Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2015

Ihe Ndị Merela Kemgbe Otu Narị Afọ Alaeze Chineke Chịwara

Ihe Ndị Merela Kemgbe Otu Narị Afọ Alaeze Chineke Chịwara

“Ka Chineke nke udo . . . jiri ihe ọma niile kwadebe unu ime uche ya.”—HIB. 13:20, 21.

ABỤ: 136, 14

1. Olee otú ikwusa ozi ọma dịruru Jizọs ná mkpa? Kọwaa.

IKWU banyere Alaeze Chineke na-atọ Jizọs ụtọ. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o kwuru banyere ya karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ọ kpọrọ Alaeze Chineke aha ihe karịrị otu narị ugboro mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma. O jighị Alaeze ahụ gwuo egwu.—Gụọ Matiu 12:34.

2. Mmadụ ole ka o nwere ike ịbụ na ha nọ mgbe Jizọs nyere iwu ahụ e dere na Matiu 28:19, 20? Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ?

2 Obere oge ka Jizọs si n’ọnwụ bilie, ya na ihe karịrị narị mmadụ ise, bụ́ ndị ga-emecha kwusawa Alaeze Chineke, nọkọrọ. (1 Kọr. 15:6) O nwere ike ịbụ n’oge ahụ ka o nyere iwu ka e kwusaara “ndị mba niile” ozi ọma Alaeze Chineke. Ọrụ ahụ agaghị abụ obere ọrụ. * Jizọs gwara ha na a ga-arụgide ya ruo “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Ọ bụ ihe a na-eme ugbu a.  O doro anya na i so na-ekwusa ozi ọma ahụ, sí otú ahụ na-emezu amụma ahụ.—Mat. 28:19, 20.

3. Olee ihe atọ nyeerela anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma?

3 Mgbe Jizọs nyechara ha iwu ikwusa ozi ọma, o kwere ha nkwa, sị: “M nọnyeere unu.” (Mat. 28:20) N’ihi ya, ọ bụ ya ga na-eduzi ozi ọma ahụ a ga-ekwusa n’ụwa niile. Jehova enyela anyị “ihe ọma niile” ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma. (Hib. 13:20, 21) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’atọ n’ime ihe ọma ndị ahụ. Nke mbụ bụ ngwá ọrụ ndị e nyerela anyị iji na-ekwusa ozi ọma. Nke abụọ bụ ụzọ dị́ iche iche anyị sirila na-ekwusa ya. Nke atọ bụ otú e sirila na-azụ anyị ikwusa ozi ọma. Ka anyị buru ụzọ tụlee ngwá ọrụ ndị anyị jirila kwusaa ozi ọma kemgbe otu narị afọ.

NGWÁ ỌRỤ NDỊ NYEERE NDỊ OHU CHINEKE AKA IKWUSA OZI ỌMA

4. Olee otú ngwá ọrụ dị́ iche iche sirila nyere anyị aka ikwusa ozi ọma?

4 Jizọs ji “okwu banyere alaeze ahụ” tụnyere mkpụrụ a ghara n’ụdị ala dị́ iche iche. (Mat. 13:18, 19) Onye ọrụ ugbo nwere ike iji ụdị ngwá ọrụ dị́ iche iche kwadebe ala ebe ọ ga-akọ ihe. Otú ahụ ka Eze anyị nyere anyị ngwá ọrụ dị́ iche iche ga-enyere anyị aka ịkwadebe obi ọtụtụ nde mmadụ ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ụfọdụ n’ime ha bara uru nwa oge, ma a ka nwere ndị bara uru ruo taa. Ma ha niile enyerela anyị aka ịma otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma.

