Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  2009-05-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Kwadebe Ụmụ Gị Ndị Dị Afọ Iri na Ụma Ịghọ Ndị Dimkpa

Kwadebe Ụmụ Gị Ndị Dị Afọ Iri na Ụma Ịghọ Ndị Dimkpa

“Ọ na-atọbu m ụtọ ịgwa ụmụ m ndị nwoke okwu. Ha na-ege m ntị nke ọma mgbe ọ bụla m na-agwa ha okwu, ha na-emekwa ihe m gwara ha mee ozugbo. Ma, ugbu a ha dị afọ iri na ụma, o nweghị ihe na-anaghị esere mụ na ha okwu. Ọbụna ihe ndị metụtara ofufe Chineke anaghịzi amasị ha. Ha na-ajụ m, sị, ‘Ọ̀ bụ iwu na anyị ga na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl?’ Tupu ụmụ m eruo afọ iri na ụma, atụtụdịghị m anya na ụdị ihe a ga-eme n’ezinụlọ m, n’agbanyeghị na mụ ahụla ebe o mere n’ezinụlọ ndị ọzọ.”—Reggie. *

Ì NWERE nwa dị afọ iri na ụma? Ọ bụrụ otú ahụ, oge a so n’oge kacha mkpa ná ndụ ya. O nwekwara ike ịbụ otu n’ime oge kacha akpata obi erughị ala. Ihe e kwuru n’okpuru ebe a ò yiri ihe ị na-ahụ?

  • Mgbe nwa gị nwoke dị obere, ọ dị ka ụgbọ e liwere n’ọdụ ụgbọ mmiri, ya bụ, n’ahụ́ gị. Ugbu a ọ dị afọ iri na ụma, o yiri ka ọ̀ na-adọsi eriri e ji liwe ya aka ike, na-achọ isere gawa, ọ dịkwa gị ka ọ chọghị ka i soro ya.

  • Mgbe nwa gị nwaanyị dị obere, ọ na-akọrọ gị ihe niile. Ugbu a ọ dị afọ iri na ụma, o yiri ka ya na ndị enyi ya hà ‘nọ n’òtù,’ ọ dịkwa gị ka ọ̀ bụ na ha achọghị ka ị bata n’òtù ha.

Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-eme n’ezinụlọ gị, ekwubila ngwa ngwa na nwa gị aghọwala nwa nnupụisi na-enweghị mmekwata. Ọ̀ bụzi gịnị na-eme? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya n’ihe dị mkpa na-eme ná ndụ nwa gị dị afọ iri na ụma.

Afọ Iri na Ụma Bụ Oge Pụrụ Iche Nwa Gị Na-erubeghị Mbụ

Malite mgbe a mụrụ nwatakịrị, ihe niile ọ na-eme bụ nke mbụ ọ na-eme ya—ọ na-azọpụ ụkwụ mbụ ya, kwuo okwu mbụ ya, gaa ụlọ akwụkwọ nke mbụ ya, na ihe ndị ọzọ. Nne na nna na-enwe obi ụtọ mgbe nwa ha mere ihe pụrụ iche ọ na-emetụbeghị. Ihe ahụ pụrụ iche o mere na-egosi na nwa ahụ etowela.

Iru afọ iri na ụma bụkwa ihe pụrụ iche nwata na-emetụbeghị, ọ bụ ezie na ihe ndị na-eme mgbe ahụ anaghị emecha ụfọdụ nne na nna obi ụtọ. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya na ọ na-adị ha otú ahụ. A sị ka e kwuwe, ò nwere nne ma ọ bụ nna obi ga-adị ụtọ ịhụ ka nwa ya na-erube isi na-anọzi ka onye a na-emegbu emegbu? N’agbanyeghị nke ahụ, oge nwata dị afọ iri na ụma bụ oge dị ezigbo mkpa ná ndụ ya. Ọ̀ bụ maka gịnị?

Baịbụl kwuru na ka oge na-aga, ‘nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya.’ (Jenesis 2:24) Otu ihe dị mkpa i kwesịrị ime mgbe nwa gị dị afọ iri na ụma bụ ịkwadebe ya maka ụbọchị ahụ ọ ga-ahapụ gị. N’oge ahụ, nwa gị kwesịrị inwe ike ikwu ihe a Pọl onyeozi kwuru: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọrọ dimkpa, ahapụwo m omume nwa ọhụrụ.”—1 Ndị Kọrịnt 13:11.

