Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2015

“Ebe Ọ Bụ na Kingsley Mere Ya, M Ga-emeli Ya”

“Ebe Ọ Bụ na Kingsley Mere Ya, M Ga-emeli Ya”

E NWERE otu nwoke aha ya bụ Kingsley. N’ụbọchị mbụ o mere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ malitere ịgụ Baịbụl ozugbo a kụtụrụ ya aka n’ubu. O ji nwayọọ na-akpọpụta okwu niile nke ọma. E nweghị nke ọ na-akpọtaghị. Ma, ọ naghị ele anya na Baịbụl. Maka gịnị?

Kingsley bi na Siri Lanka. O kpuru ìsì, bụrụ onye ntị ike, daakwa ngwọrọ. Olee otú nwoke a si mụta banyere Jehova? Oleekwa otú o si ruo eru ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ka m kọọrọ gị.

Mgbe mbụ m hụrụ Kingsley, obi tọrọ m ụtọ n’ihi otú o si chọsie ike ịmata eziokwu Baịbụl. Ya na ụfọdụ Ndịàmà Jehova amụọla Baịbụl. O nwere akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ma o meela ochie. * O kwetara ka m malite ịmụrụ ya ihe. Ma, e nwere ihe abụọ mere ka o sitụrụ anyị ike.

Nke mbụ bụ na Kingsley na ọtụtụ ndị ọzọ bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi na ndị nwere nkwarụ. M na-eti mkpu ka o wee nụ ihe m na-ekwu n’ihi na ọ bụ onye ntị ike, mkpọtụ na-adịkwa n’ebe ahụ. N’eziokwu, onye  ọ bụla nọ n’ebe ahụ na-anụ ihe anyị na-amụ kwa izu.

Nke abụọ bụ na ọ bụ naanị ihe ole na ole ka Kingsley ga-agụli ma ghọta ma anyị mụwa ihe. N’ihi ya, Kingsley na-akwado nke ọma. Tupu mụ abịa, ọ na-agụ ebe anyị ga-amụ ọtụtụ ugboro, jirikwa Baịbụl ndị ìsì ya gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị ebe ahụ, chepụtakwa otú ọ ga-esi zaa ajụjụ niile dị ebe ahụ. Otú a o si akwado baara anyị ezigbo uru. Anyị mụwa ihe, ọ na-agwọrọ na rọg a tụrụ n’ala. Ọ na-eti aka ya n’ala ma tisie mkpu ike ma ọ kọwawa ihe ọ mụtara. Ka oge na-aga, anyị malitere ịmụ ihe ugboro abụọ n’izu. Ọmụmụ ihe nke ọ bụla na-ewekwa anyị awa abụọ.

ỊGA ỌMỤMỤ IHE NA ỊZA AJỤJỤ N’ỌMỤMỤ IHE

Kingsley na Paul

Ọ na-agụsi Kingsley ike ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ dịghị mfe. A ga-ekunye ya n’oche ndị ngwọrọ, kupụta ya, kuba ya n’ụgbọala, sikwa ebe ahụ kuba ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, ọtụtụ ụmụnna na-eke onwe ha eke inyere ya aka. Ha na-ewerekwa ya ka ihe ùgwù. A gaa ọmụmụ ihe, Kingsley na-edewe ígwè okwu n’akụkụ ntị ya, na-ege ntị nke ọma, na-azakwa ajụjụ.

Mgbe Kingsley mụrụ ihe ruo ọnwa ole na ole, o kpebiri idenye aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Mgbe ọ fọrọ izu abụọ ka o mee ihe omume mbụ ya, m jụrụ ya ma ọ̀ na-akwadokwa. Ya ejiri obi ike sị m, “Ee, Nwanna m, amụọla m ya ugboro iri atọ.” M jara ya mma maka mgbalị ya, sịzie ya gụọ ya ka m nụ. Ya emeghee Baịbụl ndị ìsì ya, tụkwasị ya aka, gụwa. Ma, m chọpụtara na ọ naghị atụ ihe ọ na-agụ aka otú ndị ìsì si eme. O burula ebe ahụ niile ọ ga-agụ n’isi.

Ihe ahụ tụrụ m n’anya, anya mmiri agbaa m. M jụrụ Kingsley otú o si nwee ike iburu ebe ahụ n’isi nke ọma ebe ọ bụ naanị ugboro iri atọ ka ọ mụrụ ya. Ya asị m: “Mba, m na-amụ ya ihe dị ka ugboro iri atọ kwa ụbọchị.” Kemgbe ihe karịrị otu ọnwa, Kingsley na-anọ na rọg na-amụ ihe omume ya, na-amụgharịkwa ya ruo mgbe o buuru ha niile n’isi.

Ụbọchị Kingsley ga-eme ihe omume ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mechara ruo. Mgbe o mechara ya, ụmụnna niile kụrụ aka dara ụda, anya mmiri gbakwara ọtụtụ ndị n’ihi mbọ nwanna a gbara. Otu nwanna nwaanyị nke kwụsịburu ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi n’ihi ụjọ gara gwa onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka o denyeghachi aha ya. N’ihi gịnị? Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na Kingsley mere ya, m ga-emeli ya.”

Kingsley mụrụ ihe ruo afọ atọ. N’abalị isii n’ọnwa Septemba afọ 2008, e mere ya baptizim. O ji obi ya niile fegide Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ n’abalị iri na atọ n’ọnwa Mee afọ 2014. Obi siri Kingsley ike na ọ ga-ejere Jehova ozi na Paradaịs mgbe ọ ga-agbasi ike, ahụ́ adịkwa ya mma. (Aịza. 35:5, 6)—Akụkọ Paul McManus kọrọ.

^ para. 4 E bipụtara ya n’afọ 1995. Ma, a naghịzi ebipụta ya.