Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2015

Ịkwadebe Mba Niile Maka “Ozizi Jehova”

Ịkwadebe Mba Niile Maka “Ozizi Jehova”

“Onye ahụ na-achị ógbè ahụ . . . ghọrọ onye kwere ekwe, n’ihi na ozizi Jehova juru ya anya.”—ỌRỤ 13:12.

1-3. Olee nsogbu ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere ka ha na-agbalị ikwusa ozi ọma ná “mba niile”?

ỌRỤ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya abụghị obere ọrụ. Ọ gwara ha, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” Ka ha na-arụ ọrụ a, a ga-emecha ‘kwusaa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’—Mat. 24:14; 28:19.

2 Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ Jizọs n’anya, jirikwa ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Ma, ọ ga-abụ na ha nọ na-eche otú ha ga-esi arụ ọrụ a Jizọs nyere ha. A sị ka e kwuwe, ha dị naanị mmadụ ole na ole. E gbuokwala Jizọs bụ́ onye ha na-ekwu na ọ bụ Ọkpara Chineke. E wekwaara ha ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Ma, ozi ọma ha ga-ezi ndị mmadụ megidere ozizi ndị ndú okpukpe a ma ama, bụ́ ndị gụrụ oké akwụkwọ gbasara omenala ha ndị dị kemgbe ọtụtụ afọ. O nweghịkwa ihe e ji ndị na-eso ụzọ Jizọs kpọrọ n’obodo ha. O doro anya na o nweghị ihe  mba Izrel bụ ma e jiri ha tụnyere mba ndị ọzọ Alaeze Ukwu Rom na-achị.

3 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-akpọ ha asị, kpagbuo ha, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha. (Luk 21:16, 17) Ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha. Ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ga na-akụzi ozizi ụgha. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-ezisa ozi ọma n’ebe ndị e nwere tigbuo zọgbuo. (Mat. 24:10-12) Ọ bụrụgodị na a ga-anabata ozi ha n’ebe ọ bụla ha gara, olee otú ha ga-esi kwusaa ya ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa’? (Ọrụ 1:8) Ha nwere ike ịna-eche otú ha ga-esi rụọ ọrụ a n’agbanyeghị nsogbu a niile.

4. Olee uru ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara bara?

4 N’agbanyeghị na ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na ọrụ ahụ agaghị adị mfe, ha rubeere Jizọs isi ma kwusaa ozi ọma na Jeruselem, Sameria, nakwa n’obodo ndị ọzọ e nwere n’oge ahụ. Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ gara, otú ha si kwusaa ozi ọma n’ebe dị iche iche mere ka Pọl onyeozi kwuo na ‘e kwusara ozi ọma n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.’ Ndị si n’ọtụtụ mba ghọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Kọl. 1:6, 23) Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na-ekwusa ozi ọma n’agwaetiti Saịprọs, Sajiọs Pọlọs, bụ́ onye na-achị ebe ahụ, “ghọrọ onye kwere ekwe, n’ihi na ozizi Jehova juru ya anya.”—Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:6-12.

5. (a) Olee nkwa Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị ka otu akwụkwọ kwuru gbasara oge ndịozi Jizọs?

5 Ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na ha agaghị ekwusali ozi ọma ahụ n’ike aka ha. Jizọs kwere ha nkwa na ya ga-anọnyere ha nakwa na mmụọ nsọ ga-enyere ha aka. (Mat. 28:20) O nwere ike ịbụ na ihe ụfọdụ mere n’oge ahụ mere ka ikwusa ozi ọma dịtụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ nke kọrọ gbasara Ndị Kraịst oge mbụ kwuru na o yiri ka oge ndịozi Jizọs ọ̀ bụ oge kacha mma a ga-eji malite ikwusa ozi ọma n’ụwa. Ndị Kraịst mechara kwuo na ọ bụ Chineke mepeere ha ụzọ.

6. Gịnị ka anyị ga-atụle (a) n’isiokwu a? (b) n’isiokwu na-esonụ?

6 Chineke ọ̀ gbanwere ihe ndị na-eme n’ụwa n’oge ndịozi Jizọs ka e nwee ike ikwusa ozi ọma nke ọma? Baịbụl agwaghị anyị. Ma otu ihe doro anya bụ na Jehova chọrọ ka e kwusaa ozi ọma, ma Setan chọrọ ka a ghara ikwusa ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ mere n’oge ndịozi Jizọs, bụ́ ndị mere ka ọ dịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe ikwusa ozi ọma. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ na-enyere anyị aka n’oge anyị a ikwusa ozi ọma n’ụwa niile.

