Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2015

Jehova Na-eduzi Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa n’Ụwa Niile

Jehova Na-eduzi Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa n’Ụwa Niile

“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.”—AỊZA. 48:17.

1. Olee nsogbu Ndị Kraịst nwere mgbe ha malitere ikwusa ozi ọma n’oge anyị a?

MGBE Ndị Mmụta Baịbụl * malitere ikwusa ozi ọma n’ihe karịrị otu narị afọ na iri atọ gara aga, ha nwere ọtụtụ ihe isi ike. Dị ka ọ dị n’oge ndịozi, ozi ọma ha na-ekwusa bụ ozi ọtụtụ ndị na-achọghị ịnụ. Ha ehighị nne, ndị mmadụ wekwaara ha ka ndị na-agụghị akwụkwọ. Nsogbu ọzọ bụ na Setan bụ́ Ekwensu ga-ewesa ha “oké iwe.” (Mkpu. 12:12) Ha ga-ekwusakwa ozi ọma “n’oge ikpeazụ,” nke Baịbụl kpọrọ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.”—2 Tim. 3:1.

2. Gịnị ka Jehova na-eme ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma?

2 Ma, Jehova chọrọ ka ndị ya kwusaa ozi ọma n’oge anyị a karịa otú e kwusatụrụla ya. O nweghị ihe ga-emeli ka nzube ya ghara imezu. Otú ahụ Jehova napụtara Izrel oge ochie n’aka ndị Babịlọn, ọ napụtakwala ndị ohu ya taa n’aka “Babịlọn Ukwu ahụ,” ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. (Mkpu. 18:1-4) Ọ na-akụziri anyị ihe ga-abara anyị uru. O meela ka anyị nwee udo, na-enyekwara anyị aka ịkụziri ndị ọzọ ihe  ọ na-akụziri anyị. (Gụọ Aịzaya 48:16-18.) N’agbanyeghị na Jehova na-eduzi ọrụ anyị, ọ pụtaghị na ọ bụ mgbe niile ka ọ na-agbanwe ihe ndị na-eme n’ụwa ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma. E nweela ihe ndị mere ka ikwusa ozi ọma dịtụrụ anyị mfe. Ma, ọ bụ naanị Jehova na-enyere anyị aka idi mkpagbu na ihe ndị ọzọ na-eme ka ọ na-esiri anyị ike ịna-ekwusa ozi ọma n’ụwa a dị n’aka Setan.—Aịza. 41:13; 1 Jọn 5:19.

3. Olee otú “ezi ihe ọmụma” si baa ụba?

3 Jehova mere ka Daniel onye amụma kwuo na “ezi ihe ọmụma” ga-aba ụba n’oge ikpeazụ. (Gụọ Daniel 12:4.) Ozizi ụgha Krisendọm na-akụzi mere ka ndị mmadụ ghara ịmata eziokwu ndị dị mkpa dị na Baịbụl. Ma, Jehova nyeere Ndị Mmụta Baịbụl aka ịghọta eziokwu ndị ahụ. Taa, ndị ohu ya na-akụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl n’ụwa niile. O doro anya na amụma ahụ Daniel buru na-emezu. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde mmadụ asatọ amụtala eziokwu Baịbụl ma na-akụziri ya ndị ọzọ. Olee ihe ụfọdụ nyeere ndị Jehova aka ịna-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile?

OTÚ NSỤGHARỊ BAỊBỤL SI ENYERE ANYỊ AKA

4. N’ihe dị ka n’afọ 1900, n’asụsụ ole ka a sụgharịrịla Baịbụl?

4 Taa, ọtụtụ ndị nwere Baịbụl. Ọ na-enyere anyị aka ịna-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ma, ọ dịghị otú ahụ kemgbe ụwa. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ụkọchukwu Krisendọm achọghị ka ndị mmadụ na-agụ Baịbụl. Ha kpagburu ndị na-agụ ya, gbuokwa ụfọdụ ndị sụgharịrị ya. Malite n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, òtù dị iche iche sụgharịrị Baịbụl ma ọ bụ bipụta ya n’ihe dị ka narị asụsụ anọ. N’ihe dị ka n’afọ 1900, ọtụtụ ndị enweela Baịbụl. Ma, ha aghọtaghị ihe Baịbụl na-akụzi.

