Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2015

Zụọ Ụmụ Gị Ka Ha Na-efe Jehova—Nke Mbụ

Zụọ Ụmụ Gị Ka Ha Na-efe Jehova—Nke Mbụ

“Onye nke ezi Chineke ahụ . . . , ya bịakwute anyị ọzọ ma gwa anyị ihe anyị ga-eme nwa ahụ a ga-amụ.”—IKPE 13:8.

ABỤ: 88, 120

1. Gịnị ka Manoa mere mgbe ọ nụrụ na nwunye ya ga-amụ nwa?

O DORO Manoa na nwunye ya anya na ha agaghị amụta nwa. Ma otu ụbọchị, mmụọ ozi Jehova gwara nwunye Manoa na ọ ga-amụ nwa nwoke. Ozi ahụ juru ya anya, ma mee ya obi ụtọ. Mgbe ọ gwara di ya ihe mmụọ ozi ahụ kwuru, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ma, Manoa chere otú Jehova chọrọ ka ha si zụọ nwa ahụ. Olee otú ha ga-esi zụọ ya ka ọ hụ Jehova n’anya ma fee ya ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị Izrel na-eme ihe ọjọọ? Manoa ‘rịọrọ Jehova,’ sị: “Onye nke ezi Chineke ahụ [ya bụ, mmụọ ozi ahụ] i zitere, biko, ya bịakwute anyị ọzọ ma gwa anyị ihe anyị ga-eme nwa ahụ a ga-amụ.”—Ikpe 13:1-8.

2. Gịnị ka i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị? Olee otú ị ga-esi eme ya? (Kwuo ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Ndị Kacha Mkpa Ị Na-amụrụ Baịbụl.”)

2 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ ga-abụ na ị ghọtara otú obi dị Manoa. I nwere ọrụ inyere ụmụ gị aka ịmata Jehova na ịhụ ya n’anya. * (Ilu 1:8) N’ihi ya, nne na nna bụ́  Ndị Kraịst na-agba mbọ ka ha na ụmụ ha na-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị naanị ọmụmụ ihe ahụ unu na-enwe kwa izu ga-eme ka eziokwu Baịbụl bamie n’obi ha. (Gụọ Diuterọnọmi 6:6-9.) Gịnị ọzọ ga-enyere gị aka ịzụ ụmụ gị ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya? Isiokwu a na nke na-eso ya ga-enyere ndị nne na nna aka iṅomi Jizọs. Jizọs abụghị nna, ma ndị nne na nna ga-amụta ihe n’otú o si kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe nakwa otú o si jiri ịhụnanya, obi umeala, na nghọta zụọ ha. Ka anyị tụlee àgwà ndị a n’otu n’otu.

HỤ ỤMỤ GỊ N’ANYA

3. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya?

3 Jizọs na-agwakarị ndị na-eso ụzọ ya na ọ hụrụ ha n’anya. (Gụọ Jọn 15:9.) Ọ na-ewepụta oge ka ya na ha nọrịa, sí otú ahụ na-egosi ha na ọ hụrụ ha n’anya. (Mak 6:31, 32; Jọn 2:2; 21:12, 13) Ọ bụghị naanị onye nkụzi ha, kama ọ bụ enyi ha. N’ihi ya, o meghị ha obi abụọ ma ọ̀ hụrụ ha n’anya. Gịnị ka ị ga-amụta n’aka Jizọs?

4. Olee otú ị ga-esi mee ka ụmụ gị mata na ị hụrụ ha n’anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Na-agwa ụmụ gị na ị hụrụ ha n’anya, na-emekwa ka ha mara na i ji ha kpọrọ ihe. (Mat. 3:17; Taị. 2:4) Samuel, bụ́ onye bí n’Ọstrelia, sịrị: “Mgbe m dị obere, papa m na-agụrụ m Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible ná mgbede ọ bụla. Ọ na-aza ajụjụ ndị m jụrụ ya, makụọ m, susuo m ọnụ tupu m lakpuo. O juru m anya mgbe m matara na e mereghị papa m ụdị ihe ndị ahụ mgbe ọ dị obere. Ma, ọ gbara mbọ gosi m na ọ hụrụ m n’anya. N’ihi ya, mụ na ya dị n’ezigbo mma, obi na-adị m ụtọ, na-erukwa m ala.” Na-agwa ụmụ gị mgbe niile na ị hụrụ ha n’anya ka obi wee dị́ ha otú ahụ.  Na-egosi ha na ị hụrụ ha n’anya. Na-ewepụta oge ka gị na ha nọrịa, rikọọ nri, gwukọọkwa egwu.