5. Gịnị bụ kaadị e ji ezi ozi ọma? Olee otú ụmụnna si jiri ya zie ozi ọma?

5 Otu n’ime ihe nyeere ọtụtụ ndị aka ịmalite ikwusa ozi ọma bụ kaadị e ji ezi ozi ọma. Ndị nkwusa malitere iji ya ezi ozi ọma n’afọ 1933. Ọ bụ obere kaadị e dere ozi dị́ nkenke sí na Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, a na-ewepụta nke ọhụrụ, gbanweekwa ihe e dere na ya. Otu nwanna aha ya bụ Erlenmeyer dị ihe dị́ ka afọ iri mgbe mbụ o ji kaadị a zie ozi ọma. Ọ sịrị: “Ihe anyị na-ekwu ma anyị hụ mmadụ bụ, ‘Biko, gụọ ihe e dere na kaadị a.’ Onye ahụ gụchaa ya, anyị enye ya akwụkwọ, gawa ebe ọzọ.”

6. Olee uru kaadị ahụ e ji ezi ozi ọma baara ụmụnna?

6 Kaadị ahụ baara ụmụnna anyị uru n’ụzọ dị́ iche iche. Dị ka ihe atụ, ihere nọ na-eme ụfọdụ ndị nkwusa, ha amaghịkwa ihe ha ga-ekwu n’agbanyeghị na ha chọrọ ikwusa ozi ọma. E nwekwara ndị nkwusa obi kara. Ha ziwe mmadụ ozi ọma, ha na-eji naanị nkeji ole na ole gwa ya ihe niile ha ma. Ma, ha anaghị eji akọ ekwu okwu mgbe ụfọdụ. Kaadị ahụ nyeere ndị nkwusa niile aka izi ozi ọma dị́ nkenke ma doo anya.

7. Olee nsogbu ụmụnna ụfọdụ nwere mgbe ha ji kaadị ahụ ezi ozi ọma?

7 Ma, e nwere ụfọdụ nsogbu dị́ n’iji kaadị ahụ ezi ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Grace Estep sịrị: “Mgbe ụfọdụ, a na-ajụ anyị, sị, ‘Ehee, gịnị ka kaadị a kwuru? Ị́ gaghị agwali m ihe o kwuru?’” Ụfọdụ anaghị agụli ihe e dere na ya. E nwekwara ndị chere na a chọrọ inye ha ya ka ọ bụrụ nke ha. Ha nara ya onye nkwusa, ha emechie ụzọ. Ndị na-emegide anyị na-anara kaadị ahụ dọrie ya. N’agbanyeghị nsogbu a niile, kaadị ahụ nyeere ụmụnna anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma, meekwa ka a mara na ha na-ekwusa Alaeze Chineke.

8. Kọwaa otú ụmụnna anyị si jiri gramafon zie ozi ọma. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Ihe ọzọ ụmụnna anyị ji kwusaa ozi ọma mgbe afọ 1930 gachara bụ gramafon. Ụfọdụ ụmụnna na-akpọ ya Erọn  n’ihi na ọ na-ekwuchite ọnụ ha. (Gụọ Ọpụpụ 4:14-16.) Ha gaa izi mmadụ ozi ọma, ọ bụrụ na onye ahụ kweta ige ha ntị, ha akpọnyere ya okwu sí na Baịbụl, nke na-ewe nkeji anọ na ọkara. Ọ kpọchaa, ha enye ya akwụkwọ. Mgbe ụfọdụ, nne na nna na ụmụ ha niile na-agbakọ gee okwu ahụ. N’afọ 1934, Watch Tower Society malitere imepụta obere gramafon a ga-eji na-ezi ozi ọma. Ka oge na-aga, ụmụnna wepụtara isiokwu iri itoolu na abụọ a na-egere egere.

