di na nwunye ndị na-emekọ ihe ọnụ n’agbanyeghị na otu onye n’ime ha na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala na-anabata ọnọdụ ha hụrụ onwe ha na ya ma chọpụta ụzọ ha ga-esi na-edi ya. Ọtụtụ n’ime ihe ndị ha chọpụtarala bụ́ ndị na-enyere ha aka idi nsogbu ha kwekọrọ na ndụmọdụ ndị na-aba uru mgbe niile dị na Baịbụl. Ka anyị tụlee aro atọ ndị na-esonụ.

Na-echebaranụ Ibe Unu Echiche

Ekliziastis 4:9 kwuru, sị: “Abụọ dị mma karịa otu.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na, dị ka amaokwu nke 10 kwuru, “ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.” Ị̀ ‘na-ekulite onye ibe gị’ site n’ịja ya mma?

Ùnu na-enwe ike ịchọta ụzọ ndị unu ga-esi na-enyere ibe unu aka? Yong, bụ́ onye ahụ́ kpọnwụtụrụ nwunye ya, kwuru, sị: “M na-agbalị ichebara nwunye m echiche mgbe niile. Mgbe ọ bụla akpịrị kpọwara m nkụ, m na-ewere ya na ọ ga-abụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ. M chọọ ịpụ n’èzí ikiri ebe mara mma, m na-ajụ ya ma ọ̀ ga-achọ iso m. Anyị abụọ na-atakọ ahụhụ ọnụ, na-edikọkwa ọnọdụ anyị ọnụ.”

Ọ bụrụkwanụ na di ma ọ bụ nwunye gị na-elekọta gị, ò nwere ihe ụfọdụ i nwere ike imere onwe gị n’emeghị ka ọrịa gị ka njọ? Ya bụrụ otú ahụ, nke a nwere ike ime ka ị na-elekwu onwe gị anya ka onye bara uru, meekwa ka ọ dịkwuoro di ma ọ bụ nwunye gị mfe ịnọgide na-elekọta gị.

Kama iche na ị marala ụzọ kacha mma ị ga-esi na-echebara di ma ọ bụ nwunye gị echiche, ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ ya ihe ga-akacha amasị ya? Nancy, bụ́ onye a kpọrọ aha ná mmalite, mechara gwa di ya otú obi dị ya n’ihi amaghị ego ole ha nwere. Di ya na-agbalịzi ịkọkwuru ya otú ihe si kwụrụ.

LEENỤ MA ÙNU GA-EME IHE A: Depụta ụzọ ndị i chere di ma ọ bụ nwunye gị nwere ike isi mee ka ihe katụrụ gị mfe, gwakwa ya ka o dee nke ya. Unu nyezie ibe unu ihe unu dere. Onye nke ọ bụla n’ime unu họrọzie otu ma ọ bụ abụọ ọ ga-emeli.

Hazienụ Oge Unu nke Ọma

Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.” (Ekliziastis 3:1) Ma, o nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume ịhazi oge unu nke ọma n’ihi otú ọrịa na-anaghị ala ala si aghasa ihe n’ezinụlọ. Olee ihe ndị unu nwere ike ime iji hụ na, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, unu hazitụrụ oge unu ahazi?

Unu abụọ nwere ike ikpebi mgbe mgbe ịhapụtụ ikwu banyere ọrịa ahụ. Ùnu ka nwere ike ime ihe ụfọdụ unu na-emekọtabu ọnụ tupu di gị ma ọ bụ nwunye gị adaa ọrịa? Ya bụrụ na unu enweghịzi ike ime otú ahụ, olee ihe ọhụrụ ndị unu nwere ike ịnwa imekọta ọnụ? O nwere ike ịbụ ihe dị nnọọ mfe ka ịgụrụ ibe unu akwụkwọ ma ọ bụ ihe siri nnọọ ike ka ịmụ asụsụ ọhụrụ. Ime ihe unu abụọ nwere ike imekọ ọnụ n’agbanyeghị ọrịa ahụ ga-eme ka unu nọgide na-abụ “otu anụ ahụ́,” meekwa ka unu na-enwekwu obi ụtọ.

Iji hazie ndụ unu nke ọma, ùnu nwere egwuregwu unu abụọ ga-egwuli?

Ihe ọzọ ga-enyere unu aka ịghara ichegbubiga onwe unu ókè bụ ịnọnyere ndị ọzọ. Baịbụl kwuru n’Ilu 18:1, sị: “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” Ị̀ hụrụ na amaokwu ahụ kwuru na ịkpa iche nwere ike ime ka mmadụ chewe ihe ndị na-ezighị ezi? N’aka nke ọzọ, ịkpakwuru ndị ọzọ site n’oge ruo n’oge nwere ike ime ka obi ruo unu ala ma nyere unu aka iche ihe ndị dị mma. Ọ́ gaghị adị mma ka unu kpọọ mmadụ ka ọ bịa leta unu?

Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ndị na-elekọta di ma ọ bụ nwunye ha na-arịa ọrịa ike ịhazi ihe nke ọma. Ụfọdụ na-arụ ọrụ karịrị ha, jiri nwayọọ nwayọọ na-akpatara onwe ha oké ike  ọgwụgwụ, bụ́kwa nke nwere ike ime ka ha daakwa ọrịa. Nke a nwere ike imecha mee ka ha gharazie ilekọtali di ma ọ bụ nwunye ha ha hụrụ n’anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-elekọta di ma ọ bụ nwunye gị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala, elegharala mkpa ndị nke gị anya. Na-ewepụta oge site n’oge ruo n’oge iji nọrọ naanị gị zuo ike. * Ụfọdụ ndị achọpụtala na ịkọrọ enyi ha ha tụkwasịrị obi, bụ́ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, nsogbu ha enyerela ha aka idi ya.

LEENỤ MA ÙNU GA-EME IHE A: Depụta nsogbu ndị ị na-enwe n’ilekọta di ma ọ bụ nwunye gị n’akwụkwọ. Depụtazie ihe ndị i nwere ike ime iji merie nsogbu ndị ahụ ma ọ bụ iji die ha nke ọma karị. Kama ịtụlebiga ya ókè, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ụzọ kasị mfe, nke kasị pụta ìhè m nwere ike isi mee ka ọnọdụ m ka mma?’

Gbalịanụ Ịnọgide Na-enwe Nchekwube

Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Asịla: ‘Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?’” (Ekliziastis 7:10) Ya mere, zere ichegbubiga onwe gị ókè banyere otú ihe gaara adị. Cheta na n’ụwa a, ọ dịghị onye nwere obi ụtọ zuru ezu. Isi ihe ga-enyere unu aka bụ iwere ọnọdụ unu otú unu hụrụ ya ma mee ihe niile unu nwere ike ime na ya.

Olee ihe nwere ike inyere gị na di ma ọ bụ nwunye gị aka na nke a? Kwurịtanụ ihe ọma ndị unu nwere ná ndụ unu. Ka obi na-atọ unu ụtọ mgbe ọ bụla ọrịa ahụ katụrụ mma. Chọtanụ ihe ndị unu ga na-atụ anya ha ma na-esetịpụrụ onwe unu ihe mgbaru ọsọ ndị unu ga-eruli.

Di na nwunye bụ́ Shoji na Akiko emeela ihe ndị ahụ e kwurula, ọ rụpụtakwaara ha ezi ihe. Otu mgbe, mgbe a chọpụtachara na Akiko nwere ọrịa na-akụrisị ahụ́ a na-akpọ fibromyalgia, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ pụrụ iche ha na-arụ n’ozi Ndị Kraịst. Ò wutere ha? Eenụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Shoji nyere onye ọ bụla ụdị ọnọdụ a dabaara ndụmọdụ a: “Akụdala onwe gị obi site n’ichewe banyere ihe ndị ị na-enweghịzi ike ime. Nwee nchekwube. Ya bụrụgodị na unu abụọ na-atụ anya na otu ụbọchị, ihe ga-adịkwa otú ọ dịbu, lekwasịgodinụ anya n’otú ndụ unu dị ugbu a. Ihe nke a pụtaara m bụ ilekwasị anya ná mkpa ndị nwunye m nwere na otú m ga-esi nyere ya aka igbo ha.” Ndụmọdụ ndị ahụ bara uru nwekwara ike inyere gị aka ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye gị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 4 Isiokwu a na-ekwu banyere ebe di ma ọ bụ nwunye na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala. Ma, ime ihe ndị e kwuru n’isiokwu a nwekwara ike inyere di na nwunye na-edi mmerụ ahụ́ n’ihi ihe ọghọm ma ọ bụ nsogbu uche ndị dị ka ịda mbà n’obi aka.

^ para. 20 Dabere n’ọnọdụ unu, o nwere ike ịdị mma ka unu hụ ma ùnu ga-enwetatụ enyemaka nke ndị ọrụ ahụ́ ike ma ọ bụ ndị ọrụ ebere ma ọ bụrụ na e nwere ha n’ógbè unu.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

Olee ihe kacha mkpa ka mụ na di ma ọ bụ nwunye m mee ugbu a?

  • Ikwurịtakwu banyere ọrịa ahụ

  • Ịkwụsịlata ikwu banyere ọrịa ahụ

  • Ịkwụsịtụ ichegbu onwe anyị

  • Ichebakwuru ibe anyị echiche

  • Ịchọta ihe ndị ga na-amasị anyị abụọ n’agbanyeghị ọrịa ahụ

  • Ịkpakwuru ndị ọzọ karị

  • Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ anyị abụọ ga-eru