Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2015

 AKỤKỌ NDỤ

Ngọzi Jehova Emeela M Ọgaranya

Ngọzi Jehova Emeela M Ọgaranya

A MỤRỤ m n’afọ 1927 n’otu obere obodo a na-akpọ Waka, dị́ na Saskachewan, Kanada. Papa m na mama m mụrụ ụmụ asaa, ụmụ nwoke anọ na ụmụ nwaanyị atọ. N’ihi ya, malite mgbe m dị obere, mụ na ndị mmadụ na-anọkarị.

Oké ihe isi ike e nwere n’ụwa malite n’afọ 1929 ruo n’afọ 1939 kpara ezinụlọ anyị aka ọjọọ. N’agbanyeghị na anyị abaghị ọgaranya, nri akọghị anyị. Anyị nwere ụfọdụ ọkụkọ na otu ehi. N’ihi ya, àkwá, mmiri ara ehi, chiiz, na bọta akọghị anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị nyere aka na-elekọta anụ ụlọ anyị, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị́ n’ụlọ.

E nwere ọtụtụ ihe mere n’oge ahụ na-eme m obi ụtọ ma m cheta ha. Otu n’ime ha bụ otú ọmarịcha ísì mkpụrụ osisi apụl si eju n’ụlọ anyị. Ọ na-abụ papa anyị gaa ire àkwá, bọta, na ihe ndị ọzọ n’oge mkpụrụ osisi na-amị, ọ na-azụta apụl ndị a ghọtara ọhụrụ. Ịta ụdị apụl ahụ kwa ụbọchị na-atọgbu anyị atọgbu.

OTÚ EZINỤLỌ ANYỊ SI MỤTA EZIOKWU

Adị m afọ isii mgbe papa m na mama m nụrụ banyere eziokwu Baịbụl. Tupu mgbe ahụ, ha amụọla nwa mbụ aha ya bụ Johnny, ya anwụọ obere oge ka a mụchara ya. Ọnwụ ya gbawara nne m na nna m obi. N’ihi ya, ha jụrụ ụkọchukwu ha ebe Johnny nọ, ya asị ha na ebe ọ bụ na e meghị nwa ahụ baptizim, ọ gaghị eluigwe. Kama, ọ nọ na Limbo. Ọ gwakwara ha na ọ bụrụ na ha akwụọ ya ụgwọ, ọ ga-ekpere Johnny ekpere ka o si na Limbo pụta gawazie eluigwe. Ọ bụrụ gị, olee otú obi gaara adị gị? Ihe ahụ ọ gwara ha mere ka ike ịga chọọchị gwụ ha, ha agaghịzi jụọ ya ihe ọ bụla ọzọ. Ma, ha ka nọ na-eche ebe Johnny nọ.

Otu ụbọchị, mama m hụrụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova biri n’asụsụ Bekee. Isiokwu ya bụ “Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?” Ọ gụchapụrụ ya ozugbo. Mgbe papa m lọtara, mama m ji obi ụtọ sị ya: “Amatala m ebe Johnny nọ. Ọ nọ n’ụra. Ọ ga-eteta otu ụbọchị.” Papa m gụchara akwụkwọ ahụ ná mgbede ahụ. Obi ruru mama m na papa m ala mgbe ha matara na Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ nọ n’ụra nakwa na a ga-akpọlite ha n’ọdịnihu.—Ekli. 9:5, 10; Ọrụ 24:15.

Eziokwu ahụ ha mụtara gbanwere ndụ anyị, kasie anyị obi, meekwa ka anyị nwee obi ụtọ. Ha na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ha amalitekwa ịga ọmụmụ ihe n’obere ọgbakọ dị́ na Waka. Ọtụtụ ezinụlọ nọ́ n’ọgbakọ ahụ bụ ndị Yukren. N’oge na-adịghị anya, mama m na papa m malitere ikwusa ozi ọma.

Ka obere oge gara, anyị kwagara British Columbia. Ụmụnna nọ́ n’ọgbakọ dị́ ebe ahụ nabatara anyị nke ọma. Obi na-atọ m ụtọ ma m cheta otú ezinụlọ anyị si akwado maka Ụlọ Nche a na-amụ ụbọchị Sọnde. Anyị niile ji nwayọọ nwayọọ na-ahụkwu Jehova na eziokwu Baịbụl n’anya. M hụrụ otú ndụ anyị si na-aka mma nakwa otú Jehova si na-agọzi anyị.

