Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2015

Anyị Ga-ezereli Omume Rụrụ Arụ

Anyị Ga-ezereli Omume Rụrụ Arụ

“Meenụ ka aka unu dị ọcha, . . . meekwanụ ka obi unu dị ọcha.”—JEMS 4:8.

1. Olee otú ọtụtụ ndị si ele omume rụrụ arụ anya?

OMUME rụrụ arụ juru n’ụwa taa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị chere na nwoke idina nwoke, nwaanyị idina nwaanyị, na mmadụ na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ adịghị njọ. A na-ekwu na ụdị ndụ ahụ dị mma ma n’ihe ndị e ji atụrụ ndụ ma n’ihe ndị e ji akpọsa ngwá ahịa. (Ọma 12:8) Otú omume rụrụ arụ si ju ebe niile nwere ike ime ka i chewe, sị: ‘Mmadụ ọ̀ ga-ezereli omume rụrụ arụ?’ Obi siri anyị ike na anyị ga-ezereli ya n’ike Jehova.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5.

2, 3. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị iwepụ ọchịchọ ọjọọ n’obi anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ọ bụrụ na anyị chọrọ izere omume rụrụ arụ, ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ ịkpọ echiche rụrụ arụ asị. Dị ka ihe atụ, a na-eji nri azụ̀ e tinyere na nkò arata azụ̀. Otú ahụ ka echiche rụrụ arụ na ọchịchọ ọjọọ nwere ike ịrafu Onye Kraịst ma ọ bụrụ na o wepụghị ya n’obi ya ozugbo. Ezughị okè nwere ike ime ka ihe ọjọọ gụwa anyị. Ka oge na-aga, mmehie nwere ike iri anyị obi, anyị achọwazie otú anyị ga-esi mee ya. Ihe  ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ya bụ: “Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”—Gụọ Jems 1:14, 15.

3 Anyị kwesịrị icheta na ọchịchọ ọjọọ nwere ike iji nwayọọ nwayọọ rie mmadụ obi, mezie ka onye ahụ mee mmehie dị oké njọ. Ma obi dị anyị ụtọ n’ihi na ọ bụrụ na anyị ekweghị ka ọchịchọ rụrụ arụ rie anyị obi, anyị agaghị eme omume rụrụ arụ ma tawa ahụhụ si na ya pụta. (Gal. 5:16) Ka anyị tụlee ihe atọ ga-enyere anyị aka iwepụ ọchịchọ ọjọọ n’obi anyị. Ha bụ adịm ná mma anyị na Jehova, ndụmọdụ si n’Okwu ya, na enyemaka Ndị Kraịst tozuru okè.

“BỊARUONỤ CHINEKE NSO”

4. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị bịaruo Jehova nso?

4 Baịbụl gwara ndị chọrọ ‘ịbịaru Chineke nso,’ sị: “Meenụ ka aka unu dị ọcha, . . . meekwanụ ka obi unu dị ọcha.” (Jems 4:8) Ọ bụrụ na anyị ejiri adịm ná mma anyị na Jehova kpọrọ ihe, anyị ga na-agbasi mbọ ike ka echiche anyị na ihe ọ bụla anyị na-eme bụrụ ihe dị ya mma. Obi anyị ga-adị ọcha ma ọ bụrụ na anyị na-eche ihe dị ọcha, ihe dị mma, na ihe kwesịrị otuto. (Ọma 24:3, 4; 51:6; Fil. 4:8) Jehova ghọtara na anyị ezughị okè nakwa na echiche rụrụ arụ nwere ike ịbata anyị n’obi. Ma, anyị ma na ọ na-ewute ya ma ọ bụrụ na anyị echewe ihe rụrụ arụ, kama ịgbasi mbọ ike wepụ ya n’obi anyị. (Jen. 6:5, 6) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe a n’obi, anyị ga na-agbalịsikwu ike ka ihe anyị na-eche bụrụ ihe dị ọcha.

5, 6. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ịna-ezere ọchịchọ ọjọọ?

5 Otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi bụ ịna-arịọ ya ka o nyere anyị aka iwepụ echiche ọjọọ n’obi anyị. Ọ bụrụ na anyị abịaruo Jehova nso n’ekpere, ọ ga-abịarukwa anyị nso. Ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike izere omume rụrụ arụ, gharakwa ịna-eche ihe ọjọọ. N’ihi ya, ka anyị na-agwa Chineke mgbe niile na anyị chọrọ ka ihe anyị na-eche n’obi anyị bụrụ ihe dị ya mma. (Ọma 19:14) Ànyị na-eji obi umeala arịọ ya ka o nyochaa anyị iji chọpụta ma è nwere ihe ọjọọ ọ bụla dị anyị n’obi, nke nwere ike ime ka anyị mehie? (Ọma 139:23, 24) Ànyị na-arịọ ya mgbe niile ka o nyere anyị aka ime ihe ziri ezi ma ọnwụnwa bịara anyị?—Mat. 6:13.

