Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2015

Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?

Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?

“Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.”—MAT. 25:13.

1, 2. (a) Olee ihe Jizọs kwuru banyere oge ikpeazụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ Jizọs ka ọ nọ n’elu Ugwu Oliv na-ele anya n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ya na mmadụ anọ n’ime ndịozi ya nọ, ya bụ, Pita, Andru, Jems, na Jọn. Ha nọ na-ege Jizọs ntị nke ọma ka ọ na-agwa ha ihe ndị dị ịtụnanya ga-eme n’ọdịnihu. Ọ gwara ha ọtụtụ ihe ga-eme n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a, bụ́ mgbe ọ ga na-achị n’Alaeze Chineke. Jizọs gwara ha na n’oge ahụ, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ga-anọchi anya ya n’ụwa ma na-enye ndị na-eso ụzọ ya nri n’oge kwesịrị ekwesị.—Mat. 24:45-47.

2 Mgbe Jizọs na-ebu amụma ahụ, ọ tụrụ ilu gbasara ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. (Gụọ Matiu 25:1-13.) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ajụjụ atọ ndị a: (1) Gịnị ka ilu ahụ pụtara? (2) Olee otú ndị e tere mmanụ si eme ihe Jizọs ji ilu ahụ na-akụzi, oleekwa uru ọ bara? (3) Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi erite uru n’ilu ahụ?

 GỊNỊ KA ILU AHỤ PỤTARA?

3. N’oge gara aga, olee otú akwụkwọ anyị si kọwaa ilu gbasara ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke? Gịnị ka o nwere ike ịkpata?

3 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na n’oge anyị a, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi agbanweela otú ha si akọwa akụkọ ndị dị na Baịbụl. Ha na-elekwasịzi anya n’ihe anyị ga-amụta n’akụkọ ndị ahụ, kama ikwukarị banyere ihe ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, n’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na ihe niile Jizọs kpọrọ aha n’ilu gbasara ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke nwere ihe ha nọchiri anya ha, ma oriọna ma mmanụ ma ihe e ji agbanye mmanụ. Ò nwere ike ịbụ na otú ahụ anyị si lekwasị anya n’obere ihe niile dị n’ilu ahụ mere ka uche anyị pụọ n’ihe ilu ahụ na-akụziri anyị? Ka anyị na-atụle ilu a, anyị ga-ahụ na azịza ajụjụ a dị ezigbo mkpa.

4. N’ilu ahụ, olee otú anyị si mata (a) onye bụ́ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ? (b) ndị bụ́ ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke?

4 Ka anyị leba anya n’ihe Jizọs ji ilu ahụ akụziri ndị na-eso ụzọ ya. Chegodị banyere ndị e kwuru gbasara ha n’akụkọ ahụ. Ònye bụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ? O doro anya na ọ bụ Jizọs. Ihe mere anyị ji mara bụ na e nwere mgbe o ji onwe ya tụnyere nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. (Luk 5:34, 35) Ole ndị bụ ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke? Ha bụ ndị e tere mmanụ, ya bụ, “ìgwè atụrụ nta.” Olee otú anyị si mara? N’ilu ahụ, ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke kwesịrị ịdị njikere, jiri oriọna ha na-eche ka nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịa. Ihe ọzọ bụ na Jizọs gwara “ìgwè atụrụ nta,” sị: “Keenụ ájị̀ n’úkwù, ka oriọna unu na-enwukwa enwu, unu onwe unu, dịrịnụ ka ndị na-echere nna ha ukwu mgbe o si ịlụ nwaanyị na-alọta.” (Luk 12:32, 35, 36) Pọl onyeozi na Jọn onyeozi jikwa Ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. (2 Kọr. 11:2; Mkpu. 14:4) N’ihi ya, o doro anya na Jizọs ji ilu ahụ dị na Matiu 25:1-13 nye ndị e tere mmanụ ndụmọdụ ma dọọ ha aka ná ntị.

5. Olee otú Jizọs si mee ka anyị mata oge o bu n’obi tụọ ilu ahụ?

5 Olee oge Jizọs bu n’obi nye ndụmọdụ ahụ o nyere? Ihe Jizọs kwuru ná ngwụcha ilu ahụ nyeere anyị aka ịmata mgbe o bu n’obi. Ọ sịrị: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere.” (Mat. 25:10) Dị ka anyị mụrụ n’Ụlọ Nche Julaị 15, 2013, n’amụma ahụ Jizọs buru na Matiu isi 24 na 25, o kwuru ugboro asatọ na ya ga-abịa, bịarute ma ọ bụ lọta. Oge o bu n’obi mgbe ọ na-ekwu ihe ndị ahụ bụ oge oké mkpagbu ahụ, mgbe ọ ga-abịa ikpe ụwa ọjọọ a ikpe na ibibi ya. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na ọ bụ n’oge ikpeazụ a ka Jizọs bu n’obi tụọ ilu ahụ nakwa na ọ ga-abịa n’oge oké mkpagbu ahụ.

6. Gịnị ka Jizọs ji ilu ahụ ọ tụrụ na-akụzi?

6 Gịnị ka Jizọs ji ilu ahụ na-akụzi? Cheta ihe ọ na-ekwu mgbe ọ tụrụ ilu ahụ. Na Matiu isi 24, ọ ka kwupụrụ banyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ohu ahụ bụ ụmụ nwoke ole na ole e tere mmanụ, ndị na-eduzi ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge ikpeazụ a. Jizọs gwasiri ha ike ka ha kwesị ntụkwasị obi. N’isi 25, o ji ilu banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke nye ndị niile e tere mmanụ bi n’oge ikpeazụ ndụmọdụ. Ọ gwara ha ka ha ‘na-eche nche,’ ka ụgwọ ọrụ ha ghara ịkwa ha. (Mat. 25:13) Ka anyị tụlee ilu ahụ ugbu a, hụ otú ndị e tere mmanụ si eme ihe ahụ Jizọs gwara ha.

OLEE OTÚ NDỊ E TERE MMANỤ SI EME IHE JIZỌS GWARA HA?

7, 8. (a) Olee ihe gosiri na ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche dị njikere? (b) Olee otú ndị e tere mmanụ si gosi na ha dị njikere?

7 N’ilu ahụ, Jizọs kwusiri okwu ike na ụmụ agbọghọ ndị nwere uche adịghị ka  ndị nke dị nzuzu, kama, ha dị njikere maka ọbịbịa nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ha na-eche nche, dịrịkwa njikere. A gwara ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ka ha mụọ anya abalị ma chere mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ga-abịarute. N’ihi ya, ha kwesịrị ịmụ anya, jiri oriọna ha na-enwu enwu na-eche nche n’ogologo abalị ahụ. Ụmụ agbọghọ ise ndị nwere uche emeghị ka ndị nke dị nzuzu, kama, ha dị njikere n’ihi na ha ji oriọna na mmanụ ha gbanyere n’ihe ha ji agbanye mmanụ. Ndị e tere mmanụ hà dị njikere maka ọbịbịa Jizọs?

8 Ee, ha dị njikere. Kemgbe oge ikpeazụ malitere, Ndị Kraịst e tere mmanụ emeela ka ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche. Ha dị njikere iji obi ha niile rụọ ọrụ e nyere ha ruo ọgwụgwụ. Ha chọpụtara na ijere Chineke ozi ga-eme ka ha ghara inwe ọtụtụ ihe e ji ekpori ndụ n’ụwa Setan, ma ha dị njikere ịhapụ ihe ndị ahụ. Ha ji obi ha niile efe Jehova, ọ bụghị n’ihi na ọgwụgwụ dị nso, kama n’ihi na ha hụrụ Chineke na Ọkpara ya n’anya. Ha na-erubere Chineke isi. Ha anaghị ekwe ka mmụọ nke ụwa Setan, ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ, omume rụrụ arụ, na mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru megharịa ha anya. Ha si otú ahụ gosi na ha dị njikere, na-enwukwa ka ìhè. Ha ji obi ha niile na-echere ka Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarute, ọ bụrụgodị na o yiri ka ọ̀ na-egbu oge.—Fil. 2:15.

