Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2015

Na-eṅomi Otú Jizọs Si Dị Umeala n’Obi na Otú O Si Nwee Ọmịiko

Na-eṅomi Otú Jizọs Si Dị Umeala n’Obi na Otú O Si Nwee Ọmịiko

“Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 PITA 2:21.

1. Gịnị mere iṅomi Jizọs ga-eji mee ka anyị bịarukwuo Jehova nso?

ANYỊ na-eṅomikarị ndị àgwà ha masịrị anyị. N’ime ndị niile birila n’ụwa a, ọ bụ Jizọs Kraịst ka anyị kwesịrị iṅomi karịchaa. Maka gịnị? Jizọs kwuru, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Otú Jizọs si ṅomie àgwà Nna ya mere ka ịhụ Jizọs dị nnọọ ka ịhụ Nna ya. N’ihi ya, anyị ṅomie Jizọs, anyị ga-abịarukwu Jehova, bụ́ Onye kacha ihe niile elu, nso. Iṅomi Ọkpara Chineke bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ.

2, 3. (a) Gịnị mere Jehova ji mee ka e dee ihe ga-enyere anyị aka ịmata Ọkpara ya? Gịnịkwa ka ọ chọrọ ka anyị mee? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa na nke na-esonụ?

2 Ma, olee otú anyị ga-esi mata ụdị onye Jizọs bụ? Obi dị anyị ụtọ na Jehova mere ka e dee gbasara ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ihe mere o ji mee otú ahụ bụ na ọ chọrọ ka anyị mata onye Ọkpara ya bụ, ka anyị nwee ike iṅomi ya. (Gụọ 1 Pita 2:21.) Baịbụl ji ihe nlereanya Jizọs nyere anyị tụnyere “nzọụkwụ.” Ọ dị ka à ga-asị na Jehova na-agwa anyị ka anyị na-eso Jizọs n’azụ, ebe ọ zọnyere  ụkwụ, anyị azọnye. N’eziokwu, Jizọs zuru okè, ma anyịnwa ezughị okè. Jehova anaghịkwa atụ anya na anyị ga-eṅomi Jizọs n’emehieghị. Kama, ọ chọrọ ka anyị gbalịsie ike na-eṅomi Ọkpara ya.

3 Ka anyị tụlee ụfọdụ àgwà ọma Jizọs nwere. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú o si dị umeala n’obi, nweekwa ọmịiko. Na nke na-esonụ, anyị ga-atụle otú o si nwee obi ike na nghọta. Anyị tụlewe àgwà nke ọ bụla, anyị ga-aza ajụjụ atọ ndị a: Gịnị ka ọ pụtara? Olee otú Jizọs si kpaa àgwà ahụ? Olee otú anyị ga-esi ṅomie ya?

JJIZỌS DỊ UMEALA N’OBI

4. Gịnị ka ịdị umeala n’obi pụtara?

4 Gịnị ka ịdị umeala n’obi pụtara? Ọtụtụ ndị n’ụwa a dị mpako. Ha na-ewerekwa onye dị umeala n’obi ka onye na-adịghị ike ma ọ bụ onye na-enweghị obi ike. Ma, ọ bụghị eziokwu. Onye dị umeala n’obi dị ike, nweekwa obi ike. Ọ dịghị mpako, ọ naghịkwa eche na ya ka ndị ọzọ. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa “ịdị umeala n’obi” bụ “ịdị nwayọọ n’obi.” (Fil. 2:3) Ihe mbụ ga-egosi ma ànyị dị umeala n’obi bụ otú anyị si ele onwe anyị anya. Otu akwụkwọ nke na-akọwa Baịbụl kwuru na onye dị umeala n’obi ma na e nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Chineke. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị agaghị na-eche na anyị ka ndị ọzọ. (Rom 12:3) Ọ naghị adịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ịdị umeala n’obi. Ma, anyị ga-amụtali ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị na-echebara otú Chineke si dị ukwuu echiche ma na-eso nzọụkwụ Ọkpara ya.