9. Olee otú gramafon si nyere ụmụnna anyị aka?

9 Mgbe otu nwoke aha ya bụ Hillary Goslin gechara otu n’ime okwu ndị ahụ, ọ gbaziiri gramafon ahụ otu izu ka ọ gaa kpọọrọ ndị agbata obi ya ozi ahụ sí na Baịbụl. Mgbe nwanna ahụ nyere ya gramafon laghachiri, ọtụtụ ndị nwere mmasị n’eziokwu nọ na-eche ya. Ka oge na-aga, e mere ọtụtụ n’ime ha baptizim. Ụmụ Hillary abụọ ndị nwaanyị gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied, bụrụkwa ndị ozi ala ọzọ. Gramafon nyeere ọtụtụ ndị aka ịmalite ikwusa ozi ọma otú ahụ kaadị e ji ekwusa ozi ọma mere. Ka oge na-aga, Eze anyị ga-eji Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kụziere ndị ya otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma.

ỤZỌ DỊ́ ICHE ICHE E SIRILA KWUSAA OZI ỌMA

10, 11. Olee otú e si jiri akwụkwọ akụkọ na redio kwusaa eziokwu Baịbụl? Gịnị mere ụzọ abụọ a ji baa uru?

10 Eze anyị enyerela ndị ohu Chineke aka isi n’ụzọ dị́ iche iche kwusaara ọtụtụ ndị ozi ọma. Ụzọ ndị ahụ bara ezigbo uru karịchaa n’oge “ndị ọrụ dị ole na ole.” (Gụọ Matiu 9:37.) N’afọ 1903, ha malitere iji akwụkwọ akụkọ na-ezi ọtụtụ ndị ozi ọma n’ebe ndị ohu Jehova na-ehighị nne. Kwa izu, Nwanna Russell na-ezigara otu ụlọ ọrụ na-agbasa ozi isiokwu sí na Baịbụl. Ụlọ ọrụ ahụ na-eziga ziri ndị na-ebi akwụkwọ akụkọ n’Amerịka, Kanada, na Yurop ozi ahụ. N’afọ 1913, e biela okwu dị́ iche iche Nwanna Russell kwuru na puku akwụkwọ akụkọ abụọ, ihe dị́ ka nde mmadụ iri na ise agụọkwala ha.

11 Mgbe Nwanna Russell nwụchara, ụzọ ọzọ a malitere isi na-ekwusa ozi ọma bụ redio. N’abalị iri na isii n’ọnwa Eprel afọ 1922, Nwanna Rutherford kwuru okwu na redio. Okwu a so ná ndị mbụ o kwuru na redio. Ihe dị́ ka puku mmadụ iri ise gere ya. Ka obere oge gara, n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Febụwarị afọ 1924, anyị malitere iji ụlọ ọrụ redio anyị a na-akpọ WBBR na-agbasa ozi. Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1924, kwuru gbasara ụzọ ọhụrụ a, sị: “Obi siri anyị ike na redio bụ ụzọ kacha mma anyị sitụrụla kwusaa eziokwu Baịbụl, ọ naghịkwa efu oké ego.” Dịkwa ka akwụkwọ akụkọ, redio mere ka ọtụtụ ndị bí n’ebe ndị e nwere naanị ndị nkwusa ole na ole nụ ozi ọma.

Ọtụtụ ndị nkwusa na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, obi na-adịkwa ha ụtọ ịgwa ndị mmadụ banyere adres Ịntanet anyị, bụ́ jw.org (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. (a) Olee ebe ndị mmadụ na-anọkarị ị kacha enwe mmasị ịga zie ozi ọma? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ka ụjọ ghara ịna-atụ anyị ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị?

