Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2015

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Rọshịa

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Rọshịa

N’AFỌ 1991, ọṅụ juru Ndịàmà Jehova nọ na Rọshịa obi mgbe ndị ọchịchị wepụrụ iwu a machibidoro ọrụ ha, ha aghọọ okpukpe iwu kwadoro. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị echeghị na ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova e nwere ná mba ahụ ga-arị elu okpukpu iri ruo ihe dị ka otu narị puku na iri puku asaa ha dịzi taa. Ma, ụmụnna nọ na Rọshịa ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha si mba ọzọ bịa inye aka n’ọrụ iwe ihe ubi ahụ Jizọs kwuru okwu ya. (Mat. 9:37, 38) Ka anyị nụ ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru.

ỤMỤNNA NDỊ WEPỤTARA ONWE HA NA-EME KA ỌGBAKỌ SIE IKE

Otu nwanna aha ya bụ Matthew, bụ́ onye Briten, dị iri afọ abụọ na asatọ mgbe ndị ọchịchị wepụrụ iwu ha machibidoro ọrụ anyị na Rọshịa. Okwu e kwuru ná mgbakọ distrikti afọ ahụ gosiri na a chọrọ ụmụnna ndị ga-enye aka n’ọgbakọ ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. Dị ka ihe atụ, nwanna kwuru okwu ahụ kwuru na otu ọgbakọ dị na Sent Pitasbọg, dị na Rọshịa, nwere naanị otu ohu na-eje ozi. Ha enweghị ndị okenye. Ma, ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ahụ na-amụrụ ihe dị ka narị mmadụ abụọ ihe. Matthew kwuru, sị: “Mgbe m gechara okwu ahụ, Rọshịa ekweghị apụ m apụ n’obi. N’ihi ya, m gwara Jehova kpọmkwem na m chọrọ ịkwaga ebe ahụ.” O dokọtara ego, ree ọtụtụ ihe o nwere, kwaga Rọshịa n’afọ 1992. Olee otú ihe si gaara ya?

Matthew

Matthew sịrị: “Nsogbu mbụ m nwere bụ na amaghị m asụsụ ha. Anaghị m agwali ndị ọzọ ihe gbasara Baịbụl nke ọma.” Nsogbu ọzọ o nwere bụ ịchọta ebe ọ ga-ebi. Ọ sịrị: “Agaghị m echetali ugboro ole m si n’otu ụlọ kwaga n’ụlọ ọzọ n’ihi na a sịrị m kwapụ n’egbughị oge.” N’agbanyeghị nsogbu ndị a Matthew nwere ná mmalite, ọ sịrị: “Ịkwaga Rọshịa bụ mkpebi kacha mma m metụrụla.” Ọ sịkwara: “Ozi m na-eje ebe a emeela ka m mụta ịtụkwasịkwu Jehova obi, hụkwa ụzọ dị iche iche o si na-eduzi m.” E mechara họpụta Matthew ka ọ bụrụ okenye na ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ dị nso na Sent Pitasbọg.

 N’afọ 1999, otu nwanna aha ya bụ Hiroo gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Japan. Onye nkụzi ha gbara ya ume ka ọ gawa ozi ná mba ọzọ. Hiroo dị iri afọ abụọ na ise n’oge ahụ. Ọ nụrụ na e nwere mkpa ka ukwuu na Rọshịa, wee malite ịmụ asụsụ ha. Ihe ọzọ o mere bụ ịga Rọshịa nọọ ọnwa isii. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na ezigbo oyi na-atụ ebe ahụ n’oge oyi, m gara n’ọnwa Nọvemba ka m mata ma m̀ ga-edili ya.” Mgbe ọ nọchara n’oge oyi ahụ, ọ laghachiri Japan, selata aka n’otú o si emefu ego ka o nwee ike ịkpakọta ego ọ ga-eji kwaga Rọshịa ma birizie ebiri.