6 Otú e si zụọ anyị ma ọ bụ ụdị ndụ anyị biri n’oge gara aga nwere ike ime ka ihe Jehova kpọrọ asị na-agụ anyị. Ma, Jehova nwere ike inyere anyị aka ka anyị gbanwee, ka anyị nwee ike ịna-eme ihe ọ chọrọ. Ọ bụ ihe Eze Devid ghọtara. Mgbe ya na Bat-shiba kwachara iko, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Mee ka m nwee obi dị ọcha, . . . tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m.” (Ọma 51:10, 12) Ezughị okè nwere ike ime ka ihe ọjọọ na-agụ anyị. Ma Jehova ga-enyere anyị aka ka irubere ya isi na-agụ anyị agụụ karịa ime ihe ọjọọ. Ọ bụrụgodị na ọchịchọ ọjọọ eriela anyị obi ma mee ka ọ na-esiri anyị ike izere echiche rụrụ arụ, Jehova nwere ike ịna-eduzi anyị ka anyị na-erubere iwu ya isi, na-emekwa ihe dị ya mma. Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ịna-achị anyị.—Ọma 119:133.

Ọ bụrụ na ọchịchọ ọjọọ abatawa anyị n’obi, anyị kwesịrị iwepụ ya ozugbo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

“BỤRỤNỤ NDỊ NA-EME OKWU CHINEKE”

7. Olee otú Okwu Chineke nwere ike isi nyere anyị aka izere echiche ọjọọ?

7 Jehova nwere ike isi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl zaa ekpere anyị. Amamihe dị n’Okwu Chineke “bu ụzọ dị ọcha.”  (Jems 3:17) Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na ịtụgharị uche n’ihe anyị gụrụ nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịna-eche banyere ihe rụrụ arụ. (Ọma 19:7, 11; 119:9, 11) Na Baịbụl, e nwere akụkọ na ndụmọdụ ndị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-eche banyere ihe rụrụ arụ.

8, 9. (a) Gịnị mere ka otu nwa okorobịa na nwaanyị na-akwa iko kwaa iko? (b) Olee ụdị nsogbu ihe a kọrọ n’Ilu isi asaa nwere ike inyere anyị aka izere?

8 Ilu 5:8 sịrị: “Mee ka ụzọ gị dị anya n’ebe [nwaanyị na-akwa iko] nọ, agarukwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso.” Ilu isi asaa gwara anyị nsogbu ileghara ndụmọdụ a anya ga-akpata. Ọ kọrọ banyere otu nwa okorobịa nọ na-agagharị n’ebe dị nso n’ụlọ otu nwaanyị na-akwa iko. Chi ejiwela mgbe ahụ. Mgbe ọ na-agafe n’okporo ámá, nwaanyị ahụ zutere ya. O nwekwara ike ịbụ na nwaanyị ahụ yi ákwà na-ahụ ụzọ. Ọ bagidere nwoke ahụ, susuo ya ọnụ, jiri okwu aghụghọ ya mee ka ime ihe ọjọọ gụwa nwoke ahụ. Nwoke ahụ ewepụghịkwa ọchịchọ ọjọọ ahụ n’obi ya. N’ihi ya, o jidelighị onwe ya. Ha wee kwaa iko. O doro anya na nwa okorobịa ahụ ebughị ịkwa iko n’obi mgbe o si n’ụlọ ya pụtawa. Amamihe kọrọ ya. O nweghịkwa uche. Ma, ọ ga-ata ahụhụ ihe o mere. A sị na  ọ ma, ọ gaara agbara nwaanyị ahụ ọsọ.—Ilu 7:6-27.

9 Mgbe ụfọdụ, ànyị nwere ike ime ka ndị na-enweghị uche otú ahụ, ikekwe, anyị ejiri nwayọọ nwayọọ mewe ihe nwere ike ime ka ihe ọjọọ gụwa anyị? Dị ka ihe atụ, e nwere ike ịna-egosi ihe rụrụ arụ na tiivi n’abalị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-apịgharị tiivi n’ụdị mgbe ahụ. Ọ gaghịkwa adị mma ka anyị na-awagharị n’Ịntanet, ka o wee ghara ibuga anyị n’ebe e dewere foto ndị gba ọtọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ gbasara omume rụrụ arụ. Anyị nwere ike ịhụ ihe ga-eme ka ihe ọjọọ gụwa anyị, meekwa ka anyị ghara izere omume ọjọọ.