5. Gịnị ka Ndịàmà Jehova mere n’ihe gbasara ịsụgharị Baịbụl?

5 Ndị Mmụta Baịbụl ma na ha kwesịrị ikwusa ozi ọma. Ha ji ike ha niile na-akụziri ndị ọzọ ihe dị na Baịbụl. Ndị ohu Jehova ekesaakwala ọtụtụ nsụgharị Baịbụl, jirikwa ha na-akụziri ndị mmadụ ihe. Kemgbe afọ 1950, ha ebipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri abụọ, ma ndị nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e bipụtara n’afọ 2013 ga-eme ka ọ dị mfe ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na Baịbụl anyị ji dị mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta, ọ ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma.

OTÚ UDO SIRILA NYERE ANYỊ AKA

6, 7. (a) Olee agha ndị a lụrụ kemgbe otu narị afọ? (b) Olee otú oge udo e nwere ná mba ụfọdụ si mee ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma?

6 O nwere ike ịbụ na ị na-eche, sị, ‘Udo ọ̀ dịkwanụ n’ụwa a?’ Kemgbe ihe dị ka otu narị afọ, a lụọla ọtụtụ agha tara isi ọtụtụ nde mmadụ. Ndị kachanụ n’ime ha bụ Agha Ụwa Mbụ na Agha Ụwa nke Abụọ. Ma, ka a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ọ bụ Nwanna Nathan Knorr na-eduzi ọrụ Ndịàmà Jehova. Ná mgbakọ e nwere n’afọ 1942, o kwuru okwu isiokwu ya bụ “Udo—Ọ̀ Ga-adịgide?” Nwanna Knorr kọwara amụma dị ná Mkpughe isi iri na asaa ma jiri ya gosi na a gaghị alụrụ agha ahụ ruo n’Amagedọn, kama, na ọ ga-ebi, oge udo esochie.—Mkpu. 17:3, 11.

7 Ma, ọ pụtaghị na mgbe agha ahụ biri, udo dịzi n’ụwa niile. Otu nchọpụta e mere gosiri na malite n’afọ 1946 ruo n’afọ 2013, agha a lụrụ ruru narị atọ na iri atọ na otu. Agha ndị ahụ tara isi ọtụtụ  nde mmadụ. Ma, e nwekwara mba ebe ndị a na-anaghị alụ agha. Ndịàmà Jehova jikwa oge ahụ na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Olee uru ozi ọma ha kwusara bara? N’afọ 1944, ndị nkwusa e nwere erughị otu narị puku na puku iri. Taa, ọ fọrọ obere ka ha ruo nde asatọ. (Gụọ Aịzaya 60:22.) Ọ̀ bụ na ikwusa ozi ọma n’oge udo anaghị atọ anyị ụtọ?

ỊGA EBE DỊ ICHE ICHE ADỊTỤLA MFE

8, 9. Olee ihe ndị mere ka ịga ebe dị iche iche dị mfe? Oleekwa otú ihe ndị a si na-enyere anyị aka n’ọrụ anyị?

8 E nweela ihe ọgbara ọhụrụ na-ebuga ndị mmadụ ebe dị iche iche ha chọrọ ịga. Ihe ndị ahụ emeela ka ikwusa ozi ọma na-aga siriri werere. N’afọ 1900, ya bụ, ihe dị ka iri afọ abụọ na otu a malitere ibipụta Ụlọ Nche, ihe e nwere n’Amerịka bụ naanị puku ụgbọala asatọ na okporo ụzọ ole na ole dị mma. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị otu ijeri ụgbọala na narị nde ise n’ụwa niile nakwa nde kwuru nde okporo ụzọ dị mma n’ọtụtụ ebe. Ihe ndị a niile emeela ka anyị nwee ike ikwusara ndị bi n’ime ime obodo ozi ọma. Ma, ọ bụrụgodị na anyị na-eji ụkwụ aga ebe dị anya n’ihi na anyị ahụghị ụgbọala, anyị na-agbalịsi ike ịga na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha nọ.—Mat. 28:19, 20.

9 E nweekwala ihe ndị ọzọ nyeere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị na-eji nnukwu ụgbọala, ụgbọ mmiri, na ụgbọ okporo ígwè ebuga akwụkwọ anyị n’ebe dị iche iche. Ọ pụtara na anyị ga-ejili naanị izu ole na ole bugara ụmụnna anyị akwụkwọ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Ndị nlekọta sekit, ndị so na Kọmitii Alaka, ndị ozi ala ọzọ nakwa ụmụnna ndị ọzọ na-eji ụgbọelu aga arụ ọrụ nzukọ Jehova nyere ha. Ndị so n’Òtù Na-achị Isi na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị na-ejikwa ụgbọelu aga mba dị iche iche agba ụmụnna anyị ume, na-akụzikwara ha ihe. Ihe a niile na-eme ka ndị Jehova dị n’otu.—Ọma 133:1-3.