5, 6. (a) Ònye bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi? (b) Olee otú Maịkel si gosi na ya dị umeala n’obi?

5 Olee otú Jizọs si gosi na ya dị umeala n’obi? O nweghị mgbe Ọkpara Chineke na-adịghị umeala n’obi, ma mgbe ọ nọ n’eluigwe ma mgbe ọ bụ mmadụ zuru okè n’ụwa. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ o mere.

6 Otú o si eche echiche. Jud, bụ́ onye so dee Baịbụl, dere banyere ihe Jizọs mere tupu ọ bịa n’ụwa. (Gụọ Jud 9.) Jud kpọrọ Jizọs Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi, ma kwuo na e nwere mgbe ya na Ekwensu “sere okwu ma na-arụrịta ụka banyere ozu Mozis.” I chetaranụ na mgbe Mozis nwụrụ, Jehova liri ya n’ebe onye ọ bụla na-amaghị. (Diut. 34:5, 6) O nwere ike ịbụ na Ekwensu chọrọ iji ozu Mozis mee ka ndị Izrel kpeere arụsị. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ihe Ekwensu bu n’obi, Maịkel ekweghị ya. Otu akwụkwọ kwuru na a na-eji okwu Grik e si sụgharịta “sere okwu ma na-arụrịta ụka” akọwa ‘okwu mmadụ na ibe ya ji gaa ụlọikpe.’ O nwere ike igosi na ‘Maịkel gwara Ekwensu hoo haa na o kwesịghị iburu ozu Mozis.’ Ma, onyeisi ndị mmụọ ozi ghọtara na ọ bụghị ya kwesịrị ikpe Ekwensu ikpe. Kama, o wegaara Jehova, bụ́ Onyeikpe Kacha Elu, okwu ahụ. Maịkel si otú ahụ gosi na ya achọghị ime ihe Jehova na-enyeghị ya ikike ime, ọ bụrụgodị na a kpasuru ya iwe. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ dị umeala n’obi.

7. Olee otú ihe Jizọs kwuru na ihe ndị o mere si gosi na ọ dị umeala n’obi?

7 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere gosiri na ọ dị umeala n’obi. Okwu ya. O meghị ka ndị mmadụ towe ya. Kama, o mere ka e towe naanị Nna ya. (Mak 10: 17, 18; Jọn 7:16) O nweghị mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu ga-eme ka ha yie ndị nzuzu. Kama, ọ kwanyeere ha ùgwù, jaa ha mma maka ihe ọma ha mere, meekwa ka ha ghọta na ọ tụkwasịrị ha obi. (Luk 22:31, 32; Jọn 1:47) Omume ya. Jizọs ebighị ndụ okomoko, o nweghịkwa ọtụtụ ihe. (Mat. 8:20) O ji obi ya niile rụọ ọrụ ndị ohu na-arụ. (Jọn 13:3-15) O rubeere Chineke isi ma gosi na otú o si dị umeala n’obi enweghị atụ. (Gụọ Ndị Filipaị 2:5-8.) Ndị dị mpako anaghị achọ irube isi. Ma, Jizọs emeghị ka ha. O ji obi ya niile mee ihe Chineke chọrọ ka o mee, “rube isi ruo ọnwụ.” O doro anya na Jizọs, bụ́ Nwa nke mmadụ, dị “umeala n’obi.”—Mat. 11:29.

ṄOMIE OTÚ JIZỌS SI DỊ UMEALA N’OBI

8, 9. Olee otú ị ga-esi egosi na ị dị umeala n’obi?

