Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2015

“Otú Ahụ Bụ Ụzọ Ị Kwadoro”

“Otú Ahụ Bụ Ụzọ Ị Kwadoro”

“I zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma ma kpugheere ha ụmụ ọhụrụ.”—LUK 10:21.

1. Gịnị mere Jizọs ji “nwee oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ”? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

CHEGODỊ otú ọ ga-adị gị ịhụ Jizọs ka “o nwere oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ.” Werekwa ya na ị na-ahụ ya ka ọ na-amụmụ ọnụ ọchị. Olee ihe mere o ji nwee ụdị obi ụtọ a? Ọ dịbeghị anya o zipụrụ mmadụ iri asaa n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ chọsịrị ike ịma otú ha ga-esi rụọ ọrụ a o nyere ha. E nwere ọtụtụ ndị na-emegide ozi ọma ahụ, dị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bụ́ ndị gụrụ oké akwụkwọ, dịkwa aghụghọ. Ha mere ka ọtụtụ ndị na-ele Jizọs anya ka naanị ọkwá nkà, na-elekwa ndị na-eso ụzọ ya anya ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13; Mak 6:3) Ma, ka ndị na-eso ụzọ ya gachara ozi ọma lọta, ọṅụ juru ha obi. Ha kwusara ozi ọma n’agbanyeghị ndị na-emegide ha, ma ndị mmụọ ọjọọ. Gịnị mere ha ji nwee ọṅụ na obi ike?—Gụọ Luk 10:1, 17-21.

2. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si bụrụ ụmụ ọhụrụ? (b) Gịnị nyeere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka ịghọta eziokwu ndị dị na Baịbụl?

2 Jizọs gwara Jehova, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ. Ee, Nna, n’ihi na ime otú ahụ bụ ụzọ ị kwadoro.”  (Mat. 11:25, 26) O doro anya na ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ndị na-eso ụzọ ya bụ ụmụ ọhụrụ. Kama, ọ ma na ha yiri ụmụ ọhụrụ ma e jiri ha tụnyere ndị Farisii, bụ́ ndị gụrụ oké akwụkwọ na ndị maara ihe n’anya onwe ha. Ihe ọzọ bụ na Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha dị ka ụmụaka, na-adị umeala n’obi ma na-achọ ịmụta ihe. (Mat. 18:1-4) Olee otú ịdị umeala n’obi si baara ndị na-eso ụzọ Jizọs uru? Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka ha ghọta eziokwu bara uru ndị dị na Baịbụl. Ma, ndị maara ihe na ndị gụrụ oké akwụkwọ ledara ndị na-eso ụzọ Jizọs anya. Setan na mpako ha mere ka ha kpuo ìsì.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji nwee ọṅụ. Obi dị ya ụtọ ịhụ otú Jehova si mee ka ndị dị umeala n’obi mata eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’agbanyeghị na ha agụghị oké akwụkwọ. Obi dịkwa ya ụtọ maka otú Nna ya si akụziri ndị mmadụ ihe. Jehova ọ̀ gbanweela? Olee otú o si egosi na ya ka chọrọ ka a na-akụziri ndị dị umeala n’obi ihe otú ha ga-aghọta ya? Ka anyị na-eleba anya n’azịza ajụjụ ndị a, anyị ga-enwe obi ụtọ otú ahụ Jizọs nwere.

IME KA ONYE Ọ BỤLA GHỌTA EZIOKWU NDỊ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ

4. Olee otú Ụlọ Nche nke e ji Bekee dị mfe dee si bụrụ onyinye magburu onwe ya?

4 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, nzukọ Jehova emeela ka a ghọta na ọ dị ezigbo mkpa ka a na-akụzi ihe otú ọ ga-adị mfe nghọta ma dokwuo anya. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ. Nke mbụ bụ Ụlọ Nche nke e ji Bekee dị mfe dee. * Ọ bụ onyinye magburu onwe ya e nyere ndị ọ na-esiri ike ịgụ Bekee na ịghọta ya. Ndị nne na nna achọpụtala na Ụlọ Nche a na-enyere ụmụ ha aka ịghọta ihe a na-amụ n’ọgbakọ. Ọtụtụ ndị edegarala Òtù Na-achị Isi akwụkwọ ozi iji gosi otú obi dị ha. Otu nwanna nwaanyị kwuru na ya anaghị azabu ajụjụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. Ọ sịrị: “Ihere anaghị ekwe m tinye ọnụ.” Ma, ihe agbanweela ugbu a. Mgbe ọ malitere ịgụ Ụlọ Nche nke e ji Bekee dị mfe dee, o dere, sị: “M na-azazi ajụjụ karịa otu ugboro. Ụjọ anaghịzi atụ m. M na-ekele Jehova, na-ekelekwa unu.”

