Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2015

Olee Otú Jehova Si Egosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya?

Olee Otú Jehova Si Egosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya?

“Leenụ ụdị ịhụnanya Nna ahụ gosiri anyị.”—1 JỌN 3:1.

ABỤ: 91, 13

1. Gịnị ka Jọn onyeozi gwara anyị ka anyị chebara echiche? N’ihi gịnị?

JỌN ONYEOZI gwara anyị ka anyị chebara ịhụnanya dị́ ukwuu Jehova nwere n’ebe anyị nọ echiche. Na 1 Jọn 3:1, ọ sịrị: “Leenụ ụdị ịhụnanya Nna ahụ gosiri anyị.” Ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma banyere ịhụnanya dị́ ukwuu Jehova nwere n’ebe anyị nọ nakwa otú o si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-abịarukwu ya nso ma hụkwuo ya n’anya.

2. Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike ịghọta na Chineke hụrụ ha n’anya?

2 Ma, ụfọdụ ndị echeghị na Chineke ga-ahụli ha n’anya. Ha chere na ihe gbasara ụmụ mmadụ anaghị emetụ ya n’obi. Ha nwekwara ike iche na naanị ihe Chineke na-eme bụ inye iwu ma taa ndị nupụụrụ ya isi ahụhụ. Ozizi ụgha emeela ka ụfọdụ ndị chee na Chineke dị obi ọjọọ nakwa na mmadụ agaghị ahụli ya n’anya. E nwekwara ndị chere na Chineke hụrụ mmadụ niile n’anya n’agbanyeghị ihe ha na-eme. Ma, Baịbụl ị na-amụ emeela ka ị mata eziokwu banyere Jehova. Ị mụtala na ịhụnanya bụ àgwà ya kachanụ nakwa na o ji Ọkpara ya chụọ àjà n’ihi gị. (Jọn 3:16; 1 Jọn 4:8) Ma, otú e si zụọ gị na ebe i toro nwere ike ime ka o siere gị ike ịghọta na Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu.

3. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si hụ anyị n’anya?

 3 Olee ihe ndị gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ịghọta ihe Baịbụl kwuru jikọrọ anyị na Jehova Chineke. N’eziokwu, ọ bụ Jehova kere mmadụ niile. (Gụọ Abụ Ọma 100:3-5.) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na Adam bụ “nwa Chineke.” Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-akpọ Chineke “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Luk 3:38; Mat. 6:9) Jehova bụ Nna anyị n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ. Mmekọrịta anyị na ya dị ka nke nna na ụmụ ya. Ọ pụtara na Jehova hụrụ anyị n’anya otú ahụ ezigbo nna na-ahụ ụmụ ya.

4. (a) Olee ụdị Nna Jehova bụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya?

4 Ma, e nweghị mmadụ zuru okè. N’ihi ya, ihe ọ sọkwara ndị nna ha mee, ha agaghị ahụli ụmụ ha n’anya otú Jehova si hụ anyị n’anya. O nwedịrị ike ịna-ewute ụfọdụ ndị ma ha cheta ihe ọjọọ niile nna ha mere ha mgbe ha dị obere. Ụdị ihe ahụ na-agbawa obi. Ma, Jehova anaghị eme ụmụ ya otú ahụ. (Ọma 27:10) Ịma otú Jehova si hụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. (Jems 4:8) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ anọ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. N’isiokwu na-eso ya, anyị ga-atụle ụzọ anọ anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ya n’anya.

JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA MA NA-EGBO MKPA ANYỊ

5. Gịnị ka Pọl onyeozi gwara ndị Atens banyere Chineke?

5 Mgbe Pọl onyeozi nọ n’Atens dị́ na Gris, ọ hụrụ na ndị obodo ahụ na-efe ọtụtụ chi nakwa na ha kweere na ọ bụ chi ndị ahụ nyere ha ndụ na ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya . . . na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile. . . . Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ.” (Ọrụ 17:24, 25, 28) Jehova nyere anyị “ihe niile” ga-enyere anyị aka ịdị ndụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Chegodị banyere ụfọdụ n’ime ihe ndị o nyere anyị.

