Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2015

‘Onye Na-amaghị Ihe Na-ekweta Okwu Niile’

‘Onye Na-amaghị Ihe Na-ekweta Okwu Niile’

Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Jamanị aha ya bụ August von Schlözer (1735-1809) dere, sị: “Onye na-anaghị agụ akwụkwọ akụkọ dị nzuzu; onye kadị nzuzu bụ onye kwetara ihe naanị maka na e kwuru ya n’akwụkwọ akụkọ.”

IHE karịrị narị afọ abụọ gara aga, ndị mmadụ anaghị atụkwasị ihe niile e dere n’akwụkwọ akụkọ obi. Taakwa, ọ bụghị ihe niile anyị hụrụ ma ọ bụ gụọ n’Ịntanet ka anyị kwesịrị ikweta. Ihe dị́ n’Ịntanet karịrị akarị. Nkà na ụzụ na-emekwa ka ịchọta ha dị́ mfe. E nwere ndị bụ́ eziokwu, baa uru, ha anaghịkwa akpata nsogbu. Ma, ọtụtụ bụ ụgha, ha abaghị uru, ha na-akpatakwa nsogbu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ahọ ihe anyị ga-agụ ahọ. Ndị malitere ịga n’Ịntanet ọhụrụ nwere ike iche na ihe ọ bụla a kọrọ bụ eziokwu n’ihi na ọ dị n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ na enyi ha ziteere ha ya n’ozi iimel. Ha nwere ike ikweta ya ọ bụrụgodị na ọ dara ka ihe na-emeghị eme. Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

Anyị kwesịrị ịbụ ndị ma ihe. Ọ pụtara ịna-akpachapụ anya, na-ekweta naanị ihe anyị ma na ọ bụ eziokwu. A gaghịkwa aghọgbu anyị ikweta ihe na-abụghị eziokwu, ọ sọkwa ya bụrụ na a na-akọ ya ebe niile. Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ihe? Ihe mbụ ị ga-ajụ onwe gị bụ: ‘Ebe e si nweta akụkọ a n’Ịntanet ọ̀ bụ ebe a tụkwasịrị obi? Ka ọ̀ bụ ebe onye ọ bụla nwere ike ide ihe sọrọ ya? Ka ọ̀ bụdị na a maghị ebe e si nweta ya? È nweela ndị a tụkwasịrị obi kwuru na ihe ahụ abụghị eziokwu?’ * Ọ bụrụ otú ahụ, gosi na i nwere uche. (Ilu 7:7) Akụkọ dawa ka ihe na-emeghị eme, o nwere ike ịbụ na o meghị eme. Ị́ gụọ ihe na-adịghị mma banyere ndị ọzọ, chee banyere ndị ga-achọ ịna-akọsa ya nakwa ihe mere ha ji chọọ ịkọsa ya.

Ị̀ NA-EZIPỤKARỊ OZI E ZITEERE GỊ?

Ụfọdụ ndị nwere ike izipụrụ ndị ọzọ ozi e ziteere ha n’ebughị ụzọ chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ chee ihe o nwere ike ịkpata. O nwere ike ịbụ na ha chọrọ ịbụ ndị mbụ zipụrụ ozi ahụ. (2 Sam.  13:28-33) Ma, ọ bụrụ na anyị ‘ma ihe,’ anyị ga-eche banyere nsogbu o nwere ike ịkpatara mmadụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ ọ gbasara.

Mmadụ nwere ike ọ gaghị agbalị ịmata ma ihe ọ chọrọ izipụ ọ̀ bụ eziokwu n’ihi na ime otú ahụ ga-egbu ya oge. O nwere ike iche na ndị o zigaara ya ga-eji aka ha chọpụta. Ma ọ ga-egbukwa ndị ahụ oge ịchọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. (Efe. 5:15, 16) Kama izipụwa ozi anyị na-amaghị ma ọ̀ bụ eziokwu, ọ ka mma ichewe, sị: “Ọ bụrụ na ọ na-eme m obi abụọ, ka m kagbuo ya.”

Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ezipụkarị ozi e ziteere m? Ò nweela mgbe m rịọrọ ndị mmadụ mgbaghara maka izigara ha ozi na-abụghị eziokwu? Ò nweela onye sịrị m kwụsị izitere ya ozi iimel e ziteere m?’ Cheta na ndị ị na-ezigara ozi na-agakwa n’Ịntanet. N’ihi ya, ha nwere ike iji aka ha nweta ihe ọ bụla masịrị ha. Ha agaghị achọ ka e si n’iimel na-ezitere ha ọtụtụ akụkọ, fim, ma ọ bụ foto ndị na-atọ ọchị. Anyị ekwesịghịkwa ịna-ezigara ndị ọzọ okwu ndị anyị tinyere na teepụ ma ọ bụkwanụ okwu anyị si na teepụ depụta. * Chetakwa na ọ bụrụ na mmadụ ejiri aka ya mee nchọnchọ, gụọ amaokwu Baịbụl ndị e dere, ma ọ bụ kwadebe ihe ọ ga-aza n’ọmụmụ ihe, ọ ga-abara ya uru karịa onye ọzọ izitere ya ihe ndị a.