9. (a) Olee ihe Jizọs kwuru banyere ihi ụra? (b) Olee otú ndị e tere mmanụ si gosi na ha nụrụ mkpu e tiri na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

9 Ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche dịkwa njikere n’ihi na ha nọ na-eche nche. Ụra ò nwere ike iburu Onye Kraịst e tere mmanụ n’ogologo oge e kwesịrị ịmụ anya? Eenụ. Cheta na Jizọs kwuru na mgbe o yiri ka nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ọ̀ na-egbu oge, ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke “hulatara isi wee malite ihi ụra.” Jizọs ma na ezughị okè nwere ike ime ka ike gwụ onye ji obi ya niile na-eche nche. N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na-agbasi mbọ ike ka ha nọrọ na nche. N’ilu ahụ, ọ bụ ụmụ agbọghọ ahụ niile na-amaghị nwoke biliri mgbe e tiri mkpu, sị: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala!” Ma, ọ bụ naanị ndị nwere uche nọ na nche ruo ọgwụgwụ. (Mat. 25:5, 6; 26:41) Gịnị ka ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi taa mere? Kemgbe oge ikpeazụ malitere, ha egosila na ha nụrụ mkpu e tiri, sị: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala!” Ha na-atachi obi, na-ejikeresikwa ike maka ọbịbịa Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ. * Ma, ihe mere ná ngwụcha ilu ahụ na-ekwu banyere oge pụrụ nnọọ iche. Olee otú anyị si mara?

ỤGWỌ ỌRỤ A GA-ENYE NDỊ NWERE UCHE NA AHỤHỤ A GA-ATA NDỊ NZUZU

10. Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ maka na ụmụ agbọghọ ndị nwere uche jụrụ inye ndị nke dị nzuzu mmanụ?

10 Ebe kacha agbagwoju anya n’ilu ahụ bụ ebe ngwụcha ya. N’ilu ahụ, mgbe ụmụ agbọghọ ndị nzuzu rịọrọ ndị nke nwere uche mmanụ, ha ekweghị enye ha. (Gụọ Matiu 25:8, 9.) Ihe a merenụ n’ilu a nwere ike ime ka anyị na-eche, sị: “Oleekwanụ mgbe ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi ga-ajụ inyere mmadụ aka ma ọ rịọ ha enyemaka?” Anyị ga-aghọta azịza  ajụjụ a ma ọ bụrụ na anyị atụlee oge ihe ahụ mere. Cheta na ihe anyị ghọtara n’oge na-adịbeghị anya bụ na Jizọs, bụ́ Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ga-abịa ikpe ikpe mgbe ọ ga-afọ obere ka oké mkpagbu ahụ gwụchaa. N’ihi ya, o yiri ka ọ̀ bụ obere oge tupu oké mkpagbu ahụ agwụchaa ka Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-ajụ inyere ndị ahụ aka. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na a ga-akachala ndị e tere mmanụ akara ikpeazụ n’oge ahụ.

11. (a) Gịnị ga-eme tupu oké mkpagbu ahụ amalite? (b) Gịnị mere ụmụ agbọghọ ndị nwere uche ji gwa ndị nke dị nzuzu ka ha gaa zụrụ mmanụ nke ha?

11 N’ihi ya, tupu oké mkpagbu ahụ amalite, ọ ga-edo anya na a kachaala ndị niile e tere mmanụ nọ n’ụwa akara ikpeazụ. (Mkpu. 7:1-4) Malitezie mgbe ahụ, ọ ga-edo ha anya na ha ga-aga eluigwe. Ma, chegodị banyere afọ ole na ole tupu oké mkpagbu ahụ amalite. Olee ihe ga-eme ndị e tere mmanụ ndị na-anaghị eche nche, ndị na-ekwesịghịkwa ntụkwasị obi? Ha agaghị enweta ụgwọ ọrụ ha. O doro anya na a gaghị aka ha akara ikpeazụ tupu oké mkpagbu ahụ amalite. N’oge ahụ, a ga-ete Ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi mmanụ. Ozugbo oké mkpagbu ahụ malitere, o nwere ike iju ndị ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi anya ịhụ ka e bibiri Babịlọn Ukwu ahụ. O nwere ike ịbụ mgbe ahụ ka ha ga-aghọta na ha adịghị njikere maka ọbịbịa Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ọ bụrụ na ha arịọ ka e nyere ha aka n’oge ahụ, gịnị ga-eme? N’ilu ahụ, Jizọs gwara anyị ihe ga-eme. Ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche jụrụ inye ndị nke dị nzuzu mmanụ ha, kama ha gwara ha ka ha gakwuru ndị na-ere mmanụ, zụrụ nke ha. Ma, cheta na oge ahụ bụ “n’etiti abalị.” Hà ga-ahụ onye ga-eresị ha mmanụ n’oge ahụ? Mbanụ. Oge agaala.

