Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2015

Ị̀ Na-ahụ Otú Chineke Si Enyere Gị Aka?

Ị̀ Na-ahụ Otú Chineke Si Enyere Gị Aka?

‘A ga-eme ka ndị ohu Jehova mara aka ya.’—AỊZA. 66:14.

ABỤ: 65, 26

1, 2. Gịnị ka ụfọdụ ndị chere banyere Chineke?

ỌTỤTỤ ndị chere na ihe ha na-eme agbasaghị Chineke. Ụfọdụ kweere na Chineke achọghị ịma ma hà dị ndụ ma hà nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ajọ ifufe bibiri ọtụtụ ebe na Filipinz n’ọnwa Nọvemba afọ 2013, onyeisi otu n’ime obodo ndị dị́ ebe ahụ sịrị: “Ọ ga-abụrịrị na e nwere ebe Chineke gara.”

2 E nwere ndị chere na Chineke anaghị ahụ ihe ha na-eme. (Aịza. 26:10, 11; 3 Jọn 11) Ụfọdụ ndị chekwara otú ahụ n’oge Pọl onyeozi. O kwuru banyere ha, sị: “Ha achọghị ịmara Chineke.” Ha ‘jupụtara n’omume na-ezighị ezi niile, ajọ omume niile, anyaukwu niile, na ihe ọjọọ niile.’—Rom 1:28, 29.

3. (a) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? (b) Na Baịbụl, gịnị ka “aka” Chineke na-apụtakarị?

3 Anyịnwa kwanụ? Anyị adịghị ka ndị ahụ e kwuru okwu ha ná mmalite, kama anyị ma na Jehova na-ahụ ihe niile anyị na-eme. Ma, ànyị kwetara na Jehova nwere mmasị n’ebe anyị nọ, na-enyekwara anyị aka? Na Baịbụl, “aka” Chineke  na-apụtakarị ike ya. Ọ na-eji ike ya enyere ndị ohu ya aka, jirikwa ya na-emeri ndị iro ya. (Gụọ Diuterọnọmi 26:8.) Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị “ga-ahụ Chineke.” (Mat. 5:8) Ànyị so ná ndị ahụ? Olee otú anyị ga-esi ‘hụ Chineke’? Ka anyị tụlee banyere ndị Baịbụl kwuru ihe gosiri na ha hụrụ otú Chineke si na-enyere ha aka na ndị na-ekweghị ahụ ya. Anyị ga-amụtakwa otú okwukwe ga-esi nyere anyị aka ịna-ahụ aka Chineke.

NDỊ NA-EKWEGHỊ AHỤ AKA CHINEKE

4. Gịnị mere ndị iro ụmụ Izrel ahụghị aka Chineke?

4 N’oge ndị Izrel, ọ dịịrị ọtụtụ ndị mfe ịhụ ma nụ otú Chineke si nyere ndị Izrel aka. Jehova rụrụ ọrụ ebube napụta ndị ya n’Ijipt, nyekwara ha aka imeri ndị eze dị́ iche iche n’Ala Nkwa ahụ. (Jọsh. 9:3, 9, 10) N’agbanyeghị na ndị eze bí n’ofe Jọdan nụrụ ma hụ otú Jehova si chebe ndị ya, “ha malitere izukọta iji gbakọọ aka buso Jọshụa na Izrel agha.” (Jọsh. 9:1, 2) Mgbe ndị eze ndị ahụ malitere ịlụso ndị Izrel agha, ha kwesịrị ịhụ aka Chineke. Jehova mere ka ‘anyanwụ guzoro otu ebe, ọnwa akwụrụkwa otu ebe, ruo mgbe mba ahụ bọrọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya.’ (Jọsh. 10:13) Ma, Jehova kwere ka obi ndị iro ụmụ Izrel “kpọchie ka ha buso Izrel agha.” (Jọsh. 11:20) Ha ekweghị aghọta na Chineke na-alụrụ ndị ya ọgụ. N’ihi ya, e meriri ha.