8 Olee otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi ka Jizọs? Otú anyị si eche echiche. Ịdị umeala n’obi na-eme ka anyị ghara ime ihe a na-enyeghị anyị ikike ime. Ọ bụrụ na anyị echeta na e nyeghị anyị ikike ikpe ndị mmadụ ikpe, anyị agaghị na-akatọ ndị ọzọ n’ihi ihe ha mejọrọ ma ọ bụ nyowe ha enyo. (Luk 6:37; Jems 4:12) Ịdị umeala n’obi na-eme ka anyị ghara ‘ịbụ ndị ezi omume gabiga ókè,’ ma ọ bụ na-eleda ndị na-enweghị ihe ùgwù ndị anyị nwere anya. (Ekli. 7:16) Ndị okenye dị umeala n’obi anaghị eche na ha ka ụmụnna ndị ọzọ. Kama, ha ‘na-ewere na ndị ọzọ ka ha,’ na-ewerekwa onwe ha ka ndị ka nta.—Fil. 2:3; Luk 9:48.

9 Chegodị banyere Nwanna Thorn. E mere ya onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’afọ 1894. Mgbe ọ rụrụ ọrụ ahụ ọtụtụ afọ, a kpọrọ ya ka ọ gaa rụwa ọrụ n’Ugbo Alaeze dị n’ebe ugwu Niu Yọk. E nyere ya ọrụ n’ebe a na-azụ ọkụkọ. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla isi malitere ibu m, m na-agwa onwe m, sị: ‘Obere ihe dị ka gị, gịnị ka i nwekwaranụ mere isi ga-eji na-ebu gị?’” (Gụọ Aịzaya 40:12-15.) Ihe a gosiri na ọ dị umeala n’obi.

10. Olee otú okwu anyị na omume anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi?

10 Okwu anyị. Otú anyị si ekwu okwu ga-egosi ma ànyị dị umeala n’obi. (Luk 6:45) Mgbe anyị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, anyị ekwesịghị ịna-ekwu naanị gbasara ihe anyị mere ma ọ bụ ihe ùgwù ndị anyị nwere. (Ilu 27:2) Kama, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma ma jaa ha mma maka àgwà ọma ha, nkà ha, na ihe ha rụrụ. (Ilu 15:23) Omume anyị. Ndị Kraịst dị umeala n’obi anaghị achọ ka ha bụrụ ndị a ma ama n’ụwa ochie a. Ha anaghị ebi ndụ okomoko, kama ha na-arụ ụdị ọrụ ndị mmadụ na-eleda anya ka ha nwee ike iji ike ha niile na-ejere Jehova ozi. (1 Tim. 6:6, 8) Ụzọ kacha mkpa anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi bụ ịna-erube isi. Ọ bụ ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ‘na-erubere ndị na-edu ndú’ n’ọgbakọ isi ma na-eme ihe nzukọ Jehova gwara anyị mee.—Hib. 13:17.

JIZỌS NWERE ỌMỊIKO

11. Gịnị bụ ọmịiko?

11 Gịnị bụ ọmịiko? Ọmịiko so n’àgwà na-egosi na mmadụ nwere ịhụnanya. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Jehova na Jizọs nwere “obi ọmịiko,” “obi ebere,” na ịhụnanya dị ukwuu. (Luk 1:78; 2 Kọr. 1:3; Fil. 1:8) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru banyere ọmịiko, sị: “Mmadụ inwe ọmịiko  apụtaghị naanị imetere ndị ihe na-esiri ike ebere. Kama, ọ pụtara ime ihe ga-egosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, nakwa na anyị chọrọ inyere ha aka ka ihe dịrị ha mma.” Ọmịiko bụ àgwà na-eme ka mmadụ mee ihe ga-abara ndị ọzọ uru.

