Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2015

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee E Degharịrị n’Afọ 2013

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee E Degharịrị n’Afọ 2013

Kemgbe ọtụtụ afọ, e degharịala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke Bekee ugboro ole na ole, ma ihe e degharịrị na nke afọ 2013 dị ọtụtụ karịa ndị nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, otú e si degharịa ọtụtụ amaokwu mere ka ha ghara ito ogologo. E degharịrị okwu ụfọdụ dị́ mkpa na Baịbụl. E dere ebe ụfọdụ otú e si ede abụ, deekwa ihe ụfọdụ n’ala ala peeji iji mee ka ihe a na-ekwu doo anya. Anyị agaghị atụlechali mgbanwe ahụ niile n’isiokwu a, ma ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Olee okwu ụfọdụ dị́ mkpa e degharịrị? Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, a gbanwere otú e si sụgharịa “Shiol,” “Hedis,” na “mkpụrụ obi.” Ma, e nwekwara okwu ndị ọzọ e degharịrị.

Dị ka ihe atụ, n’ebe ụfọdụ e deburu “obiọma,” e deziri ha “ịhụnanya na-adịgide adịgide,” nke ka daba adaba. O mere ka a ghọtakwuo okwu a a na-ekwukarị ma e kwuwe gbasara “ikwesị ntụkwasị obi.”—Ọma 36:5; 89:1.

E nwere okwu ụfọdụ a na-ejibu otu okwu asụgharị, ma e jizi ihe a na-ekwu kpebie ihe a ga-akpọ ha. Dị ka ihe atụ, a na-asụgharịbu okwu Hibru bụ́ ʽoh·lamʹ “mgbe a na-akaghị aka.” Ma, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịpụta “mgbe ebighị ebi.” I nwere ike ịgụ otú e si sụgharịa okwu Hibru ahụ n’Abụ Ọma 90:2 na Maịka 5:2Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013.

Okwu Hibru na Grik a na-asụgharị “mkpụrụ” pụtara ọtụtụ ugboro na Baịbụl, ma mgbe a na-ekwu banyere ihe a na-akụ akụ ma mgbe a na-ebu amụma banyere nwa a ga-amụ. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị e wepụtara na Bekee n’oge gara aga sụgharịrị ya “mkpụrụ” ma na Jenesis 3:15 ma n’ebe ndị ọzọ. Ma, n’asụsụ Bekee, ndị mmadụ anaghịzi ekwukarị “mkpụrụ” ma ha chọọ ikwu gbasara “nwa.” N’ihi ya, ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke a e degharịrị edegharị, e dere “nwa” na Jenesis 3:15 nakwa n’amaokwu ndị yiri ya. (Jen. 22:17, 18; Mkpu. 12:17) N’amaokwu ndị ọzọ okwu ahụ pụtara, e jizi ihe a na-ekwu kpebie ihe a ga-akpọ ya.—Jen. 1:11; Ọma 22:30; Aịza. 57:3.

Gịnị mere e ji gbanwee ọtụtụ ihe a sụgharịburu otú e si dee ha n’asụsụ ndị mbụ e ji dee  Baịbụl? Peeji nke 1721 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013 kwuru na ezigbo nsụgharị Baịbụl ‘ga-eme ka a ghọta ihe okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu pụtara ma ọ bụrụ na ịsụgharị ya otú e si dee ya n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl ga-agbanwe ihe ọ pụtara ma ọ bụ mee ka a ghara ịghọta ya.’ Ọ bụrụ na akpaala okwu ndị e dere n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl ga-edo anya n’asụsụ ndị ọzọ, a ga-asụgharị ha otú ahụ e si dee ha. N’ihi ya, ná Mkpughe 2:23, okwu ahụ bụ́ ‘inyocha obi’ doro anya n’ọtụtụ asụsụ. Ma, n’otu amaokwu ahụ, ‘inyocha akụrụ’ nwere ike ọ gaghị edocha anya n’asụsụ ụfọdụ. Ọ bụ ya mere e ji sụgharịzie ya ka ọ bụrụ ‘inyocha ihe dị́ n’ala ala obi.’ E si otú ahụ mee ka a ghọta ihe okwu Grik ahụ pụtara. E mekwara otú ahụ na Diuterọnọmi 32:14, bụ́ ebe a sụgharịrị okwu bụ́ “abụba akụrụ ọka wit” ka ọ bụrụ “ọka wit kasị mma” iji mee ka o dokwuo anya. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere e ji sụgharịzie “m bụ onye a na-ebighị úgwù n’egbugbere ọnụ” ka ọ bụrụ “ikwu okwu na-esiri m ike.”—Ọpụ. 6:12.