 I kwesịrị ịghọta na ọ dịghịrị anyị bụ́ ụmụaka mfe ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere. Ma, ihe nyeere mụ na Eva bụ́ nwanne m nwaanyị aka bụ na anyị na-amụ aro a tụrụ banyere otú a ga-esi ezi mmadụ ozi ọma n’ọnwa ọ bụla, jiri ya mee ihe ngosi ná Nzukọ Ije Ozi. N’agbanyeghị na ihere na-eme anyị, ọ bụ ọmarịcha ụzọ anyị si mụta ịgwa ndị mmadụ banyere Baịbụl. Obi dị m ezigbo ụtọ n’otú e si kụziere anyị ikwusa ozi ọma.

Ihe ọzọ na-eme anyị obi ụtọ mgbe anyị na-eto bụ na ndị nọ́ n’ozi oge niile na-anọkarị n’ụlọ anyị. Dị ka ihe atụ, ọ na-atọ anyị ụtọ mgbe onye nlekọta sekit anyị bụ́ Jack Nathan na-anọ n’ụlọ anyị ma ọ bịa ileta ọgbakọ anyị. * Akụkọ ndị ọ na-akọrọ anyị na-atọgbu anyị atọgbu. Otú o sikwa aja anyị mma mere ka anyị kpebie iji obi anyị niile na-efe Jehova.

M chetara mgbe m nọ na-eche, sị, “M chọrọ ịdị ka Nwanna Nathan ma m too.” Aghọtaghị m mgbe ahụ na m si n’aka ya na-amụta otú m ga-esi jiri ndụ m niile jeere Jehova ozi. Mgbe m dị afọ iri na ise, m kpebiri ife Jehova. N’afọ 1942, e mere mụ na Eva baptizim.

ỌNWỤNWA NDỊ BỊAARA M

Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, ịhụ mba n’anya nọ na-agba ndị mmadụ ara. Otu onye nkụzi chụpụrụ ụmụnne m atọ n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ekweghị egbupụrụ ọkọlọtọ. Ọ gwakwara onye nkụzi anyị ka ọ chụpụ m. Ma, onye nkụzi anyị sịrị ya, “Anyị bi n’obodo ebe onye ọ bụla nweere onwe ya ịjụ iso mee ihe e ji eto mba.” N’agbanyeghị nsogbu onye nkụzi ahụ nyere onye nkụzi anyị, ọ sịrị ya hoo haa, ‘Ekpebiela m na m gaghị achụpụ ya.’

Onye nkụzi ahụ zara ya, sị: “Mba, ọ bụghị gị ga-ekpebi ya. Ma ị́ chụpụghị Melita, m ga-agwa ndị isi.” N’agbanyeghị na onye nkụzi anyị ma na ọ dịghị mma ka a chụọ m n’ụlọ akwụkwọ, ọ gwara papa m na mama m na a ga-achụ ya n’ọrụ ma ọ bụrụ na ọ chụghị m. N’agbanyeghị na a chụrụ anyị, anyị nwetara akwụkwọ ndị anyị ga na-anọ n’ụlọ na-amụ. Mgbe obere oge gara, anyị kwagara ebe ọzọ, malitekwa ịga akwụkwọ n’ebe ahụ.

A machibidoro akwụkwọ anyị iwu n’oge ahụ a na-alụ agha. Ma, anyị ji Baịbụl na-aga ozi ụlọ n’ụlọ. O mere ka anyị mụta otú e si eji naanị Baịbụl ezi ozi ọma. O mekwara ka okwukwe anyị na-esikwu ike, anyị ana-ahụkwa otú Jehova si enyere anyị aka.

MGBE M MALITERE OZI OGE NIILE

M na-eme isi nke ọma, nwetakwa ọtụtụ ihe nrite

Ozugbo mụ na Eva gụchara akwụkwọ, anyị malitere ozi oge niile. Ebe mbụ m rụrụ ọrụ ego bụ n’ebe a na-ere nri. Ka oge na-aga, m ji ọnwa isii gaa mụọ otú e si eme isi. M nwetara ọrụ n’ebe a na-eme isi. M na-arụ ọrụ ụbọchị abụọ n’izu, jirikwa ụbọchị abụọ n’ọnwa na-akụziri ya ndị ọzọ. M si otú ahụ na-enweta ego m ji egbo mkpa m ma na-eje ozi oge niile.