OTÚ ASỤSỤ SI ENYERE ANYỊ AKA

10. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Bekee bụ asụsụ zuru ụwa ọnụ?

10 N’oge ndịozi Jizọs, ụdị asụsụ Grik a na-asụ n’ọtụtụ ebe n’Alaeze Ukwu Rom bụ nke a na-akpọ Koine. È nwere otu asụsụ a na-asụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa taa? Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ asụsụ Bekee. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere asụsụ a na-asụ n’ụwa niile sịrị na e kee ndị bi n’ụwa  ụzọ anọ, otu ụzọ na-asụ Bekee nke ọma. Ọ bụ Bekee bụ asụsụ a kacha akụzi ná mba dị iche iche n’ihi na n’ọtụtụ mba, a na-ejikarị ya ekwurịta ihe gbasara achụmnta ego, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, sayensị, na nkà na ụzụ.

11. Olee otú asụsụ Bekee si nyere anyị aka ime ka eziokwu Baịbụl ruo ọtụtụ ebe?

11 Otú e si asụ Bekee ná mba dị iche iche emeela ka eziokwu Baịbụl ruo ọtụtụ ebe. N’oge gara aga, a na-ebu ụzọ ewepụta Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ anyị ji amụ Baịbụl n’asụsụ Bekee. Ọ bụ asụsụ a na-asụkarị n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụkwa ya ka e ji akụziri ụmụ akwụkwọ ihe n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, nke dị n’Amerịka.

12. N’asụsụ ole ka a na-asụgharị akwụkwọ anyị? Oleekwa otú ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ si na-enyere anyị aka?

12 N’ihi ihe ùgwù anyị nwere izi ndị mba niile ozi ọma Alaeze Chineke, anyị asụgharịala akwụkwọ anyị n’ihe dị ka narị asụsụ asaa. Kọmputa ọgbara ọhụrụ na ngwá ọrụ ndị a na-etinye na kọmputa enyerela anyị aka ịsụgharị akwụkwọ anyị. Ngwá ọrụ a na-akpọ MEPS na-enyere anyị aka ide akwụkwọ anyị n’asụsụ dị iche iche. Ihe ndị a emeela ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma n’ụwa niile, meekwa ka anyị na ụmụnna anyị dị n’otu. Ma, ihe kacha mee ka anyị dịrị n’otu bụ na anyị na-asụ “asụsụ dị ọcha,” nke bụ́ eziokwu dị na Baịbụl.—Gụọ Zefanaya 3:9.

OTÚ IWU OBODO SI ENYERE ANYỊ AKA

13, 14. Olee otú iwu obodo na ụlọikpe si abara Ndị Kraịst uru taa?

13 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, iwu ndị Rom baara Ndị Kraịst oge ochie uru. Taakwa, iwu ndị e nwere n’obodo dị iche iche na-abakwara Ndị Kraịst uru. Dị ka ihe atụ, n’Amerịka, bụ́ ebe isi ụlọ ọrụ anyị dị, iwu obodo kwuru na ndị mmadụ nwere ike ikpe okpukpe masịrị ha, ikwu obi ha, nakwa ịna-ezukọ. O meela ka ụmụnna anyị nọ n’Amerịka nwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusakwa ozi ọma n’obodo ahụ. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ anyị na-aga ụlọikpe iji mee ka o doo anya na anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. (Fil. 1:7) Mgbe ọ bụla ụlọikpe Amerịka gbalịrị igbochi ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma, ha na-ewere okwu ahụ gaa n’ụlọikpe ka elu, ha na-emerikwa n’ọtụtụ n’ime ha.