6. Olee otú ọmarịcha ụwa a si egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Chegodị banyere ọmarịcha ụwa Jehova “nyere ụmụ mmadụ.” (Ọma 115:15, 16) Ndị ọka mmụta sayensị emefuola nnukwu ego ebe ha na-achọgharị na mbara igwe ma hà ga-ahụ ebe ọzọ yiri ụwa. N’agbanyeghị na ha ahụla ọtụtụ ihe ndị Bekee na-akpọ planet, ọ na-ewute ha na ha ahụbeghị nke nwere ihe niile ga-eme ka mmadụ nwee ike ibi na ya. N’ime ihe niile Chineke kere, ụwa pụrụ iche. Ọ bụghị naanị na Jehova nyere anyị ihe niile ga-eme ka anyị dịrị ndụ, kama o kere ụwa ka ọ maa mma, dịkwa mma obibi, nke ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ na ya. (Aịza. 45:18) Ihe a niile gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya.—Gụọ Job 38:4, 7; Abụ Ọma 8:3-5.

7. Olee otú otú Chineke si kee anyị si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

7 N’agbanyeghị na Jehova kere ụwa ka ọ maa mma, ọ ma na ọ bụghị naanị ihe a na-ahụ anya ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ. Obi na-eru nwatakịrị ala ma ọ mara na nne ya na nna ya hụrụ ya n’anya, na-elekọtakwa ya. Jehova kere anyị n’oyiyi ya ka anyị nwee ike ịghọta na ọ hụrụ anyị n’anya, anyịnwa egosikwa ya na anyị hụrụ ya  n’anya. (Jen. 1:27) Jizọs kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Mat. 5:3) Jehova “na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” O doro anya na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ na-enyekwa anyị ihe niile dị́ anyị mkpa.—1 Tim. 6:17; Ọma 145:16.

JEHOVA NA-AKỤZIRI ANYỊ EZIOKWU

8. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na “Chineke nke eziokwu” hụrụ anyị n’anya?

8 Ndị bụ́ nna na-agbalịsi ike ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu ụmụ ha ma ọ bụ duhie ha n’ihi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya. Ma, ọtụtụ ndị nne na nna amaghị otú ha ga-esi zụọ ụmụ ha nke ọma n’ihi na ha na-eleghara ihe dị́ na Baịbụl anya. Ọ na-akpatakarị ọgba aghara, na-emekwa ka a ghara inwe obi ụtọ n’ezinụlọ. (Ilu 14:12) Ma, Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ọma 31:5) Ọ hụrụ ụmụ ya n’anya, obi na-adịkwa ya ụtọ ịkụziri anyị eziokwu banyere onwe ya na otú anyị ga-esi na-efe ya. Ọ na-egosikwa anyị ụzọ kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ. (Gụọ Abụ Ọma 43:3.) N’ihi ya, olee ihe Jehova kụziiri anyị nke gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu?

Ndị Kraịst bụ́ nna na-eṅomi Jehova. Ha na-akụziri ụmụ ha eziokwu Baịbụl, na-enyekwara ha aka ka ha na Nna ha nke eluigwe dị́ ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10)

9, 10. (a) Gịnị mere Jehova ji gwa anyị eziokwu banyere onwe ya? (b) Gịnị ka ọ na-akụziri anyị banyere nzube ya maka anyị?

9 Nke mbụ bụ na Jehova gwara anyị eziokwu banyere onwe ya. Ọ chọrọ ka anyị mata ya. (Jems 4:8) N’ihi ya, ọ gwara anyị aha ya. Aha ya pụtara na Baịbụl ọtụtụ ugboro karịa aha ọ bụla ọzọ. Jehova gwara anyị ụdị onye ọ bụ. Anyị leruo ihe ndị o kere eke anya, anyị ga-aghọta na ọ dị ike, marakwa ihe. (Rom 1:20) Mgbe anyị na-agụ Baịbụl, anyị na-amụta na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, hụkwa anyị n’anya nke ukwuu. Ka anyị na-amatakwu ọmarịcha àgwà ndị a Jehova nwere, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma.

