Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2015

Nsụgharị Baịbụl nke Na-akpa Ike

Nsụgharị Baịbụl nke Na-akpa Ike

“Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—HIB. 4:12.

ABỤ: 37, 116

1. (a) Olee ọrụ Chineke nyere Adam? (b) Gịnị ka ndị ohu Chineke ji asụsụ na-eme kemgbe ahụ?

ỊSỤ asụsụ bụ onyinye Jehova Chineke nyere ụmụ mmadụ. N’ogige Iden, Chineke nyere Adam ọrụ ịgụ ụmụ anụmanụ niile aha. Adam ji amamihe Chineke nyere ya gụọ anụ nke ọ bụla aha dabara adaba. (Jen. 2:19, 20) Kemgbe ahụ, ndị ohu Chineke ejirila asụsụ na-eto Jehova, na-agwakwa ndị ọzọ banyere uche ya. N’oge na-adịbeghị anya, ndị ohu Chineke ejirila onyinye a Chineke nyere ha na-asụgharị Baịbụl ka ọtụtụ ndị nwee ike ịmụta banyere Jehova.

2. (a) Olee ihe atọ Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ kpebiri nke mere ka ha sụgharịa Baịbụl nke ọma? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 E nwere ọtụtụ puku nsụgharị Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha sụgharịrị ihe niile nke ọma otú e si dee ya n’oge ochie. Ma ụfọdụ emeghị otú ahụ. N’ihe dị́ ka afọ 1947, Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ kpebiri ihe atọ ga-eme ka a sụgharịa Baịbụl nke ọma. Nke mbụ bụ ide aha Chineke n’ebe niile e dere ya mgbe mbụ e dere Baịbụl, sí otu a doo aha ahụ nsọ. (Gụọ Matiu 6:9.) Nke abụọ bụ ịsụgharị okwu ọ bụla e dere n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl otú e si dee  ya n’agbanweghị ihe ọ bụla. N’ebe ọ na-ekweghị omume, a sụgharịa ihe ahịrịokwu ahụ pụtara. Nke atọ bụ ịsụgharị ihe otú ọ ga-adị mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta. * (Gụọ Nehemaya 8:8, 12.) Ndị sụgharịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ emeela ihe atọ a n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú e si mee ha ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013 nakwa otú a ga-esi mee ha ná ndị a ga-asụgharị n’asụsụ ndị ọzọ.

ỊKWANYERE AHA CHINEKE ÙGWÙ

3, 4. (a) Olee ebe e dere mkpụrụ okwu Hibru anọ e si sụgharịta aha Chineke? (b) Gịnị ka ọtụtụ nsụgharị Baịbụl mere aha Chineke?

3 A na-akpọ mkpụrụ okwu Hibru anọ e si sụgharịta aha Chineke Tetragramatọn. Ọ pụtara ọtụtụ ebe n’ihe ndị e ji asụsụ Hibru dee n’oge ochie, dị́ ka n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ọ dịkwa n’ụfọdụ n’ime nsụgharị Septuagint Grik, ndị a sụgharịrị n’agbata narị afọ abụọ tupu Kraịst na otu narị afọ mgbe ọ bịachara. Obi na-adị ọtụtụ ndị ụtọ ịhụ na aha Chineke pụtara ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie.

4 O doro anya na aha Chineke kwesịrị ịdị na Baịbụl. Ma, e wepụrụ ya n’ọtụtụ nsụgharị Baịbụl. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1952, naanị afọ abụọ e wepụtachara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e biri Baịbụl Bekee a na-akpọ Revised Standard Version. E deghị aha Chineke na ya n’agbanyeghị na e dere ya na nke e si sụgharịa ya, ya bụ, American Standard Version, nke e biri n’afọ 1901. N’ihi gịnị? Okwu mmalite e dere na ya sịrị: “Chọọchị Ndị Kraịst niile e nwere n’ụwa ekwesịghị inwe aha ọ bụla a na-akpọ onye ahụ naanị ya bụ Chineke.” Otú ahụ ka e mekwara n’ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ, ma na Bekee ma n’asụsụ ndị ọzọ.

5. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka aha Chineke dịrị na Baịbụl?

