Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  2008-08-01

Aha ahụ Bụ́ Jehova Ò Kwesịrị Ịdị n’Agba Ọhụrụ?

Aha ahụ Bụ́ Jehova Ò Kwesịrị Ịdị n’Agba Ọhụrụ?

Ọ̀DỊ mkpa ka aha Chineke dịrị na Baịbụl? O doro anya na Chineke chọrọ ka aha ya dịrị na Baịbụl. Aha ya, nke bụ́ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ a na-akpọ Tetragramatọn, pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro puku asaa n’ihe odide Hibru mbụ, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie. *

Ndị ọkà mmụta Baịbụl kwetara na e dere aha Chineke n’Agba Ochie, ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma, ọtụtụ ndị kwuru na ọ dịghị n’ihe odide Grik mbụ nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ.

Gịnị ka ndị dere Agba Ọhụrụ mere mgbe ha na-ede ihe e kwuru n’amaokwu ndị dị n’Agba Ochie, bụ́ ebe Tetragramatọn dị? Ihe ọtụtụ ndị nsụgharị mere bụ ide “Onyenwe anyị” kama ide aha Chineke. Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ emeghị otú ahụ. O dere aha ahụ bụ́ Jehova narị ugboro abụọ na iri atọ na asaa n’Akwụkwọ Nsọ Grik, ma ọ bụ Agba Ọhụrụ.

Olee nsogbu ndị nsụgharị Baịbụl na-enwe ma a bịa n’ikpebi ma hà ga-ede aha Chineke n’Agba Ọhụrụ ma ọ bụ na ha agaghị ede? È nwere ezigbo ihe mere a ga-eji dee aha Chineke n’Agba Ọhụrụ? Oleekwa otú aha Chineke e dere na Baịbụl si emetụta gị?

Nsogbu Ndị Nsụgharị Kpatara

Ihe odide ndị dị ugbu a ndị e si na ha asụgharị Agba Ọhụrụ abụghị ndị nke mbụ  e dere. Ọtụtụ ndị gụrụ ihe odide ndị Matiu, Jọn, Pọl, na ndị ọzọ ji aka ha dee, n’ihi ya, ihe odide ndị ahụ kara ngwa ngwa. Ya mere, e si na ha depụta ndị ọhụrụ. Mgbe ndị nke ahụ kara, e depụtaghachiri ha ọzọ. Ọ dịkarịa ala, e depụtaghachiri ọtụtụ n’ime puku ihe odide Agba Ọhụrụ ndị dị ugbu a mgbe narị afọ abụọ e dere ndị nke mbụ gacharala. Ọ ga-abụ na ndị depụtaghachiri ha n’oge ahụ ji Ku′ri·os ma ọ bụ Ky′ri·os, bụ́ okwu Grik pụtara “Onyenwe anyị,” dochie Tetragramatọn, ma ọ bụkwanụ si n’ihe odide ndị e wepụrụ Tetragramatọn dee ihe odide ha. *

Ebe onye nsụgharị ma nke a, ọ ghaghị ikpebi ma è nwere ezigbo ihe na-egosi na Tetragramatọn dị n’ihe odide Grik mbụ n’ezie. È nwere ihe àmà dị otú ahụ? Tụlee ihe ndị a:

  • Jizọs kpọrọ aha Chineke mgbe o kwuru ihe e dere n’Agba Ochie ma ọ bụ mgbe ọ gụpụtara ya agụpụta. (Diuterọnọmi 6:13, 16; 8:3; Abụ Ọma 110:1; Aịzaya 61:1, 2; Matiu 4:4, 7, 10; 22:44; Luk 4:16-21) N’oge Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa, Tetragramatọn dị n’ihe odide Hibru nke a na-akpọkarị Agba Ochie, dịkwa ka ọ ka dị na ya taa. Ma, n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị ọkà mmụta chere na Tetragramatọn adịghị n’ihe odide Septuagint Grik, ya bụ, Agba Ochie a sụgharịrị n’asụsụ Grik. Ha chekwara na ọ dịghị n’ihe odide Agba Ọhụrụ. Otú ọ dị, n’ihe dị ka afọ iri ise gara aga, ndị ọkà mmụta hụrụ otu ihe dị oké mkpa. Ha hụrụ ụfọdụ ibé akwụkwọ ndị meworo nnọọ ochie nke nsụgharị Septuagint Grik, bụ́ nke a na-agụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Aha Chineke, bụ́ nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru, dị n’ibé akwụkwọ ndị ahụ.