10 Jehova na-akụzikwara anyị nzube ya. Ọ gwara anyị na anyị so n’ezinụlọ ya. Ọ gwakwara anyị ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme ka anyị na ndị niile nọ́ n’ezinụlọ ya dịrị n’otu, dịkwa n’udo. Baịbụl gosiri na Chineke ekeghị anyị ka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe dị́ mma na ihe dị́ njọ. (Jere. 10:23) Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala bụ ịna-erubere ya isi. Jehova kụziiri anyị eziokwu ndị a dị́ mkpa n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.

11. Olee nkwa Jehova kwere anyị nke na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

11 Ezigbo nna na-echebara ọdịnihu ụmụ ya echiche. Ọ chọrọ ka ha bie ndụ bara uru. Ma ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọtụtụ ndị jikwa ndụ ha na-achụ ihe ndị na-agaghị adịru mgbe ebighị ebi. (Ọma 90:10) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ihe Nna anyị bụ́ Jehova na-akụziri anyị abụghị naanị otú anyị ga-esi bie ndụ bara uru ugbu a, kama o kwere anyị nkwa ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.

JEHOVA NA-ADỤ ỤMỤ YA ỌDỤ, NA-ADỌKWA HA AKA NÁ NTỊ

12. Olee otú ndụmọdụ Jehova nyere Ken na Barọk si gosi na ọ hụrụ ha n’anya?

12 Mgbe Jehova hụrụ na Ken na-achọ ime ihe ọjọọ, ọ gbara mbọ inyere ya aka. Ọ jụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji na-ewe iwe dị ọkụ, gịnịkwa mere ihu gị ji gbarụọ? Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu?” (Jen. 4:6, 7) Ken egeghị Jehova ntị, ọ takwara ahụhụ si na ya pụta. (Jen. 4:11-13) N’oge ọzọ, Jehova hụrụ na  ihe na-ekwesịghị ekwesị Barọk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya, na-eche emeela ka ọ dawa mbà. N’ihi ya, ọ gwara Barọk na ihe ahụ ọ na-eche adịghị mma nakwa na o kwesịrị ịgbanwe. Barọk emeghị ka Ken. O gere Jehova ntị, Jehova echebe ya.—Jere. 45:2-5.

13. Gịnị mere Jehova ji kwe ka ọnwụnwa bịara ụfọdụ ndị ohu ya?

13 Pọl onyeozi dere, sị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị; n’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara ịbụ nwa ya ihe.” (Hib. 12:6) Ma, ịdọ mmadụ aka ná ntị abụghị naanị ịta onye ahụ ahụhụ. E nwere ụzọ dị́ iche iche e si adọ mmadụ aka ná ntị. Baịbụl gwara anyị banyere ọtụtụ ndị fere Jehova ọnwụnwa bịaara, Jehova ejiri ọnwụnwa ahụ zụọ ha, àgwà ha aka mma. Dị ka ihe atụ, mgbe ọnwụnwa siri ike bịaara Josef, Mozis, na Devid, Jehova nọnyeere ha. Ihe ndị ha mụtara nyeere ha aka mgbe Jehova nyekwuru ha ọrụ. Ka anyị na-agụ na Baịbụl otú Jehova si akwado ndị ohu ya ma na-azụ ha, anyị na-aghọta na ọ hụrụ anyị n’anya n’eziokwu.—Gụọ Ilu 3:11, 12.

14. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọjọọ, olee otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

14 Aka ná ntị Jehova na-adọ anyị na-eme ka anyị mata otú ọzọ o si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na Jehova adọọ ndị mere ihe ọjọọ aka ná ntị, ha echegharịa, ‘ọ ga-agbaghara ha mmehie ha n’ụzọ dị ukwuu.’ (Aịza. 55:7) Gịnị ka ọ pụtara? Ihe Devid kwuru banyere otú Jehova si agbaghara anyị gosiri na Jehova bụ Nna na-eme ebere. Ọ sịrị: “Onye na-agbaghara gị njehie gị dum, onye na-agwọ gị ọrịa gị niile, onye  napụtara ndụ gị n’olulu, onye kpuwere gị obiọma na ebere dị ka okpueze. Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” (Ọma 103:3, 4, 12) Ị̀ na-agbanwe ozugbo ma Jehova dọọ gị aka ná ntị ma ọ bụ dụọ gị ọdụ? Na-echeta mgbe niile na ihe mere Jehova ji adọ anyị aka ná ntị bụ na ọ hụrụ anyị n’anya.—Ọma 30:5.

