Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2015

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Ndị Kraịst hà kwesịrị ikpegara Jizọs Kraịst ekpere?

Mba. Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpegara Jehova ekpere. Ekpere ya gosikwara na ọ bụ Nna ya ka anyị kwesịrị ịna-ekpegara ekpere. (Mat. 6:6-9; Jọn 11:41; 16:23) N’ihi ya, ọ bụ Chineke ka ndị mbụ soro ụzọ Jizọs kpegaara ekpere, ọ bụghị Jizọs. (Ọrụ 4:24, 30; Kọl. 1:3)—1/1, peeji nke 14.

Olee ihe ndị anyị ga na-eme kwa afọ iji kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Otu n’ime ha bụ ịna-agụ Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Anyị nwekwara ike iwepụtakwu oge gaa ozi ọma. Anyị kwesịkwara ịna-ekpe ekpere ma na-atụgharị uche n’olileanya Chineke mere ka anyị nwee.—1/15, peeji nke 14-16.

Olee ihe mechara mee ndị mkpọrọ abụọ ahụ kọọrọ Josef nrọ gbara ha gharịị?

Josef gwara obu ihe ọṅụṅụ Fero na a ga-akpọghachi ya n’ọrụ ya. Ma ihe nrọ onye na-emere Fero achịcha pụtara bụ na a ga-egbu ya, kwụwa ya n’osisi. Ihe ahụ Josef kọwaara ha mere. (Jen. 40:1-22)—2/1, peeji nke 12-14.

Olee onyinye pụrụ iche e nyere ụmụnna nọ na Japan?

E wepụtaara ha otu akwụkwọ nta. Ihe dị na ya bụ akwụkwọ Matiu nke si ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ha na-enye ya ndị mmadụ n’ozi ọma. Ọtụtụ ndị ihe gbasara Baịbụl na-edochaghị anya na-enwe mmasị ịgụ ya.—2/15, peeji nke 3.

Olee ihe ndị mere n’oge ndịozi Jizọs mere ka ozi ọma ruo ọtụtụ ebe?

Oge udo e nwere na Rom mere ka ọgba aghara ghara ịdị. Ndị Kraịst mbụ si n’okporo ụzọ ndị a rụrụ n’oge ahụ gaa kwusaa ozi ọma n’ebe dị iche iche. A na-asụ Grik n’ọtụtụ ebe n’oge ahụ. N’ihi ya, ọ dị mfe iji ya zie ndị mmadụ ozi ọma, ma ndị Juu bi n’ebe dị iche iche ndị Rom na-achị. Ndị na-eso ụzọ Jizọs jikwa iwu ndị Rom na-akwado ozi ọma ha na-ekwusa.—2/15, peeji nke 20-23.

Gịnị mere ezi Ndị Kraịst anaghị agba Ista?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ ya. (Luk 22:19, 20)—3/1, peeji nke 8.

Kemgbe afọ ndị na-adịbeghị anya, gịnị mere akwụkwọ anyị anaghịzi ekwukarị gbasara ihe akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl nọchiri anya ya?

Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nọchiri anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Otu ihe atụ bụ ihe Pọl kwuru ná Ndị Galeshia 4:21-31. Ma, ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị ya hoo haa, anyị ekwesịghị ichewe ma ọ bụ kwuwe na e nwere ihe akụkọ a kọrọ na Baịbụl nọchiri anya ya. Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị mata ihe anyị ga-amụta n’ihe ndị a kọrọ akụkọ ha nakwa n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha. (Rom 15:4)—3/15, peeji nke 17-18.

Gịnị mere iberibe akwụkwọ papaịrọs a chọtara n’otu ebe a na-ekpofu ihe n’Ijipt oge ochie ji baa uru?

N’ihe dị ka n’afọ 1920, a chọtara otu iberibe akwụkwọ papaịrọs e dere amaokwu ụfọdụ si n’Oziọma Jọn. O nwere ike ịbụ na e dere ya ihe dị ka afọ iri abụọ na ise Jọn onyeozi nwụchara. Ihe e dere na ya gosiri na ihe dị na Baịbụl mbụ na ihe dị na nke anyị nwere taa bụ otu nakwa na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu.—4/1, peeji nke 10-11.

Gịnị mere ịchụpụ onye na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ ji egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya?

Baịbụl kwuru banyere ịchụpụ onye mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ, nke nwere ike ịba ezigbo uru. (1 Kọr. 5:11-13) Ọ na-eme ka a sọpụrụ aha Chineke, ka a ghara imetọ ọgbakọ Ndị Kraịst nakwa ka anya doo onye mere ihe ọjọọ.—4/15, peeji nke 29-30.