12. (a) N’oge oké mkpagbu ahụ, gịnị ga-eme onye ọ bụla e tere mmanụ nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi tupu mgbe a ga-aka ndị e tere mmanụ akara ikpeazụ? (b) Gịnị ga-eme ndị yiri ụmụ agbọghọ ahụ bụ́ ndị nzuzu?

12 N’oge oké mkpagbu ahụ, ndị e tere mmanụ agaghị enyeliri onye ọ bụla na-ekwesịghị ntụkwasị obi aka. Oge a ga-eji nyere ndị ahụ aka agaghịzi adị. Oleezi ihe ga-eme ndị ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi? Jizọs kwuru ihe mere mgbe ụmụ agbọghọ ndị ahụ bụ́ ndị nzuzu gara ịchọ ebe ha ga-azụta mmanụ. Ọ sịrị: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere, ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ ndị dị njikere, sooro ya banye n’oriri alụmdi na nwunye ahụ; e wee mechie ụzọ.” Mgbe Jizọs ga-abịa n’ebube ya mgbe ọ fọrọ obere ka oké mkpagbu ahụ gwụchaa, ọ ga-akpọga ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi n’eluigwe. (Mat. 24:31; 25:10; Jọn 14:1-3; 1 Tesa. 4:17) A ga-emechi ụzọ ka ndị ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ghara ịbata, ya bụ, ndị yiri ụmụ agbọghọ ndị ahụ dị nzuzu. Ha nwere ike ịna-eti, sị: “Nna anyị ukwu, nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ!” Ma, Jizọs ga-agwa ha ụdị ihe ahụ ọ ga-agwa ọtụtụ ndị yiri ewu n’oge ikpe ahụ. Ọ ga-asị ha: “Ana m agwa unu eziokwu, amaghị m unu.” Ọ ga-abụ ihe mwute.—Mat. 7:21-23; 25:11, 12.

13. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ agaghị ekwesị ntụkwasị obi? (b) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na aka ná ntị Jizọs dọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ gosiri na obi siri ya ike na ha ga-ekwesị ntụkwasị obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

13 Gịnị ka ihe ndị anyị tụlerela pụtara? Ihe Jizọs kwuru ọ̀ pụtara na ọtụtụ ndị e tere mmanụ agaghị ekwesị ntụkwasị obi, e werezie ndị ọzọ dochie ha? Mbanụ. Cheta na, na Matiu isi 24, Jizọs dọrọ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” aka ná ntị ka ọ ghara ịghọ ajọ ohu.  Ma, ọ pụtaghị na Jizọs tụrụ anya na ụdị ihe ahụ ga-eme. N’ihi ya, Jizọs ji ilu a dọọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị. Ebe ọ bụ na e nwere ụmụ agbọghọ ise bụ́ ndị nzuzu, nweekwa ise ndị nke nwere uche, onye ọ bụla bụ́ onye e tere mmanụ ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-adị njikere ma na-eche nche. Ma ó meghị otú ahụ, ọ ga-abụ onye nzuzu ma ghara ikwesị ntụkwasị obi. Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe yiri ya n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ. (Gụọ Ndị Hibru 6:4-9; tụlee Diuterọnọmi 30:19.) Pọl ezoghị ọnụ n’aka ná ntị ahụ ọ dọrọ ha. Ma, obi siri ya ike na ụmụnna ya e tere mmanụ ga-enweta ụgwọ ọrụ ha. Aka ná ntị ahụ a dọrọ ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke gosiri na obi sikwara Jizọs ike na ndị e tere mmanụ ga-enweta ụgwọ ọrụ ha. Ọ ma na onye ọ bụla n’ime ndị e tere mmanụ ga-ekwesịli ntụkwasị obi ma nweta ụgwọ ọrụ na-enweghị atụ.