 E nwere ike ikwu na ọ bụ ihe nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị na-eme mgbe ọ dị afọ iri na ụma, ya bụ, ọ na-ahapụ àgwà nwata ya, na-amụkwa otú ọ ga-esi ghọọ dimkpa nke nwere ike imere onwe ya mkpebi, toruokwa ịhapụ ụlọ. N’ezie, otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru ihe na-emetụ n’ahụ́ nke bụ́ na oge nwata dị afọ iri na ụma bụ “oge a na-amalite ịsị ya gaa nke ọma.”

N’eziokwu, o nwere ike isiri gị ike ikweta ugbu a na “obere” nwa gị ga-anọrọ nke ya. I nwere ike ịjụ, sị:

  • “Ọ bụrụ na nwa m nwoke anaghị edebe ọnụ ụlọ ya ọcha, olee otú ọ ga-esi elekọtali ụlọ nke ya?”

  • “Ọ bụrụ na nwa m nwaanyị anaghị alọta mgbe a gwara ya lọta, olee otú ọ ga-esi arụli ọrụ ma o nweta ọrụ?”

Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-echegbu gị, cheta na nwa gị ịghọ onye nweere onwe ya adịghị ka ịbanye n’otu ọnụ ụzọ n’otu ntabi anya; ọ dị ka ịga ogologo njem n’okporo ụzọ, ọ na-ewekwa ọtụtụ afọ ịgacha ya. Ka ọ dị ugbu a, i jirila ihe ndị ị na-ahụ mara na ọ bụ “nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.”—Ilu 22:15.

Ma, ọ bụrụ na i duzie nwa gị dị afọ iri na ụma nke ọma, o nwere nnọọ ike ịghọ dimkpa na-eme nke ọma, onye ‘zụworo ikike nghọta ya azụ, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’—Ndị Hibru 5:14.

Ihe Ndị Ga-eme Ka I Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Ọ bụrụ na nwa gị dị afọ iri na ụma kpara àgwà dimkpa, ọ́ gaghị adị mma ka i nyekwuo ya ohere?

Iji kwadebe nwa gị dị afọ iri na ụma ịghọ dimkpa, ọ dị mkpa ka i nyere ya aka ịzụ ‘ike iche echiche’ ya iji nwee ike ịna-eme ezi mkpebi n’onwe ya. (Ndị Rom 12:1, 2) Ihe ndị a Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

Ndị Filipaị 4:5: “Meenụ ka [a] mara na unu nwere ezi uche.” Ka e were ya na nwa gị dị afọ iri na ụma rịọrọ gị ihe, ma eleghị anya, ọ rịọrọ ka i kwe ka ọ nọfee oge ị gwara ya ka ọ lọta. Gị ajụ ozugbo. Nwa gị ejiri iwe sị, “Ị na-eme m ka m̀ bụ nwata!” Tupu gị asị ya, “Eenụ, ị na-eme ka nwata,” chebara ihe a echiche: Ndị dị afọ iri na ụma na-achọ nnwere onwe ha na-etorubeghị inweta, ma nne na nna na-akpachikarị ha karịa otú o kwesịrị. Í nweghị ike ikweta ihe o kwuru mgbe ụfọdụ? Ọ́ gaghị adị mma ka i chebara ihe nwa gị na-ekwu echiche?

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Dee otu ihe ma ọ bụ abụọ i nwere ike inyetụkwu nwa gị dị afọ iri na ụma ohere ime. Kọwaara ya na ohere a ị na-enye ya bụ iji mara ma ọ̀ ga-emezi emezi. Ọ bụrụ na o mezie emezie, ị ga-enyekwu ya ohere ka oge na-aga. Ọ bụrụkwanụ na o mezighị emezi, ị ga-akwụsị ya ime ihe ụfọdụ i nyerela ya ohere ime.—Matiu 25:21.

Ndị Kọlọsi 3:21: “Unu ndị bụ́ nna, unu anala agwakasị ụmụ unu okwu ahụ́. Ọ bụrụ na ọ na-esiri ha ezigbo ike imeta unu mma, ike nwere ike ịgwụ ha.”—Nsụgharị International Children’s Bible. Ụfọdụ nne na nna anaghị ekwe nwa ha dị afọ iri na ụma megharịa ahụ́. Iji mee ka ọ bụrụ ezigbo nwa, ha anaghị enye ya ohere ime ihe ọ bụla n’onwe ya. Ha na-ahọtara ya ndị ya na ha ga na-akpa ma na-ege ntị na nzuzo iji mara ihe ọ na-ekwu na fon. Ma, ime otú ahụ nwere ike imebi ihe. Ịhapụ inye ya ohere nwere ike ime ka ọ chọwa otú ọ ga-esi enwere onwe ya; naanị ihe ịkatọ ndị enyi ya mgbe niile ga-eme bụ ime ka o nwekwuo mmasị n’ebe ha nọ; izo ezo na-ege ihe ọ na-ekwu nwere ike ime ka ọ chọta otú ya na ndị enyi ya ga-esi na-akparịta gị aghara ịma. Ka ị na-agbalịkwu ịtụrụ ya ihe ọ na-eme, otú ahụ ka ọ ga na-esikwuru gị ike ịma ihe ọ na-eme. N’eziokwu, ọ bụrụ na nwa gị dị afọ iri na ụma amụtaghị imere onwe ya mkpebi mgbe ọ nọ n’ụlọ gị, olee otú ọ ga-esi mara otú e si eme ya mgbe ọ hapụrụ ụlọ?

