Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2015

‘Guzosie Ike n’Okwukwe’

‘Guzosie Ike n’Okwukwe’

“Guzosienụ ike n’okwukwe, . . . dịnụ ike.”—1 KỌR. 16:13.

ABỤ: 60, 64

1. (a) Gịnị mere Pita mgbe e nwere ebili mmiri n’Oké Osimiri Galili? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere Pita ji malite imikpu?

N’OTU abalị, Pita na ụfọdụ ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs nọ na-agbalị ịkwọrọ ụgbọ ha gafee Oké Osimiri Galili mgbe e nwere oké ebili mmiri. Na mberede, ha hụrụ Jizọs ka ọ na-aga ije n’elu oké osimiri ahụ. Pita gwara Jizọs ka ya jere ije bịakwute ya. Mgbe Jizọs sịrị ya bịawa, o si n’ụgbọ ahụ pụta, jere ije n’elu mmiri bịawa n’ebe Jizọs nọ. Ma, ọ dịghị anya, Pita amalite imikpu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o lekwasịrị anya n’ebili mmiri ahụ, ụjọ abịa ya. O tiri mkpu ka Jizọs nyere ya aka. Jizọs ejide ya aka ozugbo, sị ya: “Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”—Mat. 14:24-32.

2. Olee ihe anyị ga-atụle?

2 Ka anyị tụlee ihe atọ anyị ga-amụta gbasara okwukwe n’ihe ahụ Pita mere. Nke mbụ bụ otú Pita si nwee okwukwe ná mmalite na Chineke ga-akwado ya. Nke abụọ abụrụ ihe mere okwukwe Pita ji nyụwa ka ọkụ. Nke atọ abụrụ ihe nyeere Pita aka inweghachi okwukwe. Ịtụle ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi ‘guzosie ike n’okwukwe.’—1 Kọr. 16:13.

 NWEE OKWUKWE NA CHINEKE GA-ENYERE ANYỊ AKA

3. Gịnị mere Pita ji si n’ụgbọ ahụ pụta? Olee otú anyị si mee ihe yiri ihe ahụ o mere?

3 Pita nwere okwukwe siri ike. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Mgbe Jizọs gwara ya bịawa, o si n’ụgbọ ahụ pụta gawa ije n’elu mmiri. O nwere okwukwe na Chineke ga-enyere ya aka otú ahụ o nyeere Jizọs. Otú ahụ ka ọ dị mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova, e meekwa anyị baptizim. Ọ bụ okwukwe anyị mere anyị ji mee ya. Jizọs kpọrọ anyị ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Anyị nwere okwukwe na Jehova nakwa na Jizọs. Obi sikwara anyị ike na ha ga na-akwado anyị n’ụzọ dị iche iche.—Jọn 14:1; gụọ 1 Pita 2:21.

4, 5. Gịnị mere okwukwe ji bụrụ akụ̀ bara ezigbo uru?

4 Okwukwe bụ akụ̀ bara ezigbo uru. Okwukwe Pita mere ka o jee ije n’elu mmiri. Otú ahụkwa ka okwukwe anyị si enyere anyị aka ime ihe mmadụ nwere ike iche na ọ gaghị ekwe omume. (Mat. 21:21, 22) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime anyị agbanweela otú anyị si eche echiche na otú anyị si akpa àgwà nke na ọ na-esiri ndị mabu anyị ike ịmata anyị. Anyị mere otú ahụ n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya. O nyekwaara anyị aka ime ya. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:5-10.) Ozugbo okwukwe anyị mere ka anyị rara onwe anyị nye Jehova, anyị ghọrọ enyi ya. Anyị agaaraghị eme otú ahụ ma á sị na o nyereghị anyị aka.—Efe. 2:8.

5 Okwukwe anyị na-eme ka anyị sie ike. Dị ka ihe atụ, ọ na-enyere anyị aka ịlụso Ekwensu, bụ́ onye iro anyị dị́ ike, ọgụ. (Efe. 6:16) Ịtụkwasị Jehova obi na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị ma nsogbu bịara anyị. Jehova kwuru na ya ga na-egbo mkpa anyị ma ọ bụrụ na okwukwe anyị emee ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze ya. (Mat. 6:30-34) Okwukwe anyị ga-emekwa ka anyị nweta ndụ ebighị ebi, nke bụ́ onyinye mmadụ ọ bụla na-agaghị enwetali n’ike nke aka ya.—Jọn 3:16.

OKWUKWE ANYỊ GA-ANYỤ KA ỌKỤ MA ANYỊ KWỤSỊ ILEKWASỊ JIZỌS ANYA

6, 7. (a) Gịnị ka e nwere ike iji tụnyere oké ifufe na ebili mmiri ahụ mere ka Pita tụọ ụjọ? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịghọta na okwukwe anyị nwere ike ịnyụ ka ọkụ?