12. Olee ihe gosiri na Jizọs nweere ndị ọzọ ọmịiko, oleekwa ihe ọmịiko o nwere mere ka o mee?

12 Olee otú Jizọs si gosi na o nwere ọmịiko? Ọmịiko Jizọs nwere na ihe ndị o mere. Jizọs nweere ndị ọzọ ọmịiko. Mgbe ọ hụrụ na enyi ya bụ́ Meri na ndị ha na ya nọ na-eru uju n’ihi ọnwụ nwanne ya nwoke bụ́ Lazarọs, ‘anya mmiri gbara ya’ n’ihu mmadụ niile. (Gụọ Jọn 11:32-35.) Ụdị ọmịiko ahụ o nwere nke mere ka ọ kpọlite nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ mekwara ka ọ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. (Luk 7:11-15; Jọn 11:38-44) O nwere ike ịbụ na mkpọlite Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ mere ka o nwee olileanya ịga eluigwe. Ma, tupu mgbe ahụ, Jizọs nweere oké ìgwè mmadụ bịakwutere ya “ọmịiko.” Ọ bụ ya mere o ji “malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Ihe a Jizọs kụziiri ha gbanwere ndụ ndị mere ihe o kwuru. O doro anya na ọmịiko Jizọs nwere abụghị naanị n’ọnụ, kama o mere ka o nyere ndị ọzọ aka.—Mat. 15:32-38; 20:29-34; Mak 1:40-42.

13. Olee otú Jizọs si gwa ndị ọzọ okwu ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

13 Okwu ọma ya. Obi ọmịiko Jizọs nwere mere ka ọ gwa ndị mmadụ okwu ọma, nke ka nke, ndị a na-emegbu emegbu. Matiu onyeozi kwuru ihe Aịzaya dere banyere Jizọs, sị: “Ọ dịghị ahịhịa amị a zọturu azọtu ọ ga-agbaji; ọ gaghịkwa emenyụ owu oriọna nke na-achọ ịnyụ anyụ.” (Aịza. 42:3; Mat. 12:20) Otú Jizọs si kwuo okwu gbara ndị mmadụ ume, ya bụ, ndị yiri ahịhịa amị a zọturu azọtu ma ọ bụ owu oriọna nke na-achọ ịnyụ anyụ. Ozi ọma o kwusaara “ndị e tiwara obi” mere ka ha nwee olileanya. (Aịza. 61:1) Ọ gwara ‘ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ’ ka ha bịakwute ya. Ọ gwakwara ha na ha ‘ga-enweta ume.’ (Mat. 11:28-30) O mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike na Chineke na-enwere onye ọ bụla na-efe ya ọmịiko, ma ndị nke dị nta, ya bụ, ndị ndị ụwa weere na e nweghị ihe ha bụ.—Mat. 18:12-14; Luk 12:6, 7.

ṄOMIE OBI ỌMỊIKO JIZỌS

14. Olee otú anyị ga-esi na-enwere ndị ọzọ ọmịiko?

14 Olee otú anyị ga-esi na-enwere ndị ọzọ ọmịiko otú Jizọs mere? Ọmịiko anyị kwesịrị inwere ndị ọzọ. Baịbụl gwara anyị ka anyị gbalịsie ike ‘yiri obi ọmịiko dị ka uwe,’ ọ bụrụgodị na anyị ebughị ya pụta ụwa. O so n’ihe Baịbụl kpọrọ mmadụ ọhụrụ Ndị Kraịst niile kwesịrị iyiri. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:9, 10, 12.) Olee otú ị ga-esi na-enwere ndị ọzọ ọmịiko? Meghee obi gị. (2 Kọr. 6:11-13) Mmadụ kọwara gị otú obi dị ya na ihe na-echu ya ụra, gee ya ntị nke ọma. (Jems 1:19) Chee otú ọ dị onye ahụ, ma jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú obi ga-adị m ma ọ bụrụ m ka ụdị ihe a mere? Gịnị ka m ga-achọ ka e meere m?’—1 Pita 3:8.

15. Gịnị ka anyị ga-eme iji nyere ndị yiri ahịhịa amị a zọturu azọtu ma ọ bụ owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ aka?

15 Ihe ọmịiko ga-eme ka anyị mee. Ọmịiko na-eme ka anyị na-emere ndị ọzọ ihe ga-abara ha uru, karịchaa, ndị dị ka ahịhịa amị a zọturu azọtu ma  ọ bụ owu oriọna nke na-achọ ịnyụ anyụ. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka? Ndị Rom 12:15 kwuru, sị: “Soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na obi adịghị mmadụ mma, ihe e kwesịrị imere ya bụ inwere ya ọmịiko, ọ bụghị ịgwawa ya ihe o kwesịrị ime. E nwere otu nwanna nwaanyị nwa ya nwụrụ, ụmụnna akasie ya obi. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ na ndị enyi m bịara soro m bee ákwá.” Otú ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị nwere ọmịiko bụ imere ndị ọzọ ihe ọma. È nwere nwanna nwaanyị di ya nwụrụ chọrọ onye ga-arụziri ya ihe n’ụlọ ya? È nwere nwanna mere agadi e kwesịrị ịna-ebuga ọmụmụ ihe, ozi ọma ma ọ bụ ụlọ ọgwụ? Ọ bụrụgodị obere ihe ka anyị meere nwanna, o nwere ike ime ka ihe dịtụrụ ya mma. (1 Jọn 3:17, 18) Otú kacha mkpa anyị ga-esi gosi na anyị nweere ndị ọzọ ọmịiko bụ ịgbalịsi ike na-ezi ha ozi ọma. Ọ bụ otú kacha mma anyị ga-esi mee ihe ga-abara ndị chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl uru.

Ị̀ na-enwere ụmụnna gị ezigbo ọmịiko? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

16. Gịnị ka anyị ga-ekwu iji gbaa ndị dara mbà ume?

16 Okwu ọma anyị. Ọ bụrụ na anyị nweere ndị ọzọ ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị na-akasi ndị ‘dara mbà’ obi. (1 Tesa. 5:14) Gịnị ka anyị ga-ekwu iji gbaa ụdị ndị ahụ ume? Otú anyị nwere ike isi mee ka obi dị ha mma bụ igosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Anyị nwere ike iji obi anyị niile jaa ha mma ka ha mata na ha nwere àgwà ọma nakwa na e nwere ihe ndị ha na-emeta. Anyị nwere ike ichetara ha na ọ bụ Jehova mere ka ha bịakwute Ọkpara ya. N’ihi ya, o ji ha kpọrọ ihe. (Jọn 6:44) Anyị nwere ike ịgwa ha na Jehova anaghị echefu ndị ohu ya, bụ́ “ndị obi ha tiwara etiwa” ma ọ bụ “ndị e gburu mmụọ ha.” (Ọma 34:18) Okwu ọma anyị ga-akasi ndị dara mbà obi.—Ilu 16:24.

17, 18. (a) Olee otú Jehova chọrọ ka ndị okenye si na-emeso atụrụ ya? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Ndị okenye, Jehova chọrọ ka unu na-emere atụrụ ya ebere. (Ọrụ 20:28, 29) Chetanụ na unu kwesịrị ịna-elekọta atụrụ ya, na-agba ha ume, na-emekwa ka obi ruo ha ala. (Aịza. 32:1, 2; 1 Pita 5:2-4) N’ihi ya, ọ bụrụ na okenye nwere ọmịiko, ọ gaghị na-eme ka ọ̀ bụ ya nwe ụmụnna ya, na-etiri ha iwu ma ọ bụ na-agwa ha okwu ga-eme ka obi na-ama ha ikpe ma ọ bụ na-amanye ha ime ihe ha na-agaghị emeli. Kama, ọ ga na-agbalị ka obi na-adị ha ụtọ. Obi ga-esikwa ya ike na ha ga-eji obi ha niile na-efe Jehova n’ihi na ha hụrụ ya n’anya.—Mat. 22:37.

18 Anyị ahụla otú Jizọs si gosi na ya dị umeala n’obi, nweekwa ọmịiko. Ichebara ihe ndị a echiche ga-eme ka anyị na-eso nzọụkwụ ya. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle àgwà ya abụọ ọzọ magburu onwe ha, ya bụ, obi ike na nghọta.