Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  2009-10-01

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Shem Hụrụ Ajọ Omume nke Ụwa Abụọ

Shem Hụrụ Ajọ Omume nke Ụwa Abụọ

NWA Noa bụ́ Shem dị ndụ mgbe e bibiri otu ụwa, dịrịkwa ndụ mgbe ụwa ọzọ malitere. Ị̀ maara ihe mere e ji bibie ụwa mbụ ahụ Shem dịrị ndụ na ya na otú ya na ndị ezinụlọ ya si dịrị ndụ banye n’ụwa nke ọzọ ahụ?— * Ka anyị kwurịta ya.

Baịbụl kwuru na mgbe Shem bụ nwatakịrị, “ihe ọjọọ nke mmadụ” dị ukwuu. Ihe niile ndị mmadụ na-eche “mgbe niile bụ . . . ihe ọjọọ.” Ị̀ maara ihe Chineke meziri?— O wetara iju mmiri nke bibiri ụwa ọjọọ ahụ. Pita onyeozi dere, sị: ‘E bibiri ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.’—Jenesis 6:5; 2 Pita 3:6.

Ị̀ ghọtala ihe mere Chineke ji bibie ụwa ahụ?— Ọ bụ maka na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ihe ha na-echekwa “mgbe niile bụ . . . ihe ọjọọ.” Jizọs kwuru banyere nke a. O kwuru na “tupu iju mmiri ahụ,” ndị mmadụ nọ na-ekpori ndụ, “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di.” Jizọs kwukwara, sị: “Ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.”—Matiu 24:37-39.

Olee ihe ndị ahụ kwesịrị ịma nke ha na-amaghị ma ọ bụ ihe ha kwesịrị ịhụ nke ha na-ahụghị?— Nna Shem, bụ́ Noa, bụ “onye na-ekwusa ezi omume,” ma ndị ahụ egeghị ntị n’ihe o kwuru. Noa gere Chineke ntị ma wuo ụgbọ ga-ese n’elu mmiri, nke ya na ezinụlọ ya ga-anọ n’ime ya n’enweghị ihe ga-eme ha mgbe Iju Mmiri ahụ bịara. Ọ bụ naanị Noa, nwunye ya, ụmụ ha ndị nwoke, bụ́ Shem, Ham, na Jefet, na ndị nwunye ha ghọtara ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Ndị ọzọ mere naanị ihe ha chọrọ ime, n’ihi ya, Iju Mmiri ahụ kpochapụrụ ha.—2 Pita 2:5; 1 Pita 3:20.

Ihe dị ka otu afọ Iju Mmiri ahụ gachara, Shem na ezinụlọ ya pụtara n’ụgbọ ahụ n’ala akọrọ. Ọ dịkwaghị otu onye ajọ omume dị ndụ, ma nke ahụ gbanwere n’oge na-adịghị anya. Kenan, bụ́ nwa nwanne Shem bụ́ Ham, mere ihe jọrọ nnọọ njọ nke na Noa kwuru, sị: “Ka Kenan bụrụ onye a bụrụ ọnụ.” Nimrọd, bụ́ nwa nwa Ham, bụkwa onye ọjọọ. O megidere ezi Chineke, bụ́ Jehova, ma gwa ndị mmadụ ka ha wuo ụlọ elu dị nnọọ elu a kpọrọ Bebel iji meere onwe ha  aha. Olee otú i chere nke a mere ka obi dị Shem na nna ya?—Jenesis 9:25; 10:6-10; 11:4, 5.

O wutere ha, wutekwa Jehova. Ị̀ maara ihe Jehova mere?— Ọ ghagburu asụsụ ndị mmadụ ka ha ghara inwe ike ịghọta ihe ibe ha na-ekwu. Nke ahụ mere ka ha kwụsị ụlọ ahụ ha na-ewu ma gaa biri n’ebe dị iche iche, ndị nke ọ bụla na ndị ha na ha na-asụ otu asụsụ. (Jenesis 11:6-9) Ma, Chineke agbanweghị asụsụ Shem na ezinụlọ ya. Nke a mere ka ha biri ibe ha nso ma nyere ibe ha aka ife Chineke. Ì chetụla echiche afọ ole Shem fere Jehova?—

Shem dịrị ndụ narị afọ isii. Ọ dịrị ndụ afọ iri itoolu na asatọ tupu Iju Mmiri ahụ ma dịrị ndụ narị afọ ise na abụọ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara. Anyị ji n’aka na o nyeere Noa aka iwu ụgbọ ahụ na ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị maka Iju Mmiri ahụ na-abịanụ. Ma, olee ihe i chere Shem mere n’ime ihe karịrị narị afọ ise ahụ ọ dịrị ndụ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara?— Noa kpọrọ Jehova “Chineke Shem.” Ọ ga-abụrịrị na Shem nọgidere na-efe Jehova ma na-enyere ndị ezinụlọ ya aka ime otu ihe ahụ. Ka oge na-aga, a mụrụ Ebreham, Sera, na Aịzik n’ezinụlọ Shem.—Jenesis 9:26; 11:10-31; 21:1-3.

Ugbu a, chegodị echiche banyere ụwa oge a, bụ́ nke na-ajọwanye njọ kemgbe oge Shem. Gịnị ga-eme ya?— Baịbụl sịrị na ọ “na-agabiga.” Ma, amaokwu ahụ kwere nkwa, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, ọ bụrụ na anyị emee uche Chineke, anyị ga-enwe ike iso ná ndị ga-adị ndụ banye n’ụwa ọhụrụ Chineke. Site n’enyemaka Chineke, anyị ga-adịzi ndụ obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ụwa!—1 Jọn 2:17; Abụ Ọma 37:29; Aịzaya 65:17.

^ para. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.