6 Ka Pita na-eje ije n’elu Oké Osimiri Galili, ụjọ bịara ya. N’ihi gịnị? N’ihi oké ifufe na ebili mmiri. E nwere ike iji ha tụnyere ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara Ndị Kraịst. Ọ bụrụgodị na nsogbu ndị a siri ezigbo ike, Jehova ga-enyere anyị aka ịkwụrụ chịm. Ma, cheta na ọ bụghị oké ifufe na ebili mmiri mere ka Pita malite imikpu. Kama Baịbụl sịrị: “Mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya.” (Mat. 14:30) Okwukwe Pita malitere ịnyụ ka ọkụ mgbe ọ kwụsịrị ile Jizọs anya, lekwasịzie anya n’ebili mmiri ahụ. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime anyị. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya ná nsogbu bịaara anyị, anyị nwere ike inwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-enyere anyị aka.

7 Anyị kwesịrị ịghọta na okwukwe anyị nwere ike ịnyụ ka ọkụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Baịbụl kwuru na enweghị okwukwe bụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.” (Hib. 12:1) Ihe ahụ mere Pita gosiri na okwukwe anyị nwere ike ịnyụwa ka ọkụ ma anyị lekwasị anya n’ihe na-ekwesịghị ekwesị. Olee otú anyị ga-esi mata ma okwukwe anyị ọ̀ nyụwala ka ọkụ? Ka anyị tụlee ajụjụ ụfọdụ ga-enyere anyị aka ichebara onwe anyị echiche.

8. Gịnị nwere ike ime ka obi ghara isi anyị ike na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere otú ahụ o siri anyị mgbe mbụ?

8 Obi ọ̀ ka siri m ike na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere otú ahụ o siri m mgbe mbụ? Dị ka ihe atụ, Chineke kwere nkwa na ọ ga-ebibi ụwa ochie a. Ma, ụdị ntụrụndụ dị́ iche iche dị́ n’ụwa taa  hà na-emegharị anyị anya? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị nwere ike inwewe obi abụọ ma ọgwụgwụ ụwa ochie a ọ̀ dịla nso n’eziokwu. (Hab. 2:3) Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Chineke kwere nkwa na ọ ga-agbaghara anyị n’ihi àjà Jizọs chụrụ. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga, o nwere ike imewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ gbagharala anyị n’eziokwu. (Ọrụ 3:19) Ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe ọṅụ n’ozi Chineke, meekwa ka anyị kwụsị izi ndị ọzọ ozi ọma.

9. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị niile na-achụ ihe nke aka anyị?

9 M̀ ka na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova otú m na-emebu? Ihe Pọl kwuru gosiri na ịrụsi ọrụ Jehova ike ga-eme ka anyị “nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.” Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ji ike anyị niile na-achụ ihe nke aka anyị? Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikweta ịrụwa ọrụ a na-akwụ anyị ezigbo ụgwọ na ya, ma ya abụrụ na ọ na-eme ka anyị ghara ịna-enwe efe maka ofufe Chineke. O nwere ike ime ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ, anyị adịzie umengwụ, ozi anyị na-ejere Jehova abụrụzie ma efe pụta.—Hib. 6:10-12.

10. Olee otú ịgbaghara ndị ọzọ si egosi na anyị nwere okwukwe na Jehova?

10 Ọ̀ na-esiri m ike ịgbaghara ndị ọzọ? Ndị ọzọ mejọọ anyị, ànyị na-eburu ha iwe n’obi ma ọ bụ kwụsị ịtụpụrụ ha ọnụ? Ime otú ahụ ga-egosi na anyị na-eche banyere naanị otú obi dị anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaghara ha, ọ ga-egosi na anyị nwere okwukwe na Jehova. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị, ọ dị ka à ga-asị na onye ahụ ji anyị ụgwọ. Anyịnwa mejọọ Chineke, anyị jikwa ya ụgwọ. (Luk 11:4) Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, ọ ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-agọzi anyị. Ngọzi ya ga-abara anyị  uru karịa ịchọwa otú anyị ga-esi megwara onye mejọrọ anyị. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ọ bụ okwukwe ga-eme ka ha na-agbaghara ndị ọzọ. Mgbe Jizọs gwara ha ka ha na-agbaghara ọbụna ndị mejọrọ ha ọtụtụ ugboro, ha rịọrọ ya, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe.”—Luk 17:1-5.

11. Gịnị nwere ike ime ka ndụmọdụ ghara ịbara anyị uru?

11 Iwe ọ̀ na-ewe m ma é nye m ndụmọdụ? Kama ichewe otú ndụmọdụ ahụ ga-esi baara anyị uru, anyị nwere ike ilekwasị anya n’ihe onye ahụ na-emejọ ma ọ bụ n’ihe ọ na-ekwuteghị. (Ilu 19:20) Ọ ga-eme ka anyị ghara iji ohere ahụ mụta ile ihe anya otú Jehova si ele ya.