5 È nwere ihe o mere ma ndị nsụgharị dee aha Chineke na Baịbụl ma ọ bụ wepụ ya? Ee, o nwere ihe o mere. Ọ bụ uche Jehova ka e dere na Baịbụl. Ọ chọkwara ka ndị mmadụ mara aha ya. Ezigbo onye nsụgharị kwesịrị ịma ihe onye dere akwụkwọ ọ na-asụgharị chọrọ; ọ ga-ebu ya n’obi mgbe ọ na-ekpebi ihe ọ na-asụgharị. Ọtụtụ amaokwu Baịbụl gosiri na aha Chineke dị mkpa nakwa na e kwesịrị ime ka ọ dị́ nsọ. (Ọpụ. 3:15; Ọma 83:18; 148:13; Aịza. 42:8; 43:10; Jọn 17:6, 26; Ọrụ 15:14) Jehova Chineke nyere ndị dere Baịbụl ike mmụọ nsọ ide aha ya ọtụtụ puku ugboro n’ihe ndị ha dere n’oge ochie. (Gụọ Ezikiel 38:23.) N’ihi ya, ndị na-ewepụ aha Chineke mgbe ha na-asụgharị Baịbụl anaghị akwanyere Jehova ùgwù.

6. Gịnị mere e ji dee aha Chineke n’ebe isii ọzọ ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013?

6 Taa, e nweela ihe ndị ọzọ gosiri na anyị kwesịrị ịna-akpọ aha Chineke. E dere aha Chineke puku ugboro asaa na narị abụọ na iri na isii ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013. O ji isii karịa ugboro ole e dere ya na nke e biri n’afọ 1984. Ihe mere e ji dee ise n’ime ha bụ na a hụrụ aha Chineke n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. * Ebe ise ndị ahụ  bụ 1 Samuel 2:25; 6:3; 10:26; 23:14, 16. Nke mere ha isii bụ Ndị Ikpe 19:18. Ihe mere e ji denye ya ebe a bụ n’ihi ihe a chọpụtakwuru gbasara Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie.

7, 8. Gịnị ka aha ahụ bụ́ Jehova pụtara?

7 Ezi Ndị Kraịst ma na ịghọta ihe aha Chineke pụtara dị ezigbo mkpa. Aha ya pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” * N’oge gara aga, akwụkwọ anyị na-eji “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ,” nke dị́ n’Ọpụpụ 3:14, akọwa ihe aha ahụ pụtara. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 1984 kọwara na Jehova na-aghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ iji mezuo nzube ya. * Ma, nke e degharịrị n’afọ 2013 kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ihe a nwere ike iso n’ihe aha ya bụ́ Jehova pụtara, ma ọ bụghị naanị ya ka ọ pụtara. Ọ pụtakwara na ọ na-eme ka ihe mee ma a bịa n’okwu gbasara ike ihe na imezu uche ya.”

8 Jehova na-eme ka ihe o kere eke bụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, Chineke mere ka Noa bụrụ onye na-arụ ụgbọ, mee ka Bezalel bụrụ omenkà pụrụ iche, mee ka Gidiọn bụrụ dike n’agha, meekwa ka Pọl bụrụ onyeozi nke ndị mba ọzọ. N’eziokwu, ndị ohu Chineke anaghị eji aha ya egwu egwu. Ọ bụ ya mere Kọmitii Nsụgharị Baịbụl Ụwa Ọhụrụ ji dee aha Chineke na Baịbụl ha sụgharịrị.

9. Gịnị mere Òtù Na-achị Isi ji kpebie na ọ dị ezigbo mkpa ka a sụgharịa Baịbụl n’asụsụ ndị ọzọ?

9 Ọtụtụ nsụgharị Baịbụl ka na-ewepụ aha Chineke na Baịbụl ha. Ha na-eji “Onyenwe anyị” ma ọ bụ aha chi obodo ha edochi ya. O so n’ihe mere Òtù Na-achị Isi ji kpebie na ọ dị ezigbo mkpa ka e nwee Baịbụl na-akwanyere aha Chineke ùgwù n’asụsụ niile. (Gụọ Malakaị 3:16.) Ugbu a, e nweela Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. Aha Chineke dịkwa na ha.