10. Gịnị mere ịchụ nwoke na ịchụ nwaanyị ji dị njọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Ụzọ ọzọ Baịbụl si enyere anyị aka bụ inye anyị ndụmọdụ otú anyị ga-esi na-emeso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị. (Gụọ 1 Timoti 5:2.) Ụdị ndụmọdụ a na-eme ka o doo anya na ịchụ nwaanyị na ịchụ nwoke adịghị mma. Ndị Kraịst anaghị ahapụ onye ha lụrụ ma ọ bụ onye ha chọrọ ịlụ chụwa onye ọzọ. Ụfọdụ ndị chere na ọ bụrụhaala na ha emetụghị mmadụ aka, iji anya, okwu ọnụ, ma ọ bụ ihe yiri ya na-achụ onye ahụ abụghị ihe ọjọọ. Ma, mmadụ abụọ igwu egwuregwu iberiibe nwere ike ime ka ha chewe echiche ọjọọ, mezie ka ha mee omume rụrụ arụ. E nweela ndị ụdị ihe ahụ mere. O nwekwara ike ime ọzọ.

11. Olee àgwà ọma Josef kpara?

11 E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka Josef. Mgbe nwunye Pọtịfa chọrọ ka ya na ya dinaa, o kweghị. Ma, nwaanyị ahụ siri ọnwụ, na-agwa Josef kwa ụbọchị ka ya na ya nọrọ. (Jen. 39:7, 8, 10) Otu ọkà mmụta Baịbụl sịrị na ihe nwunye Pọtịfa nọ na-agwa Josef bụ: “‘Ka mụ na gị nọtụ,’ buru n’obi na ọ ga-enwe mmasị n’ebe ọ nọ.” Ma, Josef kpebisiri ike na ya agaghị ege ntị n’okwu aghụghọ nwaanyị ahụ ma ọ bụ nwee mmasị n’ebe ọ nọ. O kweghị ka ya na ya gwuwe egwuregwu iberiibe, si otú ahụ gosi na ya achọghị ka echiche ọjọọ bata ya n’obi. Mgbe nwaanyị ahụ gbalịrị ịmanye Josef ka ha kwaa iko, ọ jụrụ ozugbo. “Ọ hapụụrụ ya uwe ya wee gbara ọsọ gbapụ n’èzí.”—Jen. 39:12.

12. Olee otú anyị si mara na ihe anyị ji anya anyị hụ nwere ike ime ka ihe ọjọọ gụwa anyị?

12 Baịbụl gwakwara anyị ka anyị ghara ikwe ka anya anyị mee ka ihe ọjọọ gụwa obi anyị. Ihe anya anyị hụrụ nwere ike ime ka mmekọahụ rụrụ arụ gụwa anyị. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Mat. 5:28) Cheta ihe mere Eze Devid. ‘Ọ nọ n’elu ụlọ hụ otu nwaanyị na-asa ahụ́.’ (2 Sam. 11:2) O wepụghị anya ya ma ọ bụ gbalịa ka o chewe ihe ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji nwee mmasị n’ebe nwunye onye ọzọ nọ, ya akpọrọ ya, ha akwaa iko.

13. Gịnị mere anyị na anya anyị ji kwesị ‘ịgba ndụ’? Olee otú anyị ga-esi mee ya?

13 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka omume rụrụ arụ ghara ịna-abata anyị n’obi, anyị na anya anyị kwesịrị ‘ịgba ndụ’ otú ahụ Job mere. (Job 31:1, 7, 9) Anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị ga-akpachara anya n’ihe anyị na-ele nakwa na anyị agaghị ekwe ka anya anyị lewe mmadụ otú ga-eme ka ọ gụwa anyị agụụ ka anyị na ya kwaa iko. Ọ pụtara na anyị ga-ewepụ anya ozugbo n’ebe ọ bụla e gosiri foto ndị gba ọtọ, ma ọ̀ bụ na kọmputa ma ọ bụ n’akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ.