12 Ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị bụ ụzọ ọzọ e si ezi ozi ọma, ya bụ, n’ọdụ ụgbọala, n’ọdụ okporo ígwè, n’ebe a na-adọba ụgbọala, nakwa n’ahịa. Ọ bụrụ na ahụ́ anaghị erucha gị ala ikwusa ozi ọma n’ụdị ebe ndị ahụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Chegodị banyere ihe otu nwanna bụ́ onye nlekọta sekit ruo ọtụtụ afọ kwuru. Ọ sịrị: “Anyị na-ewere ụzọ ọhụrụ ọ bụla e si ezi ozi ọma ka ụzọ ọzọ anyị ga-esi jeere Jehova ozi na otú anyị ga-esi gosi na anyị  na-erubere ya isi nakwa na anyị ji obi anyị niile na-efe ya. Anyị chọsikwara ike igosi na anyị ga-esi n’ụzọ ọ bụla ọ chọrọ jeere ya ozi.” Ọ bụrụ na anyị akata obi sí n’ụzọ ọhụrụ ọ bụla na-ekwusa ozi ọma, ọ ga-eme ka anyị na-atụkwasịkwu Jehova obi, okwukwe anyị esikwuo ike. Otú anyị si ezi ozi ọma ga-akakwa mma.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10.

13. Olee uru ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-abara anyị? Kọọ ihe mere mgbe ị na-agwa ndị mmadụ banyere ya.

13 Obi na-adị ọtụtụ ndị nkwusa ụtọ ịgwa ndị mmadụ banyere ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ, jw.org, bụ́ ebe ha nwere ike ịgụ ma ọ bụ were akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. Kwa ụbọchị, ihe karịrị otu nde mmadụ na ọkara na-aga n’ebe ahụ anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. N’oge gara aga, anyị ji redio kwusaara ndị nọ́ n’ebe dịpụrụ adịpụ ozi ọma. Taa, anyị na-eji adres Ịntanet anyị eme otu ihe ahụ.

OTÚ E SI NA-AZỤ NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA

14. Olee ihe e kwesịrị ịkụziri ndị nkwusa? Oleekwa ụlọ akwụkwọ nyeere ha aka ịna-ezi ozi ọma nke ọma?

14 Anyị atụleela ngwá ọrụ ole na ole e ji kwusaa ozi ọma nakwa ụzọ ụfọdụ e si kwusaa ya. Ma, e kwesịrị ịzụ ndị nkwusa n’otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ụfọdụ onye a gara na nke ya na-anaghị ekweta ihe e kwuru na gramafon ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o nwere mmasị n’ihe ọ nụrụ, chọọkwa ịmụtakwu ihe. Ndị nkwusa kwesịrị ịmụta otú ha ga-esi jiri akọ zaa ndị mmadụ nakwa otú ha ga-esi kụziere ndị nwere mmasị eziokwu nke ọma. O doro anya na mmụọ nsọ Chineke mere ka Nwanna Knorr ghọta na e kwesịrị ịzụ ndị nkwusa ka ha mụta iji ọnụ ha na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, n’afọ 1943, ọgbakọ dị́ iche iche malitere inwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. O nyerela anyị niile aka ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma.

15. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị mere mgbe ha na-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? (b) Olee otú Jehova si meere gị ihe ahụ o kwuru n’Abụ Ọma 32:8?

15 O were ọtụtụ ụmụnna oge tupu ha amụta ịna-ekwu okwu n’ihu ọha. Otu nwanna aha ya bụ Ramu chetara ihe mere ya mgbe mbụ o mere ihe omume n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’afọ 1944. Ihe omume ahụ bụ gbasara Doeg, bụ́ onye a kpọrọ aha naanị n’amaokwu ise na Baịbụl. Nwanna Ramu sịrị: “Ikpere m nọ na-akụkọta ọnụ, aka m ana-ama jijiji, ezé m  nọkwa na-akụkọta ọnụ.” O kwuru na ya ji amaokwu ise ahụ kọwaa isiokwu ahụ. Ọ sịkwara: “Nkeji atọ ka m ji mee ihe omume ahụ. Nke ahụ bụ nke mbụ m kwuru okwu n’ihu ọha, ma adaghị m mbà.” Ụmụaka sokwa na-eme ihe omume n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ha mfe. Nwanna Angelo Manera chetara ihe mere mgbe otu nwa okorobịa mere ihe omume mbụ ya. Ọ sịrị: “Ahụ́ niile nọ na-ama ya jijiji mgbe ọ malitere ihe omume ahụ nke na ọ malitere ikwu ákwá ákwá. Ma, ebe ọ bụ na o kpebiri imecha ya, o kwugidere otú ahụ ruo mgbe o mechara.” Ihere ma ọ bụ ụjọ ò meela ka ị ghara ịna-aza ajụjụ ma ọ bụ na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe? Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịkata obi. Ọ ga-enyere gị aka otú ahụ o nyeere ụmụnna ndị ahụ mgbe a malitere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ọhụrụ.—Gụọ Abụ Ọma 32:8.