NSỤGHARỊ ZIRI EZI MA DOO ANYA

10, 11. Olee ụfọdụ ihe mere ka o siere ndị nsụgharị ike isi ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee sụgharịa Baịbụl n’asụsụ ndị ọzọ?

10 Ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ dị́ iche iche adịchaghị mfe. Dị ka ihe atụ, n’oge gara aga, ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee, e dere okwu Hibru bụ́ “Shiol” n’Ekliziastis 9:10 nakwa n’amaokwu ndị ọzọ. E dekwara ya otú ahụ n’ụfọdụ Baịbụl Bekee ndị ọzọ. Ma, a gaghị edeli okwu ahụ n’ọtụtụ asụsụ n’ihi na ọtụtụ ndị na-agụ ha amaghị ihe okwu Hibru ahụ pụtara. Ọ dịghị n’akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ ha. Ụfọdụ na-echedị na “Shiol” bụ aha obodo. N’ihi ya, e nyere ndị nsụgharị ikike ịsụgharị ma okwu Hibru bụ́ “Shiol” ma okwu Grik bụ́ “Hedis” ka ọ bụrụ “Ili.” Otú a e si asụgharị ya doro anya, ziekwa ezi.

11 Okwu Hibru na nke Grik e si sụgharịta “mkpụrụ obi” na-esikwa ike ịsụgharị n’asụsụ ụfọdụ. N’ụfọdụ asụsụ, é kwuo “mkpụrụ obi,” ihe ndị mmadụ na-aghọta bụ mmụọ ma ọ bụ ihe na-apụ n’ahụ́ mmadụ ma mmadụ nwụọ. E nyere ndị nsụgharị ikike ịsụgharị okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” otú ọ ga-adaba n’ihe a na-ekwu ka ọ ghara ịgbagwoju ndị mmadụ anya. A kọwara ihe dị́ iche iche okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara na peeji nke 1762 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Igbo. N’eziokwu, e degharịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee  otú ọ ga-adị mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta. A kọwakwara okwu Hibru na Grik ụfọdụ n’ihe e dere n’ala ala peeji.

12. Olee ụfọdụ ihe a gbanwere ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013? (Kwuo ihe dị́ n’isiokwu bụ́ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee E Degharịrị n’Afọ 2013,” n’Ụlọ Nche a.)

12 Ajụjụ dị́ iche iche ndị nsụgharị jụrụ mere ka a mata ihe ndị ọzọ e nwere ike ịghọtahie na Baịbụl. N’ihi ya, na Septemba afọ 2007, Òtù Na-achị Isi nyere ikike ka e degharịa Baịbụl nke Bekee. Mgbe a na-edegharị ya, kọmitii na-asụgharị Baịbụl lebara anya n’ọtụtụ ajụjụ ndị nsụgharị jụrụ. E wepụrụ okwu Bekee ndị a na-anaghịzi ekwu, jiri ndị a na-ekwu ugbu a dochie ha. A gbasiri mbọ ike ka ọ dị́ mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta. Ma, ihe ha sụgharịrị ka ziri ezi. Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ ndị ọzọ sokwa mee ka nke Bekee ọhụrụ ahụ dịkwuo mma.—Ilu 27:17.

O MERE ỌTỤTỤ NDỊ OBI ỤTỌ

13. Olee otú obi dị ọtụtụ ndị banyere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013?

13 Olee otú obi dị ọtụtụ ndị n’ihi Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị edegharị? Ọtụtụ ụmụnna eziterela isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị́ na Bruklin akwụkwọ ozi, kwuo na obi dị ha ụtọ. Ihe otu nwanna nwaanyị dere gosiri otú obi dị ọtụtụ ndị. O dere, sị: “Baịbụl yiri igbe nke ọlaedo juru n’ọnụ. Ịgụ okwu Jehova ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013 dị ka mmadụ iwere ọlaedo nke ọ bụla, na-eleru ya anya, na-ahụ ụcha ya, mma ọ mara, na otú o si egbu maramara. Otú e si jiri okwu dị́ mfe nghọta sụgharịa Baịbụl a enyerela m aka ịmatakwu Nna anyị bụ́ Jehova. Ọ na-adị m ka ò jidere m aka na-agụpụtara m okwu ya nke na-eme ka obi ruo m ala.”