Gịnị mere e ji sụgharịa “ụmụ ndị ikom Izrel” ka ọ bụrụ “ụmụ Izrel,” sụgharịakwa “ụmụ nwoke na-enweghị nna” ka ọ bụrụ “ụmụ na-enweghị nna”? N’asụsụ Hibru, e nwere okwu ndị na-eme ka a mata ma onye a na-ekwu maka ya ọ̀ bụ nwoke ka ọ̀ bụ nwaanyị. Ma, mgbe ụfọdụ, é kwuo maka ụmụ nwoke, o nwere ike ịpụta ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Dị ka ihe atụ, n’amaokwu ụfọdụ e kwuru “ụmụ ndị ikom Izrel,” ihe ndị ọzọ e kwuru mere ka a ghọta na a na-ekwu maka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. Ọ bụ ya mere e ji sụgharịzie ya ka ọ bụrụ “ụmụ Izrel.”—Ọpụ. 1:7; 35:29; 2 Eze 8:12.

Ọ bụkwa otú ahụ ka e mere na Jenesis 3:16. Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị e wepụtara na Bekee n’oge gara aga, a sụgharịrị otu okwu Hibru pụtara “ụmụ ndị ikom” ka ọ bụrụ “ụmụ.” Ma, n’Ọpụpụ 22:24, a sụgharịrị ya ka ọ bụrụ “ụmụ” n’ahịrịokwu bụ́ “ụmụ unu ga-aghọkwa ụmụ na-enweghị nna.” E nwekwara amaokwu ndị ọzọ e mere otú ahụ, ya bụ, gbanwee “nwa nwoke na-enweghị nna” ka ọ bụrụ “nwa na-enweghị nna” ma ọ bụ “nwa mgbei.” (Diut. 10:18; Job 6:27) O yiri ihe e mere ná nsụgharị Septuagint Grik. Ọ bụkwa ya mere n’Ekliziastis 12:1, ihe e deziri bụ “n’oge ntorobịa gị,” ọ bụghịzi “n’oge ị bụ okorobịa.”

Gịnị mere e ji mee ka ọtụtụ ngwaa Hibru dịkwuo mfe? E nwere ngwaa Hibru e ji akọwa ihe a ka na-eme eme, nweekwa nke e ji akọwa ihe e mecharala. Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị e wepụtara na Bekee n’oge gara aga, e dere ‘wee gaa n’ihu ikwu ma ọ bụ ime’ iji gosi ihe a ka na-eme eme ma ọ bụ ihe a na-eme ugboro ugboro. * E dekwara okwu ndị dị́ ka “aghaghị” na “n’ezie” iji gosi na a na-ekwu banyere ihe e mecharala.

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013, e deghị ụdị ngwaa ndị ahụ, ọ gwụkwala ma ọ̀ ga-eme ka a ghọta ihe a na-ekwu. Dị ka ihe atụ, ọ baghị uru ikwuwe na Chineke kwuru ugboro ugboro, sị, “Ka ìhè dị.” N’ihi ya, na Baịbụl Bekee nke ọhụrụ ahụ, a sụgharịghị “kwuo” ka ihe a na-emechabeghị. (Jen. 1:3) Ma, o doro anya na Jehova kpọrọ Adam ugboro ugboro. Ọ bụ ya mere e ji dee “na-akpọ” na Jenesis 3:9. A sụgharịrị ọtụtụ ngwaa otú ha ga-adịkwu mfe nghọta. E mere ka  a ghọta ihe okwu Hibru ndị ahụ pụtara, ọ bụghị ikwuwe ma hà na-ekwu banyere ihe a ka na-eme eme ma ọ bụ ihe e mecharala. Otu n’ime uru otú a e si sụgharịa ha bara bụ na ọ dịzi nkenke otú ahụ ọ na-adị n’asụsụ Hibru.

E dekwuru ebe ụfọdụ n’ụdị abụ iji gosi ebe ndị e dere ka abụ n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl

Gịnị mere e ji dekwuo ebe ụfọdụ otú e si ede abụ? Mgbe e dere Baịbụl, e dere ọtụtụ ebe otú e si ede abụ. N’ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’oge anyị a, ihe e ji amata ihe e dere n’ụdị abụ bụ otú okwu ikpeazụ ndị dị́ n’otu ahịrịokwu na ibe ya si adakọ. Ma n’asụsụ Hibru, ihe e ji amata ihe e dere n’ụdị abụ bụ otú ahịrịokwu na ibe ya si yie ma ọ bụ dịrịta iche. Ihe na-eme ka abụ tọọ ụtọ abụghị otú okwu ikpeazụ ndị dị́ n’ahịrịokwu ya si adakọ, kama ọ bụ otú e si hazie ihe ndị e kwuru na ya.