OTÚ OGE UDO E NWERE NA ROM SI NYE AKA

7. Olee oge udo e nwere na Rom n’oge ochie? Oleekwa ihe mere oge udo a ji pụọ iche?

7 Oge udo e nwere mgbe ndị Rom na-achị mere ka ikwusa ozi ọma dịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe. N’oge ahụ, ọchịchị Rom gbara mbọ kwụsị obere ọgba aghara ọ bụla. Ma, mgbe ụfọdụ, a ka nwere obere agha otú ahụ Jizọs buru n’amụma. (Mat. 24:6) Ndị Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70, lụọkwa obere agha ndị ọzọ n’ebe ndị dị nso n’ókè ha na mba ndị ọzọ. Ma, udo dị n’ọtụtụ ebe Alaeze Ukwu Rom na-achị. N’ihi ya, ọ dịịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe ịga ebe dị iche iche kwusaa ozi ọma. Oge  udo a dịruru ihe dị ka narị afọ abụọ. Otu akwụkwọ kwuru na kemgbe ụwa, e nwebeghị oge udo dị ka nke a, nke baara ọtụtụ ndị uru.

8. Olee uru oge udo ahụ e nwere na Rom baara ndị na-eso ụzọ Jizọs?

8 N’ihe dị ka narị afọ atọ Kraịst nwụchara, otu ọkà mmụta aha ya bụ Orijen dere gbasara oge udo a. O kwuru na ebe ọ bụ na ndị Rom na-achị ọtụtụ mba n’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara ozi ọma na ha niile. Ndị mmadụ ejighị oge ahụ na-alụ agha iji chebe obodo ha, kama ha bicha n’udo n’obodo ha. Orijen kwuru na ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji nwee ike ige ntị n’ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara gbasara ịhụnanya na udo. N’agbanyeghị na a kpagburu ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha ji oge ahụ e nwere udo mee ihe kacha baa uru, nke bụ́ ikwusa ozi ọma n’ebe niile.—Gụọ Ndị Rom 12:18-21.

OTÚ EZIGBO OKPORO ỤZỌ SI NYE AKA

9, 10. Olee ihe ụfọdụ mere ka ọ dịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe ịga ebe dị iche iche?

9 Okporo ụzọ dị iche iche ndị Rom rụrụ karịrị iri puku kilomita asatọ. A na-esi na ha aga ebe ọ bụla ha na-achị. Okporo ụzọ ndị a mere ka ọ dịrị ndị agha Rom mfe ịga ebe ọ bụla ha chọrọ ịga iji chebe obodo ha, meekwa ka a na-erubere ọchịchị ha isi. Ndị Kraịst si n’okporo ụzọ ndị a gafee ma oké ọhịa ma ọzara ma ugwu ka ha nwee ike ikwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche.

10 E wezụga okporo ụzọ ndị a, ndị Rom na-ejikwa ụgbọ mmiri aga ebe dị iche iche. Ha na-eji ya agafe ụdị mmiri dị iche iche ruo n’ọtụtụ ọdụ ụgbọ mmiri ndị a rụrụ n’Alaeze Ukwu Rom. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụzọ ụgbọ mmiri ndị Rom nwere dị ihe dị ka narị itoolu. N’ihi ya, Ndị Kraịst na-ejikwa ụgbọ mmiri aga ebe dị iche iche n’oge ahụ. O nweghị onye na-asị ha gosi akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ. Ihe ọzọ bụ na ndị ohi anaghị anọkarị n’ụzọ n’ihi na ha ma na ndị Rom ga-emesi ha ike ma aka kpara ha. Ndị njem anaghị atụ ụjọ ndị omekome n’ụzọ n’ihi na ndị agha Rom na-eji ụgbọ mmiri ha agbagharị n’osimiri ndị dị n’ebe ahụ. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na ụgbọ mmiri Pọl nọ na ya kpuru mgbe ụfọdụ nakwa na e nwere mgbe ọ nọ n’ihe ize ndụ n’oké osimiri, o kwughị na ndị omekome nyere ha nsogbu n’osimiri. N’ihi ya, isi n’okporo ụzọ na oké osimiri aga ebe dị iche iche na-agakarị siriri werere.—2 Kọr. 11:25, 26.

OTÚ ASỤSỤ SI NYE AKA

Kodeks mere ka ọ dị mfe ịchọta ihe n’Akwụkwọ Nsọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

11. Olee ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji jiri asụsụ Grik kwusaa ozi ọma?

11 Ụdị asụsụ Grik a na-akpọ Koine mere ka ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ahụ na-akparịta ụka nke ọma ma dị n’otu. Tupu mgbe ahụ, Alegzanda Onye Ukwu meriri ọtụtụ obodo, ndị Rom achịwazie ha, ha amụta asụsụ Grik. O mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee ike izi onye ọ bụla ozi ọma. Otú ahụ ka ozi ọma si gbasaa. Ihe ọzọ bụ na tupu mgbe ahụ, ndị Juu bi n’Ijipt asụgharịala Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Grik ma kpọọ ya Septuagint. Ọtụtụ ndị ma Akwụkwọ Nsọ ahụ nke ọma. Ndị Kraịst oge mbụ na-agwakwa ndị ọzọ ihe e kwuru na ya. Ndị Kraịst jikwa asụsụ Grik dee akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl. E nwere ọtụtụ okwu e ji akọwa ihe n’asụsụ ahụ. N’ihi ya, ọ bụ  asụsụ magburu onwe ya ha ji kọwaa eziokwu ndị dị na Baịbụl.

12. (a) Gịnị bụ kodeks? Olee otú o si ka akwụkwọ mpịakọta mma? (b) Olee mgbe ọtụtụ Ndị Kraịst malitere iji kodeks ede ihe?

12 Olee otú Ndị Kraịst ga-esi jiri Akwụkwọ Nsọ na-ekwusa ozi ọma? Akwụkwọ mpịakọta na-ebu ibu. Imeghe ya na imechi ya anaghị adị mfe. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ naanị n’otu akụkụ ka a na-ede ihe na ya. Otu akwụkwọ mpịakọta ga-aba naanị Oziọma Matiu. Ma e mechara nwee ụdị akwụkwọ a na-akpọ kodeks. O yitewere akwụkwọ e nwere ugbu a a na-asape asape. Onye na-agụ ya nwere ike imeghe ya, ya adịrị ya mfe ịhụ ebe ọ chọrọ ịgụ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ eziokwu na o nweghị onye ma kpọmkwem mgbe Ndị Kraịst malitere iji kodeks ede ihe, otu akwụkwọ kwuru na Ndị Kraịst bidoro iji akwụkwọ a n’egbughị oge nakwa na mgbe otu narị afọ gachara, ọ bụ ya ka ọtụtụ na-eji kama iji akwụkwọ mpịakọta.

OTÚ IWU NDỊ ROM SI NYE AKA

13, 14. (a) Olee uru Pọl ritere n’ihi na ọ bụ na nwa amaala Rom? (b) Olee otú iwu ndị Rom si baara Ndị Kraịst uru?

13 Iwu ndị Rom baara Ndị Kraịst oge mbụ uru. Dị ka ihe atụ, Pọl bụ nwa amaala Rom. Iwu ndị Rom na-echebekarị ya n’ebe ndị ọ gara. Mgbe ndị agha Rom jidere Pọl na Jeruselem ma chọọ ka ha pịa ya ụtarị, ọ jụrụ ha, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka unu pịa onye Rom nke a na-amaghị ikpe ihe?” Mbanụ. Mgbe Pọl kwuru na ya bụ nwa amaala Rom site n’ọmụmụ, ndị ahụ chọrọ ịpịa ya ụtarị ‘si n’ebe ọ nọ pụọ; ọchịagha ahụ tụkwara egwu mgbe ọ chọpụtara na Pọl bụ onye Rom nakwa na ya ekeworị ya agbụ.’—Ọrụ 22:25-29.

14 Na Filipaị, mgbe ndị nduzi obodo chọpụtara na Pọl bụ nwa amaala Rom, ha bịara rịọ ya arịrịọ maka ihe ha pịara ya. (Ọrụ 16:35-40) N’Efesọs, onye nlekọta obodo kwuru banyere iwu ndị Rom mgbe o mechara ka obi jụrụ ìgwè mmadụ iwe ji. (Ọrụ 19:35-41) Na Sesaria, Pọl kwuru na ya chọrọ ka e kpegharịa ikpe ya. Ọ bụ ya mere e ji kpọga ya ebe ọ ga-azara ọnụ ya n’ihu Siza. (Ọrụ 25:8-12) N’ihi ya, iwu ndị Rom mere ka e nwee ike “ịkwado ozi ọma na iji iwu mee ka o guzosie ike.”—Fil. 1:7.