14, 15. Olee otú obi dị ndị mmadụ n’ihi Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e wepụtara n’asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Bekee?

14 Obi dịkwa ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Bekee ụtọ maka Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Otu agadi nwoke bí n’obodo Sofia, dị́ na Bọlgeria, kwuru otú obi dị ya n’ihi Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e wepụtara n’asụsụ Bọlgeria. Ọ sịrị: “Agụọla m Baịbụl ọtụtụ afọ, ma agụtụbeghị m  Baịbụl dị́ mfe nghọta ma na-eru n’obi ka Baịbụl a.” Mgbe otu nwanna nwaanyị onye Albenia nwetara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, ọ sịrị: “Okwu Chineke na-atọ ezigbo ụtọ n’asụsụ Albenian. Ọ bụ ihe ùgwù na Jehova na-agwa anyị okwu n’asụsụ anyị.”

15 N’ọtụtụ mba, ọ naghị adị mfe inweta Baịbụl, ọ na-adịkwa oké ọnụ. N’ihi ya, obi na-adị ndị mmadụ ezigbo ụtọ ma ha nweta ya. Ozi sí Rụwanda kwuru, sị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ ndị a na-amụrụ Baịbụl anaghị eme nke ọma n’ihi na ha enweghị Baịbụl. Ha enweghị ego ha ga-eji azụta nke ndị chọọchị sụgharịrị. Ha anaghịkwa aghọtacha ihe e kwuru n’amaokwu ụfọdụ. N’ihi ya, ha anaghị eme nke ọma.” Ma, ihe gbanwere mgbe e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ha. Na Rụwanda, otu nwanna na nwunye ya nakwa ụmụ ha anọ kwuru, sị: “Anyị na-ekele Jehova na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche maka Baịbụl a ha nyere anyị. Anyị dara ogbenye, anyị enweghịkwa ego anyị ga-eji zụtara onye ọ bụla nọ́ n’ezinụlọ anyị Baịbụl. Ma, ugbu a, onye ọ bụla n’ime anyị nwere Baịbụl nke ya. Anyị niile na-agụ ya kwa ụbọchị iji gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ.”

16, 17. (a) Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-eme? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

16 Ka oge na-aga, a ga-ewepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a e degharịrị edegharị n’asụsụ ndị ọzọ. Setan na-agba mbọ ka a ghara ime ya. Ma, obi siri anyị ike na Jehova chọrọ ka ndị ohu ya niile na-ege ntị ka ọ na-agwa ha okwu n’asụsụ doro anya, nke ha ga-aghọta nke ọma. (Gụọ Aịzaya 30:21.) N’oge na-adịghị anya, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịza. 11:9.

17 Ka anyị kpebisie ike iji ihe ọ bụla Jehova nyere anyị na-efe ya, ma nsụgharị Baịbụl a nke na-akwanyere aha ya ùgwù. Kwe ka o si na Baịbụl na-agwa gị okwu kwa ụbọchị. Ọ na-ege ntị nke ọma n’ekpere anyị niile. Ịgụ Baịbụl na ikpegara Jehova ekpere ga-enyere anyị aka ịmatakwu ya, meekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya.—Jọn 17:3.

“Ọ bụ ihe ùgwù na Jehova na-agwa anyị okwu n’asụsụ anyị”

^ para. 2 Gụọ peeji nke 1718 ruo 1721 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee, nke afọ 2013 nakwa isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị nke Ọma?” n’Ụlọ Nche May 1, 2008.

^ para. 6 Malite mgbe e dere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, ihe karịrị otu puku afọ gafere tupu e nwee Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị Masoret depụtaghachiri.

^ para. 7 Otú a ka e si kọwaa ya n’akwụkwọ ụfọdụ na-akọwa okwu ndị dị́ na Baịbụl, ma ọ bụghị ndị ọkà mmụta niile kwetara.

^ para. 7 Gụọ peeji nke 1760 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Igbo, n’isiokwu bụ́ ‘Aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Hibru Nakwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.’