N’afọ 1955, m chọrọ ịga mgbakọ “Alaeze nke Na-enwe Mmeri” na Niu Yọk, dị́ n’Amerịka nakwa na Nurembag, dị́ na Jamanị. Ma, tupu mụ agawa Niu Yọk, m hụrụ Nwanna Nathan Knorr sí n’isi ụlọ ọrụ anyị bịa. Ya na nwunye ya bịara mgbakọ na Vankuva, dị́ na Kanada. Mgbe ha bịara, a gwara m mee Nwanna Nwaanyị Knorr isi. Isi ahụ mere Nwanna Knorr obi ụtọ, ya achọọ ịhụ m. Ka mụ  na ya na-akparịta ụka, m gwara ya na m chọrọ ịga Niu Yọk tupu mụ agawa Jamanị. Ọ gwara m ka m bịa rụọ ọrụ ụbọchị itoolu na Betel dị́ na Bruklin.

Ịga ebe ahụ gbanwere ndụ m. Na Niu Yọk, m hụrụ nwa okorobịa aha ya bụ Theodore (Ted) Jaracz. Obere oge anyị hụchara, o juru m anya na ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ bụ ọsụ ụzọ oge niile?” Mụ asị ya mba. Enyi m nwaanyị aha ya bụ LaVonne nụrụ ihe m zara ya, sị ya ozugbo, “Ee, ọ bụ.” Ihe o kwuru juru Ted anya, ya ajụọ LaVonne, sị, “Olee nke m ga-ewere? Ọ̀ bụ nke gị ka ọ̀ bụ nke ya?” M kọwaara ya na m na-asụbu ụzọ, burukwa n’obi ịmalite ozugbo m si mgbakọ laghachi Kanada.

DI M ANAGHỊ EJI OZI JEHOVA EGWU EGWU

A mụrụ Ted n’afọ 1925, na Kentọki dị́ n’Amerịka. E mere ya baptizim mgbe ọ dị afọ iri na ise. N’agbanyeghị na ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile afọ abụọ ka e mechara ya baptizim. O si otú ahụ malite ozi oge niile o jere ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ isii na asaa.

N’ọnwa asaa n’afọ 1946, mgbe Ted dị afọ iri abụọ, ọ gụchara akwụkwọ na klas nke asaa n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe e mechara, ọ bụzi onye nlekọta sekit na Klivland dị́ n’Ohayo. Mgbe afọ anọ gara, e mere ya onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ dị́ n’Ọstrelia.

Ted gara mgbakọ ahụ e mere na Nurembag dị́ na Jamanị. Mụ na ya nọrịkwara. Otú ahụ ka anyị si dịwa ná mma. Obi dị m ụtọ na ihe ndị ọ na-eme gosiri na o kpebiri iji ndụ ya niile jeere Jehova ozi. O ji obi ya niile efe Jehova. Ọ naghị eji ozi Jehova egwu egwu, ma ọ dị obi ebere, ya na ndị mmadụ na-adịkwa ná mma. M chọpụtara na ọ naghị achọ naanị ọdịmma onwe ya. Mgbe a gbasara mgbakọ ahụ, Ted laghachiri Ọstrelia, mụnwa alaghachi Vankuva. Ma, anyị na-edegara ibe anyị akwụkwọ ozi.

Ka Ted nọrọ ihe dị ka afọ ise n’Ọstrelia, ọ laghachiri Amerịka, mechaa bịa sụwa ụzọ na Vankuva. Obi dị m ụtọ na ndị ezinụlọ anyị hụrụ ya n’anya. Nwanne m nwoke aha ya bụ Michael ejighị m egwu egwu. Mgbe ọ bụla ọ chọpụtara na e nwere nwanna nwoke nwere mmasị n’ebe m nọ, ọ na-agwa m ka m kpachara anya. Ma, ọ raghị ahụ́ Michael na Ted abụrụ enyi. Ọ gwara m, sị, “Melita, onye a bụ ezigbo mmadụ. Jidesie ya ike. Gbalịsie ike ka ọ ghara ịhapụ gị.”

Mgbe mụ na di m lụchara n’afọ 1956, anyị ji obi ụtọ jekọọ ozi oge niile ọtụtụ afọ

Ihe Ted masịkwara m. Anyị lụrụ n’abalị iri n’ọnwa Disemba afọ 1956. Anyị sụrụ ụzọ na Vankuva nakwa na Kalịfọnịa. E mechara ziga di m ka ọ bụrụ onye nlekọta sekit na Mizuri nakwa n’Akansas. Ruo ihe dị ka afọ iri na asatọ, anyị na-ehi n’ụlọ dị iche iche kwa izu mgbe anyị na-eleta ọgbakọ ndị dị́ n’Amerịka. E nwere ọtụtụ ihe magburu onwe ha mere mgbe anyị na-eje ozi n’ebe ahụ. Mkpakọrịta anyị na ụmụnna anyị mekwara anyị obi ụtọ. Ihe ndị a niile mere ka ọrụ sekit tọọ anyị ụtọ n’agbanyeghị na ịkwagharị kwa izu adịghị mfe.

