Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2015

Zere Mkpakọrịta Ọjọọ n’Oge Ikpeazụ A

Zere Mkpakọrịta Ọjọọ n’Oge Ikpeazụ A

“Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”1 KỌR. 15:33.

ABỤ: 73, 119

1. Olee oge anyị bi na ya?

ANYỊ bi n’oge siri ezigbo ike nke Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ.” Oge a “dị oké egwu, nke tara akpụ,” malitere n’afọ 1914. Kemgbe ahụ, ihe ndị na-eme n’ụwa adịla njọ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (2 Tim. 3:1-5) Ma, ihe ndị na-eme n’ụwa ka ga na-aka njọ n’ihi na Baịbụl buru amụma na “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ.”2 Tim. 3:13.

2. Gịnị ka ndị mmadụ ji atụrụ ndụ n’ụwa taa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Ihe ọtụtụ ndị ji atụrụ ndụ bụ ile ma ọ bụ ime ihe Baịbụl kwuru na ọ dịghị mma, dị ka ime ihe ike, omume rụrụ arụ, mgbaasị, ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Ịntanet, tiivi, fim, na akwụkwọ ọgụgụ na-emekarị ka ime ihe ike na omume rụrụ arụ yie ihe dị mma. Iwu obodo ụfọdụ na-akwadozi omume ndị mmadụ na-asọbu oyi. Ma, ọ pụtaghị na ụdị omume ahụ dịzi Chineke mma.Gụọ Ndị Rom 1:28-32.

3. Olee otú ndị mmadụ si ele ndị na-erubere iwu Chineke isi anya?

Ndị Kraịst oge mbụ ejighị ihe ndị na-adịghị mma na-atụrụ  ndụ. Ndị mmadụ kwutọrọ ha, kpagbuokwa ha n’ihi na ha na-erubere iwu Chineke isi. Pita onyeozi dere, sị: “Ebe ọ bụ na unu esoghị ha na-ebi ndụ ịla n’iyi a, ọ na-eju ha anya, ha ewee na-ekwujọ unu.” (1 Pita 4:4) Taakwa, ndị ụwa na-ewere ndị na-erubere iwu Chineke isi ka ndị gbapụrụ iche. Baịbụl kwukwara na ‘a ga-akpagbu ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.’2 Tim. 3:12.

“MKPAKỌRỊTA ỌJỌỌ NA-EMEBI ÀGWÀ ỌMA”

4. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịhụ ụwa n’anya?

4 Baịbụl gwara ndị chọrọ ime uche Chineke ka ha ghara ịhụ “ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.” (Gụọ 1 Jọn 2:15, 16.) Ọ bụ Setan, bụ́ “chi nke usoro ihe a,” na-achị ụwa a. Ọ na-eji okpukpe dị iche iche, ndị ọchịchị, ndị ọchụnta ego, nakwa ụlọ ọrụ mgbasa ozi eduhie ndị mmadụ. (2 Kọr. 4:4; 1 Jọn 5:19) N’ihi ya, anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị izere mkpakọrịta ọjọọ. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”1 Kọr. 15:33.

5, 6. Olee ndị anyị na ha na-ekwesịghị ịna-akpakọrịta? N’ihi gịnị?

5 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova na-adị ná mma, anyị na ndị na-akpa àgwà ọjọọ ekwesịghị ịna-akpa. Ndị a na-ekwu maka ha abụghị naanị ndị na-ekweghị ekwe na-akpa àgwà ọjọọ, kamakwa ndị sịrị na ha na-efe Jehova ma kpachara anya na-emebi iwu ya. Ọ bụrụ na ụdị ndị ahụ emee mmehie dị oké njọ ma jụ ichegharị, anyị na-ezere ha.Rom 16:17, 18.

6 Ọ bụrụ na anyị na ndị na-anaghị erubere Chineke isi ana-akpakọrịta, anyị nwere ike isoro ha mewe ihe ha na-eme ka ha nwee ike nabata anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na ndị na-eme omume rụrụ arụ na-akpakọrịta, anyị nwere ike imewe omume rụrụ arụ. Ụdị ihe a emeela ụfọdụ ụmụnna anyị, a chụọkwala ụfọdụ n’ọgbakọ n’ihi na ha ekweghị echegharị. (1 Kọr. 5:11-13) Ọ bụrụ na ha echegharịghị, ọnọdụ ha nwere ike ịdịzi ka nke ndị ahụ Pita kwuru gbasara ha.Gụọ 2 Pita 2:20-22.

