Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Julaị 2015

Na-eme Ka Paradaịs Ime Mmụọ Makwuo Mma

Na-eme Ka Paradaịs Ime Mmụọ Makwuo Mma

“M ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.”—AỊZA. 60:13.

ABỤ: 102, 75

1, 2. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, gịnị ka “ihe mgbakwasị ụkwụ” nwere ike ịpụta?

JEHOVA CHINEKE kwuru, sị: “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m.” (Aịza. 66:1) O kwukwara banyere “ihe mgbakwasị ụkwụ” ya, sị: “M ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.” (Aịza. 60:13) Olee otú o si eme ya? Ebe ọ bụ na anyị bi ‘n’ihe mgbakwasị ụkwụ’ Chineke, olee uru ime ya ka ọ maa mma baara anyị?

2 E wezụga ụwa, Akwụkwọ Nsọ Hibru kpọkwara ụlọ nsọ dị n’Izrel oge ochie “ihe mgbakwasị ụkwụ.” (1 Ihe 28:2; Ọma 132:7) Ụlọ nsọ ahụ dị n’ụwa bụ ebe a na-anọ efe Jehova. N’ihi ya, ọ mara mma n’anya ya. Ụlọ nsọ ahụ mekwara ka ihe mgbakwasị ụkwụ Jehova dị ebube.

3. Gịnị bụ ụlọ nsọ ihe atụ Chineke, oleekwa mgbe ọ malitere?

3 Ọ bụghịzi n’ụlọ nsọ nkịtị ka a na-anọ efe Jehova taa. Kama, ọ bụ n’ụlọ nsọ ihe atụ, nke na-enye Jehova otuto karịa ụlọ ọ bụla. Ụlọ nsọ ihe atụ a bụ ndokwa Chineke mere ka ụmụ mmadụ nwee ike ịbụ ndị enyi ya ma na-efe ya. Ọ bụ àjà Jizọs chụrụ na ọrụ nchụàjà ọ na-arụ mere ka o kwe omume. Ndokwa a malitere n’afọ 29, mgbe e mere Jizọs baptizim, teekwa ya mmanụ ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà ụlọ nsọ ihe atụ Jehova.—Hib. 9:11, 12.

4, 5. (a) Olee otú Abụ Ọma nke 99 si kọwaa ihe na-agụsi ndị na-efe Jehova ike? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

 4 Obi dị anyị ezigbo ụtọ n’ihi ndokwa a Chineke mere. Ọ bụ ya mere anyị ji agwa ndị mmadụ banyere aha Jehova nakwa onyinye na-enweghị atụ o nyere anyị, ya bụ, ihe mgbapụta. Obi dịkwa anyị ụtọ na e nwere ihe karịrị nde ezigbo Ndị Kraịst asatọ ji obi ha niile na-eto Jehova kwa ụbọchị. Anyị adịghị ka ụfọdụ ndị okpukpe bụ́ ndị chere na ọ bụ mgbe ha gara eluigwe ka ha ga-eto Chineke. Kama, anyị niile bụ́ Ndịàmà Jehova ma na anyị kwesịrị ịna-eto ya ugbu a n’ụwa ebe a.

5 N’ihi ya, anyị na-eṅomi ndị ohu Jehova e kwuru okwu ha n’Abụ Ọma 99:1-3, 5. (Gụọ ya.) Ndị fere Chineke n’oge ochie dị ka Mozis, Erọn, na Samuel ji obi ha niile fee Jehova otú ọ chọrọ. (Ọma 99:6, 7) Taa, tupu ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa esoro Jizọs bụrụ ndị nchụàjà n’eluigwe, ha ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ihe atụ ya dị n’ụwa. Ọtụtụ nde ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ji obi ha niile na-akwado ha. (Jọn 10:16) N’agbanyeghị na olileanya ndị e tere mmanụ na nke ndị so n’atụrụ ọzọ dị iche iche, ha ji otu obi na-efe Jehova n’ụwa a bụ́ ihe mgbakwasị ụkwụ Chineke. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M na-eji ike m niile akwado ndokwa Jehova mere maka ofufe ya?’

ỊMATA NDỊ NA-EFE CHINEKE N’ỤLỌ NSỌ IHE ATỤ YA

6, 7. Olee nsogbu malitere n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ, oleekwa ihe merenụ tupu afọ 1919 agafee?

6 Ihe na-erughị otu narị afọ ka e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst, ọtụtụ ndị malitere ịkụzi ozizi ụgha otú ahụ ndịozi Jizọs buru n’amụma. (Ọrụ 20:28-30; 2 Tesa. 2:3, 4) Ka oge na-aga, o sikwuru ike ịmata ndị na-efe Chineke n’eziokwu. Ọtụtụ narị afọ gara tupu Jehova esi n’aka Eze ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs Kraịst mee ka a mata ndị na-efe Chineke n’ụlọ nsọ ihe atụ ya.

7 Tupu afọ 1919 agafee, a matara ndị Jehova họpụtara, bụ́ ndị na-efe ya n’ụlọ nsọ ihe atụ ya. A nụchara ha ka Chineke nwee ike nabatakwuo ozi ha na-ejere ya. (Aịza. 4:2, 3; Mal. 3:1-4) Ihe Pọl onyeozi hụrụ n’ọhụụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ malitere imezu.