 NDỊ JUU BI NÁ MBA DỊ ICHE ICHE

15. Olee ebe ndị Juu bicha n’oge ndịozi Jizọs?

15 O nwere ike ịbụ na ihe ọzọ mere ka ọ dịtụrụ Ndị Kraịst mfe ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma bụ na e nwere ọtụtụ ndị Juu n’ebe dị iche iche ndị Rom na-achị. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, ma ndị Asiria ma ndị Babịlọn dọọrọ ndị Juu n’agha laa n’obodo ha. Ihe dị ka narị afọ ise Tupu Oge Ndị Kraịst, e nwere ọtụtụ ndị Juu n’otu narị obodo na iri abụọ na asaa Alaeze Peshia na-achị. (Esta 9:30) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e nwere ọtụtụ ndị Juu n’Eshia Maịnọ, Gris, Mesopotemia, Ijipt, nakwa n’obodo ndị ọzọ dị n’Ebe Ugwu Afrịka. Otu akwụkwọ kwuru na ndị bi n’ebe dị iche iche ndị Rom na-achị ruru iri nde mmadụ isii nakwa na ihe karịrị nde anọ n’ime ha bụ ndị Juu. Ọ bụ eziokwu na ndị Juu bi n’ebe dị iche iche, ha ka nọkwa na-ekpe okpukpe ha.—Mat. 23:15.

16, 17. (a) Olee otú ebe dị iche iche ndị Juu bi si baara ndị na-abụghị ndị Juu uru? (b) Olee ihe ndị Juu na-eme ndị na-eso ụzọ Jizọs mụtara?

16 Otú ndị Juu si birichaa n’ebe dị iche iche mere ka ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu mata Akwụkwọ Nsọ Hibru, mụtakwa ihe ndị Juu kweere. Dị ka ihe atụ, ha mụtara na e nwere naanị otu ezi Chineke nakwa na ndị na-efe ya kwesịrị ịna-erubere iwu ya isi. Ha mụtara na Akwụkwọ Nsọ Hibru si n’aka Chineke nakwa na o buru ọtụtụ amụma banyere Mesaya. (Luk 24:44) N’ihi ya, mgbe Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma, ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu amatala ihe ụfọdụ Ndị Kraịst na-ekwusa. Pọl nọ na-achọ ndị ga-ege ntị n’ozi ọma. Ọ na-agakarị n’ụlọ nzukọ ndị Juu, ha na ya ana-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:1, 2.

17 Ndị Juu na-ezukọ mgbe mgbe ka ha fee Chineke, ma ọ̀ bụ n’ụlọ nzukọ ha ma ọ bụ n’èzí. Ha na-abụ abụ, kpee ekpere ma kwurịta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọgbakọ Ndị Kraịst na-eme taa.

JEHOVA NYEERE HA AKA

18, 19. (a) Olee uru ihe ndị mere n’oge ndịozi Jizọs baara ha? (b) Olee otú ihe anyị tụlere n’isiokwu a mere ka obi dị gị gbasara Jehova?

18 O doro anya na oge ndịozi Jizọs bụ oge pụrụ iche. N’Alaeze Ukwu Rom, e nwere udo, ọtụtụ ndị na-asụ otu asụsụ, iwu ndị Rom chebekwara ndị mmadụ. Ọ dị mfe ịga ebe dị iche iche, ndị bi n’ọtụtụ mba ma gbasara ndị Juu na Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe a niile nyeere Ndị Kraịst aka ịna-arụ ọrụ Chineke nyere ha, nke bụ́ ikwusa ozi ọma.

19 Ihe dị ka narị afọ anọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, otu nwoke bụ́ onye Grik aha ya bụ Pleto dere na o siiri ndị mmadụ ezigbo ike ịmata onye kere eluigwe na ụwa anyị a. O kwukwara na ọ bụrụgodị na ha amata onye ọ bụ, ha agaghị agwali ndị niile bi n’ụwa banyere ya. Ma, Jizọs sịrị: “Ihe na-ekweghị omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Luk 18:27) Onye kere eluigwe na ụwa chọrọ ka ndị mmadụ chọta ya ma mata onye ọ bụ. Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:19) N’ike Jehova, anyị ga-arụli ọrụ a Jizọs nyere anyị. Isiokwu na-esonụ ga-eme ka a mata otú e si na-arụ ọrụ a n’oge anyị a.