Hiroo na Svetlana

Hiroo ebiela na Rọshịa afọ iri na abụọ, jeekwa ozi n’ọgbakọ dị iche iche. E nwere mgbe ụfọdụ naanị ya bụ okenye na-elekọta ihe karịrị otu narị ndị nkwusa. N’otu ọgbakọ, ọ bụ ya na-eme ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ihe omume niile ná Nzukọ Ije Ozi kwa izu, na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, na-agakwa n’ebe ise dị iche iche eduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọ gakwaara ọtụtụ ụmụnna nleta ọzụzụ atụrụ. Mgbe Hiroo chetara afọ ndị ahụ gara aga, ọ sịrị: “Inyere ụmụnna aka ka okwukwe ha sikwuo ike mere ka m nwee ezigbo ọṅụ.” Olee uru o ritere n’ozi o jere n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ọ sịrị: “Tupu mụ agaa Rọshịa, m bụ okenye na ọsụ ụzọ oge niile. Ma, mgbe m bịara ebe a, ọ dị m ka adịm ná mma mụ na Jehova ọ̀ malitere ọhụrụ. Amụtala m ịtụkwasị Jehova obi m niile n’ihe niile m na-eme.” N’afọ 2005, Hiroo lụrụ Svetlana. Ha abụọ ka bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile.

Michael na Olga nakwa Marina na Matthew

Otu nwanna aha ya bụ Matthew dị afọ iri atọ na anọ. Ya na nwanne ya nwoke nke dị afọ iri abụọ na asatọ aha ya bụ Michael bụ ndị Kanada. Mgbe ha gara Rọshịa, o juru ha anya ịhụ na ọtụtụ ndị nwere mmasị na-abịa ọmụmụ ihe, ma ọ bụ naanị ụmụnna nwoke ole na ole na-eduzi ọmụmụ ihe. Matthew sịrị: “Ndị bịara ọmụmụ ihe n’ọgbakọ m gara dị narị abụọ. Ma, ọ bụ otu okenye bụ́ agadi nwoke na otu ohu na-eje ozi bụ́ nwa okorobịa duziri ọmụmụ ihe niile. Ihe a mere ka m chọọ ịkwaga ebe ahụ nyere ụmụnna aka.” Ọ kwagara Rọshịa n’afọ 2002.

Mgbe afọ anọ gara, Michael kwagara Rọshịa ma chọpụta na a ka chọkwuru ụmụnna nwoke n’ebe ahụ. N’oge ahụ ọ bụ ohu na-eje ozi, ọrụ e nyere ya bụ ịhụ maka ihe ndekọ ego, akwụkwọ, na ókèala. A gwakwara ya ka ọ na-arụ ọrụ odeakwụkwọ na-arụ, ka ọ na-ekwu okwu ihu ọha, nyekwa aka na-ahazi mgbakọ na ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke bụ́ eziokwu bụ na a ka chọkwuru ndị ga na-arụ ọrụ n’ọtụtụ ọgbakọ. Michael bụzi okenye. N’agbanyeghị na ọ naghị adịrị otu onye mfe ịrụ ọtụtụ ọrụ, ọ sịrị: “Inyere ụmụnna aka na-atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe kacha mma m ji ndụ m na-eme.”

Matthew mechara lụọ Marina, Michael alụọ Olga. Ka a na-enwekwu ọgbakọ ndị ọzọ, ha anọ na ụmụnna ndị ọzọ wepụtara onwe ha na-enyere ha aka.

ỤMỤNNA NWAANYỊ NDỊ JI OBI HA NIILE NA-EWE IHE UBI

Tatyana

N’afọ 1994, mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Tatyana dị afọ iri na isii, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche isii si Chek Ripọblik, Poland, na Slovakịa bịa ije ozi n’ọgbakọ ha dị na Yukren. Obi na-adị ya ụtọ ma o cheta ha. Ọ sịrị: “Ha bụ ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi. Ha na-emesapụ ihu, dị obiọma, marakwa Baịbụl nke ọma.” Ọ hụrụ otú Jehova si gọzie mbọ ha gbara n’ozi ya. N’ihi ya, o kwuru n’obi ya, sị, ‘Achọrọ m ịdị ka ha.’