8, 9. Kọwaa ihe atọ “paradaịs” ahụ Pọl hụrụ n’ọhụụ pụtara.

8 A kọwara ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ ná 2 Ndị Kọrịnt 12:1-4. (Gụọ ya.) A kpọrọ ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ ahụ ‘mkpughe.’ Ihe ahụ ọ hụrụ bụ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe na-eme n’oge ya. Gịnị bụ “paradaịs” ahụ Pọl hụrụ mgbe ‘e bugara ya n’eluigwe nke atọ’? Ọ ga-abụ ma paradaịs nkịtị ma nke ime mmụọ ma nke eluigwe. Ha niile ga-abụcha n’ọdịnihu. O nwere ike ịpụta Paradaịs ga-adị n’ụwa n’ọdịnihu. (Luk 23:43) O nwekwara ike ịpụta paradaịs ime mmụọ ga-ezu ezu n’ụwa ọhụrụ. Ihe ọzọ o nwere ike ịpụta bụ ọnọdụ magburu onwe ya e nwere na “paradaịs Chineke” n’eluigwe.—Mkpu. 2:7.

9 Gịnịkwanụ mere Pọl ji kwuo na ya ‘nụrụ okwu a na-apụghị iji ọnụ kwuo, nke iwu na-akwadoghị ka mmadụ kwuo’? Ọ bụ n’ihi na oge erubeghị ka a kọwaa ihe ndị dị ebube ọ hụrụ n’ọhụụ ahụ. Ma, taa, Jehova chọrọ ka  anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere ihe ọma ndị na-eme ugbu a ná nzukọ ya.

10. Gịnị mere “paradaịs ime mmụọ” na “ụlọ nsọ ihe atụ” abụghị otu ihe?

10 Anyị na-ekwukarị banyere “paradaịs ime mmụọ.” Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara ọnọdụ pụrụ iche nke mere ka anyị na Chineke na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Ma, anyị ekwesịghị iche na “paradaịs ime mmụọ” na “ụlọ nsọ ihe atụ” bụ otu ihe. Ụlọ nsọ ihe atụ bụ ndokwa Chineke mere ka ndị mmadụ nwee ike ịna-efe ya. Paradaịs ime mmụọ na-eme ka a mata ndị na-efe Chineke n’eziokwu nakwa ndị na-ejere ya ozi taa n’ụlọ nsọ ihe atụ ya.—Mal. 3:18.

11. Olee ihe ùgwù anyị nwere taa gbasara paradaịs ime mmụọ?

11 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na kemgbe afọ 1919, Jehova kwere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-eme ka paradaịs ime mmụọ ya makwuo mma, sikwuo ike, na-agbasakwa. Ì so arụ ọrụ a magburu onwe ya? Ọ̀ na-eme ka i jiri obi gị niile soro Jehova na-eme ka ‘ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ’ dị ebube?

JEHOVA NA-EME KA NZUKỌ YA MAKWUO MMA

12. Olee otú anyị si mara na amụma e buru n’Aịzaya 60:17 emezuola? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

12 Aịzaya buru amụma na a ga-agbanwe ọtụtụ ihe ná nzukọ Jehova iji mee ka ọ makwuo mma. (Gụọ Aịzaya 60:17.) Ndị na-eto eto na ndị ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ agụọla banyere mgbanwe ndị a ma ọ bụ nụ banyere ha n’ọnụ ndị ọzọ. Ma, ọtụtụ ụmụnna ji anya ha hụ mgbanwe ndị ahụ. Ka a sịkwa ihe mere obi ji sie ha ike na Jehova si n’aka Eze anyị bụ́ Jizọs na-eduzi nzukọ ya. Ha ma na obi ike ha nwere kwesịrị ekwesị. Obi sikwara anyị ike otú ahụ. Ịnụ ihe ụmụnna ndị a na-akọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, meekwa ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi.

13. Gịnị ka Abụ Ọma 48:12-14 kwuru na anyị kwesịrị ịna-eme?

13 N’agbanyeghị afọ ole anyị nọrọla n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịna-agwa ndị ọzọ banyere nzukọ Jehova. Ọ bụ ọrụ ebube na anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile dị n’udo, dịrịkwa n’otu n’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa ọjọọ rụrụ arụ, nke ịhụnanya na-adịghị. Anyị kwesịrị iji ọṅụ kọọrọ “ọgbọ dị n’ihu” ihe ndị magburu onwe ha banyere “Zayọn,” ya bụ, nzukọ Jehova, nakwa eziokwu banyere paradaịs ime mmụọ anyị.—Gụọ Abụ Ọma 48:12-14.

14, 15. Olee ihe a gbanwere mgbe afọ 1970 gara? Olee uru ọ baara nzukọ Jehova?