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị e wepụtara na Bekee n’oge gara aga, otú e si dee akwụkwọ Job na Abụ Ọma gosiri na n’asụsụ Hibru mbụ, a chọrọ ka a na-abụ ha ka abụ ma ọ bụ ka e buru ha n’isi. Otú ahụ e si dee ha mere ka ha doo anya, dịkwa mfe ncheta. Na Baịbụl Bekee ahụ e degharịrị n’afọ 2013, e dekwuola akwụkwọ Ilu, Abụ Sọlọmọn, na ọtụtụ ebe n’akwụkwọ ndị amụma n’ụdị abụ iji gosi na e deburu ha otú ahụ n’asụsụ Hibru nakwa iji gosi otú ahịrịokwu na ibe ya si yie ma ọ bụ dịrịta iche. Otu ihe atụ bụ Aịzaya 24:2, bụ́ ebe ahịrịokwu nke ọ bụla kwuru banyere ihe abụọ dị́ iche n’ibe ya, ahịrịokwu nke ọ bụla ejirikwa ihe e kwuru na nke bu ya ụzọ mee ka a ghọta na o nweghị onye ga-agbanahụ ikpe Chineke. Ọ bụrụ na onye na-agụ ebe ndị ahụ aghọta na e dere ha n’ụdị abụ, ọ ga-amata na ihe onye dere ha mere abụghị naanị ikwughachi ihe o kwuburu, kama na o ji ihe ahụ o dere na-eme ka ozi Chineke doo anya.

N’asụsụ Hibru, ọ naghị adị mfe mgbe niile ịmata ihe dị́ iche n’ihe e dere n’ụdị abụ na ihe e dere n’ụdị akụkọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee ụzọ dị́ iche iche e si dee ebe ndị e kwesịrị ide n’ụdị abụ n’ọtụtụ Baịbụl. Ọ bụ ndị sụgharịrị Baịbụl na-ekpebi amaokwu ndị ha ga-ede n’ụdị abụ. N’ebe ụfọdụ, ị ga-ahụ akụkọ ndị a kọrọ ma dee ha n’ụdị abụ. A na-etinyecha ihe ndị e ji mara abụ, ma ihe atụ ma ahịrịokwu ndị yiri ibe ha, iji mee ka ihe a na-ekwu doo anya.

Na Baịbụl Bekee nke ọhụrụ ahụ, ị ga-ahụ ihe ndị e dere ná mmalite akwụkwọ nke ọ bụla iji mee ka a mata ihe e kwuru na ya. Ọ na-eme ka a mata onye kwuru nke o kwuru n’akwụkwọ Abụ Sọlọmọn ahụ e dere n’oge ochie.

Olee otú ihe ndị a chọpụtara n’Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie si baa uru na Baịbụl Bekee nke ọhụrụ ahụ? Ebe e si nweta ihe e ji sụgharịa Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke mbụ a sụgharịrị bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị Masoret depụtaghachiri na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Westcott na Hort depụtaghachiri, nke a na-akwanyere ùgwù. Ndị ọkachamara ka na-amụ banyere ihe ndị ahụ e dere n’oge ochie. Ihe ndị ha chọpụtara emeekwala ka a ghọtakwuo ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ụfọdụ. E nwere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ugbu a. A mụkwuola banyere ihe ndị e dere n’oge ochie n’asụsụ Grik. E nweekwala ọtụtụ ihe ọhụrụ a chọpụtara gbasara ihe ndị ahụ e dere n’oge ochie ma tinye ha na kọmputa, nke mere ka ọ dịkwuo mfe ileru ihe dị́ iche n’ihe ndị ahụ e dere anya iji mata nke kacha zie ezi n’ihe ndị ahụ e dere n’oge ochie n’asụsụ Hibru na Grik. Ihe a niile a chọpụtara mere ka Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ lerukwuo amaokwu ụfọdụ anya, nke mere ka ha gbanwee ihe ụfọdụ.

Dị ka ihe atụ, na 2 Samuel 13:21, ihe ọzọ dị́ ná nsụgharị Septuagint Grik bụ: “Ma, o meghị ihe ga-ewute Amnọn nwa ya, n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya, ebe ọ bụ ọkpara ya.” E deghị ihe a ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị e wepụtara n’oge gara aga n’ihi na ọ dịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị Masoret depụtaghachiri. Ma, e dere ya n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ọ bụ ya mere e ji dee ya na Baịbụl Bekee nke ọhụrụ ahụ. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere e ji dekwuo aha Chineke n’ebe ise n’akwụkwọ Samuel nke Mbụ. Ihe ndị a chọpụtara n’Akwụkwọ Nsọ Grik ndị e dere n’oge ochie mekwara ka a gbanwee usoro e ji dee ihe a kọrọ na Matiu 21:29-31. E nwere ihe ụfọdụ a gbanwere n’ihi ihe a chọpụtara n’ọtụtụ n’ime Akwụkwọ Nsọ Grik ndị ahụ e dere n’oge ochie, ọ bụghị n’ihi ihe otu n’ime ha kwuru.

Ihe ndị e kwuru ebe a bụ naanị ole na ole n’ime ihe ndị a gbanwere ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e wepụtara ọhụrụ, ka ịgụ ya na ịghọta ya dịkwuo mfe. Ọ ga-abara ndị ghọtara na ọ bụ onyinye sí n’aka Chineke ezigbo uru.

^ para. 10 Gụọ peeji nke 1572 na 1573 na New World Translation of the Holy Scriptures—With References, bụ́ ebe kwuru banyere ngwaa Hibru ndị na-egosi ihe a ka na-eme eme.