Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2008-03-01

Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Gị

Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Gị

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, mgbe ndị Juu na-eme ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A., otu nwoke na-enweghị ihe o mere nwụrụ ka ndị ọzọ wee dị ndụ. Ònye bụ nwoke ahụ? Ọ bụ Jizọs onye Nazaret. Olee ndị ihe ọma ahụ o mere ga-abara uru? Ọ bụ mmadụ niile. Otu amaokwu Baịbụl a ma nke ọma kwuru banyere àjà ahụ na-azọpụta ndụ, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16, nsụgharị Igbo Union Version.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị maara amaokwu ahụ, n’eziokwu, ọ bụ mmadụ ole na ole ghọtara ihe ọ pụtara. Ha na-eche, sị: ‘Olee ihe mere àjà Kraịst ji dị anyị mkpa? Olee otú ọnwụ otu nwoke ga-esi napụta ụmụ mmadụ n’aka ọnwụ ebighị ebi nke chere ha ihu?’ Baịbụl zara ajụjụ ndị a nke ọma n’ụzọ na-eju afọ.

Otú Ọnwụ Si Malite Ịchị Ụmụ Mmadụ

Ụfọdụ ndị kweere na e kere ụmụ mmadụ ka ha bie obere oge n’ụwa, tatụ ahụhụ, kporitụ ndụ, e mechazie ha anwụọ gaa biri n’ebe ka mma. Ihe nke a pụtara bụ na nzube Chineke bụ ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. Ma, Baịbụl gosiri na o nwere ihe ọzọ mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Amaokwu a na-egosi na ọ bụ mmehie mere ụmụ mmadụ ji na-anwụ anwụ. Ònyekwanụ bụ “otu mmadụ” ahụ nke ụmụ mmadụ si n’aka ya keta mmehie ahụ nke kpatara ọnwụ?

Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru na ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kweere na mmadụ niile si otu ebe, Baịbụl kwukwara hoo haa na otu ebe ahụ ha si bụ “otu mmadụ.” Jenesis 1:27 kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.” Baịbụl si otú a kwuo na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kere di na nwunye mbụ wee jiri ha chọọ ihe niile o kere n’ụwa mma.

Jenesis kọrọ ọtụtụ ihe ọzọ banyere otú ụmụ mmadụ si bie ndụ mgbe Jehova bụ́ Chineke kechara mmadụ mbụ. Ọ dị mma ịmara na  n’akụkọ ahụ dum, Chineke ekwutetụdịghị okwu ọnwụ ma e wezụga mgbe ọ na-ekwu ihe nnupụisi ga-ewetara ụmụ mmadụ. (Jenesis 2:16, 17) Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ nwee obi ụtọ, nweekwa ezigbo ahụ́ ike ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa n’ime paradaịs. Ọ chọghị ka ha kaa nká ma mechaa nwụọ. Oleezi otú ọnwụ si chịwa mmadụ niile?

Jenesis isi nke atọ kọrọ otú di na nwunye mbụ si kpachara anya họrọ inupụrụ Onye nyere ha ndụ, bụ́ Jehova Chineke, isi. N’ihi ya, Chineke mara ha ikpe ahụ o bu ụzọ gwa ha agwa. Ọ gwara mmadụ ahụ, sị: ‘Ọ bụ n’ájá ka ị ga-alaghachi.’ (Jenesis 3:19) Ihe Chineke kwuru mezuru. Ndị nnupụisi abụọ ahụ mechara nwụọ.

Otú ọ dị, ọ bụghị naanị di na nwunye mbụ ahụ ka nke a mebiiri ihe. Isi ha nupụrụ mere ka ụmụ ha, bụ́ ndị gaara ezu okè, ghara izu okè. Jehova kwuru ihe bụ́ nzube ya maka Adam na Iv na ụmụ ha ga-amụ mgbe ọ gwara di na nwunye ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) Mgbe oge na-aga, ezinụlọ ụmụ mmadụ ga-amụju ụwa, nwee obi ụtọ dị ukwuu ma ghara ịnwụ anwụ. Ma, nna ha ochie bụ́ Adam, bụ́ “otu mmadụ” ahụ, rere ha, ha ghọọ ndị ohu mmehie, ndị ọnwụ ga-egburịrị. Pọl onyeozi, bụ́ otu n’ime ụmụ nke mmadụ mbụ ahụ, dere, sị: “Abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie.”—Ndị Rom 7:14.