5. Gịnị ka Eze Ehab na-ekwetaghị?

5 Mgbe e mechara, ajọ Eze Ehab kwesịrị ịhụ aka Chineke ugboro ugboro. Ịlaịja sịrị ya: “Igirigi agaghị ada, mmiri agaghịkwa ezo, . . . ọ gwụla ma m̀ kwuru ka o mee!” (1 Eze 17:1) O doro anya na ọ bụ Chineke mere ka o kwuo ihe ahụ, ma Ehab ekwetaghị. Ịlaịja mechara kpegara Jehova ekpere, ya esi n’eluigwe zite ọkụ ka o repịa àjà nsure ọkụ ya. Ehab hụrụ ihe ahụ merenụ. Ịlaịja gwaziri ya na Jehova ga-eme ka oké ọkọchị ahụ kwụsị. Ọ sịrị ya: “Gbadawakwa ka oké mmiri ozuzo ghara igbochi gị ịla!” (1 Eze 18:22-45) Ehab hụrụ ọrụ ebube niile ahụ, ma o kwetaghị na ọ bụ Chineke rụrụ ha. Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe abụọ a a kọrọ na Baịbụl bụ na anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ otú Jehova si enyere anyị aka.

NDỊ HỤRỤ AKA JEHOVA

6, 7. Gịnị ka Rehab na ndị Gibiọn ghọtara?

6 Ndị Gibiọn emeghị ka mba ndị gbara ha gburugburu. Ha hụrụ aka Chineke. Kama ịlụsowe ndị Izrel ọgụ, ha gakwuuru ha ka ha na ha mee udo. N’ihi gịnị? Ha sịrị Jọshụa: ‘Ndị ohu gị bịara n’ihi aha Jehova bụ́ Chineke gị, n’ihi na anyị anụwo ude ya na ihe niile o mere.’ (Jọsh. 9:3, 9, 10) Ha ghọtara na ọ bụ Jehova na-alụrụ ndị Izrel ọgụ. O gosiri na ha ma ihe.

7 Rehab bụ onye ọzọ hụrụ aka Chineke. Ọ bụghị onye Izrel, ma ọ nụrụ otú Jehova si napụta ndị ya n’Ijipt. Mgbe ndị nledo abụọ bụ́ ndị Izrel bịakwutere ya, ọ sịrị ha: “Amaara m na Jehova ga-enye unu ala a.” Rehab kwetara na Jehova ga-echebe ya na ndị ezinụlọ ha. O nwere okwukwe na Jehova n’agbanyeghị na ọ ma na ihe ọ na-eme nwere ike itinye ya ná nsogbu.—Jọsh. 2:9-13; 4:23, 24.

8. Olee otú ụfọdụ ndị Izrel si hụ aka Chineke?

8 Ụfọdụ ndị Izrel emeghị ka ajọ eze Ehab. Mgbe ha hụrụ otú Jehova si jiri ọkụ zaa Ịlaịja, ha ghọtara na o si n’aka Jehova. Ha tiri, sị: “Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke!” (1 Eze 18:39) O doro ha anya na ha hụrụ ike Chineke.

9. Olee otú anyị ga-esi hụ Jehova na aka ya taa?

 9 Ihe atụ ndị anyị tụlerela, ma nke ọma ma nke ọjọọ, enyerela anyị aka ịghọta ihe ‘ịhụ Chineke’ ma ọ bụ ịhụ aka ya pụtara. Ka anyị na-amatakwu Jehova na àgwà ya, anyị na-eji ‘anya nke obi anyị’ ahụ aka ya. (Efe. 1:18) O doro anya na anyị chọrọ iṅomi ndị jí obi ha niile fee Chineke, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a, ya bụ, ndị hụrụ otú Jehova si nyere ha aka. Ma, è nwere ihe na-egosi anyị na Chineke na-enyere ndị na-efe ya aka taa?

IHE NDỊ NA-EGOSI NA CHINEKE NA-ENYERE ANYỊ AKA TAA

10 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na Jehova na-enyere ndị mmadụ aka. Ọtụtụ mgbe, anyị na-anụ banyere ndị kpere ekpere ka Chineke nyere ha aka, ya enyere ha aka. (Ọma 53:2) Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna na-ekwusa ozi ọma n’otu agwaetiti dị́ na Filipinz, otu nwaanyị ọ gara izi ozi ọma malitere ibe ákwá. Nwanna ahụ sịrị: “Nwaanyị ahụ ka kpere ekpere n’ụtụtụ ahụ ka Jehova mee ka Ndịàmà ya bịakwute ya. Mgbe ọ na-eto eto, ya na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl, ma mgbe ọ lụrụ di, kwata n’agwaetiti ahụ, ọ hụghịzi ha. Otú Chineke si zaa ekpere ya n’egbughị oge metụrụ ya n’ahụ́.” N’ihe na-erughị otu afọ, ọ raara onwe ya nye Jehova.

Ị̀ na-ahụ ihe na-egosi na Jehova na-enyere ndị ya aka taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 13)

11, 12. (a) Olee ụzọ dị́ iche iche Jehova si enyere ndị ohu ya aka? (b) Kọọ otú Jehova si nyere otu nwanna nwaanyị aka.

