Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2015

Kraịst Bụ Ike nke Chineke

Kraịst Bụ Ike nke Chineke

‘Kraịst bụ ike nke Chineke.’—1 KỌR. 1:24.

1. Gịnị mere Pọl ji sị na ‘Kraịst bụ ike nke Chineke’?

JEHOVA si n’ihe ndị Jizọs Kraịst mere gosi ike ya dị egwu. Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ ụfọdụ ọrụ ebube Jizọs rụrụ, bụ́ ndị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. O nwere ike ịbụ na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ. (Mat. 9:35; Luk 9:11) N’eziokwu, ihe ndị Jizọs mere gosiri na Chineke nyere ya ike. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji sị na ‘Kraịst bụ ike nke Chineke.’ (1 Kọr. 1:24) Ma, olee uru ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ baara anyị?

2. Gịnị ka anyị ga-amụta n’ọrụ ebube Jizọs rụrụ?

2 Pita onyeozi kwuru na Jizọs rụrụ ọrụ ebube. (Ọrụ 2:22) Ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri ihe ọma ka ukwuu ọ ga-eme mgbe ọ ga na-achị n’Alaeze Chineke. Jizọs ji ọrụ ebube ndị ahụ gosi ihe ọ ga-eme n’ebe niile n’ụwa ọhụrụ. Ọrụ ebube ndị ahụ na-enyekwara anyị aka ịghọta ma àgwà Jizọs ma àgwà Nna ya. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ọrụ ebube Jizọs rụrụ ma hụ otú ha ga-esi baara anyị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

 ỌRỤ EBUBE NKE NA-AKỤZIRI ANYỊ ỊNA-EMESAPỤ AKA

3. (a) Kọọ ihe ndị mere tupu Jizọs arụọ ọrụ ebube mbụ ya. (b) Mgbe Jizọs gara Kena, olee otú o si gosi na ya na-emesapụ aka?

3 Ọ bụ mgbe Jizọs gara oriri agbamakwụkwọ na Kena nke Galili ka ọ rụrụ ọrụ ebube mbụ ya. O yiri ka ndị bịara ya karịrị mmadụ ole a tụrụ anya. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na mmanya gwụrụ. Meri nne Jizọs so ná ndị bịara oriri ahụ. O doro anya na kemgbe ọtụtụ afọ, o cheela banyere amụma niile e buru gbasara nwa ya, marakwa na a ga-akpọ ya “Ọkpara nke Onye Kasị Elu.” (Luk 1:30-32; 2:52) Ọ̀ ma na Jizọs egosibeghị ike ya? Otu ihe doro anya bụ na Meri na Jizọs nweere ndị ahụ gbara akwụkwọ na Kena ọmịiko, chọọkwa ka ihere ghara ime ha. Jizọs ma na onye kpọrọ ndị mmadụ oriri kwesịrị inye ha mmanya. N’ihi ya, ọ rụrụ ọrụ ebube, mee ka ihe dị ka otu narị galọn mmiri ghọọ “mmanya dị mma.” (Gụọ Jọn 2:3, 6-11.) Iwu ò ji Jizọs ịrụ ọrụ ebube a? Mba. Ọ chọrọ igosi na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi nakwa na ọ na-emesapụ aka ka Nna ya nke eluigwe.

4, 5. (a) Gịnị ka ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ na-akụziri anyị? (b) Gịnị ka ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ na Kena na-akụziri anyị banyere ọdịnihu?

4 Jizọs rụrụ ọrụ ebube mee ka e nwee ezigbo mmanya buru ibu, nke ga-ezuru ọtụtụ ndị. Ị̀ hụrụ ihe ọrụ ebube ahụ na-akụziri anyị? Otú ahụ Jizọs si jiri obi ya niile rụọ ọrụ ebube ahụ mere ka obi sie anyị ike na ya na Nna ya anaghị eji otú obi dị ndị mmadụ egwu egwu. Ha adịghị aka ntagide. Chegodị otú Jehova ga-esi jiri ike ya mee ka nri ju ebe niile n’ụwa ọhụrụ.—Gụọ Aịzaya 25:6.

5 Chegodị echiche. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-egboro anyị mkpa anyị niile, mee ka onye ọ bụla nwee ụlọ mara mma na ezigbo nri. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị cheta ihe ọma niile Jehova ga-emere anyị mgbe ụwa ga-abụ Paradaịs.

Ọ bụrụ na anyị na-ewepụta oge anyị enyere ndị ọzọ aka, ọ ga-egosi na anyị na-emesapụ aka ka Jizọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee ihe Jizọs ji ike ya mee? Olee otú anyị ga-esi ṅomie ya?

6 I chetaranụ na mgbe Ekwensu nwara Jizọs ka o mee ka nkume ghọọ achịcha, Kraịst ekweghị eji ike ya arụ ọrụ ebube ga-abara naanị ya uru. (Mat. 4:2-4) Ma, o ji ike ya mee ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jizọs? Jizọs gwara anyị ka anyị na-enye ndị ọzọ ihe. (Luk 6:38) Otú anyị ga-esi mee ya bụ ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa n’ụlọ anyị ka anyị na ha rikọọ nri ma kwurịta ihe gbasara Okwu Chineke. A gbasaa ọmụmụ ihe, anyị nwere ike iwepụta oge nyere nwanna aka, dị ka ige nwanna nwere ihe omume ntị mgbe ọ na-amụgharị ya. Anyị nwekwara ike inye aka na-akụziri ndị ọzọ otú e si ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị  na-enyere ndị ọzọ aka ma na-akụziri ha ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-egosi na anyị na-emesapụ aka ka Jizọs.

‘HA NIILE RIRI, RIJUO AFỌ’

7. Olee nsogbu ga-adịgide n’ụwa ochie a?

7 Ogbenye dị kemgbe ụwa. Jehova gwara ụmụ Izrel na e nweghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala ha. (Diut. 15:11) Ka ọtụtụ narị afọ gachara, Jizọs kwuru, sị: “Unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile.” (Mat. 26:11) Okwu Jizọs ọ̀ pụtara na a ga-enwe ndị ogbenye n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi? Mba. Ọ pụtara na o nweghị mgbe ogbenye na-agaghị adị n’ụwa ochie a. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ na Jizọs ji ọrụ ebube ndị ahụ ọ rụrụ gosi na ihe ga-aka mma mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa. N’oge ahụ, ogbenye agaghịzi adị, nri ga-abụkwa atụrụ tawa.

8, 9. (a) Gịnị mere Jizọs ji nye ìgwè mmadụ nri? (b) Olee otú obi na-adị gị ma ị gụọ banyere ọrụ ebube ahụ?

8 Ọbụ abụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka gị, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.” (Ọma 145:16) “Kraịst, bụ́ ike nke Chineke,” mere ka Nna ya. O gbooro ndị na-eso ụzọ ya mkpa ha ugboro ugboro. O meghị ya iji gosi na ọ ga-arụli ọrụ ebube. Kama, ọ bụ iji gosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Ka anyị tụlee Matiu 14:14-21. (Gụọ ya.) Ìgwè mmadụ si n’obodo dị iche iche jiri ụkwụ chọrọ Jizọs bịa. (Mat. 14:13) Ná mgbede, ndị na-eso ụzọ ya malitere iche ihe ndị ahụ ga-eri n’ihi na agụụ ji ha, ike gwụchakwara ha. N’ihi ya, ha gwara Jizọs ka ọ sị ìgwè mmadụ ahụ lawa gaa zụrụ ihe ha ga-eri. Gịnị ka Jizọs ga-eme?

9 Jizọs ji ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ nye puku ụmụ nwoke ise na ọtụtụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka nri. Ọ̀ bụ na obi anaghị adị anyị ụtọ ma anyị cheta otú Jizọs si jiri ike ya rụọ ọrụ ebube iji gbooro ezinụlọ dị iche iche mkpa ha, ma ụmụntakịrị? Baịbụl kwuru na oké ìgwè mmadụ ahụ ‘riri, rijuo afọ.’ Ọ pụtara na nri juru eju, bara abara. Jizọs nyere ha nri ga-eme ka ike dị ha ịlaghachi n’ebe dị anya ha si bịa. (Luk 9:10-17) Ihe ha rifọrọ juru nkata iri na abụọ.

10. Gịnị ka Chineke ga-eme ịda ogbenye n’oge na-adịghị anya?

10 Anyaukwu ndị ọchịchị na arụrụala ha emeela ka imirikitiimi daa ogbenye. E nwedịrị ụmụnna ndị na-anaghị ‘eriju afọ.’ Ma n’oge na-adịghị anya, ndị niile na-erubere Chineke isi ga-ebi n’ụwa ebe arụrụala na ịda ogbenye na-agaghị adị. A sị na ị ga-emeli ya, ọ̀ bụ na ị gaghị egboro ụmụ mmadụ mkpa ha? Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ga-emeli ya, ọ ga-emekwa ya n’oge na-adịghị anya. Ọ gaghịkwa egbu oge.—Gụọ Abụ Ọma 72:16.

11. Gịnị mere obi ji sie gị ike na Kraịst ga-eji ike ya mee ihe ga-abara ụwa niile uru? Oleekwa ihe i kpebiri ime?

11 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ naanị afọ atọ na ọkara ka ọ rụrụ ọrụ ebube n’obodo ole na ole. (Mat. 15:24) Ma mgbe Jizọs ga-achị otu puku afọ, ọ ga-enyere ụmụ mmadụ niile aka. (Ọma 72:8) Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-eme ka obi sie anyị ike na ọ chọrọ iji ike ya mee ihe dị mma nakwa na ọ ga-eme ya n’oge na-adịghị anya. Anyị agaghị arụli ọrụ ebube, ma anyị ga-ejili obi anyị niile na-agwa ndị ọzọ banyere ọmarịcha nkwa ndị Chineke kwere anyị na Baịbụl. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime ebe  anyị bụ Ndịàmà Jehova. (Rom 1:14, 15) Ka ịtụgharị uche n’ihe ndị a mee ka anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke.—Ọma 45:1; 49:3.

ỊCHỊKWA IFUFE NA OKÉ OSIMIRI

12. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jizọs ghọtara ihe niile dị n’ụwa?

12 Mgbe Chineke na-eke ụwa na ihe ndị dị n’ime ya, Ọkpara ya ọ mụrụ naanị ya “nọ n’akụkụ ya dị ka onye ọkà ọrụ.” (Ilu 8:22, 30, 31; Kọl. 1:15-17) N’ihi ya, Jizọs ghọtara ihe ndị dị n’ụwa nke ọma nakwa otú ha si arụ ọrụ. Ọ ma ihe o nwere ike iji ha mee na otú ọ ga-esi hazie ha ka ha na-arụ ọrụ nke ọma.

Gịnị masịrị gị n’otú Jizọs si rụọ ọrụ ebube? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

13, 14. Nye ihe atụ gosiri otú Jizọs si chịkwaa oké ifufe na oké osimiri.

13 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, otú o si chịkwaa ifufe na oké osimiri gosiri na ọ bụ “ike nke Chineke.” Chegodị ihe o mere mgbe oké ifufe chọrọ ime ka ụgbọ ha kpuo. (Gụọ Mak 4:37-39.) Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “oké ifufe” [na Mak 4:37] pụtara ifufe na-ebibi ihe. Ụdị ifufe ahụ fewe, ebe niile agbajie, égbè eluigwe ana-agba, nnukwu mmiri ana-ezokwa. Ọ na-efesasịkwa ihe niile.

14 Weregodị ya na ị na-ahụ ihe na-emenụ. Oké ebili mmiri na oké ifufe nọ na-enugharị ụgbọ mmiri Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na ya. Mmiri na-awụjukwa n’ụgbọ ahụ. N’agbanyeghị ụzụ oké ifufe ahụ na-eme na otú mmiri ahụ si na-enugharị ụgbọ ha, Jizọs nọ na-ehiri ụwa ya ụra. Ezigbo ike gwụchara ya n’ihi ozi ọma o kwusara. Ụjọ ji ndị na-eso ụzọ ya, ha akpọtee ya, sị ya: “Anyị na-aga ịla n’iyi!” (Mat. 8:25) Jizọs biliri gwa oké ifufe ahụ na oké osimiri ahụ, sị: “Shịị! Daa jụụ!” Ifufe ahụ wee kwụsị. (Mak 4:39) E nwere ike ikwu na Jizọs nyere oké ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ iwu, “ebe niile wee daa jụụ.” Jizọs gosiri na o nwere ike n’eziokwu.