12. Ọ bụrụ na mmadụ na-atamu ntamu megide ndị Jehova ji eduzi ọgbakọ ya, olee ihe ọ na-egosi?

12 M̀ na-atamu ntamu megide ndị Jehova ji eduzi ọgbakọ ya? Mgbe ndị Izrel lekwasịrị anya n’ihe ọjọọ ndị nledo iri kọọrọ ha, ha malitere ịtamu ntamu megide Mozis na Erọn. Jehova jụrụ Mozis, sị: ‘Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ na-abụ ndị na-enweghị okwukwe n’ebe m nọ?’ (Ọnụ Ọgụ. 14:2-4, 11) O doro anya na ntamu ndị Izrel tamuru gosiri na ha atụkwasịghị Chineke obi, bụ́ onye họpụtara Mozis na Erọn. Otú ahụ ka ọ dị taa. Ọ bụrụ na anyị na-atamu ntamu megide ndị Chineke ji na-eduzi ndị ya, ọ́ gaghị egosi na okwukwe anyị esighịzi ike?

13. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịda mbà ma anyị chọpụta na okwukwe anyị esighịzi ike?

13 I chebarachaa ajụjụ ndị a echiche, adala mbà ma ị́ chọpụta na okwukwe gị esighịzi ike. Cheta na Pita tụrụ ụjọ, nweekwa obi abụọ. Jizọs nyekwara ndịozi ya niile ndụmọdụ mgbe ụfọdụ n’ihi na ha bụ “ndị okwukwe nta.” (Mat. 16:8) Cheta na ihe dị́ mkpa anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Pita mere bụ ihe o mere mgbe o nwere obi abụọ ma malite imikpu n’oké osimiri ahụ.

LEKWASỊ JIZỌS ANYA KA O MEE KA OKWUKWE GỊ SIE IKE

14, 15. (a) Gịnị ka Pita mere mgbe ọ malitere imikpu n’oké osimiri ahụ? (b) Ebe ọ bụ na anyị agaghị ahụli Jizọs anya, olee otú anyị ga-esi ‘legide ya anya’?

14 Mgbe Pita lekwasịrị ebili mmiri ahụ anya, ọ gaara egwuru mmiri laghachi n’ụgbọ mmiri ahụ. Ọ ma otú e si egwu mmiri. O nwedịrị ike ịgbata ya n’obi. (Jọn 21:7) Ma, kama ịtụkwasị onwe ya obi, o lekwasịrị Jizọs anya ma kwe ka o nyere ya aka. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na okwukwe anyị anyụwala ka ọkụ, anyị kwesịrị ime ka Pita. Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya?

15 Cheta na Pita lekwasịrị Jizọs anya ka o nyere ya aka. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ‘ilegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.’ (Gụọ Ndị Hibru 12:2, 3.) Ma anyị agaghị ejili anya nkịtị hụ Jizọs otú ahụ Pita hụrụ ya. Oleezi otú anyị ga-esi elegide ya anya? Ọ bụ ịmụ ihe ndị ọ kụziri na ihe ndị o mere ma na-agba mbọ iṅomi ya. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-enwe ike ime ka okwukwe anyị sie ike. Ka anyị leba anya n’ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi ṅomie Jizọs.

Ilekwasị Jizọs anya na iṅomi ya ga-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

16. Olee otú ịmụ Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ka okwukwe anyị sikwuo ike?

16 Tụkwasịkwuo Baịbụl obi. Obi siri Jizọs ike na Akwụkwọ Nsọ bụ Okwu Chineke nakwa na ọ na-enye anyị ndụmọdụ ga-akacha baara anyị uru. (Jọn 17:17) Otú anyị ga-esi gosi na anyị na-eme ka Jizọs bụ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-amụ ya ma na-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ. Ihe ọzọ anyị kwesịrị ime bụ ịna-eme nchọnchọ n’ihe ndị na-edoghị anyị anya. Dị ka ihe atụ, obi ò siri gị ike na anyị bi n’oge ikpeazụ? Mụọ banyere amụma Baịbụl ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ ka okwukwe gị sikwuo ike na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Ị̀ chọrọ ime ka obi  sikwuo gị ike na Chineke ga-emezu nkwa ya n’ọdịnihu? Ọ bụrụ otú ahụ, mụọ banyere amụma Baịbụl ndị mezurula. Ì kwetara na ihe Baịbụl kwuru bara uru taa? I nwere ike ịgụ banyere ụmụnna ndị Baịbụl nyeere aka ịgbanwe ndụ ha. *1 Tesa. 2:13.