14 Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị agadi n’etiti anyị ejirila anya ha hụ mgbanwe ụfọdụ e mere ná nzukọ Jehova, ndị mere ka ọ makwuo mma. Ha na-echeta mgbe ọgbakọ ọ bụla nwere otu ohu ọgbakọ kama inwe òtù ndị okenye, mgbe mba ọ bụla nwere otu ohu alaka kama inwe Kọmitii Alaka, nakwa mgbe ntụziaka na-esi n’aka onyeisi oche Watch Tower Society kama isi n’aka Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ọ bụ eziokwu na n’oge ahụ, e nwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-enyere ụmụnna ndị a aka, ọ bụ otu onye na-ekpebi ihe a ga-eme n’ọgbakọ, n’alaka ụlọ ọrụ, nakwa n’isi ụlọ ọrụ anyị. Mgbe afọ 1970 gara, a gbanwere otú e si ekpebi ihe a na-eme n’ọgbakọ ka ọ bụrụzie òtù ndị okenye kama ịbụ otu onye.

 15 Ò nwere uru mgbanwe a bara? Ee. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ihe a ghọtakwuru na Baịbụl mere e ji mee ya. Kama otu onye ga na-ekpebi ihe niile a na-eme, amamihe ndị okenye niile na-abara nzukọ Jehova uru. Ha bụ onyinye Jehova nyere ọgbakọ ya.—Efe. 4:8; Ilu 24:6.

Jehova na-eme ka ndị nọ n’ebe dị iche iche nweta ndụmọdụ ga-abara ha ezigbo uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16, 17. Olee mgbanwe ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya kacha masị gị? N’ihi gịnị?

16 Cheekwa banyere ihe ndị a gbanwere n’oge na-adịbeghị anya, dị ka otú akwụkwọ anyị na-adị, isiokwu ndị na-adị na ha, na otú anyị si enye ha ndị mmadụ. Obi na-adị anyị ụtọ inye ndị mmadụ akwụkwọ anyị, bụ́ ndị mara mma ma na-abara ọtụtụ ndị uru. Cheekwa otú anyị si eji Ịntanet na ihe ọgbara ọhụrụ ndị ọzọ ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, adres Ịntanet anyị, bụ́ jw.org, na-eme ka ndị nọ n’ebe dị iche iche nweta ndụmọdụ ga-abara ha ezigbo uru. Ihe a niile na-egosi na Jehova na-echere ndị mmadụ echiche ọma.

17 Obi dị anyị ụtọ na a gbanwere ugboro ole anyị na-aga ọmụmụ ihe ka anyị nwee mgbede anyị ga-eji na-enwe Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye. Mgbanwe e mere banyere mgbakọ na-emekwa anyị obi ụtọ. Anyị na-ekwukarị na mgbakọ na-akakwu mma kwa afọ. Anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ maka ụlọ akwụkwọ dị iche iche e ji na-azụ anyị ná nzukọ Jehova. O doro anya na ọ bụ Jehova mere ka e nwee mgbanwe ndị a. O ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka nzukọ ya na paradaịs ime mmụọ o nyere anyị ugbu a na-amakwu mma.

 IHE Ị GA-EME KA PARADAỊS IME MMỤỌ MAKWUO MMA

18, 19. Olee otú anyị ga-esi mee ka paradaịs ime mmụọ anyị na-amakwu mma?

18 Ọ bụ ihe ùgwù na Jehova kwere ka anyị soro na-eme ka paradaịs ime mmụọ anyị na-amakwu mma. Otú anyị si eme ya bụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, na-emekwa ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ọ bụla anyị nyeere mmadụ aka ka o nyefee Chineke onwe ya, ọ pụtara na anyị emeela ka paradaịs ime mmụọ anyị na-agbasa.—Aịza. 26:15; 54:2.

19 Ihe ọzọ anyị ga-eme ka paradaịs ime mmụọ anyị makwuo mma bụ ịgbasi mbọ ike na-akpakwu àgwà Ndị Kraịst. Ọ ga-eme ka paradaịs ime mmụọ anyị makwuo mma n’anya ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ihe mbụ na-adọta ndị mmadụ ná nzukọ Jehova, ha abịa fewe Chineke ma sowe ụzọ Jizọs, abụghị na ha hụrụ na anyị ma Baịbụl, kama ọ bụ na anyị na-akpa àgwà ọma.

I nwere ike iso na-eme ka paradaịs ime mmụọ anyị na-agbasa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

20. Dị ka e kwuru n’Ilu 14:35, olee ihe kwesịrị ịna-agụsi anyị ike?

20 O doro anya na obi dị Jehova na Jizọs ụtọ ịhụ otú paradaịs ime mmụọ anyị si maa mma taa. Ọṅụ anyị na-enwe ugbu a maka na anyị so eme ka ọ makwuo mma na-egosi ụdị ọṅụ anyị ga-emecha nwee mgbe anyị ga-eso na-eme ka ụwa niile bụrụ paradaịs. Ka anyị buru ihe Ilu 14:35 kwuru n’obi. Ebe ahụ sịrị: “Eze na-enwe obi ụtọ n’ebe onye na-ejere ya ozi nke ji nghọta eme ihe nọ.” Ka anyị jiri amamihe na-agbalịsi ike ka paradaịs ime mmụọ anyị makwuo mma.