Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Julaị 2015

Ijere Jehova Ozi ‘n’Oge Ọdachi’

Ijere Jehova Ozi ‘n’Oge Ọdachi’

OTU nwanna dị afọ iri asaa na ụma aha ya bụ Emele sịrị: “Ọtụtụ ọrịa mụ na ha na-alụ anaghị ekwe m ṅụọ mmiri tọgbọ iko.” * Ì kwutụla ụdị ihe a? Ọ bụrụ na ị kawala nká, ya abụrụ na ahụ́ esighịzi gị ike, ike ana-agwụkwa gị, i nwere ike ịghọta ihe a kọwara n’Ekliziastis isi iri na abụọ. Amaokwu nke mbụ kpọrọ oge agadi “oge ọdachi.” Ọ bụrụgodị na ị bụ agadi, ọ pụtaghị na nke gị agwụla. Ị ka nwere ike ibi ndụ bara uru, jirikwa obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.

NA-EME KA OKWUKWE GỊ SIE IKE

Ọ bụghị naanị unu bụ́ ndị agadi anyị hụrụ n’anya ka nsogbu ndị a bịatụụrụla. Ụdị nsogbu ndị a bịaara ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie. Dị ka ihe atụ, Aịzik, Jekọb, na Ahaịja kpuru ìsì mgbe ha mere agadi. (Jen. 27:1; 48:10; 1 Eze 14:4) Sera kwuru na ya ‘akaala nká,’ nke gosiri na ahụ́ agwụla ya. (Jen. 18:11, 12) Mgbe Eze Devid mere agadi, “ahụ́ adịghị ekporo ya ọkụ.” (1 Eze 1:1) Bazilaị bụ aka ji akụ̀, ma mgbe o mere agadi, nri na egwú anaghịzi atọ ya ụtọ. (2 Sam. 19:32-35) Ebreham nọ na-edi ọnwụ nwunye ya. Otú ahụkwa ka Neomi nọ na-edi ọnwụ di ya.—Jen. 23:1, 2; Rut 1:3, 12.

Gịnị nyeere onye ọ bụla n’ime ha aka iji obi ya niile na-ejere Jehova ozi ma na-enwe ọṅụ? Mgbe Ebreham mere agadi, “ọ ghọrọ onye dị ike site n’okwukwe ya” n’ihi na o nwere okwukwe ná nkwa Chineke. (Rom 4:19, 20) Anyị kwesịkwara inwe okwukwe siri ike. Ọ bụghị afọ ole anyị dị, nkà anyị nwere, ma ọ bụ otú ihe si dịrị anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Dị ka ihe atụ, Jekọb nwere okwukwe ná nkwa Chineke n’agbanyeghị na ike adịghịzi ya, ya ekpuokwa ìsì, ọ naghịkwa apụ apụ. (Jen. 48:1-4, 10; Hib. 11:21) E nwere otu nwanna nwaanyị dị iri afọ itoolu na atọ aha ya bụ Agnes. Ụdị ọrịa ọ na-arịa mere ka ike na-agwụ ya. Ma, ọ sịrị: “Kwa ụbọchị, obi na-esi m ike na Jehova agọziela m. M na-eche banyere Paradaịs kwa ụbọchị. Ọ na-eme ka m nwee olileanya.” Ihe a nwanna nwaanyị a na-eme magburu onwe ya.

Otú anyị ga-esi na-eme ka okwukwe anyị sie ike bụ ịna-ekpe ekpere, ịna-amụ Baịbụl, na ịna-aga ọmụmụ ihe. Mgbe Daniel onye amụma mere agadi, ọ na-ekpe ekpere mgbe niile ugboro atọ n’ụbọchị, na-amụkwa Okwu Chineke. (Dan. 6:10; 9:2) Ana bụ́ agadi nwaanyị di ya nwụrụ “adịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ.” (Luk 2:36, 37) Mgbe ọ bụla ị gara ọmụmụ ihe ma zaa ajụjụ ma ọ bụ mee ihe omume otú ike kwere gị, ọ ga-eme ka obi dị ma gị ma ndị niile bịaranụ ụtọ. Obi na-adịkwa Jehova ụtọ ịnụ ekpere gị, ọ bụrụgodị na ị gaghị emeli ọtụtụ ihe.—Ilu 15:8.

