Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2015

Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova

Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova

“Ekworo maka ụlọ gị ga-eripịa m.”—JỌN 2:17.

ABỤ: 127, 118

1, 2. (a) Olee ebe dị iche iche ndị ohu Jehova nọ fee ya n’oge ochie? (b) Olee otú Jizọs si were ụlọ nsọ Chineke dị na Jeruselem? (ch) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

KEMGBE ụwa, ndị ohu Chineke na-enwe ebe ha na-anọ efe Chineke. Dị ka ihe atụ, o yiri ka Ebel rụrụ ebe ịchụàjà mgbe ọ chụụrụ Chineke àjà. (Jen. 4:3, 4) Noa, Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Mozis rụchara ebe ịchụàjà. (Jen. 8:20; 12:7; 26:25; 35:1; Ọpụ. 17:15) Jehova gwakwara ndị Izrel ka ha rụọ ụlọikwuu. (Ọpụ. 25:8) Mgbe e mechara, ha rụrụ ụlọ nsọ ha na-anọ efe Jehova. (1 Eze 8:27, 29) Mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta, ha na-agakarị n’ụlọ nzukọ efe Chineke. (Mak 6:2; Jọn 18:20; Ọrụ 15:21) Ndị Kraịst oge mbụ na-ezukọkwa n’ụlọ ụmụnna. (Ọrụ 12:12; 1 Kọr. 16:19) Taa, ndị ohu Jehova n’ụwa niile na-anọ n’ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze amụ banyere Jehova ma na-efe ya.

2 Otú Jizọs si kwanyere ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem ùgwù ma jiri ya kpọrọ ihe chetaara ndị na-eso ụzọ ya ihe ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Ekworo maka ụlọ gị eripịawo m.” (Ọma 69:9; Jọn 2:17) A gaghị asị na Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ụdị “ụlọ Jehova” ahụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem bụ. (2 Ihe 5:13; 33:4)  Ma, Baịbụl gwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-akpa àgwà n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-akwanyere ya ùgwù. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nakwa otú ha si gbasa idewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na inye onyinye iji na-elekọta ya. *

ANYỊ NA-AKWANYERE ỌMỤMỤ IHE ANYỊ ÙGWÙ

3-5. Gịnị ka a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Olee otú anyị kwesịrị isi were ọmụmụ ihe?

3 Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe bụ́ isi anyị na-anọ efe Jehova. Ọmụmụ ihe anyị na-enwe kwa izu so n’onyinye Jehova nyere anyị iji mee ka anyị na ya na-adị ná mma. Ọ bụkwa ebe anyị na-enweta agbamume na ntụziaka si ná nzukọ ya. E nwere ike ikwu na ndị niile na-abịa ọmụmụ ihe bịara ịza òkù Jehova na Ọkpara ya kpọrọ ha. N’agbanyeghị na Jehova kpọrọ anyị niile òkù ka anyị bịa na-eri na ‘tebụl ya,’ anyị ekwesịghị iji ihe ùgwù a gwurie egwu.—1 Kọr. 10:21.

4 Jehova chọrọ ka anyị na-abịa ọmụmụ ihe ka anyị fee ya ma gbaa ụmụnna anyị ume. Ọ bụ ya mere o ji si n’ọnụ Pọl onyeozi gwa anyị ka anyị ghara ịhapụ ịga ọmụmụ ihe. (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) Ọ bụrụ na anyị ahapụ ịga ọmụmụ ihe n’ihi ihe na-enweghị isi, ọ̀ ga-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù? Otú anyị ga-esi eme ka a mata na anyị ji ndokwa Jehova meere anyị kpọrọ ihe bụ ịkwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ma na-aza ajụjụ.—Ọma 22:22.

5 Otú anyị si akpa àgwà n’ọmụmụ ihe na otú anyị si elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-egosi ma ànyị na-asọpụrụ Jehova. Anyị chọrọ ka àgwà anyị mee ka a na-eto aha Jehova, bụ́ ihe a na-ede na saịn bọọdụ Ụlọ Nzukọ Alaeze.—Tụlee 1 Ndị Eze 8:17.