  • Jizọs kpọrọ aha Chineke, o mekwara ka ndị ọzọ mara ya. (Jọn 17:6, 11, 12, 26) Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Abịawo m n’aha Nna m.” O mekwara ka ọ pụta ìhè na ọ bụ ‘n’aha Nna ya’ ka ọ na-arụ ọrụ niile ọ na-arụ. N’ezie, aha Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”—Jọn 5:43; 10:25.

  •   Aha Chineke e dere ná ndebiri dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Aha Chineke dị n’okwu bụ́ “Aleluya” ma ọ bụ “Haleluja,” nke dị ná Mkpughe 19:1, 3, 4, 6. Okwu a pụtara “Toonụ Jaa!” ma e kwuo ya otú e si dee ya n’asụsụ Grik. Jaa bụ otú e si edebiri aha Chineke, bụ́ Jehova.

  • Ihe odide ndị Juu dere n’oge ochie na-egosi na ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst dere aha Chineke n’ihe odide ha. Akwụkwọ bụ́ The Tosefta, nke e dere iwu dị iche iche e nyere n’ọnụ, bụ́ nke e dechara n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga, kwuru banyere akwụkwọ Ndị Kraịst dere bụ́ ndị a gbara ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike, sị: “Ha anaghị ewepụta akwụkwọ Ndị Ozi Ọma na akwụkwọ minim [e chere na okwu a pụtara ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst] n’ọkụ. Kama, ha na-ahapụ ha ka ọkụ gbaa ha n’ebe ha dị, . . . ha na Aha Chineke e dere na ha.” Otu akwụkwọ ahụ kwuru ihe Rabbi Yosé, onye Galili, kwuru, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga. Ọ sịrị na nwoke ahụ kwuru na n’ụbọchị nkịtị, “e kwesịrị ịchapụta ebe dị iche iche e dere Aha Chineke na ha [ya bụ, n’akwụkwọ Ndị Kraịst dere] ma dowe ha iche, ma gbaa ndị nke ọzọ ọkụ.” Ya mere, e nwere ezigbo ihe àmà na-egosi na ndị Juu, ndị dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, kweere na Ndị Kraịst dere aha Jehova n’akwụkwọ ha.

Olee Ihe Ndị Nsụgharị Merela Banyere Nke A?

Ọ̀ bụ naanị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ Baịbụl e weghachiri aha Chineke na ya mgbe a na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik? Mba. N’ihi ihe àmà ahụ e kwuru na mbụ, ọtụtụ ndị nsụgharị Baịbụl ekpebiwo na ha kwesịrị iweghachi aha Chineke n’Agba Ọhụrụ mgbe ha na-asụgharị ya.

