Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2015

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka e nwere ike ime iji nyere ụmụnna ísì sent na-enye nsogbu aka?

Ọ naghị adịrị mmadụ mfe ma ọ bụrụ na ísì sent na-enye ya nsogbu. O nwere ike ịbụ na o nweghị otú onye ahụ ga-esi zere ísì sent mgbe ya na ndị ọ na-amaghị na-emekọ ihe kwa ụbọchị. Ma, ụfọdụ ajụọla ma è nwere ike ịgwa ụmụnna ka ha ghara ịna-agba sent ma ha bịawa ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ.

O doro anya na e nweghị Onye Kraịst ga-akpachara anya mee ka o siere onye ọzọ ike ịbịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ. O nweghị onye n’ime anyị na-ekwesịghị ịna-aga ọmụmụ ihe ka a gbaa ya ume. (Hib. 10:24, 25) N’ihi ya, e nwee ndị ísì sent na-enye nsogbu nke na ọ gaghị ekwe ha ịga ọmụmụ ihe, ha kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha na ha kwurịta ihe e nwere ike ime. Ndị okenye ekwesịghị inye ụmụnna iwu ka ha ghara ịna-agba sent ma ha bịawa ọmụmụ ihe, kama, ha nwere ike ime ka ọgbakọ mata na e nwere ụmụnna ísì sent na-enye nsogbu. Ndị okenye nwere ike ikpebi ka a tụlee ihe e dere n’akwụkwọ anyị gbasara okwu a n’ụbọchị a ga-elebara mkpa ọgbakọ anya ná Nzukọ Ije Ozi ma ọ bụkwanụ ha amaa ọkwa gbasara otú a ga-esi nyere ụdị ndị ahụ aka. * Ma, ọ bụghị mgbe niile ka a ga na-ama ụdị ọkwa a. N’ọmụmụ ihe anyị, a na-enwe ndị nwere mmasị na ndị ọbịa, bụ́ ndị na-amaghị banyere nsogbu ụmụnna ndị a nwere. N’ihi ya, anyị achọghị ikwu ihe ga-eme ka ahụ́ ghara iru ha ala. E kwesịghị ikwu ihe ga-eme ka ahụ́ ghara iru onye gbara ntakịrị sent ala.

N’ọgbakọ e nwere ụdị nsogbu a, ndị okenye nwere ike ịhazi ebe ụdị ndị ahụ ga na-anọpụ iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma o kwe omume. Dị ka ihe atụ, e nwere ike inwe ebe dịpụrụ iche ọ ga-abụ mmadụ nọrọ, ya ana-anụ ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe. Unu mechaa ihe ndị a, ya abụrụ na e nwere ndị ísì sent ka na-enyesi nsogbu ike, ọgbakọ nwere ike ịna-etinye ihe e kwuru n’ọmụmụ ihe na teepụ ka ndị ahụ gere ya n’ụlọ ha. