Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Gịnị Mere Anyị Ji Ekpe Ekpere n’Aha Jizọs?

Gịnị Mere Anyị Ji Ekpe Ekpere n’Aha Jizọs?

JIZỌS kụziiri ndị mmadụ banyere ekpere ọtụtụ mgbe. N’oge ọ nọ n’ụwa, ndị ndú okpukpe ndị Juu na-anọ n’ebe “ụzọ nwere ngalaba na-ekpe ekpere.” N’ihi gịnị? “Ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha.” O doro anya na ha chọrọ ka ndị mmadụ hụ ezi omume ha. Ọtụtụ n’ime ha na-ekpe ogologo ekpere, na-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro, dị ka à ga-asị na “ọtụtụ okwu ha na-ekwu” ga-eme ka a nụ ekpere ha. (Matiu 6:5-8) Jizọs kwuru hoo haa na ime otú ahụ abaghị uru. O si otú ahụ mee ka ndị nwere ezi obi mara ihe ha na-agaghị eme mgbe ha na-ekpe ekpere. Ma, ọ bụghị naanị ihe a na-agaghị eme mgbe a na-ekpe ekpere ka Jizọs kụziri.

Jizọs kụziri na ekpere anyị kwesịrị igosi na anyị chọrọ ka e doo aha Chineke nsọ, ka Alaeze Ya bịa, nakwa ka uche Ya mee. Jizọs kụzikwara na o kwesịrị ka anyị na-arịọ Chineke ka o gbooro anyị mkpa anyị. (Matiu 6:9-13; Luk 11:2-4) Jizọs ji ihe atụ dị iche iche gosi na ọ bụrụ na Chineke ga-anụ ekpere anyị, anyị kwesịrị ịnọgidesi ike na-arịọ ya arịrịọ. Anyị kwesịrị inwe okwukwe, kwesịkwa ịdị umeala n’obi. (Luk 11:5-13; 18:1-14) O jikwa ihe nlereanya ya gosi na ihe ọ kụziri dị mkpa.—Matiu 14:23; Mak 1:35.

O doro anya na ihe ndị a Jizọs kụziri nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ka otú ha si ekpe ekpere kakwuo  mma. Ma, Jizọs cheere ruo n’abalị ikpeazụ ya n’ụwa tupu ya akụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe dị oké mkpa banyere ekpere.

“Mgbe A Gbanwere Otú E Si Na-ekpe Ekpere Kemgbe Ụwa”

N’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa, o wepụtara oge dị ukwuu gbaa ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ume. Ọ bụ oge kwesịrị ekwesị iji kọọrọ ha ihe ọhụrụ. Jizọs sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” Mgbe e mechara, o kwere ha nkwa nke na-emesi obi ike, sị: “Ihe ọ bụla unu rịọkwara n’aha m, m ga-eme ya, ka e wee nye Nna m otuto site n’aka Ọkpara ya. Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” Mgbe o kwuchawara ihe ọ na-ekwu, ọ sịrị: “Ruo ugbu a, unu arịọbeghị otu mkpụrụ ihe n’aha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezu.”—Jọn 14:6, 13, 14; 16:24.

Okwu ndị a dị oké mkpa. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kọwara ya dị ka “mgbe a gbanwere otú e si na-ekpe ekpere kemgbe ụwa.” Ihe Jizọs bu n’obi abụghị ka a malite ikpeku ya ekpere kama ikpeku Chineke. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka a mata ụzọ ọhụrụ a ga-esi na-agakwuru Jehova bụ́ Chineke.

N’ezie, ọ dịghị mgbe Chineke na-anaghị anụ ekpere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. (1 Samuel 1:9-19; Abụ Ọma 65:2) Ma, malite n’oge ụmụ Izrel na Chineke gbara ndụ, ndị chọrọ ka Chineke nụ ekpere ha aghaghị ikweta na ndị Izrel bụ mba Chineke họọrọ. Mgbe e mechara, malite n’oge Sọlọmọn, ha aghaghị ikweta na ụlọ nsọ ahụ bụ ebe Chineke họọrọ ka a na-achụrụ ya àjà. (Diuterọnọmi 9:29; 2 Ihe E Mere 6:32, 33) Ma, ofufe ahụ adịteghị aka. Dị ka Pọl onyeozi dere, Iwu ahụ e nyere ndị Izrel na àjà ha chụrụ n’ụlọ nsọ ahụ bụ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa, ma ọ bụghị ihe ndị ahụ kpọmkwem.” (Ndị Hibru 10:1, 2) Ihe bụ́ ezie nke gaje ịbịa ga-anọchi onyinyo ahụ. (Ndị Kọlọsi 2:17) Kemgbe afọ 33 O.A., mmadụ idebe Iwu Mozis anaghị eme ka ya na Jehova dị ná mma. Kama nke ahụ, ihe na-eme ka mmadụ na Jehova dị ná mma bụ irubere onye Iwu ahụ kwuru banyere ya isi, ya bụ, Kraịst Jizọs.—Jọn 15:14-16; Ndị Galeshia 3:24, 25.

Aha “Dị Elu Karịa Aha Ọ Bụla Ọzọ”

Jizọs kwuru ụzọ ọhụrụ ka mma a ga-esi na-abịakwute Jehova. O kwuru na ya bụ ezigbo enyi dị anyị oké mkpa, onye na-emeghere anyị ụzọ ka Chineke wee na-anụ ekpere anyị ma na-aza ya. Gịnị mere Jizọs ji emere anyị ihe a?