6. Gịnị ka ụfọdụ ndị kwuru banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na ndị na-abịa ọmụmụ ihe na ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ahụ na anyị na-akwanyere ebe anyị na-anọ efe Jehova ùgwù. Dị ka ihe atụ, otu nwoke bi na Tọki sịrị: “Otú unu si edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ọcha na otú ihe niile si dị n’usoro masịrị m. Ndị nọ ebe ahụ jiri ejiji dị mma, na-amụmụ ọnụ ọchị. Ha kelekwara m nke ọma. O mere ka obi dị m ụtọ.” Nwoke ahụ malitere ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ọ dịghị anya, e mee ya baptizim. N’otu obodo dị n’Indonisha, tupu e nyefee Jehova Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a rụrụ, ụmụnna kpọrọ ndị agbata obi ha na ndị ọchịchị obodo ahụ ka ha bịa legharịa anya. Onyeisi obodo ahụ bịara. Otú e si rụsie ụlọ ahụ ike, ihe a ga-eji ya na-eme, na otú e si chọọ gburugburu ya mma masịrị ya. Ọ sịrị: “Otú Ụlọ Nzukọ Alaeze a si dị ọcha gosiri na okwukwe unu siri ike.”

Àgwà anyị nwere ike igosi na anyị anaghị akwanyere Chineke ùgwù (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)

7, 8. Gịnị ka ndị na-abịa ọmụmụ ihe kwesịrị iburu n’uche?

7 Ebe ọ bụ Jehova kpọrọ anyị òkù, otú anyị kwesịrị isi gosi na anyị na-akwanyere ya ùgwù bụ ịna-akpa àgwà ọma, na-ejikwa ejiji dị mma. Ọ pụtakwara na anyị agaghị na-emebiga ihe ókè. E nweghị iwu kwuru na anyị ekwesịghị ịna-emegharị ahụ́ n’ọmụmụ ihe. Ma, anyị ekwesịghị ịna-eme ka ànyị nọ n’ụlọ anyị. N’eziokwu, Jehova chọrọ ka ahụ́ ruo ndị ohu ya na ndị ọzọ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ala. Ma, onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe ekwesịghị ime ihe ga-egosi na ọ naghị  akwanyere ọmụmụ ihe ùgwù. Anyị ekwesịghị iyi uwe na-adịghị ọcha ma ọ bụ uwe anyị na-eyi anọ n’ụlọ bịa ọmụmụ ihe. Anyị ekwesịghịkwa ịna-akparịta ụka, jiri ekwentị na-ezigara mmadụ ozi, na-eri ihe ma ọ bụ na-aṅụ mmanya n’ọmụmụ ihe. Ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha na ha ekwesịghị ịna-agbagharị ma ọ bụ na-egwu egwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.—Ekli. 3:1.

8 Mgbe Jizọs hụrụ na ndị mmadụ na-ere ihe n’ụlọ nsọ Chineke, ezigbo iwe were ya, ya achụpụ ha. (Jọn 2:13-17) Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị bụkwa ebe anyị na-anọ efe Jehova, na-amụkwa banyere ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe gbasara ịchụ ego.—Tụlee Nehemaya 13:7, 8.

ANYỊ NA-ENYE AKA ARỤ ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE

9, 10. (a) Olee otú ndị Jehova si arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Gịnị ka a rụpụtarala? (b) Olee otú nzukọ Jehova si enyere ọgbakọ ndị na-enweghị ego ha ga-eji arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka?

9 Nzukọ Jehova na-agbasi mbọ ike ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ilekọta ya. Ndị na-ese Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a ga-arụ, ndị na-arụ ha, na ndị na-arụgharị ha na-eji aka ha ewepụta onwe ha. A naghị akwụ ha ụgwọ. Gịnị ka ha rụpụtarala? Kemgbe abalị mbụ n’ọnwa Nọvemba afọ 1999, a rụọlara ọgbakọ dị iche iche n’ụwa niile ihe karịrị puku Ụlọ Nzukọ Alaeze iri abụọ na asatọ. Ọ pụtara na n’ime afọ iri na ise gara aga, a rụrụ ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze ise kwa ụbọchị.

