Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2015

Na-atụ Anya Ya

Na-atụ Anya Ya

“Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya.”HAB. 2:3.

ABỤ: 128, 45

1, 2. Gịnị ka ndị ohu Jehova na-eme kemgbe ụwa?

KEMGBE ụwa, ndị na-efe Jehova na-atụ anya ka amụma ndị o buru mezuo. Dị ka ihe atụ, Jeremaya buru amụma na ndị Babịlọn ga-ebibi Juda, ya emezuo n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Jere. 25:8-11) Aịzaya buru amụma na Jehova ga-eme ka ndị Juu laghachi Juda. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị niile na-atụ anya ya.” (Aịza. 30:18) Maịka bukwara amụma banyere ndị Chineke n’oge ochie. O kpebiri na ya “ga na-ele anya Jehova.” (Maị. 7:7) Ruo ọtụtụ narị afọ, obi siri ndị Chineke ike na amụma ndị e buru banyere Mesaya ga-emezu.Luk 3:15; 1 Pita 1:10-12. *

Ndị na-efe Chineke taa na-atụkwa anya ka amụma ndị e buru banyere Alaeze Jehova mezuchaa. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eji Alaeze Mesaya bibie ndị ọjọọ ma napụta ndị ya n’ụwa ochie a dị́ n’aka Setan. Ọ ga-emekwa ka ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kwụsị. (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ka anyị mụrụ anya ma ghọta nke ọma na ọgwụgwụ ụwa ochie a adịla ezigbo nso.

3. Ọ bụrụ na anyị echeela ọgwụgwụ ụwa a ruo ọtụtụ afọ, gịnị ka anyị nwere ike ịna-eche?

 3 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka ‘uche ya mee n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’ (Mat. 6:10) Ma, ọ bụrụ na anyị echeela ọgwụgwụ ụwa a ruo ọtụtụ afọ, anyị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ̀ bara uru ịka nọ na-eche?’ Ka anyị chọpụta.

GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI NA-ATỤSI ANYA ỌGWỤGWỤ ỤWA OCHIE A IKE?

4. Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ịna-eche nche’?

4 Baịbụl gwara anyị otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà ebe ọ bụ na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-eche nche’ ma ‘mụrụ anya.’ (Mat. 24:42; Luk 21:34-36) Ihe a Jizọs kwuru kwesịrị ime ka anyị na-atụ anya na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Nzukọ Jehova na-agwa anyị mgbe niile ka anyị “na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche,” lekwasịkwa anya n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị nkwa ya.Gụọ 2 Pita 3:11-13.

5. Olee ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịna-eche nche?

5 Ebe ọ bụ na a gwara Ndị Kraịst oge mbụ ka ha na-atụ anya ụbọchị Jehova, anyịnwa kwesịrị ịna-eme otú ahụ karị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ịrịba ama ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ ghọọla Eze n’eluigwe kemgbe afọ 1914 nakwa na anyị bi ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a,’ ya bụ, n’oge ikpeazụ. Otú ahụ Jizọs kwuru, nsogbu ụwa a na-aka njọ, a na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. (Mat. 24:3, 7-14) Jizọs ekwughị afọ ole oge ikpeazụ a ga-adịru. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụrụ anya ma na-eche nche.

6. Olee otú anyị si mara na nsogbu ụwa a ga na-aka njọ ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso?

6 Mmadụ nwere ike ịjụ, sị: Ọ̀ bụ na o nweghị ike ịbụ na “ọgwụgwụ usoro ihe a” Baịbụl kwuru okwu ya ka ga-abụ n’ọdịnihu mgbe nsogbu ụwa a ga-adị njọ karịa otú ọ dị ugbu a? O doro anya na Baịbụl kwuru na ihe ọjọọ ga na-arị ibe ya elu “n’oge ikpeazụ.” (2 Tim. 3:1, 13; Mat. 24:21; Mkpu. 12:12) N’ihi ya, n’agbanyeghị na nsogbu ụwa a adịla ezigbo njọ ugbu a, anyị ma na ọ ga na-aka njọ.

7. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:37-39 na-egosi banyere nsogbu ụwa n’oge ikpeazụ a?

7 Ma, olee otú ihe ga-adịru njọ tupu “oké mkpagbu ahụ” amalite? (Mkpu. 7:14) Dị ka ihe atụ, ị̀ na-atụ anya na a ga na-alụ agha ná mba ọ bụla, na o nweghị onye ga-ahụ ihe ọ ga-eri, nakwa na ọrịa ga-adị n’ezinụlọ niile? Ụdị ihe ahụ mee, ndị na-arụ Baịbụl ụka ga-ekweta na amụma Baịbụl emezuwela. Ma, Jizọs kwuru na ọtụtụ ndị n’ụwa ‘agaghị ama’ na ya aghọọla Eze n’eluigwe. Ha ga na-eme ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị ruo mgbe ọ ga-abụzi na oge agaala. (Gụọ Matiu 24:37-39.) N’ihi ya, ihe Baịbụl kwuru gosiri na nsogbu ụwa n’oge ikpeazụ agaghị eru nke na mmadụ niile ga-ekweta na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso.Luk 17:20; 2 Pita 3:3, 4.

8. Olee ihe doro anyị anya ebe ọ bụ na anyị ‘na-eche nche’ otú ahụ Jizọs kwuru?

8 Ihe mere Jizọs ji nye ndị na-eso ụzọ ya ihe ịrịba ama ahụ bụ ka ọ dọọ ha aka ná ntị banyere ụdị oge ha ga-ebi na ya. Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eche nche otú ahụ Jizọs kwuru. (Mat. 24:27, 42) Kemgbe afọ 1914, ihe ndị so n’ihe ịrịba ama ahụ na-emezu. Obi siri anyị ike na anyị bi ugbu a ‘n’ọgwụgwụ usoro  ihe a.’ Jehova ekpebiela mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a Setan na-achị.

9. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụ anya na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya?

9 N’ihi ya, gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụ anya na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya? Ọ bụ n’ihi na anyị na-erubere Jizọs Kraịst isi. Anyị jikwa anya anyị na-ahụ ka ihe ndị o kwuru a ga-eji amata oge ikpeazụ na-emezu. Ihe mere anyị ji kwere na ọgwụgwụ dị nso abụghị n’ihi na anyị na-ekwere ihe ọ bụla anyị nụrụ, kama ọ bụ n’ihi na obi siri anyị ike na amụma Baịbụl na-emezu. Anyị kwesịrị ịna-eche nche ma dịrị njikere maka ọgwụgwụ ụwa ochie a.

OLEE MGBE ANYỊ GA-ECHERU?

10, 11. (a) Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-eche nche’? (b) Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ma ọ bụrụ na ụbọchị Jehova abịaghị mgbe ha tụrụ anya ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Ọtụtụ n’ime anyị efeela Jehova ọtụtụ afọ. Ma, ka anyị ghara ikwe ka ọtụtụ afọ ndị a garalanụ mee ka ike gwụ anyị ichere ụbọchị Jehova. Anyị kwesịrị ịdị njikere maka mgbe Jizọs ga-abịa ibibi ụwa ochie a. Cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-elenụ anya, mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ. Ọ dị ka nwoke jewere mba ọzọ, nke hapụrụ ụlọ ya ma nye ndị ohu ya ikike. O nyere onye nke ọ bụla ọrụ ọ ga-arụ, nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ na-eche nche. Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa, ma ọ̀ bụ n’uhuruchi ka ọ̀ bụ n’etiti abalị ka ọ̀ bụ mgbe oké ọkpa ji akwa ka ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ; ka o wee ghara ịhụ unu ka unu na-ehi ụra mgbe ọ lọtara na mberede. Ma ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ niile, Na-echenụ nche.”Mak 13:33-37.