5. Olee uru Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Bekee nke ọhụrụ bara?

5 Nke abụọ bụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị edegharị. E wepụtara ya n’abalị ise n’ọnwa iri n’afọ 2013 ná Nnọkọ A Na-enwe Kwa Afọ. * Otú e si degharịa ọtụtụ amaokwu mere ka ha ghara ito ogologo. Ma, ihe amaokwu ndị ahụ na-ekwu agbanweghị. Ha dịzi mfe nghọta. Dị ka ihe atụ, na Baịbụl Bekee nke ochie, mkpụrụ okwu dị na Job 10:1 dị iri abụọ na asaa. Ma, na nke ọhụrụ a, ọ dịzi iri na itoolu. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’Ilu 8:6. Mkpụrụ okwu dị na ya dịbu iri abụọ. Ma, ọ dịzi iri na atọ. Amaokwu ndị ahụ dokwuru anya na Baịbụl ọhụrụ a. Otu nwanna e tere mmanụ ferela Jehova ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: “M ka gụchapụrụ akwụkwọ Job na Baịbụl Bekee ọhụrụ a. Ọ dị m ka ọ̀ bụ ugbu a ka m ghọtara ihe ọ na-ekwu.” Ọtụtụ ndị ekwuokwala ụdị ihe a.

6. Olee otú obi dị gị banyere otú e si mee ka Matiu 24:45-47 dokwuo anyị anya?

6 Nke atọ bụ ihe ndị e mere ka ha dokwuo anyị anya na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, obi dị anyị ezigbo ụtọ mgbe e mere  ka anyị ghọta nke ọma onye bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” n’Ụlọ Nche Julaị 15, 2013. (Mat. 24:45-47) A kọwaara anyị na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ Òtù Na-achị Isi nakwa na ndị bụ́ “ezinụlọ” ahụ a na-elekọta bụ ndị niile a na-akụziri Okwu Chineke n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma hà so ‘n’atụrụ ọzọ.’ (Jọn 10:16) Eziokwu ndị a a na-akụziri anyị na-eme anyị obi ụtọ, obi na-adịkwa anyị ụtọ ịkụziri ha ndị ọzọ. Olee otú ọzọ Jehova sirila gosi na ọ chọrọ ka a na-akụziri ndị mmadụ ihe otú ọ ga-edo ha anya, dịkwara ha mfe nghọta?

ỤZỌ DỊ MFE E SI KỌWAA AKỤKỌ NDỊ DỊ NA BAỊBỤL

7, 8. Olee ihe ụfọdụ dị na Baịbụl nwere ihe ha na-anọchi anya ha?

7 Ọ bụrụ na ọ dịla anya i fewere Jehova, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na e nweela ihe ụfọdụ a gbanwerela n’otú akwụkwọ anyị si akọwa ihe ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, n’oge gara aga, akwụkwọ anyị na-ekwukarị na akụkọ ndị dị na Baịbụl na-anọchi anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. È nwere ihe dị na Baịbụl gosiri na e kwesịrị isi otú ahụ akọwa ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl? Azịza ya bụ ee. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru banyere “ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma.” (Gụọ Matiu 12:39, 40.) Jizọs kọwara na oge Jona nọrọ n’afọ azụ̀ ahụ nọchiri anya oge Jizọs ga-anọ n’ili. Afọ azụ̀ ahụ gaara abụ ili Jona ma a sị na Jehova echebeghị ya.

8 E nwere akụkọ Baịbụl ndị ọzọ nọchiri anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ n’ime ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl ji adịm ná mma Ebreham, Hega, na Sera buo amụma banyere adịm ná mma Jehova, mba Izrel, na nzukọ Chineke dị n’eluigwe. (Gal. 4:22-26) Otú ahụ ka ụlọikwuu, ụlọ nsọ, Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà, na ihe ndị ọzọ dị n’Iwu Mozis si bụrụ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Hib. 9:23-25; 10:1) Ịmụ gbasara ihe ndị a na ihe ha nọchiri anya ha na-atọ anyị ụtọ, na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike. Ma, ọ̀ pụtara na onye ọ bụla a kọrọ akụkọ ya ma ọ bụ ihe ọ bụla dị na Baịbụl nwere ihe ọ na-anọchi anya ya?