Otú ahụ ndị na-eme ihe ike si emebisị ọrụ e ji nkà rụọ, ọ bụ otú ahụ ka Adam si mebie ihe magburu onwe ya Chineke kere, ya bụ, ụmụ mmadụ, mgbe o mehiere. Ụmụ Adam mụrụ ụmụ, ụmụ ha amụọkwa ụmụ nke ha, ụmụ mmadụ wee mụrụ ụmụ na-aga. Ọgbọ nke ọ bụla a mụrụ na-etolite mụọ ụmụ, e mechaa ọgbọ ahụ anwụọ. Gịnị mere ha niile ji nwụọ? Ọ bụ maka na ha niile bụ ụmụ Adam. Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ mmadụ nwụrụ site ná njehie nke otu onye.” (Ndị Rom 5:15) Ọrịa, nká, ọchịchọ ime ihe ọjọọ na ọnwụ bụcha ihe dị mwute Adam kpataara ezinụlọ ya. Anyị niile so ná ndị ezinụlọ ya.

N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Rom, ọ kọrọ otú ọnọdụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, tinyere ya onwe ya, si dị mwute, kọọkwa otú mmehie si na-echi anyị ọnụ n’ala n’ọgụ anyị na mmehie na-alụ. O tiri  mkpu, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a?” Ọ̀ bụ na nke a abụghị ezigbo ajụjụ? Ònye ga-anapụta Pọl, na ndị niile ọzọ chọrọ ka a napụta ha, ka ha ghara ịbụkwa ohu nke mmehie na ọnwụ? Pọl zara ajụjụ ahụ n’onwe ya, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Ndị Rom 7:14-25) N’eziokwu, Onye okike anyị emeela ndokwa ịnapụta anyị site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst.

Ọrụ Jizọs Rụrụ ná Mgbapụta Chineke Gbapụtara Ụmụ Mmadụ

Jizọs kọwara ọrụ ọ rụrụ n’ịgbapụta ụmụ mmadụ ka ha ghara ịbụkwa ndị ohu mmehie nke na-eweta ọnwụ. Ọ sịrị na Nwa nke mmadụ bịara ‘ka O were ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28, nsụgharị Igbo Union Version) Olee otú ndụ Jizọs si bụrụ ihe mgbapụta? Olee otú ọnwụ ya si abara anyị uru?

Baịbụl kwuru na Jizọs ‘enweghị mmehie’ nakwa na ọ bụ “onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ.” Ná ndụ ya niile, o rubeere Iwu Chineke isi ruo n’isi. (Ndị Hibru 4:15; 7:26) Ya mere, Jizọs anwụghị n’ihi mmehie, ọ bụghịkwa nnupụisi Adam mere o ji nwụọ. (Ezikiel 18:4) Kama nke ahụ, Jizọs kwetara ịnwụ ọnwụ na-ekwesịghị ya, ka o wee mee uche Nna ya nke bụ́ ịnapụta ụmụ mmadụ ná mmehie nakwa n’aka ọnwụ. Dị ka e kwuru ná mbụ, Jizọs ji obi ya bịa ka ‘o were ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta.’ Ịhụnanya nke ọ na-enweghị mmadụ nwetụrụla ụdị ya mere ka Jizọs jiri obi ya “detụ ọnwụ ire maka mmadụ niile.”—Ndị Hibru 2:9.

Jizọs nyere ndụ ya iji kwụọ ụgwọ ihe mmehie Adam kpatara

Ndụ ahụ Jizọs chụrụ n’àjà na ndụ ahụ Adam tụfuru mgbe o mehiere enweghị nke ka ibe ya. Gịnị ka ọnwụ ahụ Jizọs nwụrụ rụpụtara? Jehova nabatara àjà ahụ “ka ọ bụrụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile.” (1 Timoti 2:6) E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Chineke ji ndụ Jizọs zụrụghachi, ma ọ bụ, gbapụta, ụmụ mmadụ ka ha ghara ịbụkwa ndị ohu nke mmehie na ọnwụ.