15. Olee otú Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile si gosi na ya ga-achịkwali ma mmiri ozuzo ma oké ifufe?

15 Ọ bụ Jehova nyere Kraịst ike. N’ihi ya, obi siri anyị ike na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ga-achịkwali ma mmiri ozuzo ma oké ifufe. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Tupu Iju Mmiri, Jehova kwuru, sị: “Ọ fọrọ naanị ụbọchị asaa ka m mee ka mmiri zoo n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.” (Jen. 7:4) Ọpụpụ 14:21 kwuru, sị: “Jehova wee malite iji oké ifufe siri ike nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mee ka oké osimiri ahụ laghachi azụ.” Jona 1:4 kwukwara, sị: “Jehova wee mee ka oké ifufe fekwasị oké osimiri ahụ, e wee nwee oké ebili mmiri n’oké osimiri ahụ; ụgbọ mmiri ahụ wee chọwa ikpu ihu.” Obi dị anyị ụtọ ịma na Jehova ga-achịkwali ihe ndị a niile. O doro anya na ọ gaghị ekwe ka ha bibie ihe ọ bụla n’ụwa ọhụrụ.

16. Gịnị mere obi ji dị anyị ụtọ na Jehova na Jizọs nwere ike ịchịkwa ma oké ifufe ma ihe ndị ọzọ na-emebi ihe?

16 Obi ga-esi anyị ike ma anyị cheta ike dị egwu Onye kere anyị na “onye ọkà ọrụ” ya nwere. Na puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, obi ga-eru ndị niile ga-ebi n’ụwa ala. Ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịzi na-eme. N’ụwa ọhụrụ, ndị mmadụ agaghịzi na-atụ ụjọ na idei mmiri, ala ọma jijiji, ma ọ bụ oké ifufe ga-emerụ ha ahụ́. Obi na-adị anyị ụtọ icheta na ọ gaghị adị anya, ọdachi agaghịzi na-egbu ndị mmadụ ma ọ bụ merụọ ha ahụ́ n’ihi na ‘ụlọikwuu  nke Chineke ga-adịnyere mmadụ.’ (Mkpu. 21:3, 4) Obi siri anyị ike na n’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, Chineke ga-enye ya ike ọ ga-eji chịkwaa oké ifufe na ihe ndị ọzọ na-emebi ihe.

ṄOMIE CHINEKE NA KRAỊST UGBU A

17. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi ṅomie Chineke na Kraịst?

17 O doro anya na anyị agaghị egbochili ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọ bụ naanị Jehova na Jizọs nwere ike ime otú ahụ. Ma, anyị ga-emeli ihe e kwuru n’Ilu 3:27. (Gụọ ya.) Mgbe ihe na-esiri ụmụnna anyị ike, anyị nwere ike ịkasi ha obi, gbookwara ha ụfọdụ mkpa ha. (Ilu 17:17) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inyere ha aka mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha mere. Mgbe oké ifufe na idei mmiri mebisịrị ụlọ otu nwanna nwaanyị, ọ sịrị: “Obi dị m ezigbo ụtọ ịnọ n’ọgbakọ Jehova, ọ bụghị naanị maka aka ụmụnna nyeere m, kama, n’ihi ume ha gbara m.” Mgbe oké mmiri ozuzo mebiri ụlọ nwanna nwaanyị ọzọ na-alụbeghị di, ike ụwa gwụrụ ya. Ma, mgbe ụmụnna nyechaara ya aka rụgharịa ụlọ ya, ọ sịrị: “Amaghị m ihe m ga-ekwu. Enweghị m ike ịkọwa otú obi dị m . . . Jehova, i meela.” Obi dị anyị ụtọ na anyị na ụmụnna anyị nọ ná nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ. Anyị hụkwara ibe anyị n’anya, na-enyekwara ha aka. Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova na Jizọs Kraịst n’obi.

18. Gịnị masịrị gị banyere ihe mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube?

18 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ya bụ “ike nke Chineke.” Ma, gịnị mere o ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ? Ọ bụghị iji gosi ike ya ma ọ bụ mee ihe ga-abara onwe ya uru. Kama, ọrụ ebube ndị ahụ gosiri na Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Anyị ga-atụlekwu banyere ya n’isiokwu na-esonụ.