11 Ọtụtụ ndị ohu Chineke ahụla otú o si nyere ha aka ịkwụsị àgwà ọjọọ riri ha ahụ́, dị́ ka ise sịga, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ ile ndị gba ọtọ. Ụfọdụ ndị kwuru na ha gbalịrị ugboro ugboro ịkwụsị ya, ma o kweghị ha. Ma, mgbe ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka, o nyere ha “ike karịrị ike nkịtị,” nke nyeere ha aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ.—2 Kọr. 4:7; Ọma 37:23, 24.

12 Jehova enyerela ọtụtụ ndị ohu ya aka idi nsogbu ndị bịaara ha. Ọ bụ ihe o meere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Amy. A gwara ya ka o soro rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ebe ndị ozi ala ọzọ ga-ebi n’otu obere agwaetiti dị́ n’Oké Osimiri Pasifik. Ọ sịrị: “Anyị nọrọ n’otu obere họtel. Kwa ụbọchị, anyị gawa n’ebe anyị ga-arụ ọrụ, anyị na-eji ụkwụ agafe n’okporo ámá ndị mmiri juru.” Ọ dịrịghị ya mfe ịmụta otú ndị ebe ahụ si eme ihe. Ọtụtụ mgbe, ọkụ na mmiri anaghị adị. Nwanna nwaanyị ahụ sịkwara: “Nke ka njọ bụ na m baara otu nwanna nwaanyị anyị na ya na-arụkọ ọrụ mba. Obi adịghị m mma mgbe m laruru. M bara n’ụlọ gwa Jehova otú ọ dị m n’obi, rịọ ya ka o nyere m aka.” Mgbe e wetara ọkụ, ọ malitere ịgụ Ụlọ Nche nke kwuru gbasara ememme ngụcha akwụkwọ nke ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Isiokwu ahụ kwuru banyere ihe niile ahụ na-esiri ya ike. Ọ sịrị: “Aghọtara m na Jehova nọ na-agwa m okwu n’abalị ahụ. O mere ka obi sie m ike ịnọsi ike n’ozi m bịara ebe ahụ ijere ya.”—Ọma 44:25, 26; Aịza. 41:10, 13.

13. Olee ihe na-egosi na Jehova na-enyere ndị ya aka ‘ịkwado ozi ọma na iji iwu na-eme ka o guzosie ike’?

13 Ihe ọzọ na-egosi na Jehova na-enyere ndị ya aka bụ na ọ na-eme ka ha ‘na-akwado ozi ọma ma jiri iwu na-eme ka o guzosie ike.’ (Fil. 1:7) Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ọchịchị n’obodo ụfọdụ gbalịrị ịkwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa, anyị gara n’ụlọikpe zara ọnụ anyị. Kemgbe  afọ 2000, ikpe ndị anyị meririla n’ụwa niile n’ụlọikpe dị́ elu eruola narị abụọ na iri isii na asatọ. E kpere iri abụọ na anọ n’ime ha n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. O doro anya na e nweghị onye ga-egbochili Jehova ime ihe ọ chọrọ ime.—Aịza. 54:17; gụọ Aịzaya 59:1.

14. Olee ihe ndị ọzọ gosiri na Chineke nọnyeere ndị ya?

14 Ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile bụ ihe ọzọ gosiri na Chineke na-enyere anyị aka. (Mat. 24:14; Ọrụ 1:8) Ihe ọzọ bụ na ndị ohu Jehova dị n’otu n’agbanyeghị na ha si ná mba dị́ iche iche. Ọ gaaraghị ekwe omume ma á sị na aka Jehova adịghị ya. Otú anyị si dị́ n’otu enweghị atụ. Ka a sịkwa ihe mere ndị na-abụghị ndị Jehova ji ekwu, sị: “N’ezie, Chineke nọ n’etiti unu.” (1 Kọr. 14:25) Anyị nwere ọtụtụ ihe gosiri na Chineke nọnyeere ndị ya. (Gụọ Aịzaya 66:14.) Gịnwa kwanụ? Ị̀ na-ahụ otú Jehova si enyere gị aka?

Ị̀ NA-AHU OTÚ JEHOVA SI ENYERE GỊ AKA?