Otú ihe ndị ọsụ ụzọ ahụ mere si gbaa Tatyana ume mere ka o jiri oge ezumike ụlọ akwụkwọ ha soro ndị ọzọ gaa n’ime ime obodo ndị dị na Yukren na Belarus n’ebe Ndịàmà Jehova na-ekwusatụbeghị ozi ọma. Ozi ọma ha kwusara ebe ndị ahụ tọrọ ya ụtọ nke na o kpebiri ịkwaga Rọshịa ka o nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ihe mbụ o mere bụ ịga leta otu nwanna  nwaanyị si mba ọzọ bịa ije ozi nakwa ịchọta ọrụ ọ ga na-arụ ma na-asụ ụzọ. O mechara kwaga Rọshịa n’afọ 2000. Ò siiri ya ike ime otú ahụ?

Tatyana sịrị: “Ebe ọ bụ na agaghị m akwụli ụgwọ flat, m nwetara otu ọnụ ụlọ n’ebe ndị ọzọ bi. Ibi ebe ahụ adịghịrị m mfe. E nwere mgbe ọ na-adị m ka ọ̀ bụ m laa. Ma, Jehova nyeere m aka mgbe niile ịghọta na m ga-erite uru n’ozi m na-ejere ya ebe a.” Taa, Tatyana bụzi onye ozi ala ọzọ na Rọshịa. Ọ sịrị: “Afọ niile m hapụrụ obodo anyị na-eje ozi ebe a emeela ka m nwee ọtụtụ ndị enyi ma mụta ọtụtụ ihe m nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ. Nke kachanụ bụ na o meela ka okwukwe m sikwuo ike.”

Masako

Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Masako, bụ́ onye Japan, dị ihe dị ka iri afọ ise na atọ. Kemgbe ụwa, ọ chọrọ ịbụ onye ozi ala ọzọ, ma ọrịa mere ka o yie ka ọ gaghị ekwe ya omume. Mgbe ọrịa ya belatatụrụ, o kpebiri ịkwaga Rọshịa gaa nye aka n’ọrụ iwe ihe ubi. Ọ dịrịghị ya mfe ịchọta ma ọrụ ma ebe dị mma ọ ga-ebi, ma o jisiri ike na-asụ ụzọ, na-akụzi asụsụ Japaniiz, na-ehichakwara ndị mmadụ ihe iji na-akpata ihe ọ ga-eri. Olee ihe nyeere ya aka ka ọ ghara ịkwụsị ozi ọ na-eje ebe a?

Masako kwuru otú ọ na-adị ya ma o cheta afọ iri na anọ o jerela ozi na Rọshịa. Ọ sịrị: “Obi ụtọ m na-enwe n’ozi m na-eme ka m chefuo nsogbu m niile. Ikwusa ozi ọma n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na-eme ka ndụ mmadụ baa ezigbo uru, obi ana-atọkwa ya ụtọ.” O kwukwara, sị: “M jirila anya m hụ otú Jehova si na-enye m nri, uwe, na ebe obibi. M weere ya ka ọrụ ebube ọ na-arụ n’oge anyị a.” Ọ bụghị naanị na Masako jere ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Rọshịa, o sokwa jee ozi na Kegịstan. O nyekwaara ìgwè nta ndị na-amụ ihe n’asụsụ Bekee, Chaịniiz, nakwa Wigụa aka. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile ugbu a na Sent Pitasbọg.

EZINỤLỌ DỊ ICHE ICHE NYERE AKA, JEHOVA AGỌZIE HA

Inga na Mikhail

Ihe isi ike emeela ka ụfọdụ ezinụlọ si ná mba ha kwaga mba ọzọ iji mee ka ihe dịtụrụ ha mma. Ma,  e nweela ezinụlọ ndị kwagara mba ọzọ ka ha mee uche Chineke otú ahụ Ebreham na Sera mere. (Jen. 12:1-9) Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Mikhail na Inga nwunye ya. Ha si Yukren kwaga Rọshịa n’afọ 2003. Ọ dịghị anya, ha ahụ ndị na-achọ eziokwu Baịbụl.