10 Nzukọ Jehova na-agbakwa mbọ ka a rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ndị a na-enweghị ya. Anyị na-eme ihe ahụ Baịbụl kwuru, ya bụ, ka ihe mafọọrọ ụfọdụ ndị mejuo ihe kọrọ ndị ọzọ, “ka e wee nwee ịha nhata.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:13-15.) N’ebe ụmụnna na-enweghị ego ha ga-eji rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ihe a emeela ka e nwee ike ịrụrụ ha ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze.

11. Gịnị ka ụfọdụ ụmụnna kwuru banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze a rụụrụ ha? Olee otú obi dị gị maka ihe ha kwuru?

11 Na Kosta Rika, otu ọgbakọ a rụụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dere, sị: “Mgbe anyị guzo n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ. Anyị amaghị na ụdị ihe a ga-eme eme. Naanị abalị asatọ ka e ji rụchaara anyị ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze a. Ọ bụ ngọzi Jehova, ndokwa nzukọ ya mere, na aka ụmụnna anyị nyeere anyị mere ka a rụọrọ anyị ya. Ụlọ Nzukọ Alaeze a bụ onyinye pụrụ iche Jehova nyere anyị. Obi atọgbuola anyị.” Ọ̀ bụ na obi anaghị adị gị ụtọ ịnụ ka ụmụnna anyị na-ekele Jehova maka Ụlọ Nzukọ Alaeze a rụụrụ ha?  Obi na-adịkwa anyị ụtọ na ụmụnna anyị n’ụwa niile na-enwe ụdị ọṅụ ahụ. O doro anya na Jehova na-agọzi ọrụ a, n’ihi na ozugbo a rụchara Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọtụtụ ndị ọhụrụ na-amalite ịbịa ọmụmụ ihe ka ha mụta banyere Jehova.—Ọma 127:1.

12. Olee otú anyị nwere ike isi nye aka mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?

12 Obi dị ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ụtọ nke ukwuu n’ihi na ha esotụla rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma ànyị nwere ike iso rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ na anyị enweghị ike, anyị niile nwere ihe ùgwù inye onyinye iji kwado ya. Ndị Chineke n’oge ochie ji obi ha niile nye onyinye a ga-eji rụọ ebe a ga-anọ na-efe Chineke. Anyị na-emekwa otú ahụ taa ka e too Jehova.—Ọpụ. 25:2; 2 Kọr. 9:7.

ANYỊ NA-EME KA ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE DỊ ỌCHA

13, 14. Gịnị ka anyị mụtara na Baịbụl gosiri na anyị kwesịrị ịna-eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị ọcha?

13 A rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, e kwesịrị ime ka ọ na-adị ọcha n’ihi na Chineke anyị na-efe dị ọcha, dịkwa nsọ. Ọ chọkwara ka ihe niile dị n’usoro. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:33, 40.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ọcha ma dị nsọ ka Jehova, ọ bụghị naanị ofufe anyị ka anyị kwesịrị ime ka ọ dị ọcha, kama anyị kwesịrị ime ka echiche anyị, omume anyị, na ahụ́ anyị dị ọcha.—Mkpu. 19:8.

14 Ọ bụrụ na anyị na-eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị ọcha, ọnụ ga-esi anyị ike ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa ọmụmụ ihe. Ha ga-ahụ ihe gosiri na anyị na-eme ihe anyị na-ezi ha n’ozi ọma gbasara ụwa  ọhụrụ nke ga-adị ọcha. Ha ga-aghọtakwa na Chineke anyị na-efe dị nsọ nakwa na ọ ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs mara mma n’oge na-adịghị anya.—Aịza. 6:1-3; Mkpu. 11:18.

15, 16. (a) Gịnị mere na ọ naghị adị mfe mgbe niile idewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha? Gịnị mere o ji dị mkpa? (b) Olee otú e si hazie idewe Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ọcha? Olee ihe ùgwù onye ọ bụla n’ime anyị nwere?