15. Gịnị nwere ike ime mgbe ụfọdụ ka anyị ghara ịhụ na Jehova na-enyere anyị aka?

15 Olee ụfọdụ ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike ịghọta na Chineke na-enyere anyị aka? O nwere ike ịdị anyị ka nsogbu na-abịara anyị ọ̀ karịala. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee, anyị nwere ike ichefu na Jehova enyerela anyị aka ọtụtụ mgbe. Ọ bụ ihe mere Ịlaịja. O nwere obi ike. Ma, mgbe Jezibel bụ́ nwunye eze chọrọ igbu ya, ụjọ tụrụ ya, ya echefuo aka niile Jehova nyeere ya. Baịbụl kwuru na Ịlaịja rịọrọ Chineke ka ya nwụọ. (1 Eze 19:1-4) Gịnị ka Ịlaịja kwesịrị ime? Ọ bụ ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka.—1 Eze 19:14-18.

16. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị hụ Chineke otú ahụ Job hụrụ ya?

16 Otú Job si na-echegbu onwe ya banyere nsogbu bịaara ya mere ka ọ ghara ile ya anya otú Chineke si ele ya. (Job 42:3-6) Dị ka Job, o nwere ike  isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịhụ aka Chineke ma nsogbu bịara anyị. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịhụ ihe Chineke na-emere anyị? Anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru banyere nsogbu ahụ. Ka anyị na-aghọtakwu otú Jehova si na-akwado anyị, obi ga-esikwu anyị ike na ọ dị adị. Anyị ga-enwezi ike ikwu ka Job, sị: “Ọ bụ n’akụkọ ka m nụrụ banyere gị, ma ugbu a, anya m na-ahụ gị.”

Jehova ò ji gị enyere ndị ọzọ aka ịhụ ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na nke 18)

17 Olee otú anyị ga-esi ahụ aka Jehova? Ka anyị tụlee ihe atụ ise. Nke mbụ, o nwere ike ịbụ na ị ghọtara na Jehova nyeere gị aka ịchọta eziokwu. Nke abụọ, i nwere ike icheta mgbe ị gara ọmụmụ ihe, gechaa okwu ma sị: “Ọ bụ ihe a ka m chọrọ.” Nke atọ, o nwere ike ịbụ na ị hụla otú Jehova si zaa ekpere gị. Nke anọ, o nwere ike ịbụ na ị chọrọ iwepụtakwu oge jeere Jehova ozi, gị ahụkwa otú o si nyere gị aka ime ihe i kpebiri. Nke ise, ma eleghị anya, ị hapụrụ ọrụ ị na-arụbu n’ihi na ọ naghị enye gị ohere ijere Jehova ozi, gị emechaa hụ otú Chineke si mezuo nkwa ya, nke bụ́, ‘M gaghị agbahapụ gị ma ọlị.’ (Hib. 13:5) Ọ bụrụ na anyị na Jehova adịrị n’ezigbo mma, ọ gaghị esiri anyị ike ịhụ otú o si enyere anyị aka.

17, 18. (a) Olee otú ị ga-esi ghọta na Jehova na-enyere gị aka? (b) Kọọ ihe gosiri otú Chineke si na-enyere anyị aka taa.

18 Otu nwanna nwaanyị onye Kenya aha ya bụ Sera kwuru, sị: “M kpere ekpere banyere onye m na-amụrụ ihe m chere na o jighị ihe ọ na-amụ kpọrọ ihe. M jụrụ Jehova ma m̀ kwesịrị ịkwụsị ịmụrụ ya ihe. Ozugbo m sịrị ‘Amen,’ ekwentị m kụrụ. Onye ahụ m na-amụrụ ihe kpọrọ m, gwa m na ya chọrọ iso m gaa ọmụmụ ihe. O riri m ọnụ.” Ọ bụrụ na anyị eleruo anya, anyị ga-ahụ otú Chineke si na-enyere anyị aka. Nwanna nwaanyị ọzọ bí n’Eshia kwuru na ọ na-ewe oge ịhụ otú Jehova si enyere anyị aka. O kwukwara, sị: “Ma, anyị hụhaala ya, ọ ga-eju anyị anya ịmata na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.”

19. Olee ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịhụ Chineke?

19 Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.” (Mat. 5:8) Olee otú anyị ga-esi “dị ọcha n’obi”? Anyị kwesịrị ịna-eche naanị ihe dị́ mma, kwụsịkwa ime ihe ọjọọ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:2.) Ka anyị na-agbalịsi ike ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, na-emekwa ihe dị́ mma, anyị ga-eso ná ndị na-ahụ Chineke. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú okwukwe ga-esi mee ka anyị na-ahụ otú Jehova si enyere anyị aka.