5, 6. (a) Gịnị ka Jizọs na-eme ndị ọ hụrụ n’anya? (b) Kọwaa otú ịdọ ụmụaka aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị si eme ka ha mata na a hụrụ ha n’anya.

5 Jizọs kwuru, sị: “Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.” * (Mkpu. 3:19) Ndị na-eso ụzọ ya rụrụ ụka ugboro ugboro banyere onye ka ukwuu n’etiti ha, ma ike ha agwụghị ya. Ọ gbachighịkwa ha nkịtị mgbe ha na-emeghị ihe ọ gwara ha. Kama, o ji obiọma dụọ ha ọdụ n’oge kwesịrị ekwesị nakwa n’ebe kwesịrị ekwesị.—Mak 9:33-37.

6 Na-adọ ụmụ gị aka ná ntị iji gosi na ị hụrụ ha n’anya. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe ị ga-eme bụ ịgwa ha ihe mere ihe ha chọrọ ime ji dị́ mma ma ọ bụ dị́ njọ. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ha nupụrụ gị isi? (Ilu 22:15) Mee ka Jizọs. Nweere ha ndidi. Na-eduzi ha, na-akụziri ha ihe, na-agbazikwa ha, sí otú ahụ na-adọ ha aka ná ntị. Chọọ oge dị́ mma na ebe dị́ mma ị ga-anọ dọọ ha aka ná ntị, jirikwa obiọma mee ya. Otu nwanna nwaanyị bí na Saụt Afrịka aha ya bụ Elaine chetara otú nne ya na nna ya si adọ ya aka ná ntị. Ha na-agwa ya ihe ha chọrọ ka o mee. Ọ bụrụ na ha ekwuo na ha ga-ata ya ahụhụ ma o nupụ isi, ha na-eme ihe ahụ ha kwuru. Ma, ọ sịrị: “O nweghị mgbe ha ji iwe dọọ m aka ná ntị ma ọ bụkwanụ taa m ahụhụ n’agwaghị m ihe m mere.” N’ihi otú ha si emeso ya, obi siri ya ike na ha hụrụ ya n’anya.

DỊRỊ UMEALA N’OBI

7, 8. (a) Olee otú ekpere Jizọs kpere si gosi na ọ dị umeala n’obi? (b) Olee otú ekpere gị ga-esi kụziere ụmụ gị ịna-atụkwasị Jehova obi?

7 Obere oge tupu e gbuo Jizọs, o kpere ekpere rịọ Nna ya, sị: “Aba, Nna, ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ; wepụ iko a n’ebe m nọ. Ma ọ bụghị ihe m chọrọ, kama ihe ị chọrọ.” * (Mak 14:36) Chegodị otú obi dị ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha nụrụ ekpere ahụ ma ọ bụ mechaa nụ banyere ya. Ha ghọtara na n’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ rịọrọ Nna ya ka o nyere ya aka. N’ihi ya, ha mụtara na hanwa kwesịrị ịdị umeala n’obi, tụkwasịkwa Jehova obi.

8 Gịnị ka ụmụ gị na-amụta n’ekpere gị? Ọ bụ eziokwu na ihe mere i ji ekpe ekpere abụghị ka ị kụziere ụmụ gị ihe, ma ọ bụrụ na i jiri obi umeala na-ekpe ekpere, ụmụ gị ga-amụta ịna-atụkwasị Jehova obi. Otu nwanna nwaanyị bí na Brazil aha ya bụ Ana sịrị: “Mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị, dị́ ka mgbe nne na nna mama m na-arịa ọrịa, papa m na mama m na-arịọ Jehova ka o nye ha ike idi nsogbu ahụ nakwa amamihe ha ga-eji mee mkpebi dị́ mma. Ọ bụrụgodị na nsogbu ahụ siri ezigbo ike, ha na-ahapụrụ ya Jehova. O mere ka m mụta ịna-atụkwasị Jehova obi.” Gị na ụmụ gị kpewe ekpere, arịọla naanị ka Jehova nyere ha aka. Rịọkwa ya ka o nyere gị aka. I nwere ike ịrịọ ya ka o nye gị obi ike izi onye agbata obi gị ozi ọma ma ọ bụ ịgwa onye ị na-arụrụ ọrụ ka o nye gị ohere ị ga-eji aga mgbakọ. Ọ bụrụ na ị dịrị umeala n’obi ma na-ewepụta onwe gị ijere Chineke ozi, ụmụ gị ga-amụta ịna-emekwa otú ahụ.