M̀ kwesịrị izigara onye ọzọ ozi iimel a?

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ị́ gaa n’Ịntanet hụ ihe na-abụghị eziokwu banyere nzukọ Jehova? Mechie ya ozugbo. Ụfọdụ chere na ha kwesịrị izigara ya ndị ọzọ iji mata ihe ha chere. Ma ime otú ahụ bụ ịgbasakwu ozi ahụ. Ọ bụrụ na ihe anyị hụrụ n’Ịntanet na-enye anyị nsogbu n’obi, anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere ka o nye anyị amamihe. Anyị nwekwara ike ịgakwuru ụmụnna ndị tozuru okè ka ha nyere anyị aka. (Jems 1:5, 6; Jud 22, 23) O kwesịghị iju anyị anya ma ndị mmadụ kwuwe ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị. Ọ bụ ihe e mere Jizọs. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na ndị iro ha ga na-akpagbu ha, ‘na-aghagide ha ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide ha.’ (Mat. 5:11; 11:19; Jọn 10:19-21) Anyị kwesịrị iji “ikike iche echiche”  na “nghọta” mata mgbe mmadụ na-aghara anyị ụgha, na-achọkwa iduhie anyị.—Ilu 2:10-16.

NA-AKWANYERE NDỊ ỌZỌ ÙGWÙ

Anyị kwesịkwara ịkpachapụ anya n’ihe gbasara izipụ akụkọ ndị anyị nụrụ banyere ụmụnna anyị. E nwere mgbe ọ na-agaghị adị mma ịkọ ihe ụfọdụ banyere ndị ọzọ á sịgodị na ọ bụ eziokwu. (Mat. 7:12) Dị ka ihe atụ, ọ gaghị adị mma ịkọsawa asịrị, ọ bụrụgodị na ọ bụ ihe mere eme. (2 Tesa. 3:11; 1 Tim. 5:13) A na-enwe ihe mmadụ na-achọbeghị ịkọrọ ndị ọzọ. Anyị kwesịrị ịkwanyere onye ahụ ùgwù, hapụ ya ka o jiri aka ya kpebie mgbe ọ ga-akọ ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị akọọ ihe ahụ mgbe onye ahụ na-achọbeghị ịkọ ya, o nwere ike ịkpata nsogbu.

Taa, e nwere ike ịkọsa akụkọ n’egbughị oge, ma ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ ụgha, ma ọ̀ bara uru ma ọ bụ na ọ baghị uru, ma ọ̀ ga-akpata nsogbu ma ọ bụ na o nweghị ihe o mere. Onye jí ekwentị ma ọ bụ kọmputa zigara mmadụ ozi kwesịrị ịghọta na onye ahụ nwere ike izigara ya ụwa niile ozugbo. N’ihi ya, ka anyị ghara ịna-eme e zitere anyị ozi, anyị ezigara ya ndị niile anyị ma ozugbo. N’agbanyeghị na ịhụnanya “na-ekwere ihe niile,” ọ naghịkwa enyo ihe niile enyo, anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-amaghị ihe, na-ekwere ihe ọhụrụ ọ bụla na akụkọ ọ bụla na-atọ ụtọ. (1 Kọr. 13:7) Anyị agaghị ekwere ụgha ma ọ bụ ihe ọ bụla e ji akatọ nzukọ Jehova nakwa ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya. Cheta na ndị na-echepụta ụgha ndị a ma na-akọsa ha na-eme Setan bụ́ Ekwensu obi ụtọ. Ọ bụ ya bụ “nna ụgha.” (Jọn 8:44) N’ihi ya, ka anyị mara ihe, na-echekwa echiche nke ọma banyere ihe anyị ga-eji ozi ndị anyị na-enweta na ọtụtụ ihe anyị na-anụ kwa ụbọchị na-eme. Cheta na Baịbụl sịrị: “Ndị na-amaghị ihe ga-aghọ ndị nzuzu, ma ndị maara ihe ga-eke ihe ọmụma dị ka ákwà isi.”—Ilu 14:18.

^ para. 4 Cheta na ọtụtụ mgbe, e nwere ike ịkọgharị akụkọ ndị e kwuru na ha abụghị eziokwu, kọsawa ha ka akụkọ ọhụrụ.

^ para. 8 Gụọ “Igbe Ajụjụ” dị́ n’Ozi Alaeze Anyị nke Eprel 2010.