14. Gịnị ka anyị ga-eme iji zere omume rụrụ arụ?

 14 Ọ bụrụ na ihe ndị anyị tụlere emeela ka ị chọpụta ebe i kwesịrị ịgbasikwu mbọ ike ka i zere omume rụrụ arụ, emela anya ụra. Jiri obi gị niile mee ihe Baịbụl kwuru n’ihi na ọ ga-enyere gị aka izere ihe ọjọọ na omume rụrụ arụ.—Gụọ Jems 1:21-25.

“KPỌỌ NDỊ OKENYE”

15. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike iwepụ echiche ọjọọ n’obi anyị, gịnị mere anyị ji kwesị ịchọ enyemaka?

15 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike iwepụ echiche ọjọọ n’obi gị, Ndị Kraịst ibe gị nwere ike inyere gị aka. N’eziokwu, ọ naghị adịcha mfe ịkọrọ onye ọzọ ụdị nsogbu ahụ. Ma, ịkata obi kọọrọ ya nwanna tozuru okè ka o jiri obiọma nyere anyị aka ga-eme ka anyị ghọta na iche echiche ọjọọ adịghị mma. (Ilu 18:1; Hib. 3:12, 13) Ọ bụrụ na anyị agwa nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nsogbu anyị, o nwere ike inyere anyị aka ịhụ ebe anyị kwesịrị ịkpachapụkwu anya. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike ịgbanwe àgwà anyị iji nọgide n’ịhụnanya Jehova.

16, 17. (a) Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere ndị ọ na-esiri ike iwepụ echiche ọjọọ n’obi ha aka? Nye ihe atụ. (b) Gịnị mere ndị na-ele ndị gba ọtọ ji kwesị ịchọ enyemaka n’egbughị oge?

16 Ndị okenye ọgbakọ kacha ruo eruo inyere anyị aka. (Gụọ Jems 5:13-15.) Na Brazil, e nwere otu nwa okorobịa o siiri ike iwepụ echiche ọjọọ n’obi ya ruo ọtụtụ afọ. Ọ sịrị: “Ama m na ihe m na-eche adịghị Jehova mma, ma ihere ekweghị m kọọrọ ya ndị ọzọ.” Otu okenye chọpụtara na nwanna a nwere nsogbu ma gbaa ya ume ka ọ gwa ndị okenye ka ha nyere ya aka. Nwa okorobịa ahụ kwuru, sị: “Otú ndị okenye si jiri obiọma nyere m aka tụrụ m n’anya. Ha ghọtara nsogbu m karịa otú m tụrụ anya ya. Ha weturu obi gee ntị mgbe m na-akọrọ ha ihe mụ na ya na-alụ. Ha ji Baịbụl mesie m obi ike na Jehova hụrụ m n’anya. Ha kpekwaara m ekpere. O mere ka ọ dịrị m mfe ịnabata ndụmọdụ ha ji Baịbụl nye m.” Ka oge na-aga, nwanna a mere ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. Ọ sịrị: “Aghọtala m ugbu a na anyị nwee nsogbu, anyị kwesịrị ịchọ enyemaka, kama naanị anyị ịgbalịwa ka anyị dozie ya.”

17 I kwesịrị ịchọ enyemaka ozugbo ma ọ bụrụ na ihe mere omume rụrụ arụ ji agụ gị bụ na ị na-ele ndị gba ọtọ. Ọ bụrụ na anyị achọghị enyemaka ozugbo, ọchịchọ ọjọọ nwere ike ‘ịtụrụ ime,’ mee ka anyị mehie, kpatara ndị ọzọ obi mgbawa, meekwa ka a kọchaa aha Jehova. Ọtụtụ ndị agakwurula ndị okenye ka e nyere ha aka n’ihi na ha chọrọ ime Jehova obi ụtọ ma nọsie ike n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Jems 1:15; Ọma 141:5; Hib. 12:5, 6.

KPEBISIE IKE IZERE OMUME RỤRỤ ARỤ

18. Gịnị ka i kpebiri ime?

18 Ka omume ndị mmadụ na-eretọkwu n’ụwa Setan a, chegod ụdị obi ụtọ Jehova na-enwe ka ndị na-efe ya na-agbasi mbọ ike ime ihe dị ya mma ma na-ezere omume rụrụ arụ. N’ihi ya, ka anyị niile kpebisie ike ịnọ Jehova nso ma na-anabata ndụmọdụ o si n’Okwu ya nakwa n’ọgbakọ ya na-enye anyị. Izere omume rụrụ arụ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a, obi eruokwa anyị ala. (Ọma 119:5, 6) E bibichaa Setan n’ọdịnihu, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ebe a na-agaghị enwe ihe ga-eme ka anyị na-eche ihe ọjọọ.