9. (a) Olee otú Jizọs si kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha dị́ umeala n’obi ma na-ejere ndị ọzọ ozi? (b) Ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi ma na-ejere ndị ọzọ ozi, gịnị ka ụmụ gị ga-amụta?

 9 Jizọs ji okwu ọnụ ya na omume ya kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-adị umeala n’obi ma na-ejere ndị ọzọ ozi. (Gụọ Luk 22:27.) Ọ kụziiri ha ka ha na-ewepụta onwe ha na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na ị na-ewepụta onwe gị, jiri obi umeala na-eje ozi, ụmụ gị ga-amụta ya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Debbie mụrụ ụmụ abụọ. Ọ sịrị: “Di m bụ okenye. Iwe anaghịkwa ewe m maka oge o ji enyere ndị ọzọ aka n’ọgbakọ. Ama m na e nwee ihe mụ na ụmụ anyị chọrọ ka o meere anyị, ọ ga-ewepụta ohere.” (1 Tim. 3:4, 5) Di ya sịrị: “Ụmụ anyị mechara na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ ná mgbakọ nakwa n’ihe ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Obi na-adị ha ụtọ. Ha metara ezigbo ndị enyi, na-agbakwa mbọ ka ha na ụmụnna ha na-anọ.” Debbie na di ya na ụmụ ha na-eje ozi oge niile ugbu a. Ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi ma na-ejere ndị ọzọ ozi, ụmụ gị ga-amụta ịna-enyere ndị ọzọ aka.

NA-AGHỌTA ỤMỤ GỊ

10. Mgbe ìgwè mmadụ chọ Jizọs bịa, olee otú o si gosi na o nwere nghọta?

10 Jizọs na-aghọta ndị mmadụ nke ọma. Ọ naghị elekwasị anya naanị n’ihe mmadụ mere, kama ọ na-amata ihe mere onye ahụ ji mee ya. Ọ na-ama ihe dị́ ndị mmadụ n’obi. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ndị sí Galili chọọrọ ya bịa Kapaniọm. (Jọn 6:22-24) Ma, Jizọs ghọtara na ọ bụ nri ka ha chọ bịa, ọ bụghị ka ha gere ihe ọ na-akụzi. (Jọn 2:25) Ọ hụrụ na ihe ha bu n’obi adịghị mma. O weturu obi gbazie ha, kọwakwaara ha mgbanwe ndị ha kwesịrị ime.—Gụọ Jọn 6:25-27.

Ịga ozi ọma ọ̀ na-atọ nwa gị ụtọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. (a) Olee otú ị ga-esi gbalịa ịghọta otú obi na-adị ụmụ gị banyere ikwusa ozi ọma? (b) Olee otú ị ga-esi mee ka ikwusa ozi ọma na-atọ ụmụ gị ụtọ?

11 N’agbanyeghị na ị naghị ama ihe dị́ mmadụ n’obi, i nwere ike ịna-aghọta ụmụ gị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgba mbọ ghọta otú obi dị ha gbasara ikwusa ozi ọma. Ọtụtụ ndị nne na nna na-akwụsịtụ n’ozi ọma ka ụmụ ha zurutụ ike, riekwa ihe tupu ha agawakwa. Ma, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị, ‘Ihe na-atọ ụmụ m ụtọ  ọ̀ bụ ikwusa ozi ọma, ka ọ̀ bụ oge ahụ anyị na-akwụsịtụ ka anyị rie nri?’ Ị chọpụta na ozi ọma anaghị atọcha ha ụtọ, gbalịa mee ka ọ tọwa ha ụtọ. Gwa ha ihe ha ga-ekwu n’ozi ọma ka ha wee mata na ha bara uru.

12. (a) Gịnị ka Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ya? (b) Gịnị mere o ji kwesị ịdọ ha aka ná ntị ahụ?

12 Olee otú ọzọ Jizọs si gosi na ya nwere nghọta? Ọ ghọtara na ihe mmadụ mejọrọ nwere ike ime ka o mee mmehie dị́ oké njọ. Ọ dọkwara ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ya. Dị ka ihe atụ, ndị na-eso ụzọ ya ma na omume rụrụ arụ dị njọ. Ma Jizọs dọrọ ha aka ná ntị banyere ihe nwere ike ime ka mmadụ mee omume rụrụ arụ. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya. Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.” (Mat. 5:27-29) Ihe a Jizọs kwuru baara Ndị Kraịst bí n’ebe ndị Rom na-achị uru, n’ihi na n’oge ahụ, ọtụtụ ndị Rom na-enwe mmasị ile egwuregwu ebe a na-eme omume rụrụ arụ, na-ekwukwa okwu na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jiri obiọma dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha zere ihe ọ bụla ga-eme ka o siere ha ike ime ihe dị́ mma.