7. Olee ndị anyị kwesịrị imeta enyi?

7 N’agbanyeghị na anyị kwesịrị ịna-emere mmadụ niile ihe ọma, anyị na ndị na-anaghị erubere Chineke isi ekwesịghị ịbụ enyi. N’ihi ya, é nwee onye a na-emebeghị baptizim, ya bụ, onye na-anaghị efe Jehova ma ọ bụ onye na-anaghị erubere iwu ya isi, ọ gaghị adị mma ka ya na Onyeàmà Jehova na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kpawa. Ime ihe dị Chineke mma dị mkpa karịa ịchọwa otú ndị na-ahụghị Chineke n’anya ga-esi lewe anyị anya ọma. Ndị anyị kwesịrị imeta enyi bụ naanị ndị na-eme uche Chineke. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme uche Chineke, ọ bụ ya bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.”Mak 3:35.

8. Gịnị ka mkpakọrịta ọjọọ kpataara ndị Izrel?

8 Ihe mere ndị Izrel gosiri na mkpakọrịta ọjọọ na-akpata nsogbu. Mgbe Jehova napụtara ha n’ohu ha nọ na-agba n’Ijipt ma duru ha na-aga Ala Nkwa, ọ dọrọ ha aka ná ntị banyere ndị bi n’ala ahụ, sị: “Akpọrọla chi ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, emekwala ihe ọ bụla ga-eyi ihe niile ha rụrụ, kama ị ghaghị ịkwatu ha, ị ghaghịkwa ịkụtu ogidi nsọ ha. Jeerenụ Jehova bụ́ Chineke unu ozi.” (Ọpụ. 23:24, 25)  Ma, ọtụtụ ndị Izrel erubereghị iwu ahụ Chineke nyere ha isi. (Ọma 106:35-39) Ebe ọ bụ na ha nupụụrụ Chineke isi, Jizọs sịrị ha: “Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Mat. 23:38) Jehova jụrụ ndị Izrel ma họrọzie ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha bụrụ ndị ya.Ọrụ 2:1-4.

KPACHARA ANYA N’ỤDỊ IHE Ị NA-AGỤ NA IHE Ị NA-ELE

9. Gịnị mere ọtụtụ n’ime ihe e ji agbasa ozi n’ụwa a ji dị njọ?

9 Ọtụtụ n’ime ihe e ji agbasa ozi n’ụwa a, dị ka tiivi, Ịntanet, na akwụkwọ ọgụgụ, nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. E meghị ihe ndị ahụ ka ha nyere Ndị Kraịst aka inwe okwukwe na Jehova nakwa ná nkwa ya. Kama, ha na-akwado ụwa ọjọọ Setan ma na-eme ka ndị mmadụ tụkwasị ya obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ile ma ọ bụ gụọ ma ọ bụ gere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị nwewe “ọchịchọ nke ụwa.”Taị. 2:12.

10. Gịnị ga-eme ihe niile ụwa Setan ji akụziri ndị mmadụ ihe ọjọọ?

10 N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ụwa Setan na ihe niile o ji akụziri ndị mmadụ ihe ọjọọ, ma ndị a na-agụ agụ ma ndị a na-ele ele. Baịbụl sịrị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Otu ọbụ abụ sịkwara: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Ruo ole mgbe? “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”Ọma 37:9, 11, 29.