Ọtụtụ mgbe, Baịbụl kwuru okwu banyere oké ọrụ a Onye kere ụmụ mmadụ ji ịhụnanya rụọ. Pọl chetaara Ndị Kraịst na “e ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta” ha. (1 Ndị Kọrịnt 6:20; 7:23) Pita kwuru na ọ bụghị ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo ka Chineke ji gbapụta Ndị Kraịst ka ha ghara ibikwa ndụ nke ga-eduga ha n’ọnwụ, kama, ọ bụ ọbara Ọkpara ya ka o ji gbapụta ha. (1 Pita 1:18, 19) Jehova mere ndokwa iji àjà mgbapụta Kraịst napụta ụmụ mmadụ n’ọnwụ ebighị ebi nke chere ha ihu.

Àjà Mgbapụta Kraịst Ọ̀ Ga-Abara Gị Uru?

Jọn onyeozi dere otú àjà mgbapụta Kraịst si baa uru nke ukwuu, sị: “[Jizọs Kraịst] bụ àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị, kama, ọ bụkwa maka mmehie nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:2) N’ezie, àjà mgbapụta Kraịst bụ maka mmadụ niile.  Nke a ọ̀ pụtara na ndokwa a dị oké ọnụ ahịa ga-abara mmadụ niile uru, ma hà chọrọ ma ha achọghị? Mba. Cheta ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu bu nke a ụzọ bụ́ ndị e si n’ime ala kpọpụta. Ndị ahụ chọrọ ịkpọpụta ha wedaara ha ihe yiri nkata, ma, onye nke ọ bụla n’ime ha banyere n’ime ya. N’otu aka ahụ, ndị chọrọ ka àjà mgbapụta Kraịst baara ha uru agaghị afanye aka n’ụkwụ chere ka Chineke gọzie ha. O nwere ihe ha kwesịrị ime.

Gịnị ka Chineke chọrọ ka ha mee? Jọn 3:36 gwara anyị, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” Chineke chọrọ ka anyị nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst. Ọ ka nwere ihe ọzọ. “Anyị ga-eji nke a mara na anyị amarawo [Jizọs], ya bụ, ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu.” (1 Jọn 2:3) Ya mere, o doro anya na ọ bụ inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst na irube isi n’iwu Kraịst ga-eme ka a gbapụta mmadụ ná mmehie nakwa n’aka ọnwụ.

Otu ụzọ dị mkpa isi gosi okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs bụ inwe obi ekele maka ọnwụ ya site n’icheta ọnwụ ya, dị ka o nyere n’iwu. Tupu Jizọs anwụọ, o hiweere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nri ihe atụ, wee gwa ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ọ na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ nke ukwuu na ha na Ọkpara Chineke bụ enyi, ha na-erubekwa isi n’iwu ahụ. N’afọ a, a ga-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst na Saturday, March 22, mgbe anyanwụ dachara. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị bịa nzukọ a pụrụ iche iji rube isi n’iwu Jizọs nyere. Ndịàmà Jehova ndị nọ n’ebe unu bi ga-agwa gị oge na ebe ọ ga-abụ. Ná nzukọ a a ga-eji cheta Ọnwụ Jizọs, ị ga-amụta ihe i kwesịrị ime ka àjà mgbapụta Kraịst napụta gị ná mmehie Adam nke na-eweta ọnwụ.

Ọ bụ mmadụ ole na ole taa nwere obi ekele maka àjà dị ukwuu Onye kere ha na Ọkpara ya chụrụ iji napụta ha ná mbibi. Ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ na-enwe obi ụtọ pụrụ iche. Pita onyeozi dere banyere Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Unu nwere okwukwe n’ebe [Jizọs] nọ, na-aṅụrịkwa ọṅụ nke ukwuu, ya bụ, ọṅụ nke ọnụ na-apụghị ịkọwa, nke dịkwa ebube, ebe unu ga-enweta ihe okwukwe unu ga-arụpụta, bụ́ nzọpụta nke mkpụrụ obi unu.” (1 Pita 1:8, 9) Site n’ịhụ Jizọs Kraịst n’anya na inwe okwukwe n’àjà mgbapụta ya, ị ga-enwe ọṅụ ná ndụ ị dị ugbu a, ị ga-enwekwa olileanya na a ga-anapụta gị ná mmehie nakwa n’aka ọnwụ.