13, 14. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha ghara ịna-eji ihe rụrụ arụ atụrụ ndụ?

13 Nghọta nwere ike inyere gị aka ichebe ụmụ gị ka ha ghara ime ihe Jehova kpọrọ asị. Taa, e nwere ọtụtụ ebe ụmụaka nwere ike ile ndị gba ọtọ nakwa ihe ndị ọzọ rụrụ arụ. N’eziokwu, nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-agwa ụmụ ha ka ha ghara ịna-ele ebe a na-egosi omume rụrụ arụ. Ma, nghọta nwere ike ime ka ị mata ihe nwere ike ime ka ụmụ gị chọọ ile ndị gba ọtọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị nwere ike ime ka ha chọọ ile ndị gba ọtọ? Hà ma nsogbu ọ na-akpata? M̀ na-eme ka ọ dịrị ha mfe ịgwa m ihe ọ bụla, nke ga-eme ka ha nwee ike ịgwa m ka m nyere ha aka ma ha chọọ ile ndị gba ọtọ?’ Ọ bụrụgodị na ụmụ gị ka dị ezigbo obere, i nwere ike ịgwa ha, sị: “Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-egosi omume rụrụ arụ n’Ịntanet, gị achọọ ile ya, biko, bịa gwa m. Ụjọ atụla gị, emekwala ihere. M chọrọ inyere gị aka.”

14 Mgbe ị na-ekpebi ụdị ihe ị ga-eji atụrụ ndụ, cheta na ụmụ gị kwesịrị ịmụta ezigbo ihe n’aka gị. Nwanna ahụ anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ọ bụ ụdị egwú, fim, ma ọ bụ akwụkwọ anyị bụ́ nne na nna ji atụrụ ndụ ka ndị ezinụlọ anyị ga-ejikwa na-atụrụ ndụ. I nwere ike ikwu ọtụtụ ihe banyere ihe dị́ iche iche, ma ụmụ gị na-ele ihe ị na-eme, ọ bụkwa ihe ha ga-amụta.” Ọ bụrụ na ụmụ gị ahụ na ị na-agbasi mbọ ike iji ihe ndị dị́ mma atụrụ ndụ, ha ga-amụta ịna-emekwa otú ahụ.—Rom 2:21-24.

EZI CHINEKE GA-EGE GỊ NTỊ

15, 16. (a) Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na Chineke ga-enyere gị aka ịzụ ụmụ gị? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

15 Gịnị mere mgbe Manoa rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka ịzụ nwa ha? Baịbụl kwuru, sị: “Ezi Chineke wee gee ntị n’olu Manoa.” (Ikpe 13:9) Ndị nne na nna, Jehova ga-egekwa unu ntị. Ọ ga-aza ekpere unu, nyekwara unu aka ịzụ ụmụ unu. Ọ ga-enyere unu aka igosi na unu hụrụ ụmụ unu n’anya, dịrị umeala n’obi, nweekwa nghọta.

16 Otú ahụ Jehova ga-enyere gị aka ịzụ ụmụ gị mgbe ha ka dị obere ka ọ ga-enyekwara gị aka ịna-azụ ha mgbe ha nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú ị ga-esi ṅomie ịhụnanya Jizọs, obi umeala ya, na nghọta ya mgbe ị na-azụ ụmụ gị ndị ahụ.

^ para. 2 Ụmụaka a na-ekwu okwu ha n’isiokwu a bụ malite ná ndị a mụrụ ọhụrụ ruo ná ndị dị́ afọ iri na abụọ.

^ para. 5 Baịbụl gosiri na ịdọ aka ná ntị pụtara iduzi, ịzụ, na ịgbazi mmadụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-apụta ịta mmadụ ahụhụ. Ndị nne na nna kwesịrị iji obiọma na-adọ ụmụ ha aka ná ntị. Ha ekwesịghị ime ya n’iwe.

^ para. 7 Otu akwụkwọ nke na-akọwa okwu ndị dị́ na Baịbụl kwuru na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ụmụaka na-akpọ papa ha Aba. Okwu ahụ na-egosi na ha hụrụ nna ha n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù.