Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2015

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’oge gara aga, akwụkwọ anyị na-ekwukarị gbasara akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na ihe ha nọchiri anya ya. Ma, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ha anaghịzi ekwukarị otú ahụ. N’ihi gịnị?

Ụlọ Nche Bekee nke September 15, 1950, kọwara na oge ụfọdụ, onye ma ọ bụ ihe a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl na-anọchi anya ihe ga-eme n’ọdịnihu. N’oge gara aga, akwụkwọ anyị kwuru na Debora, Elaịhu, Jefta, Job, Rehab, Ribeka, na ọtụtụ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nọchiri anya ndị e tere mmanụ ma ọ bụ “oké ìgwè mmadụ.” (Mkpu. 7:9) Dị ka ihe atụ, anyị kwuru na Jefta, Job, na Ribeka nọchiri anya ndị e tere mmanụ, Debora na Rehab anọchie anya oké ìgwè mmadụ. Ma, anyị anaghịzi ekwu otú ahụ ugbu a. N’ihi gịnị?

Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nọchiri anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Galeshia 4:21-31, Pọl onyeozi kwuru na e ji ụmụ nwaanyị abụọ mee “ihe ngosi bụ́ ihe atụ.” Hega, bụ́ ohu Ebreham, nọchiri anya mba Izrel, bụ́ ndị ha na Jehova si n’Iwu Mozis gbaa ndụ. Ma, Sera, bụ́ “nwaanyị nke nweere onwe ya,” nọchiri anya nwunye Chineke, ya bụ, nzukọ Chineke n’eluigwe. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, o kwuru ọtụtụ ihe mere Jizọs ji yie Melkizedek, bụ́ eze na onye nchụàjà. (Hib. 6:20; 7:1-3) Ihe ọzọ bụ na Pọl ji Aịzaya na ụmụ ya tụnyere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ. (Hib. 2:13, 14) Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee ihe ahụ o dere. N’ihi ya, obi siri anyị ike na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu.

IHE BAỊBỤL KWURU

Nwa atụrụ e ji mee ememme ngabiga n’Izrel oge ochie nwere ihe ọ nọchiri anya ya.Ọnụ Ọgụ. 9:2

IHE Ọ NỌCHIRI ANYA YA

Pọl kwuru na Kraịst bụ “nwa atụrụ ememme ngabiga.”1 Kọr. 5:7

Ma, ọ bụrụgodị ebe Baịbụl kwuru na e nwere onye mmadụ nọchiri anya ya, anyị ekwesịghị iche na ihe niile mere ná ndụ onye ahụ nọchiri anya ihe ka ukwuu ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na Pọl kwuru na Melkizedek nọchiri anya Jizọs, o kwughị ihe ọ bụla banyere oge ahụ Melkizedek nyere Ebreham achịcha na mmanya mgbe o merichara ndị eze anọ. N’ihi ya, Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla gosiri na  e nwere ihe ọzọ ihe ahụ merenụ pụtara.—Jen. 14:1, 18.

Ụfọdụ n’ime ndị dere ihe na narị afọ ole na ole mgbe Kraịst nwụchara chere na ihe ọ bụla e kwuru na Baịbụl nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Otu akwụkwọ nke na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara ihe Orijen, Ambros, na Jerom kụziri. O kwuru, sị: ‘Ha na-agbalịsi ike ịhụ ihe ha ga-asị na ihe ọ bụla e dere na Baịbụl nọchiri anya ya, ọ bụrụgodị ntakịrị ihe. Ha chere na ọ bụrụgodị obere ihe ka a kọrọ na Baịbụl, e nwerịrị ihe dị omimi ọ pụtara. Dị ka ihe atụ, mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, Baịbụl kwuru na azụ̀ ndị na-eso ụzọ ya gbutere n’abalị ụbọchị ọ pụtara n’ihu ha dị otu narị na iri ise na atọ. Ụfọdụ gbalịsiri ike ikwu ihe ọnụ ọgụgụ ahụ pụtara.’

Onye ọzọ aha ya bụ Ọgọstịn nke Hipo kwuru na akụkọ ahụ Baịbụl kọrọ gbasara puku mmadụ ise Jizọs ji ogbe achịcha bali ise na azụ̀ abụọ nyejuo afọ nwere ihe ọ pụtara. O kwuru na ogbe achịcha ọka bali ise ahụ nọchiri anya akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl, kwuokwa na ebe ọ bụ na ndị mmadụ weere na ọka wit ka ọka bali mma, ọ pụtara na “Agba Ọhụrụ” ka “Agba Ochie” mma. Ihe ọzọ o kwuru bụ na azụ̀ abụọ ahụ nọchiri anya eze na onye nchụàjà. Ọkà mmụta ọzọ kwuru na otú ahụ Jekọb si jiri ofe na-acha ọbara ọbara zụrụ ọnọdụ Isọ dị ka ọkpara nọchiri anya otú Jizọs si jiri ọbara ya zụtara ụmụ mmadụ olileanya ịga eluigwe.

Ọ bụrụ na ihe ndị ahụ a kọwara siiri mmadụ ike ikweta, i nwere ike ịghọta ihe kpatara ya. Ndị mmadụ agaghị amatali akụkọ Baịbụl ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha na ndị nke na-enweghị ihe ha nọchiri anya ha. N’ihi ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Ọ bụrụ na Baịbụl kwuru na ihe ma ọ bụ onye a kọrọ akụkọ ya nwere ihe ọ nọchiri anya ya, anyị na-anabata ihe ahụ Baịbụl kwuru. Ma ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị otú ahụ, anyị ekwesịghị ikwuwe na e nwere ihe akụkọ a kọrọ na Baịbụl nọchiri anya ya.

Oleekwanụ otú ihe ndị a kọrọ na Baịbụl ga-esi baara anyị uru? Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Rom 15:4, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” Ihe Pọl na-ekwu bụ na ụmụnna ya bụ́ ndị e tere mmanụ n’oge ahụ nwere ike ịmụta ihe bara ezigbo uru n’ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, kemgbe ahụ, ihe e dere na Baịbụl abaarala Ndị Kraịst niile uru, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma hà bụ “atụrụ ọzọ,” ma hà bi “n’oge ikpeazụ” ma ọ bụ na ha ebighị.—Jọn 10:16; 2 Tim. 3:1.

N’ihi ya, ọtụtụ ihe a kọrọ na Baịbụl agbasaghị naanị ndị e tere mmanụ, “atụrụ ọzọ,” ma ọ bụ Ndị Kraịst bi n’otu oge. Kama, ọtụtụ n’ime ha abaarala ndị niile fere Chineke uru, ma ndị nke ugbu a ma ndị oge ochie. Dị ka ihe atụ, ahụhụ Job tara anọchighị anya naanị ahụhụ ndị e tere mmanụ tara n’Agha Ụwa Mbụ. Ọtụtụ ndị ohu Chineke, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ma ndị e tere mmanụ ma oké ìgwè mmadụ, ejirila ezé kpee ekwere otú ahụ Job mere. Ha ahụkwala “ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.”—Jems 5:11.

N’ọgbakọ dị iche iche taa, anyị na-ahụ ụmụnna nwaanyị katarala ahụ́, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ka Debora nakwa ndị okenye na-akatabeghị ahụ́, bụ́ ndị ma ihe ka Elaịhu. Anyị na-ahụkwa ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi ma nwee obi ike ka Jefta nakwa ndị nwoke na ndị nwaanyị na-atachi obi ka Job. Obi dị anyị ụtọ maka “ihe niile e dere n’oge gara aga” Jehova mere ka o ruo anyị aka “ka anyị wee site ná . . . nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.”

N’ihi ihe a niile, anyị anaghịzi agbalị ịchọta ihe akụkọ ọ bụla a kọrọ na Baịbụl nọchiri anya ya. Kama, akwụkwọ anyị na-elekwasịkarị anya ugbu a n’ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị a kọrọ na Baịbụl.