11 Mgbe ndị na-eso ụzọ Kraịst ghọtara na Jizọs ghọrọ Eze n’eluigwe n’afọ 1914, ha ghọtakwara na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Ha malitere ikwusasi ozi ọma ike iji gosi na ha adịla njikere. Jizọs kwuru na ya nwere ike ịbịa n’oge ọ bụla, ‘mgbe oké ọkpa ji akwa ma ọ bụ n’isi ụtụtụ.’ Gịnịzi ka ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime? Ọ sịrị ha: “Na-echenụ nche.” N’ihi ya, ọ bụrụgodị na anyị echeela ọtụtụ afọ, ọ pụtaghị na ụbọchị Jehova ka dị anya ma ọ bụ na ọ gaghị abịa n’oge anyị a.

12. Gịnị ka Habakọk jụrụ Jehova? Gịnị ka Chineke gwara ya?

12 Chegodị banyere Habakọk onye amụma. Jehova gwara ya ka o buo amụma na a ga-ebibi Jeruselem. Mgbe ọ malitere ọrụ ahụ, ndị amụma bú ya ụzọ adọọla ndị bí n’obodo ahụ aka ná ntị ruo ọtụtụ afọ. Habakọk hụrụ na “ndị ajọ omume gbara ndị ezi omume gburugburu” nakwa na ‘a na-agbagọ ikpe ziri ezi.’ Ka a sịkwa ihe mere o ji jụọ Jehova, sị: “Ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka?” Kama ịza ajụjụ a hoo haa, Jehova mere ka obi sie onye amụma ahụ ike na mbibi ahụ e buru n’amụma agaghị ‘egbu oge.’ Chineke gwara Habakọk ka ọ “na-atụ anya ya.”Gụọ Habakọk 1:1-4; 2:3.

13. Olee ụdị ihe Habakọk gaara na-eche n’obi ya? Gịnị mere na o kwesịghị iche otú ahụ?

13 Gịnị gaara eme ma a sị na ike gwụrụ Habakọk, ya echewe, sị: ‘M tụwala anya mbibi Jeruselem ruo ọtụtụ afọ. Ọ́ bụrụkwanụ na ọ ka dị ezigbo anya? Ọ dị ka ọ baghịzi uru ịnọ na-ebu amụma  ka à ga-asị na oge eruola ka e bibie Jeruselem. Ka ndị ọzọ rụtụwagodị ọrụ a.’ A sị na Habakọk chewere ụdị ihe a, ya na Jehova agaraghị adịzi ná mma. O nwekwara ike ịnwụ mgbe ndị Babịlọn bịara bibie Jeruselem.

14. Gịnị mere anyị ga-eji na-ekele Jehova maka na ọ na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị tụsiwe anya ụbọchị ya ike?

14 Were ya na ị nọ n’ụwa ọhụrụ. Amụma niile e buru banyere oge ikpeazụ mezuchara otú ahụ Jehova kwuru. Ị ga-atụkwasịkwu Jehova obi, obi esikwuo gị ike na ọ ga-emezu ihe ndị ọzọ niile o kwere ná nkwa. (Gụọ Jọshụa 23:14.) Ị ga na-ekele Chineke maka na o kpebiri mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a, dọọkwa ndị ya aka ná ntị ka ha na-atụ anya ya.Ọrụ 1:7; 1 Pita 4:7.

ỊTỤ ANYA ỤBỌCHỊ JEHOVA PỤTARA NA ANYỊ GA NA-EKWUSA OZI ỌMA

Ị̀ na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15, 16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwusasi ozi ọma ike n’oge ikpeazụ a?

15 Nzukọ Jehova ga na-echetara anyị mgbe niile na anyị kwesịrị ime ka ijere Jehova ozi bụrụ ihe kacha anyị mkpa. Ihe mere e ji echetara anyị ihe a abụghị naanị ka anyị ghara ịkwụsị ijere Chineke ozi, kama ọ bụ iji nyere anyị aka ịghọta na ihe ndị na-eme ugbu a gosiri na Kraịst achịwala n’eluigwe. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a n’ihi ụdị oge anyị bi na ya? Ọ bụ ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekwusasi ozi ọma ike.Mat. 6:33; Mak 13:10.