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Oge ọzọ o nwere ihe dị mkpa ị na-agwa nwa gị dị afọ iri na ụma, nyere ya aka iche echiche banyere otú ihe ndị ọ na-ahọrọ ime si egosi ụdị mmadụ ọ bụ. Dị ka ihe atụ, kama ịkatọ ndị enyi ya, sị ya: “Gịnị ga-eme ma a nwụde [aha enyi ya] maka ịda iwu? Olee otú a ga-esi lee gị anya?” Nyere nwa gị dị afọ iri na ụma aka ịhụ otú ihe ndị ọ na-ahọrọ ime si eme ka o nwee aha ọma ma ọ bụ aha ọjọọ.—Ilu 11:17, 22; 20:11.

 Ndị Efesọs 6:4: “Unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” Okwu bụ́ “nduzi echiche” abụghị naanị ịkụziri nwata ihe. Ọ pụtara ime ka nwatakịrị chebara ihe ọ na-eme echiche nke na ọ ga-agbanwe àgwà ya. Nke a dị mkpa karịchaa mgbe nwa gị ruru afọ iri na ụma. Otu nna aha ya bụ Andre kwuru, sị: “Ka ụmụ gị na-eto, otú ahụ ka i kwesịrị ịnọ na-agbanwe otú i si azụ ha ma na-agwa ha okwu ndị ga-eme ka ha chee echiche.”—2 Timoti 3:14.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Ọ bụrụ na e nwere okwu dapụtaranụ, sị ya bụrụ nna ma ọ bụ nne ka gịnwa bụrụ nwa. Jụọ nwa gị dị afọ iri na ụma ndụmọdụ ọ ga-enye gị ma a sị na ị bụ nwa ya. Gwa ya ka o mee nnyocha iji chọpụta ihe ndị mere ọ ga-eji gwa gị ka i mee ihe ọ chọrọ ka i mee. Gị na ya kwurịtaghachi ya tupu otu izu agafee.

Ndị Galeshia 6:7: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.” E nwere ike ịkụziri nwata ihe site n’inye ya ahụhụ, ma eleghị anya, ịghara ikwe ka ọ pụọ èzí ma ọ bụ mee ihe na-atọ ya ụtọ ime. Ma, ọ bụrụ na ọ dị afọ iri na ụma, ihe i kwesịrị ilekwasị anyị bụ ime ka ọ mata ihe ga-esi n’omume ya pụta.—Ilu 6:27.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Akwụla ụgwọ o kotara iji zọọ ya, agwakwalanụ onye nkụzi ya na ọ bụchaghị ya ka ụta dịịrị maka ule ọ dara. Hapụ ya ka o buru ihe o metara, ọ gaghịkwa echefu ihe ọ ga-amụta na ya echefu.

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ikekwe, ọ dị gị ka ya bụrụ na oge nwa gị dị afọ iri na ụma dị ka mkpọda ugwu nke nwa gị ga-akpọda ngwa ngwa, ghọzie dimkpa. Ma, ọ naghị adịkarị otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, i nwere ohere magburu onwe ya n’oge nwa gị dị afọ iri na ụma ‘ịzụlite ya dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị.’ (Ilu 22:6) Ọ bụ ụkpụrụ Baịbụl ga-eme ka ezinụlọ gị nwee obi ụtọ.

^ para. 3 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

Mgbe oge ga-eru ka nwa m dị afọ iri na ụma hapụ ụlọ, ọ̀ ga-emeli ihe ndị a?

  • ịnọgide na-enwe mmasị n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke

  • ime ezi mkpebi na ịhọrọ ime ihe ndị dị mmav

  • ịma otú e si agwa ndị ọzọ okwu

  • ilekọta ahụ́ ya anya

  • ijizi ego ya ejizi

  • idebe ụlọ ya ọcha

  • iji aka ya mee ihe o kwesịrị ime