 Ebe ọ bụ na a mụrụ anyị ná mmehie, ọ dịghị ọrụ anyị ga-arụ ma ọ bụ àjà anyị ga-achụ ga-asachapụ mmehie anyị ma ọ bụ mee ka anyị na Chineke anyị nke dị nsọ, bụ́ Jehova, dị ná mma. (Ndị Rom 3:20, 24; Ndị Hibru 1:3, 4) Ma, Jizọs ji ndụ ya zuru okè mgbe ọ bụ mmadụ chụọ àjà wee kwụọ ụgwọ mmehie nke ụmụ mmadụ ndị ha na Chineke nwere ike ịdịghachi ná mma. (Ndị Rom 5:12, 18, 19) Jehova na ndị niile chọrọ ka a sachapụ mmehie ha nwere ike ịdịghachi ná mma, ha nwekwara ike iji “nkwuwa okwu” na-agwa Chineke okwu, naanị ma ọ bụrụ na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ ma na-ekpe ekpere n’aha ya.—Ndị Efesọs 3:11, 12.

Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere n’aha Jizọs, anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe, ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’ụzọ ọrụ atọ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke: (1) Ọ bụ “Nwa Atụrụ Chineke,” onye chụrụ àjà nke mere ka a na-agbaghara anyị mmehie. (2) Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ, ugbu a kwa, ọ bụ “onyeisi nchụàjà” nke na-eme ka àjà ahụ ọ chụrụ baara anyị uru. (3) Ọ bụ naanị ya bụ “ụzọ” e si agakwuru Jehova n’ekpere.—Jọn 1:29; 14:6; Ndị Hibru 4:14, 15.

Ikpe ekpere n’aha Jizọs na-ewetara Jizọs nsọpụrụ. Nsọpụrụ a kwesịrị ekwesị, n’ihi na ọ bụ uche Jehova ka ‘ikpere ọ bụla gbuo n’ala n’aha Jizọs, ka ire ọ bụla kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.’ (Ndị Filipaị 2:10, 11) Ma, ihe ka mkpa bụ na ikpe ekpere n’aha Jizọs na-ewetara Jehova otuto, bụ́ onye nyere Ọkpara ya maka ọdịmma anyị.—Jọn 3:16.

Anyị kwesịrị iji ‘obi anyị dum’ na-ekpe ekpere, ọ bụghị iji mezuo iwu

Baịbụl ji ọtụtụ utu aha na aha dị iche iche kọwaa Jizọs iji mee ka anyị ghọta ụdị ọkwá o nwere. Ha na-enyere anyị aka ịghọta ọtụtụ uru na-abịara anyị n’ihi ihe ndị Jizọs mewooro anyị, ihe ndị ọ na-emere anyị, na ihe ndị ọ ka ga-emere anyị. (Lee igbe nke isiokwu ya bụ, “ Ọrụ Ndị Dị Mkpa Jizọs Na-arụ”) N’ezie, e nyewo Jizọs “aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.” * E nyewo ya ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.—Ndị Filipaị 2:9; Matiu 28:18.

 Ọ Bụghị Iji Mezuo Iwu

N’eziokwu, anyị aghaghị ikpe ekpere n’aha Jizọs ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nụ ya. (Jọn 14:13, 14) Ma, anyị ekwesịghị ịdị na-ekwu “n’aha Jizọs” naanị iji mezuo iwu. N’ihi gịnị?

Tụlee ihe atụ a. Ọ bụrụ na onye na-achụ nta ego edetara gị akwụkwọ ozi, o nwere ike ịsị ná ngwụcha akwụkwọ ozi ahụ na ya bụ “ezigbo onye ahịa gị.” Ì chere na ihe ahụ o dere si ya n’obi, ka ò dere ya naanị maka na ọ bụ otú e si akwanyere ndị mmadụ ùgwù ma e dewe ụdị akwụkwọ ozi ahụ? N’ezie, mgbe anyị na-akpọ aha Jizọs n’ekpere anyị, o kwesịghị ịdị ka ihe ahụ na-adịghị esi ndị mmadụ n’obi nke a na-ede ná ngwụcha akwụkwọ ozi. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ikpe “ekpere n’akwụsịghị akwụsị,” anyị kwesịrị iji ‘obi anyị dum’ na-ekpe ya, ọ bụghị iji mezuo iwu.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; Abụ Ọma 119:145.

Olee otú ị ga-esi ghara ịdị na-ekwu “n’aha Jizọs” naanị iji mezuo iwu? Ọ́ gaghị adị mma ka i chee echiche banyere àgwà na-enye obi ụtọ ndị Jizọs nwere? Chee echiche banyere ihe ndị o mewooro gị na ndị ọ ka dị njikere imere gị. Mgbe ị na-ekpe ekpere, kelee Jehova ma nye ya otuto maka ihe ndị magburu onwe ha o ji Ọkpara ya mee. Ọ bụrụ na ị na-eme nke a, obi ga-esikwu gị ike na nkwa Jizọs kwere ga-emezu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.”—Jọn 16:23.

^ para. 14 Dị ka akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of New Testament Words si kwuo, okwu Grik a sụgharịrị “aha” nwere ike ịpụta “ihe niile mere e ji gụọ onye ahụ aha, ikike onye ahụ nwere, àgwà ya, ọkwá ya, ebube ya, ike ya, [na] ịma mma ya.”