14 Ụlọikpe ndị dị n’obodo ndị ọzọ  emeekwala ka o doo anya na anyị nweere onwe anyị ife Jehova na ikwusa ozi ọma. N’obodo ụfọdụ, e nwere okwu ndị anyị na-emerighị n’ụlọikpe, anyị emechaa wega ha n’ụlọikpe nke mba dị iche iche. Dị ka ihe atụ, anyị na-ewegakarị okwu ụfọdụ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. Ka ọ na-erula n’ọnwa Jun 2014, ikpe ndị anyị meririla n’ụlọikpe ahụ dị iri ise na asaa. Iwu jikwa ọtụtụ obodo dị na Yurop ime ihe ụlọikpe ahụ kpebiri. N’agbanyeghị na ‘mba niile kpọrọ anyị asị,’ ụlọikpe ndị e nwere n’ọtụtụ mba ekpebiela na anyị nweere onwe anyị ife Jehova.—Mat. 24:9.

IHE NDỊ ỌZỌ NA-ENYERE ANYỊ AKA

Anyị na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ụwa niile

15. Olee ihe ọgbara ọhụrụ ndị e ji ebi akwụkwọ ugbu a? Oleekwa otú ha sirila nyere anyị aka?

15 Ígwè ọgbara ọhụrụ ndị e ji ebi akwụkwọ enyerela anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. N’ihe karịrị narị afọ ise gara aga, otu nwoke aha ya bụ Gutenberg malitere otu ụzọ e si ebi akwụkwọ. Ọ bụ otú ahụ ka e si na-ebipụta akwụkwọ ruo ọtụtụ narị afọ. Ma, kemgbe ihe dị ka narị afọ abụọ, e nweela ígwè ọgbara ọhụrụ ndị mere ka ọ dịkwuo mfe ibipụta akwụkwọ. Ndị e nwere ugbu a ebukwuola ibu, na-ebikwa akwụkwọ ọsọ ọsọ. Ha bụkwa ọkpọka. Imepụta akwụkwọ na ikwe ya ekwe anaghịzi efu nnukwu ego otú ha na-efubu. E nweela ụzọ ọgbara ọhụrụ e sizi ebi akwụkwọ, nke mere ka a na-ebipụta ọtụtụ akwụkwọ ngwa ngwa, ihe e sere na ya amakwuo mma. Olee uru ihe a niile baara anyị? Chegodị echiche. Ụlọ Nche mbụ e bipụtara na Julaị 1879 dị naanị puku isii. E nweghị ihe e sere na ya, ọ bụkwa naanị n’asụsụ Bekee ka e biri ya. Otu narị afọ na iri atọ na isii agaala kemgbe ahụ. A na-ebipụtazi Ụlọ Nche n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ. A na-esekwa ọmarịcha foto na ha. Ụlọ Nche nke ọ bụla e bipụtara na-akarị iri nde ise.

16. Olee ihe ndị ọzọ nyeerela anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

16 Ọtụtụ n’ime ihe ndị e mepụtara kemgbe narị afọ abụọ enyerela ndị Chineke aka ịna-ekwusa ozi ọma. Anyị ekwuola gbasara ụgbọ okporo ígwè, ụgbọala, na ụgbọelu. Ma, e nwekwara ígwè a na-agba agba, taịpraịta, ígwè e ji ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ozi telegram, telefon, kamera, ihe ndị e ji etinye ihe na teepụ, redio, tiivi, fim, kọmputa, na Ịntanet. Ihe ndị a esila n’ụzọ dị iche iche nyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ndị Jehova mepụtara ihe ndị a, ma ha ji ha ebipụta Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ n’ọtụtụ asụsụ, jirikwa ha na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Ha si otú a ‘aṅụ ara nke mba dị iche iche’ dị ka e buru n’amụma n’akwụkwọ Aịzaya.—Gụọ Aịzaya 60:16.

17. (a) Gịnị ka ihe ndị anyị tụlere mere ka o doo anya? (b) Gịnị mere Jehova ji kwe ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ?

17 Ihe ndị a anyị tụlere emeela ka o doo anya na Jehova na-agọzi ozi ọma anyị na-ekwusa. Ọ bụ ya nyere anyị ọrụ a, ma ọ bụghị n’ihi na ọ gaghị arụli ya ma ọ bụrụ na anyị enyeghị aka. Kama, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ. Ozi ọma anyị na-ekwusa gosiri na anyị hụrụ ya n’anya, hụkwa ndị mmadụ ibe anyị n’anya. (1 Kọr. 3:9; Mak 12:28-31) Ka anyị jiri ohere ọ bụla anyị nwere na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ ya bụ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa taa. Ka anyị gbasie mbọ ike ịna-egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si eduzi ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile, ma na-agọzi ya.

^ para. 1 Ndị Mmụta Baịbụl malitere ịza Ndịàmà Jehova n’afọ 1931.—Aịza. 43:10.