Ihe kacha mee ka m na-akwanyere Ted ùgwù bụ na ọ naghị eji adịm ná mma ya na Jehova egwu egwu. O ji ozi ọ na-ejere Onye kacha ihe niile elu kpọrọ ihe. Ọ na-atọ anyị ụtọ ịgụkọ Baịbụl ọnụ na ịmụkọ ya ọnụ. Tupu anyị alakpuo n’abalị, anyị na-esekpuru ala n’akụkụ ihe ndina anyị, ya ekpee ekpere. E mechaa, onye ọ bụla ekpezie nke ya. E nwee ihe na-enye Ted nsogbu n’obi, m na-ama. Ọ na-ebili, sekpuru ala ọzọ, kpetee ekpere aka n’obi ya. Otú o si ekpegara Jehova ekpere ma n’obere ihe ma ná nnukwu ihe mere ka m hụkwuo ya n’anya.

 Afọ ole na ole ka anyị lụchara, Ted kọwaara m na ya ga-amalite ịta achịcha e ji echeta ọnwụ Jizọs. Ọ sịrị m, “Ekpesiela m ekpere ike banyere ya ka obi sie m ike na ọ bụ ihe Jehova chọrọ ka m mee.” O juchaghị m anya na Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ ka o soro Kraịst chịa n’eluigwe. M weere ya na ọ bụụrụ m ihe ùgwù ịkwado otu n’ime ụmụnna Kraịst.—Mat. 25:35-40.

ỌRỤ ỌZỌ E NYERE ANYỊ

O juru anyị anya mgbe a kpọrọ Ted n’afọ 1974 ka o soro n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. A kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị́ na Bruklin. Ka Ted na-arụ ọrụ ahụ e nyere ya, m nọ na-arụ n’ebe a na-eme isi. Mgbe ụfọdụ, m na-eso ná ndị na-ehicha ụlọ.

Ihe só n’ọrụ e nyere Ted bụ ịga na-eleta alaka ụlọ ọrụ anyị ndị dị́ ná mba dị iche iche. O nwere ezigbo mmasị n’ozi ọma a na-ekwusa ná mba ndị a machibidoro ọrụ anyị iwu, dị ka ná mba ndị dị́ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. E nwere otu mgbe anyị chọsiri ike ịga ezumike na Swidin, Ted asị m: “Melita, a machibidoro ozi ọma iwu na Poland. M chọkwara ịga nyere ụmụnna ndị ebe ahụ aka.” N’ihi ya, anyị nwetara akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ ma gaa Poland. Ted na ụfọdụ ụmụnna ndị na-elekọta ọrụ anyị n’obodo ahụ nwere nnọkọ. Ha ji ụkwụ gaa ogologo ije ka onye ọ bụla ghara ịnụ ihe ha na-ekwurịta. Ụmụnna ndị ahụ ji ụbọchị anọ nwee nnọkọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma, obi dị m ụtọ ịhụ otú ọṅụ si ju Ted obi n’ihi aka o nyeere ụmụnna ndị ahụ.

Mgbe ọzọ anyị gara Poland bụ n’ọnwa Nọvemba afọ 1977. Ọ bụ ya bụ nke mbụ e zigara ndị só n’Òtù Na-achị Isi ebe ahụ. Ọ bụ Nwanna F. W. Franz, Daniel Sydlik, na Ted gara. A ka machibidoro ọrụ anyị iwu mgbe ahụ, ma ụmụnna atọ a gwara ndị nlekọta, ndị ọsụ ụzọ, na ụmụnna ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ okwu n’obodo ndị dị́ n’ebe ahụ.

Ebe Ted na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ikpe Ziri Ezi na Mọsko mgbe ndị ọchịchị Rọshịa debachara aha okpukpe anyị n’akwụkwọ

Mgbe Nwanna Milton Henschel na Ted gara Poland n’afọ na-eso ya, ha gara hụ ndị isi ọchịchị. N’oge ahụ, obi ajụrụtụwala ha n’ebe anyị nọ. N’afọ 1982, ndị ọchịchị Poland kwere ka ụmụnna anyị mee mgbakọ otu ụbọchị. N’afọ na-eso ya, e mere mgbakọ ndị ka nke ahụ. A nọ n’ụlọ ezumezu ndị a kwụrụ ụgwọ ha mee ọtụtụ n’ime ha. Mgbe a ka machibidoro ọrụ anyị iwu n’afọ 1985, ha kwere ka anyị mee mgbakọ anọ ná nnukwu ámá egwuregwu dị iche iche. N’ọnwa ise n’afọ 1989, mgbe a nọ na-ahazi otú a ga-esi mee mgbakọ ndị ka ukwuu, ndị ọchịchị Poland debara aha okpukpe anyị n’akwụkwọ ka ọ bụrụ nke iwu kwadoro. Ihe a so n’ihe kacha mee Ted obi ụtọ.