16 Otu nwanna nwaanyị sịrị: “Ọ bụrụ na anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị . . . ga-enye aka napụta ndị mmadụ ka a ghara igbu ha mgbe a ga-ebibi ụwa ochie a.” Ọ ma otú obi na-adị onye a zọrọ ndụ, n’ihi na ya na di ya so ná ndị a napụtara mgbe otu nnukwu ụgbọ mmiri ndị Jamanị kpuru n’afọ 1945. Ihe ahụ merenụ so n’ọdachi kacha njọ metụrụla n’osimiri. Ma, onye nọ n’ụdị nsogbu ahụ nwere ike ọ gaghị aghọta ihe ka mkpa n’eziokwu. Nwanna nwaanyị ahụ chetara na e nwere otu nwaanyị nọ na-eti: “Akpa m! Akpa m! Ọla ntị m na ihe olu m! Ha niile dị n’ime ụgbọ mmiri a! Agbazi m aka!” Ma, ọtụtụ ndị ọzọ nọ́ n’ụgbọ mmiri ahụ ghọtara ihe kacha mkpa. Ọ bụ ya mere ha ji gbalịsie ike ịzọ ndụ ndị mmadụ n’agbanyeghị na osimiri ahụ jụrụ ezigbo oyi. Anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime inyere ndị mmadụ aka otú ahụ ndị nọ n’ụgbọ ahụ mere. Anyị ghọtara na oge agwụla agwụ. N’ihi ya, anyị na-ekwusasi ozi  ọma ike ma na-enyere ndị ọzọ aka iso ná ndị ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya.

Ị̀ na-eme mkpebi dị mma ka ihe ọ bụla ghara ime ka i chefuo na ụbọchị Jehova dị ezigbo nso? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị na gịnị mere anyị ji kwesị ikweta na Chineke nwere ike ibibi ụwa ochie a n’oge ọ bụla?

17 Ihe ndị na-eme n’ụwa emeela ka o doo anya na amụma Baịbụl na-emezu ugbu a nakwa na ọgwụgwụ ụwa ochie a adịla ezigbo nso. Anyị na-eche ka “mpi iri ahụ” na “anụ ọhịa ahụ” bibie Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. (Mkpu. 17:16) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na ọ ga-ewe oge tupu ya emee. Ka anyị cheta na ọ bụ Chineke ‘ga-etinye ya n’obi ha’ ka ha bibie okpukpe ụgha. O nwere ike ime ngwa ngwa n’oge ọ bụla. (Mkpu. 17:17) Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ ụwa ochie a dị ezigbo nso, anyị kwesịrị ime ihe ahụ Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.” (Luk 21:34, 35; Mkpu. 16:15) Ka anyị mụrụ anya ma jiri obi anyị niile na-ejere Jehova ozi. Ka obi siekwa anyị ike na ọ ‘na-emere onye na-atụ anya ya ihe.’Aịza. 64:4.

18. Olee ajụjụ a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

18 Ka anyị na-eche ka e bibie ụwa ochie a, anyị kwesịrị ime ihe Jud si n’ike mmụọ nsọ kwuo. Ọ sịrị: “Ndị m hụrụ n’anya, site n’iwuli onwe unu elu n’okwukwe unu nke kasị nsọ, na ikpe ekpere site na mmụọ nsọ, nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke, ebe unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.” (Jud 20, 21) Ma, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị chọrọ ka ụwa ọhụrụ Chineke kwere nkwa ya bịa n’oge na-adịghị anya nakwa na anyị na-atụsi anya ya ike? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 1 Ị chọọ ịhụ ebe e dere ụfọdụ amụma gbasara Mesaya na otú ha si mezuo, gụọ akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 200.