9. Olee otú e si kọwaa akụkọ Nebọt n’oge gara aga?

9 N’oge gara aga, akwụkwọ anyị na-ekwukarị na n’akụkọ ụfọdụ dị na Baịbụl, onye ma ọ bụ ihe ọ bụla e kwuru okwu ya nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe anyị cheburu banyere akụkọ Nebọt. Ajọ eze nwaanyị bụ́ Jezibel mere ka di ya bụ́ Ehab gbuo Nebọt ka o nwee ike iwere ubi vaịn ya. (1 Eze 21:1-16) N’afọ 1932, Ụlọ Nche kọwara na Ehab na Jezibel nọchiri anya Setan na ndị òtù ya, ebe Nebọt nọchiri anya Jizọs, ọnwụ Nebọt anọchie anya ogbugbu e gburu Jizọs. Ma n’afọ 1961, akwụkwọ bụ́ “Let Your Name Be Sanctified” kwuru na Nebọt nọchiri anya ndị e tere mmanụ, Jezibel anọchie anya Krisendọm. O kwukwara na mkpagbu Jezibel kpagburu Nebọt nọchiri anya mkpagbu a na-akpagbu ndị e tere mmanụ n’oge ikpeazụ a. Kemgbe ọtụtụ afọ, otú a e si kọwaa akụkọ Baịbụl a mere ka okwukwe ndị ohu Chineke sie ike. Gịnịzi mere ihe ji gbanwee?

10. (a) Olee otú ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-aghọtakwu si eme ka ha na-akpachapụkwu anya? (b) Gịnị ka akwụkwọ anyị na-elekwasịkarị anya na ya ugbu a?

10 Kemgbe ọtụtụ afọ, Jehova na-enyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye  nwekwara uche” aka ịna-akpachapụkwu anya n’otú ha si akọwa Baịbụl. Ha anaghị ekwu na akụkọ Baịbụl nwere ihe ọ nọchiri anya ya ọ gwụla ma Baịbụl ò kwuru ihe doro anya gosiri na ihe ahụ nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Ihe ọzọ bụ na a chọpụtala na otú ahụ e si kọwaa ụfọdụ akụkọ Baịbụl na ihe ndị a sịrị na ha nọchiri anya ha na-esiri ọtụtụ ndị ike nghọta. Icheta onye akụkọ nke ọ bụla nọchiri anya ya na ihe mere o ji nọchie anya ya na-esi ike. Nke kachanụ bụ na ihe e kwesịrị ịmụta n’akụkọ ndị ahụ anaghị edocha ọtụtụ ndị anya n’ihi otú e si akọwa ha. N’ihi ya, akwụkwọ anyị na-ekwukarị gbasara ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta banyere ịsọpụrụ Chineke, inwe okwukwe, ndidi, na àgwà ndị ọzọ anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị a kọrọ na Baịbụl. *

Akụkọ Nebọt na-akụziri anyị ihe bara uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. (a) Olee otú anyị si aghọta akụkọ Nebọt ugbu a? Oleekwa otú o si abara anyị uru? (b) Gịnị mere na akwụkwọ anyị ndị a na-ewepụta ugbu a anaghị ekwukarị banyere ihe akụkọ ndị dị na Baịbụl nọchiri anya ha? (Gụọ igbe bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke dị n’Ụlọ Nche a.)

11 Oleezi otú anyị si aghọta akụkọ Nebọt? A na-akọwa ya otú doro anya, dịkwa mfe nghọta. Ihe mere Nebọt ji nwụọ bụ na o kpebisiri ike ime uche Chineke, ọ bụghị n’ihi na ọ nọchiri anya Jizọs ma ọ bụ ndị e tere mmanụ. O rubeere Iwu Jehova isi n’agbanyeghị na otu eze dị ike kpagburu ya. (Ọnụ Ọgụ. 36:7; 1 Eze 21:3) Anyị na-amụta ihe bara uru n’akụkọ ahụ n’ihi na ụdị ọnwụnwa ahụ nwere ike ịbịara onye ọ bụla n’ime anyị. (Gụọ 2 Timoti 3:12.) E nweghị onye na-agaghị aghọtali ihe akụkọ a na-akụziri anyị. Icheta ya esighị ike, ọ dịkwa mfe ịhụ otú ọ ga-esi mee ka okwukwe anyị sie ike.

12. (a) Olee ihe anyị na-ekwesịghị iche banyere akụkọ ndị dị na Baịbụl? (b) Gịnị mere anyị ji aghọta otú e si akọwa “ihe ndị miri emi nke Chineke”? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

12 Ọ̀ pụtara na ọ bụ naanị otu ihe ka anyị ga-amụta n’akụkọ ndị dị na Baịbụl, na e nweghịzi ihe ọzọ ha pụtara? Mbanụ. Taa, ihe a na-ekwukarị n’akwụkwọ  anyị bụ na e nwere ihe akụkọ ụfọdụ na-echetara anyị ma ọ bụ na e nwere otú ha na ihe ụfọdụ si yie. Ọ naghịzi abụ a kọọ ọtụtụ akụkọ a kọrọ na Baịbụl, e kwuo ihe ọ ga-abụrịrị na ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, otú Nebọt si rubere Chineke isi ruo n’ọnwụ n’agbanyeghị na a kpagburu ya na-echetara anyị otú Kraịst na ndị e tere mmanụ si na-erubere Chineke isi. Ma, ọ na-echetakwara anyị otú ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ si erubere Chineke isi n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha. O doro anya na Jehova na-akụziri anyị ihe otú ọ ga-adịrị anyị mfe nghọta. *