Mikhail sịrị: “N’otu mgbe anyị gara kwusaa ozi ọma n’ebe Ndịàmà Jehova na-ekwusatụbeghị ozi ọma, otu agadi nwoke mepere ụzọ ya, jụọ anyị, sị: ‘Ùnu bụ ndị ozi ọma?’ Anyị asị ya ee. Ya asị: ‘Ama m na unu ga-abịa otu ụbọchị. O nweghị otú ihe Jizọs kwuru ga-esi ghara imezu.’ Nwoke ahụ kwuziri ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:14.” Mikhail kwukwara, sị: “N’otu ebe ahụ, anyị hụkwara ihe dị ka ụmụ nwaanyị iri bụ́ ndị Chọọchị Baptist. Eziokwu Baịbụl na-agụsi ha agụụ ike. Ha nwere akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. Ha na-ejikwa ya amụ Baịbụl ná ngwụcha izu ọ bụla. Anyị ji ọtụtụ awa zaa ajụjụ ha, anyị na ha abụọkwa abụ Alaeze ma rikọọ nri. Ọgịga anyị gara ebe ahụ so n’ihe ọ na-abụ m cheta, ọṅụ eju m obi.” Mikhail na Inga kwuru na ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu emeela ka ha na Jehova dịkwuo ná mma, mee ka ha hụkwuo ndị mmadụ n’anya, meekwa ka ndụ ha na-ebi na-eme ha obi ụtọ. Taa, ha nọ n’ọrụ sekit.

Oksana, Aleksey, na Yury

N’afọ 2007, otu nwanna aha ya bụ Yury na nwunye ya bụ́ Oksana na nwa ha bụ́ Aleksey gara leta alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Rọshịa. Di na nwunye a dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise, nwa ha dị afọ iri na atọ ugbu a. Map Rọshịa ha hụrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ gosiri na e nwere ọtụtụ ókèala a na-eketaghị ọrụ n’ebe ahụ. Oksana sịrị: “Mgbe anyị hụrụ map ahụ, anyị ghọtara na a chọkwuru ndị nkwusa n’ebe ahụ. O mere ka anyị kpebie ịkwata Rọshịa.” Gịnị ọzọ nyeere ha aka? Yury sịrị: “Ịgụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ anyị nyeere anyị aka. Otu n’ime ha bụ ‘Ị̀ Pụrụ Ije Ozi n’Ubi Ala Ọzọ?’ * Alaka ụlọ ọrụ tụụrụ anyị aro ebe anyị nwere ike ịga. Anyị gara hụ otú ebe ahụ dị, chọọkwa ụlọ na ọrụ anyị ga na-arụ.” Ha kwagara Rọshịa n’afọ 2008.

Mgbe ha ruru, ịchọta ọrụ siiri ha ike. Ọtụtụ ugboro, ha si n’otu ụlọ kwaga n’ụlọ ọzọ. Yury sịrị: “Anyị rịọrọ Jehova ugboro ugboro ka anyị ghara ịda mbà, anyị nọkwa na-ekwusa ozi ọma, tụkwasị Jehova obi na ọ ga-akwado anyị. Anyị hụrụ otú Jehova si elekọta anyị ma anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze ya. Ozi anyị na-ejere ya mere ka okwukwe anyị sie ike.” (Mat. 6:22, 33) Olee uru Aleksey ritere n’ozi ha jere n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Oksana sịrị: “O nyerela ya aka. O nyefere Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim mgbe ọ dị afọ itoolu. Ọ hụla na a chọkwuru ndị nkwusa. N’ihi ya, ọ na-asụ ụzọ inyeaka mgbe ọ bụla ha nwere ezumike n’ụlọ akwụkwọ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịhụ na o ji ozi ọma kpọrọ ihe, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya.” Taa, Yury na Oksana bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.

“NAANỊ IHE NA-EWUTE M”

Ihe ụmụnna ndị a kwuru mere ka o doo anya na onye chọrọ ịkwaga ebe ọzọ ka o jekwuoro Jehova ozi kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ya niile. N’eziokwu, ọ naghị adịchara ndị gara ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu mfe. Ma, obi na-adị ha ezigbo ụtọ ka ndị mmadụ na-ege ntị n’ozi ọma ha na-ekwusa. Ị̀ ga-akwagali n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma ka i soro na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu Baịbụl? I kpebie ime otú ahụ, n’oge na-adịghị anya, obi nwere ike ịdị gị otú ọ dị Yury. O kwuru banyere mkpebi o mere ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, sị: “Naanị ihe na-ewute m bụ na amaliteghị m n’oge.”

^ para. 20 Gụọ Ụlọ Nche October 15, 1999, peeji nke 23-27.