Na-agba ndị ọzọ ume

Ọtụtụ n’ime unu chọrọ ịna-ahụ ụzọ nke ọma ka unu nwee ike ịna-agụ ihe, chọọkwa ka ahụ́ gbasie unu ike ka unu nwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe. Ma, o nwere ike isiri unu ike ma ọ bụdị ghara ikwe unu omume. Gịnịzi ka ị ga-eme? Gbalịa na-eme ihe i nwere ike ime. Ọtụtụ ndị na-enweghị ike ịga ọmụmụ ihe na-eji ekwentị egere ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asaa na itoolu aha ya bụ Obidiya na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe n’agbanyeghị na ọ naghịzi ahụcha ụzọ. Otu nwanna nwoke nọ n’ọgbakọ ha na-eji kọmputa ebipụtara ya ihe ndị ahụ ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo.

O nwere ike ịbụ na i nwere ohere karịa ndị ọzọ. Ọ ga-adị mma ka i jiri oge ahụ na-egere ihe ndị e tinyere na teepụ, dị ka Baịbụl, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, okwu ihu ọha, na ihe nkiri. I nwekwara ike ịkpọ ụfọdụ ụmụnna n’ekwentị, ka unu ‘gbarịta ibe unu ume.’—Rom 1:11, 12.

NA-EJESI OZI CHINEKE IKE

Na-ekwusa ozi ọma

Otu nwanna nwaanyị dị ihe dị ka iri afọ asatọ na ise aha ya bụ Chinyere sịrị: “Obi anaghị adị mmadụ mma ma ọ bụrụ na o nweghịzi ike ịna-ejere Chineke  ozi otú ọ na-ejebu.” Oleezi otú ndị agadi ga-esi na-enwe ọṅụ n’ozi Jehova? Otu nwanna nwoke dị iri afọ asaa na ise aha ya bụ Pita sịrị: “Ọ bụ ịgbalị na-eche banyere ihe ga-eme ka obi na-adị gị mma. Echela banyere ihe ị na-anaghịzi emeli, kama jiri obi ụtọ na-eme ihe ị ga-emeli.”

Ì nwere ike icheta ụzọ ụfọdụ ị ka nwere ike isi na-ezi ozi ọma? Otu nwanna nwaanyị dị iri afọ asatọ na ụma anaghịzi agali ozi ụlọ n’ụlọ. Ma, ọ mụtara iji kọmputa edere ndị ọzọ akwụkwọ ozi. Ụfọdụ ndị agadi na-aga nọrọ n’ebe a na-anọ atụrụ ndụ ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọala na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụkwa na ị nọ n’ụlọ ọgwụ, i nwere ike ịna-ezi ndị nọọsụ, ndị dọkịta, na ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ ozi ọma.

Na-ele ndị mmadụ ọbịa

Afọ ole na ole tupu Eze Devid anwụọ, o ji obi ya niile kwado ofufe Jehova. O wetara ego na ihe ndị ọzọ a ga-eji rụọ ụlọ nsọ. (1 Ihe 28:11–29:5) I nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ. Mata ihe a na-arụ ná nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ ma gbalịsie ike ka ị kwado ya. I nwekwara ike ịgba ndị ọsụ ụzọ na ụmụnna ndị ọzọ ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma n’ọgbakọ unu ume, nye ha onyinye ma ọ bụ kpọọ ha ka ha bịa ritụ ihe n’ụlọ gị. I nwekwara ike ịna-echeta ndị na-eto eto, ezinụlọ dị iche iche, ndị ozi oge niile, ndị ọrịa, na ndị na-elekọta ọgbakọ Jehova n’ekpere.

Gị na ozi ị na-eje bara ezigbo uru. Nna anyị nke eluigwe agaghị ajụ unu bụ́ ndị agadi. (Ọma 71:9) Jehova hụrụ unu n’anya, jirikwa unu kpọrọ ihe. N’oge na-adịghị anya, afọ ndụ anyị ga na-agbago, ma ọ gaghị abụrụ anyị oge ọdachi. Kama, ike ga-eju anyị ahụ́, anyị agaghịkwa arịa ọrịa ọ bụla. Anyị ga na-efekwa Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.