11. Olee otú Chineke si enyere anyị aka iji obi anyị niile na-efe ya?

11 Nzukọ Jehova anaghị eme ka ụwa Setan. Ihe ndị ọ na-ewepụta n’oge ikpeazụ a na-enyere ndị mmadụ aka ịna-akpa àgwà ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. Jizọs kpegaara Jehova ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Nna anyị nke eluigwe ji nzukọ ya na-enye anyị ihe niile ga-eme ka anyị mata ya. Dị ka ihe atụ, anyị nwere Ụlọ Nche, Teta!, broshọ, akwụkwọ ndị ọzọ, vidio, na ihe ndị dị n’Ịntanet na-enyere anyị aka ịna-ejere Chineke ozi. Nzukọ ya na-ahazikwa ọmụmụ ihe a na-enwe kwa izu n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri n’ụwa niile. Ihe e ji Baịbụl akụziri anyị n’ọmụmụ ihe ndị ahụ nakwa ná mgbakọ dị iche iche na-eme ka okwukwe anyị nwere na Jehova nakwa ná nkwa ya sie ike.Hib. 10:24, 25.

LỤỌ “NAANỊ N’IME ONYENWE ANYỊ”

12. Kọwaa ndụmọdụ Baịbụl ahụ bụ́ lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.”

12 Ndị Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịkpachara ezigbo anya n’ụdị ndị ha na ha na-akpa. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu? Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?” (2 Kọr. 6:14) Baịbụl dụkwara Ndị Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ọdụ ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị,” ya bụ, ka ha lụọ naanị onye raara onwe ya nye Chineke, e mee ya baptizim, ya ana-erubekwara iwu Jehova isi. (1 Kọr. 7:39) Ọ bụrụ na ị lụọ ụdị  onye ahụ, ya bụ, onye hụrụ Jehova n’anya, onye ahụ ga-enyere gị aka iji obi gị niile na-efe Chineke.

13. Olee iwu Chineke nyere ndị Izrel banyere alụmdi na nwunye?

13 Jehova ma ihe ga-akacha baara ndị ohu ya uru. Ọ na-agwa anyị mgbe niile ihe ọ chọrọ ka anyị mara banyere alụmdi na nwunye. Cheta iwu doro anya o si n’aka Mozis nye ndị Izrel. Mba ndị gbara ha gburugburu anaghị efe Chineke. Jehova si n’ọnụ Mozis gwa ha, sị: “Gị na ha agọkwala ọgọ. Akpọrọla nwa gị nwaanyị kpọnye nwa ya nwoke, alụtarala nwa gị nwoke nwa ya nwaanyị. N’ihi na ọ ga-eme ka nwa gị nwoke kwụsị iso m, ha ga-efekwa chi ọzọ dị iche iche; Jehova ga-ewesokwa unu iwe dị ọkụ, ọ ga-alakwa gị n’iyi ọsọ ọsọ.”Diut. 7:3, 4.

14, 15. Gịnị mere Sọlọmọn n’ihi na o leghaara iwu Jehova anya?

14 Mgbe nwa Devid bụ́ Sọlọmọn malitere ịchị Izrel, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe. Jehova nyekwara ya amamihe n’ụba. Ọ bụ ya mere Eze Sọlọmọn ji bụrụ eze a ma ama maara ihe. Ihe gakwaara ndị Izrel nke ọma mgbe ọ na-achị. Mgbe eze nwaanyị Shiba letara Sọlọmọn, ihe ọ hụrụ juru ya anya. O wee sị: “Ekwetaghị m ihe e kwuru ruo mgbe m bịara ka m jiri anya m hụ; ma, lee! a gwarughị m ọkara ya. Amamihe na ịba ụba gị akarịwo ihe a na-anụ bụ́ nke m nụkwara.” (1 Eze 10:7) Ma, ihe Sọlọmọn mechara mee na-akụziri anyị ihe nwere ike ime mmadụ ma o leghara iwu Chineke anya lụọ onye na-anaghị efe Jehova.Ekli. 4:13.

15 N’agbanyeghị ihe ọma niile Chineke meere Sọlọmọn, o leghaara iwu ahụ Chineke nyere anya. Sọlọmọn ‘hụrụ ọtụtụ nwunye si mba ọzọ n’anya.’ O mechara lụọ narị ụmụ nwaanyị asaa, nweekwa narị ndị iko atọ. Gịnị ka ọ kpataara ya? Mgbe Sọlọmọn mere agadi, ndị nwunye ya bụ́ ndị na-ekpere arụsị “mere ka obi ya chigharịa soro chi ọzọ dị iche iche, . . . Sọlọmọn wee malite ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.” (1 Eze 11:1-6) Mkpakọrịta ọjọọ mere ka Sọlọmọn mee iberiibe, meekwa ka ọ kwụsị ife Jehova. Ọ bụrụ na ụdị ihe a mere Sọlọmọn, o nwere ike ime onye ọ bụla. Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst ekwesịghị ichewe echiche ịlụ onye na-anaghị efe Jehova.

16. Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere onye di ya ma ọ bụ nwunye ya na-abụghị Onye Kraịst?

16 Gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ lụọla di ma ọ bụ nwunye tupu ya abụrụ Onyeàmà Jehova? Baịbụl kwuru, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke.” (1 Pita 3:1) Ọ bụ ụmụnna nwaanyị ka Pọl gwara okwu ahụ, ma ọ gbasakwara ụmụ nwoke ndị nwunye ha na-abụghị Ndịàmà Jehova. Ndụmọdụ doro anya Baịbụl nyere bụ: Bụrụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye, na-emekwa ihe Chineke gwara di na nwunye ka ha na-eme. Ọtụtụ ndị aghọọla Ndịàmà Jehova n’ihi na ha hụrụ otú di ha ma ọ bụ nwunye ha si gbanwee mgbe ọ malitere ime ihe Baịbụl kwuru.

NA-EMETA NDỊ HỤRỤ JEHOVA N’ANYA ENYI

17, 18. Gịnị mere Noa ji lafere Iju Mmiri? Olee ihe nyeere Ndị Kraịst oge mbụ aka ịlanahụ mbibi Jeruselem?

17 Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma. Ma, mkpakọrịta anyị na ndị bụ́  ezigbo mmadụ na-aba uru. Chegodị banyere Noa. O biri n’ụwa mgbe ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma o metaghị ndị ahụ enyi. N’oge ahụ, “Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.” (Jen. 6:5) N’ihi ya, Chineke kpebiri iji Iju Mmiri bibie ụwa ọjọọ ahụ. Ma, “Noa bụ onye ezi omume. Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ. Noa so ezi Chineke jee ije.”Jen. 6:7-9.

18 O doro anya na Noa na ndị na-anaghị efe Jehova akpakọrịtaghị. Ya na ndị ezinụlọ ya nọ na-arụ ụgbọ Chineke gwara ya rụọ. Noa bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Noa, nwunye ya, ụmụ ya atọ, na ndị nwunye ha nọ na-akpakọrịta. Ha mere ihe Chineke chọrọ. Ọ bụ ya mere ha ji lafere Iju Mmiri ahụ. Anyị niile dị́ ndụ taa si n’agbụrụ ha. N’ihi ya, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ maka na Noa na ndị ezinụlọ ya rubeere Jehova isi ma zere mkpakọrịta ọjọọ. Otú ahụkwa ka Ndị Kraịst oge mbụ mere. Ha na ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke akpakọrịtaghị. N’ihi ya, ọkọ akọghị ha mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 70.Luk 21:20-22.

Anyị na ụmụnna anyị ịna-akpakọrịta ga-eme ka anyị ghọta otú ụwa ọhụrụ ga-adị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-erubere Chineke isi?

19 Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị kwesịrị ime ihe ahụ Noa na ndị ezinụlọ ya na Ndị Kraịst oge mbụ mere. Anyị na onye ọ bụla na-ahụghị Jehova n’anya anaghị akpakọrịta. E nwere ọtụtụ nde ụmụnna anyị ndị anyị nwere ike imeta enyi. Ọ bụrụ na ndị anyị na-emeta enyi bụ ndị na-erubere Chineke isi, ọ ga-eme ka anyị ‘guzosie ike n’okwukwe’ n’oge a siri ezigbo ike. (1 Kọr. 16:13; Ilu 13:20) Chegodị ihe magburu onwe ya anyị na-atụ anya ya. Ọ bụrụ na anyị ezere mkpakọrịta ọjọọ n’oge ikpeazụ a, anyị nwere ike ịlafere mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a ma banye n’ụwa ọhụrụ Jehova nke dị ezigbo nso ugbu a.