Dị ka ihe atụ, aha Chineke pụtara ọtụtụ ugboro n’Agba Ọhụrụ ndị a sụgharịrị n’ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’Africa, America, Eshia, na mba ndị dị n’agwaetiti Pacific. (Gụọ chaatị dị na peeji nke 21.) A sụgharịrị ụfọdụ n’ime Baịbụl ndị a n’oge na-adịbeghị anya, ndị dị ka nsụgharị Rotuman Bible (1999), bụ́ nke e dere Jihova ugboro iri ise na otu n’amaokwu iri anọ na asatọ ọ pụtara n’Agba Ọhụrụ ya. Jahowa pụtara otu narị ugboro na iri n’Agba Ọhụrụ nke nsụgharị Batak-Toba (1989), bụ́ nke a na-agụ n’Indonesia. Aha Chineke dịkwa na Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ French, German, na Spanish. Dị ka ihe atụ, Pablo Besson sụgharịrị Agba Ọhụrụ  n’asụsụ Spanish n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga. O dere Jehová na Jud 14, kwuokwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro otu narị n’ala ala peeji na ọ ga-abụ aha Chineke ka e kwesịrị ide n’ebe ndị ahụ.

Baịbụl Bekee ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime Baịbụl ndị aha Chineke dị n’Agba Ọhụrụ ha:

  • A Literal Translation of the New Testament . . . From the Text of the Vatican Manuscript, nke Herman Heinfetter sụgharịrị (1863)

  • The Emphatic Diaglott, nke Benjamin Wilson sụgharịrị (1864)

  • The Epistles of Paul in Modern English, nke George Barker Stevens sụgharịrị (1898)

  • St. Paul’s Epistle to the Romans, nke W. G. Rutherford sụgharịrị (1900)

  • The Christian’s Bible—New Testament, nke George N. LeFevre sụgharịrị (1928)

  • The New Testament Letters, nke J.W.C. Wand, bụ́ Bishọp London, sụgharịrị (1946)

N’oge na-adịbeghị anya, Baịbụl a ma ama bụ́ New Living Translation, nke e bipụtara na 2004, kwuru n’okwu mbido ya, n’okpuru isiokwu bụ́ “Otú Anyị Si Dee Aha Chineke,” sị: “N’ebe niile tetragramatọn (YHWH) pụtara, anyị sụgharịrị ya ‘ONYENWE ANYỊ.’ Anyị ji mkpụrụ akwụkwọ ukwu ndị e dere obere obere, dị ka ndị nsụgharị Bekee na-emekarị, dee ha. Nke a ga-eme ka ọ dị iche na ′adonai, bụ́ nke anyị sụgharịrị ‘Onyenwe anyị.’” O kwuru banyere Agba Ọhụrụ, sị: “Anyị sụgharịrị okwu Grik bụ́ kurios ‘Onyenwe anyị’ n’ebe niile ọ pụtara. Ma, anyị sụgharịrị ya ‘ONYENWE  ANYỊ’ n’ebe niile ihe odide Agba Ọhụrụ kwuru kpọmkwem ihe dị n’Agba Ochie, bụ́ ebe e dere ya ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu ndị e dere obere obere.” (Ọ bụ anyị dere okwu ndị a n’aka akwụkwọ dị iche.) Ya mere, ndị sụgharịrị Baịbụl a kwetara na e kwesịrị ide Tetragramatọn (YHWH) n’amaokwu ndị dị n’Agba Ọhụrụ bụ́ ebe ndị e kwuru kpọmkwem ihe ndị dị n’Agba Ochie.

Ọ dị mma ịmara na akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru n’okpuru isiokwu bụ́ “Tetragramatọn n’Agba Ọhụrụ,” sị: “E nwere ihe àmà na-egosi na n’oge mbụ e dere Agba Ọhụrụ, Tetragramatọn, ya bụ, Aha Chineke, bụ́ Yahweh, dị n’ụfọdụ ma ọ bụ n’ihe niile e kwuru n’Agba Ochie, bụ́ ndị e kwughachiri n’Agba Ọhụrụ.” Ọkà mmụta bụ́ George Howard, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na Tetragramatọn dị na Baịbụl Grik [ya bụ, Septuagint], nke so n’Akwụkwọ Nsọ nke Ndị Kraịst oge ochie gụrụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikwu na ndị dere Agba Ọhụrụ dere Tetragramatọn n’amaokwu ndị e kwuru kpọmkwem ihe ndị dị n’Agba Ochie, ma ọ bụrụ na Tetragramatọn dị na ha.”