OLEE OTÚ “ATỤRỤ ỌZỌ” GA-ESI RITE URU?

14. Gịnị mere “atụrụ ọzọ” ga-eji rite uru n’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ?

14 Ebe ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Jizọs bu n’obi tụọ ilu gbasara ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, ànyị kwesịrị iche na o nweghị uru ọ ga-abara “atụrụ ọzọ”? (Jọn 10:16) Mbanụ. Cheta na Jizọs kwuru ihe mere o ji tụọ ilu ahụ. Ọ sịrị: “Na-echenụ nche.” Ihe a o kwuru ọ̀ gbasara naanị ndị e tere mmanụ? O nwere mgbe Jizọs kwuru, sị: “Ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ niile, Na-echenụ nche.” (Mak 13:37) Jizọs chọrọ ka ndị niile na-eso ụzọ ya dịrị njikere ma na-eche nche. N’ihi ya, Ndị Kraịst niile na-eṅomi ndị e tere mmanụ. Ha na-ewere ozi Chineke ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha otú ahụ ndị e tere mmanụ na-eme. Cheta na ụmụ agbọghọ ndị ahụ dị nzuzu rịọrọ ndị nke ahụ nwere uche ka ha nyetụ ha mmanụ nke ha. Ọ na-echetara anyị na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya kwesị ntụkwasị obi, dịrị njikere ma na-eche nche. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Jizọs Kraịst ajụjụ. Ọ bụ ya ka Jehova mere Onyeikpe. Anyị kwesịrị ịdị njikere n’ihi na ọbịbịa ya adịla ezigbo nso.

Arịrịọ ụmụ agbọghọ nzuzu rịọrọ ka e nyetụ ha mmanụ na-echetara anyị na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya na-eche nche ma ọ bụ kwesị ntụkwasị obi

15. Gịnị mere ọlụlụ nwunye Kraịst ji eme ezigbo Ndị Kraịst niile obi ụtọ?

15 Ndị Kraịst niile nwere ike irite uru n’ọlụlụ nwunye ahụ Jizọs kwuru banyere ya n’ilu ahụ ọ tụrụ. A sị ka e kwuwe, ò nwere onye n’ime anyị obi na-anaghị adị ụtọ ma o cheta ọlụlụ nwunye ahụ? Ndị e tere mmanụ ga-anọ n’eluigwe mgbe ahụ. A lụchaa agha Amagedọn, ha abụrụzie nwunye Kraịst. (Mkpu. 19:7-9) Ndị niile nọ n’ụwa mgbe ahụ ga-erite uru n’ọlụlụ nwunye ahụ n’ihi na ọ ga-eme ka ezigbo ọchịchị ruo mmadụ niile aka. Ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, ka anyị kpebisie ike na anyị ga-amụta ihe dị mkpa Jizọs ji ilu ụmụ agbọghọ iri ahụ kụzie. Ka anyị dịrị njikere mgbe niile. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịnọsi ike n’ozi Chineke ma na-eche nche ka anyị nwee ike inweta ihe dị ebube Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu.

^ para. 9 N’ilu ahụ, ọ bụghị ozugbo e tiri mkpu, sị: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala!” ka nwoke ahụ bịarutere (amaokwu nke 6). O doro anya na oge gafere tupu ya abịarute (amaokwu nke 10). Kemgbe oge ikpeazụ malitere, ndị e tere mmanụ nọ na-eche nche. Ha ghọtakwara na ihe ndị na-eme na-egosi na Jizọs amalitela ịchị n’Alaeze Chineke. Ma, ha ka ga na-atachi obi, na-eche ruo mgbe ọ ga-abịarute.