Mgbakọ distrikti e mere na Poland

 MGBE ỌRỊA BỊARA DI M

N’afọ 2007, anyị nọ na-aga Saụt Afrịka maka na a chọrọ ịrara alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ ebe ahụ nye Jehova. Mgbe anyị ruru Ịngland, Ted nwere ọbara mgbali elu, otu dọkịta agwa ya ka o cheretụ tupu ya agawa ebe ọ bụla. Mgbe Ted gbakere, anyị laghachiri Amerịka. Ka izu ole na ole gara, Ted dara strok, akụkụ aka nri ya akpọnwụọ.

Ted ji nwayọọ nwayọọ na-agbake. Ná mmalite, ọ naghị agali ọfis ya. Ma, obi dị anyị ụtọ na ọ na-ekwu okwu nke ọma. N’agbanyeghị ọrịa ahụ, ọ nọ na-agbalị ịrụ ọrụ ya. Ọ na-anọ n’ụlọ jiri fon soro ná nnọkọ ndị só n’Òtù Na-achị Isi na-enwe kwa izu.

Obi dị Ted ezigbo ụtọ maka otú ndị na-ahụ maka ahụ́ ike na Betel si nyere ya aka. O ji nwayọọ nwayọọ malite ịna-agagharị. O mere ka o nwee ike ịka na-arụ ụfọdụ n’ime ọrụ ndị e nyere ya, na-agbalịkwa ịna-enwe obi ụtọ mgbe niile.

Mgbe afọ atọ gara, ọ dara strok ọzọ ma nwụọ na Wenezdee, abalị itoolu n’ọnwa isii afọ 2010. N’agbanyeghị na m ma kemgbe na otu ụbọchị, Ted ga-ejecha ozi ya n’ụwa, otú obi si gbawaa m abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ọnwụ ya ka na-ewutekwa m. Ma, m na-ekele Jehova kwa ụbọchị maka na o mere ka m nyere Ted aka. Anyị jekọrọ ozi oge niile ihe karịrị iri afọ ise na atọ. M na-ekele Jehova maka otú Ted si nyere m aka ka mụ na Nna m nke eluigwe na-adịkwu ná mma. Ugbu a, obi siri m ike na ọrụ ọhụrụ e nyere ya na-eme ya ezigbo obi ụtọ.

OTÚ M SI NA-EDI IHE NDỊ NA-ESIRI M IKE UGBU A

Ịrụ n’ebe a na-eme isi na Betel na ịkụziri ndị ọzọ otú e si eme isi tọrọ m ụtọ nke ukwuu

Ka mụ na di m ji obi ụtọ jekọchaa ozi ọtụtụ afọ, ọ dịrịghị m mfe idi ihe ndị na-esiri m ike kemgbe ọ nwụrụ. Obi na-adị anyị ụtọ ikele ndị bịara ileta Betel na ndị si esi bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ugbu a ezigbo di m na-anọghịzi, ahụ́ esighịkwa m ike otú o siburu m, ndị mụ na ha na-akpa adịghịzi ọtụtụ. Ma, obi ka na-adị m ụtọ mgbe mụ na ụmụnna na-anọrị ma na Betel ma n’ọgbakọ anyị. Ọrụ Betel adịghị mfe. Ma, isi otú a ejere Chineke ozi na-eme m obi ụtọ. Ịga ozi ọma ka na-atọkwa m ụtọ. N’agbanyeghị na ike na-agwụ m, anaghịkwa m akwụ ọtọ ogologo oge, ịgba àmà okporo ámá na iduzi ọmụmụ Baịbụl na-eme ka ọṅụ ju m obi.

M lechaa ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa a, obi na-adị m ezigbo ụtọ ma m cheta otú mụ na ezigbo di m si jeere Jehova ozi. N’eziokwu, ngọzi Jehova emeela m ọgaranya.—Ilu 10:22.

^ para. 13 E dere akụkọ ndụ Jack Nathan n’Ụlọ Nche September 1, 1990, peeji nke 10-14.