Ihe Abụọ Dị Mkpa Mere E Ji Dee Ya

Ya mere, o doro anya na ọ bụghị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ Baịbụl mbụ aha Chineke pụtara n’Agba Ọhụrụ ya. Dị ka ọkàikpe nke a gwara ka o kpebie ikpe nke ndị nọ mgbe ihe ọ na-ekpe ikpe ya mere na-anọghịzi ndụ, Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ ji nlezianya tụlee ihe àmà niile kwesịrị ekwesị. N’ihi ihe àmà ndị ha nwere, ha kpebiri ide aha Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Grik mgbe ha na-asụgharị ya. Lee ihe abụọ dị mkpa mere ha ji mee otú ahụ.

(1) Ndị sụgharịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ kweere na ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ Grik nke si n’ike mmụọ nsọ na Akwụkwọ Nsọ Hibru nke sikwa n’ike mmụọ bụ otu, iwepụ aha Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Grik adabaghị adaba.

Gịnị mere ihe a ha kwuru ji bụrụ ihe amamihe dị na ya? N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri ise gara aga, Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs, gwara ndị okenye nọ na Jeruselem, sị: “Simiọn kọrọ nke ọma otú Chineke si chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ na nke mbụ ya, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.” (Ọrụ 15:14) Ọ̀ dị gị ka ọ bụ ihe amamihe dị na ya na Jems ga-ekwu ihe a ma ọ bụrụ na ndị mmadụ amaghị aha Chineke ma ọ bụ na-akpọ ya n’oge ahụ?

(2) Mgbe a chọtara Baịbụl Septuagint ndị e dere aha Chineke kama ide ha Ky′ri·os (ya bụ, Onyenwe anyị), o doro ndị nsụgharị anya na aha Chineke dị n’Akwụkwọ Nsọ niile e nwere n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ma ndị e dere n’asụsụ Grik ma ndị e dere n’asụsụ Hibru.

O yiri ka ọ̀ bụ mgbe oge na-aga ka a malitere iwepụ aha Chineke n’ihe odide Grik, bụ́ omume na-anaghị enye Chineke nsọpụrụ. Ì chere na Jizọs na ndị ozi ya kwadoro ozizi ahụ?—Matiu 15:6-9.

Kpọkuo “Aha Jehova”

N’ezie, Akwụkwọ Nsọ na-agba akaebe na Ndị Kraịst oge ochie dere aha Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Grik mgbe ha na-ede ya, karịchaa, mgbe ha na-ede kpọmkwem ihe e dere n’Agba Ochie, bụ́ ebe aha Chineke pụtara. Ya mere, o doro anya na e nwere ezigbo ihe mere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji weghachi aha Chineke, bụ́ Jehova, n’Akwụkwọ Nsọ Grik.

Olee otú nke a si metụta gị? Pọl onyeozi kwughachiri ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mgbe ọ gwara Ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” O wee jụọ, sị: “Olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ? Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe onye ha na-anụbeghị banyere ya nọ?” (Ndị Rom 10:13, 14; Joel 2:32) Nsụgharị Baịbụl ndị e dere aha Chineke n’ebe ndị o kwesịrị ịdị ga-enyere gị aka ịbịaru Chineke nso. (Jems 4:8) N’ezie, ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù na e mere ka anyị mara aha Chineke, bụ́ Jehova, ka anyị wee na-akpọku ya.

^ para. 2 Tetragramatọn bụ mkpụrụ akwụkwọ anọ, ya bụ, YHWH, nke bụ́ aha Chineke n’asụsụ Hibru. A na-asụgharịkarị ya Jehovah ma ọ bụ Yahweh n’asụsụ Bekee.

^ para. 7 Ị chọọ ịmatakwu banyere otú e si mee nke a, gụọ broshuọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, peeji nke 23-27, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.