Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  2008-02-01

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Mak Adaghị Mbà

Mak Adaghị Mbà

Ọ BỤ Mak dere otu n’ime akwụkwọ anọ dị na Baịbụl ndị kwuru banyere ndụ Jizọs. Ọ bụ nke ahụ o dere kacha ntakịrị, ọ bụkwa ya kacha mfe ọgụgụ. Ònye bụ Mak? Ì chere na ọ ma onye Jizọs bụ?— * Ka anyị hụ ọnwụnwa tara akpụ ndị bịaara Mak ma mata ihe mere na ọ kwụsịghị ịbụ Onye Kraịst.

Aha Mak pụtara nke mbụ na Baịbụl mgbe Eze Herọd Agrịpa tụbara Pita onyeozi n’ụlọ mkpọrọ. N’otu abalị, mmụọ ozi mere ka Pita si n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụta. Ozugbo ahụ, ọ gara n’ụlọ nne Mak, bụ́ Meri, onye bi na Jeruselem. E mere ka Pita si n’ụlọ mkpọrọ pụta mgbe ihe dị ka afọ iri e gburu Jizọs n’Ememme Pentikọst nke afọ 33 O. A. gachara.—Ọrụ 12:1-5, 11-17.

Ị̀ ma ihe mere Pita ji gaa n’ụlọ Meri?— Ọ ga-abụ na ọ ma ndị ezinụlọ Meri, marakwa na ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ezukọ n’ebe ahụ. Ọ dịla anya nwa nwanne nne Mak bụ́ Banabas ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, kemgbe Ememme Pentikọst nke afọ 33 O. A. Baịbụl kwuru banyere aka o mesapụụrụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụrụ. Ya mere, ọ ga-abụ na Jizọs maara onye Banabas bụ, marakwa nwanne nne ya bụ́ Meri nakwa nwa ya nwoke bụ́ Mak.—Ọrụ 4:36, 37; Ndị Kọlọsi 4:10.

Mak dere n’Oziọma ya na otu nwa okorobịa nke yi uwe, “nke na-eyighị ihe ọzọ n’ahụ́,” nọ ya n’abalị ahụ e jidere Jizọs. Mgbe ndị iro Jizọs jidere Jizọs, Mak dere na nwa okorobịa ahụ gbalagara. Ònye ka i chere na nwa okorobịa ahụ bụ?— Ọ ga-abụ Mak! Ya mere, mgbe Jizọs na ndịozi ya pụwara n’abalị ahụ, ọ ga-abụ na Mak yiiri uwe ya ngwa ngwa soro ha.—Mak 14:51, 52.

Olee onye i chere nwa okorobịa a bụ? Olee ihe na-eme ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

Mak na ọtụtụ ndị ohu Chineke na-akpakọrịta. O nwere ike ịbụ na ọ nọ mgbe mmụọ nsọ dakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs n’Ememme Pentikọst nke afọ 33 O.A. Ya na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Pita, kpachikwara anya. O sokwa nwa nwanne nne ya bụ́ Banabas jee ozi, bụ́ onye nyeere Sọl aka site n’ịkpọrọ ya gakwuru Pita mgbe ihe dị ka afọ atọ Jizọs mere ka Sọl hụ ya n’ọhụụ gachara. Ọtụtụ afọ mgbe nke a gafechara, Banabas gara Tasọs ka ọ gaa chọọ Sọl n’ebe ahụ.—Ọrụ 9:1-15, 27; 11:22-26; 12:25; Ndị Galeshia 1:18, 19.

N’afọ 47 O.A., a họpụtara Banabas na Sọl ka ha jee ozi n’ala ọzọ. Ha kpọọrọ  Mak gawa. Ma, n’ihi ihe merenụ nke a na-edeghị na Baịbụl, Mak mechara hapụ ha laghachi Jeruselem. Iwe were Sọl, bụ́ onye e mechara jiri aha Rom ya bụ́ Pọl mara. O legharaghị ihe a o chere dị oké njọ Mak mere anya.—Ọrụ 13:1-3, 9, 13.

Mgbe Pọl na Banabas si n’ozi ha gara n’ala ọzọ lọta, ha kọrọ otú ozi ha si gaa nnọọ nke ọma. (Ọrụ 14:24-28) Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ha abụọ dokwara ịgaghachi leta ndị ọhụrụ chegharịrị echegharị n’ebe ha kwusara ozi ọma. Banabas chọrọ ka Mak soro ha gaa, ma, ị̀ ma ihe bụ́ uche Pọl?— O ‘cheghị na o kwesịrị ekwesị’ n’ihi na Mak hapụrụ ha na mbụ laa. O doro anya na ihe ọzọ merenụ wutere Mak!

Iwe were Pọl na Banabas, ha wee “see ezigbo okwu” ma kewaa. Banabas kpọọrọ Mak gawa ikwusa ozi ọma na Saịprọs. Ma, Pọl kpọọrọ Saịlas gawa iletaghachi ndị na-eso ụzọ ọhụrụ ahụ, dị ka ha dokwara na mbụ. O doro anya na o wutere Mak nke ukwuu na ọ bụ ya mere Pọl na Banabas ji see okwu.—Ọrụ 15:36-41.

Anyị amaghị ihe mere Mak ji hapụ ha na mbụ lawa. Mak nwere ike iche na ihe mere o ji laa ziri ezi. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, o doro anya na obi siri Banabas ike na ihe ahụ agaghị eme ọzọ. Ihe o chere ziri ezi. Mak adaghị mbà! Mgbe e mechara, ya na Pita jere ozi n’ala ọzọ, n’ebe dị anya bụ́ Babịlọn. Pita si n’ebe ahụ zipụ ozi ekele. O denyere n’ozi ekele ahụ, sị: “Mak nwa m na-ekelekwa unu.”—1 Pita 5:13.

 Pita na Mak dị ná mma nke ukwuu n’ihi na ha jekọrọ ozi ọnụ! Anyị ga-ahụkwa nke a ma anyị gụọ Oziọma Mak. N’Oziọma ahụ, Mak dere ihe ndị Pita kọọrọ ya, bụ́ ndị Pita ji anya ya hụ. Dị ka ihe atụ, tụlee akụkọ banyere oké ifufe nke fere n’Oké Osimiri Galili. N’akụkọ ahụ, Mak dere ebe Jizọs nọ na-ehi ụra n’ime ụgbọ ahụ na ihe o ji hiwe isi ya, bụ́ ihe onye na-akụ azụ̀ dị ka Pita ga-ahụ. Ọ ga-adị mma ka anyị jiri anya anyị hụ ya site n’ịgụkọ akụkụ Baịbụl ndị kọrọ akụkọ ahụ ọnụ wee hụ ihe nke ọ bụla n’ime ha kwuru. Ka anyị gụọ Matiu 8:24; Mak 4:37, 38; na Luk 8:23.

Mgbe e mechara, n’oge a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, o kwuru okwu ọma banyere Mak n’ihi otú o si kwadoo ya. (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Mgbe a tụkwara Pọl mkpọrọ n’ebe ahụ ọzọ, o degaara Timoti akwụkwọ ozi ma gwa ya ka ọ kpọrọ Mak bịa, kwuokwa, sị: “Ọ baara m uru maka ije ozi.” (2 Timoti 4:11) N’eziokwu, Mak jeere Chineke ozi n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na ọ daghị mbà!

Olee ngọzi ndị Mak nwetara maka na ọ daghị mbà?

^ para. 3 Ọ bụrụ na ọ bụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ ihe a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ ka nwatakịrị ahụ zaa ajụjụ ndị ahụ.