ỤZỌ DỊ MFE E SI KỌWAA IHE ATỤ NDỊ JIZỌS MERE

13. Olee ihe gosiri na otú anyị si akọwa ihe atụ ụfọdụ Jizọs mere na-adịzi mfe nghọta?

13 Jizọs Kraịst bụ onye nkụzi kachanụ bitụrụla n’ụwa. Ọ na-ejikarị ihe atụ akụziri ndị mmadụ ihe. (Mat. 13:34) Iji ihe atụ akụzi ihe na-eme ka mmadụ ghọta ihe a na-ekwu, chebara ya echiche, ya eruokwa onye ahụ n’obi. Kemgbe ọtụtụ afọ, otú akwụkwọ anyị si akọwa ihe atụ ndị Jizọs mere na-adịzi mfe nghọta. Dị ka ihe atụ, otú Ụlọ Nche July 15, 2008 si mee ka anyị ghọtakwuo ihe atụ Jizọs mere gbasara ihe iko achịcha, mkpụrụ mọstad, na ụgbụ mere anyị obi ụtọ. Anyị ghọtaziri na ihe atụ ndị ahụ na-ekwu banyere Alaeze Chineke na otú o si na-enyere ọtụtụ ndị aka isi n’ụwa ọjọọ a pụta ma bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst.

14. (a) Olee otú anyị sibu akọwa ilu Jizọs banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi? (b) Olee otú anyị si aghọta ilu ahụ ugbu a?

14 Oleekwanụ otú anyị ga-esi ghọta ilu ndị Jizọs tụrụ? Ụfọdụ n’ime ha nwere ihe ha nọchiri anya ya. E nwekwara ndị nke e ji akụziri anyị ihe. Ma, olee otú anyị ga-esi mata nke bụ́ nke? Ka oge na-aga, anyị na-aghọtakwu nke bụ́ nke. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otú anyị sibu akọwa ilu Jizọs tụrụ banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi. (Luk 10:30-37) N’afọ 1924, Ụlọ Nche kwuru na onye Sameria ahụ nọchiri anya Jizọs, ụzọ ahụ si Jeruselem gbadaa Jeriko anọchie anya otú nsogbu ndị mmadụ si na-aka njọ kemgbe Adam nupụrụ isi n’ogige Iden. O kwukwara na ndị ohi nọ n’ụzọ ahụ nọchiri anya nnukwu ụlọ ahịa na ndị ọchụnta ego dị anyaukwu nakwa na onye nchụàjà ahụ na onye Livaị ahụ nọchiri anya Krisendọm. Taa, akwụkwọ anyị na-eji akụkọ ahụ echetara Ndị Kraịst niile na anyị ekwesịghị ịna-ele mmadụ anya n’ihu mgbe anyị na-enyere ndị mmadụ aka, karịchaa mgbe anyị na-akụziri ha eziokwu banyere Chineke. Obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si akụziri anyị ihe na-edo anyị anya.

15. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

15 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ilu ọzọ Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. (Mat. 25:1-13) Olee otú Jizọs si chọọ ka ndị na-eso ụzọ ya n’oge ikpeazụ a ghọta ilu ahụ? Ọ̀ pụtara na onye ọ bụla na ihe niile gbasara ilu ahụ nwere ihe ga-eme n’ọdịnihu ha nọchiri anya ya? Ka ọ̀ bụ na Jizọs chọrọ iji ya kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe ga-enyere ha aka n’oge ikpeazụ a? Anyị ga-amata n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 4 N’ọnwa Julaị afọ 2011 ka e wepụtara Ụlọ Nche mbụ e ji Bekee dị mfe dee. Kemgbe ahụ, e wepụtala ya n’asụsụ ndị ọzọ.

^ para. 5 A ga-ewepụta Baịbụl ọhụrụ a n’asụsụ ndị ọzọ.

^ para. 10 Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Ṅomie Okwukwe Ha tụlere banyere mmadụ iri na anọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ọ kọwara ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ha, ọ bụghị ihe ndị ha nọchiri anya ha.

^ para. 12 N’eziokwu, e nwere ihe ndị dị n’Okwu Chineke nwere ike ‘isi ike nghọta,’ dị ka ihe ụfọdụ Pọl dere. Ma, ọ bụ ike mmụọ nsọ ka ndị niile dere Baịbụl ji dee ya. Taa, mmụọ nsọ Chineke na-enyekwara Ndị Kraịst aka ịghọta ihe dị na Baịbụl, na-emekwa ka ha ghọta “ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.”—2 Pita 3:16, 17; 1 Kọr. 2:10.