15 Otú ndị mmadụ si ewere idebe ihe ọcha dị iche iche. Maka gịnị? O nwere ike ịbụ maka otú e si zụọ ha. Ụfọdụ bi n’ebe ruru unyi ma ọ bụ n’ebe uzuzu ma ọ bụ pọtọpọtọ juru n’okporo ụzọ. E nwekwara ndị bi n’ebe a na-enweghị mmiri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e ji asa ihe. N’agbanyeghị ebe anyị bi na otú ndị ọzọ si ele idewe ihe ọcha anya, anyị kwesịrị ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-adị ọcha mgbe niile, ebe ọ bụ na e dere aha Jehova na ya. Ọ bụkwa ebe anyị na-anọ efe Jehova.—Diut. 23:14.

16 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-adị ọcha, anyị kwesịrị ịhazi otú a ga-esi na-edewe ya ọcha. Ndị okenye kwesịrị iwepụta ebe e dere mgbe ìgwè ozi ubi nke ọ bụla ga-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze, hụkwa na e nwere ihe ndị e ji ehicha ihe na ihe ndị e ji asụcha ahịhịa. Ha kwesịkwara ịhụ na a na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. A na-arụ ụfọdụ n’ime ụdị ọrụ ahụ ozugbo a gbasara ọmụmụ ihe. E nwekwara ndị a na-arụ kwa izu, kwa ọnwa, ma ọ bụ karịa. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ùgwù iso na-eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-adị ọcha.

ANYỊ NA-ARỤZI IHE NDỊ MEBIRI EMEBI

17, 18. (a) Olee ihe anyị mụtara na Baịbụl n’otú ndị Jehova n’oge ochie si rụzie ihe ndị mebiri n’ebe a na-anọ efe Jehova? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-adị mma n’anya?

17 Ndị ohu Jehova na-agbalịsikwa ike ịrụzi ihe ọ bụla mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe Eze Jehoash na-achị Juda, ọ gwara ndị nchụàjà ka ha jiri ego a tụkọtara maka ụlọ nsọ Jehova ‘rụzie ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ, n’ebe ọ bụla a hụrụ ebe gbawara agbawa.’ (2 Eze 12:4, 5) Mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ gachara, Eze Josaya jikwa ego ndị a tụkọtara rụzie ụlọ Jehova.—Gụọ 2 Ihe E Mere 34:9-11.

18 E nwere alaka ụlọ ọrụ ndị kwuru na ụfọdụ ụmụnna anaghị arụzi ihe ndị mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. N’obodo ndị ahụ, o nwere ike ịbụ naanị mmadụ ole na ole ma otú e si arụzi ihe ndị ahụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụmụnna enweghị ego ga-ezu ịrụzi ha. Ma, ọ bụrụ na anyị anaghị arụzi ihe ndị mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ka oge na-aga, ọ gaghịzi adị mma n’anya. Ọ gaghị ewetara Jehova otuto. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ agbasie mbọ ike soro na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, ọ ga-eme ka e too aha Jehova, meekwa ka ego ụmụnna nyere n’onyinye ghara ịna-ala n’iyi.

E kwesịghị ileghara ihicha Ụlọ Nzukọ Alaeze na ịrụzi ya anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 18)

19. Gịnị ka ị ga na-eme iji gosi na ị na-akwanyere ebe anyị na-anọ efe Chineke ùgwù?

19 Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ụlọ e nyefere Jehova. N’ihi ya, e kwesịghị ikwu na ọ bụ mmadụ ma ọ bụ otu ọgbakọ nwe ya n’agbanyeghị aha e dere n’akwụkwọ ikike e ji rụọ ya. Dị ka anyị tụlere n’isiokwu a, ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịghọta otú anyị kwesịrị isi na-ele ebe anyị na-anọ efe Chineke anya. Ebe ọ bụ na anyị na-asọpụrụ Jehova, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ọmụmụ ihe anyị na Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ùgwù. Obi dị anyị ụtọ iji ego anyị na-akwado ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-agbalịsikwa ike ịna-arụzi ya ma na-eme ka ọ dị ọcha. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị na-akwanyere ebe anyị na-anọ efe Jehova ùgwù otú ahụ Jizọs mere.—Jọn 2:17.

^ para. 2 N’agbanyeghị na ọ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ka anyị ga-ekwu banyere ya n’isiokwu a, ọ gbasakwara Ụlọ Mgbakọ na ebe ndị ọzọ anyị na-anọ efe Jehova.