JEHOVA NA-ECHEBE ANYỊ

15. Olee ihe gosiri na Jehova anaghị eji ndị ya egwu egwu?

15 Ezigbo nna na-agba mbọ echebe ndị ezinụlọ ya. Otú ahụ ka Jehova bụ́ Nna anyị na-emere anyị. Otu ọbụ abụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ na-eche mkpụrụ obi nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche; ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.” (Ọma 97:10) Dị ka ihe atụ, o doro anya na ị naghị eji anya gị egwu egwu. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova si were ndị ya. (Gụọ Zekaraya 2:8.) Chineke anaghị eji ndị ya egwu egwu.

16, 17. Olee otú Jehova sirila chebe ndị ya ma n’oge anyị a ma n’oge ochie?

16 Jehova na-ejikwa ndị mmụọ ozi ya echebe ndị ya. (Ọma 91:11) Otu mmụọ ozi chebere Jeruselem mgbe ndị Asiria bịara ibuso ndị Chineke agha. Mmụọ ozi ahụ gburu otu narị puku ndị agha Asiria na iri puku asatọ na ise n’otu abalị. (2 Eze 19:35) Mmụọ ozi napụtara Pita na Pọl na ndị ọzọ n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 5:18-20; 12:6-11) N’oge anyị a kwa, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ. N’oge na-adịbeghị anya, agha dara n’otu mba dị́ n’Afrịka. A nọ na-ezuru ihe ndị mmadụ, na-edina ụmụ nwaanyị n’ike, na-egbukwa ndị mmadụ, nke mere ka ebe niile na-agba gharaghara. N’agbanyeghị na e nweghị nwanna nwụrụnụ, ihe niile ọtụtụ ụmụnna nwere lara n’iyi. Ma, ha ghọtara na Jehova hụrụ ha n’anya nakwa na ọ na-elekọta ha. N’agbanyeghị ahụhụ niile ha tara, obi ka na-adịkwa ha ụtọ. Mgbe nwanna na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị bịara leta ha ma jụọ ha otú ha mere, ha ji ọnụ ọchị sị ya, “Nsogbu adịghị. Ekele dịrị Jehova.” Obi siri ha ike na Chineke hụrụ ha n’anya.

17 E nweekwala mgbe ụfọdụ Jehova kwere ka e gbuo ndị na-efe ya, dị ka Stivin na ndị ọzọ. Ma, ọ na-agwa ndị ohu ya niile banyere ụzọ dị́ iche iche Setan si agbalị inweta ha, sí otú ahụ na-echebe ha. (Efe. 6:10-12) Ọ na-eji Baịbụl na akwụkwọ ndị ọgbakọ ya na-ebipụta adọ anyị aka ná ntị banyere ịhụ ego n’anya, ntụrụndụ ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha, nsogbu Ịntanet na-akpata, nakwa ihe ndị ọzọ. O doro anya na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-echebekwa anyị.

IHE ÙGWÙ NA-ENWEGHỊ ATỤ

18. Olee otú obi dị gị n’ihi otú Jehova si hụ gị n’anya?

18 Ugbu a anyị tụlerela ụzọ ụfọdụ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, obi adịla anyị otú ọ dị Mozis. Mgbe o chechara banyere afọ niile o ji jeere Jehova ozi, obi siri ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jehova, sị: “Jiri obiọma gị mee ka afọ ju anyị n’ụtụtụ, ka anyị wee tie mkpu ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ ụbọchị niile nke ndụ anyị.” (Ọma 90:14) Otu n’ime ihe ùgwù anyị nwere taa bụ ịghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere obi ji dị́ anyị otú ahụ ọ dị Jọn onyeozi. Ọ sịrị: “Leenụ ụdị ịhụnanya Nna ahụ gosiri anyị.”—1 Jọn 3:1.