16. Gịnị ka e bu n’obi banyere Ụlọ Akwụkwọ Gilied (a) mgbe a malitere ya, nakwa (b) kemgbe afọ 2011?

16 Ọ bụghị naanị Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ka Jehova ji azụ ndị ya taa. Ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ eritela ezigbo uru n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Otu n’ime ndị nkụzi n’ụlọ akwụkwọ a kwuru na ihe mere e ji malite ya bụ ka o nyere ndị gara ya aka inwekwu mmasị n’ikwusa ozi ọma. A malitere Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1943. Kemgbe ahụ, ihe karịrị puku ụmụnna asatọ na narị ise agaala ya. E zigakwala ha n’ihe dị́ ka otu narị mba na iri asaa. Kemgbe afọ 2011, ndị na-agazi ụlọ akwụkwọ a bụ ndị nọ́ n’ozi oge niile pụrụ iche, ya bụ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị na-eje ozi na Betel, ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

17. Olee uru Ụlọ Akwụkwọ Gilied barala?

17 È nweela uru e ritere n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied? Ee. Chegodị banyere Japan. N’ọnwa Ọgọst afọ 1949, ndị obodo ahụ bụ́ ndị nkwusa erughị mmadụ iri. Ma, tupu afọ ahụ agwụ, ndị ozi ala ọzọ iri na atọ a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied nọ na-ekwusa ozi ọma ná mba ahụ. Taa, e nwere ihe dị́ ka narị puku ndị nkwusa abụọ na puku iri na isii na Japan. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha na-asụkwa ụzọ.

18. Olee ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ anyị nwere?

18 Anyị nwekwara ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ, dị́ ka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Sekit na Nwunye Ha, na Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha. A zụọla ọtụtụ ụmụnna n’ụlọ akwụkwọ ndị a, okwukwe ha esie ike. O doro anya na Eze anyị ka na-azụ ndị na-erubere ya isi.

19. Gịnị ka Nwanna Russell kwuru banyere ikwusa ozi ọma? Olee otú ihe ahụ o kwuru si bụrụ eziokwu?

19 Ihe karịrị otu narị afọ agaala kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị. Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst ka na-azụkwa anyị. Obere oge tupu Nwanna Russell anwụọ n’afọ 1916, obi siri ya ike na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa. O kwuru, sị: “Ọrụ a na-ehikwu nne n’ike n’ike, ọ ka ga na-ehikwa nne, n’ihi na a ga-ekwusa ‘ozi ọma nke a nke alaeze’ n’ụwa niile.” (Peeji nke 69, n’akwụkwọ bụ́ Faith on the March, nke A. H. Macmillan dere.) Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Obi dịkwa anyị ụtọ na Chineke nke udo na-enye anyị ihe ndị anyị ga-eji na-arụ ọrụ a na-eme ezigbo obi ụtọ. N’eziokwu, ọ na-enye anyị “ihe ọma niile” ga-enyere anyị aka ịna-eme uche ya.

^ para. 2 O nwere ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ mechara bụrụ Ndị Kraịst. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Pọl onyeozi kpọrọ ha “narị ụmụnna ise.” Ọ sịkwara: “Ọtụtụ n’ime ha ka nọ ruo ugbu a, ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ.” N’ihi ya, ọ dị ka Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ ma ọtụtụ n’ime ndị ahụ nọ́ mgbe Jizọs nyere iwu ahụ.