17. Gịnị nyeere Jizọs aka idi ọnwụnwa niile bịaara ya? Olee otú i nwere ike isi ṅomie ya?

17 Lekwasị anya ná ngọzi ndị Jehova kwere anyị ná nkwa. Jizọs lekwasịrị anya ‘n’ọṅụ e debere n’ihu ya.’ Ọ bụ ihe nyeere ya aka idi ọnwụnwa niile bịaara ya. (Hib. 12:2) O kweghị ka ihe ndị dị́ n’ụwa megharịa ya anya. (Mat. 4:8-10) Olee otú i nwere ike isi ṅomie Jizọs? Ọ bụ ịtụgharị uche n’ọmarịcha nkwa ndị Jehova kwere anyị. Were ya na ị nọ n’ụwa ọhụrụ. Dee ihe ndị ị ga-achọ ime na Paradaịs ma ọ bụ see ha ese. Dee aha ndị ị ga-achọ ịhụ ma a kpọlite ha n’ọnwụ nakwa ihe ị ga-achọ ka gị na ha kpaa. Were ya na ọ bụ gịnwa ka Chineke kwere nkwa ndị ahụ niile.

18. Olee otú ekpere ga-esi nyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike?

18 Rịọ Chineke ka o nyekwuo gị okwukwe. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha rịọ Jehova ka o nye ha mmụọ nsọ. (Luk 11:9, 13) Ka ị na-arịọ Jehova mmụọ nsọ ya, rịọkwa ya ka o nyekwuo gị okwukwe, nke só ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Kpọọrọ Chineke okwu aha n’ekpere. Dị ka ihe atụ, ị́ chọpụta na ọ na-esiri gị ike ịgbaghara ndị ọzọ, rịọ Jehova ka o mee ka okwukwe gị sie ike nakwa ka o nyere gị aka ka ị na-agbaghara ndị ọzọ.

19. Olee otú anyị ga-esi meta ezigbo enyi?

19 Meta ndị okwukwe ha siri ike enyi. Jizọs kpachapụrụ anya ná ndị o metara enyi. Ndịozi ya bụ ndị nwere okwukwe, jirikwa obi ha niile na-erubere ya isi. (Gụọ Jọn 15:14, 15.) Ṅomie Jizọs ma kpachara anya n’ụdị ndị ị na-emeta enyi. Ha kwesịrị ịbụ ndị nwere okwukwe siri ike na ndị na-erubere Jizọs isi. Cheta na otu n’ime ihe e ji ama onye bụ́ ezigbo enyi bụ na ọ ga na-agwa enyi ya eziokwu, ma mgbe ọ na-enye ya ndụmọdụ ma mgbe ọ bụ yanwa ka a na-enye ndụmọdụ.—Ilu 27:9.

20. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-eme ka okwukwe ndị ọzọ sie ike?

20 Nyere ndị ọzọ aka ka okwukwe ha sie ike. Ihe Jizọs kwuru na ihe o mere nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ime ka okwukwe ha sie ike. (Mak 11:20-24) Anyị kwesịrị ime ka Jizọs. Ọ bụrụ na anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka okwukwe ha sie ike, okwukwe anyị ga na-esikwa ike. (Ilu 11:25) Olee otú ị ga-esi nyere ndị ị na-ezi ozi ọma aka? Ma mgbe ị na-ezi mmadụ ozi ọma ma mgbe ị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, kwuo ihe ndị gosiri na Chineke dị, na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi nakwa na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụnna aka ka okwukwe ha sie ike? Ị́ chọpụta na nwanna na-atamukarị ntamu megide ndị na-edu ndú n’ọgbakọ, ihe ị ga-eme abụghị izewe ya eze ozugbo. Kama, jiri akọ nyere ya aka ka okwukwe ya sie ike. (Jud 22, 23) Ọ bụrụ na ị ka na-aga akwụkwọ, a kụziwere unu na mmadụ si n’enwe pụta, jiri obi ike kwuo ihe i kweere banyere okike. I mee otú ahụ, ihe onye nkụzi unu na ụmụ klas unu ga-eme nwere ike iju gị anya.

21. Olee nkwa Jehova kwere onye ọ bụla n’ime anyị?

21 Chineke si n’aka Jizọs mee ka Pita kwụsị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ. Pita mechara bụrụ onye ndị ọzọ si n’aka ya mụta inwe okwukwe siri ike. Jehova na-enyekwara anyị niile aka ka okwukwe anyị sie ike otú o nyeere Pita. (Gụọ 1 Pita 5:9, 10.) Mbọ ọ bụla anyị na-agba iji mee ka okwukwe anyị sie ike agaghị ala n’iyi n’ihi na otú Jehova ga-esi gọzie anyị enweghị atụ.

^ para. 16 Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agbakarị n’Ụlọ Nche ọhaneze.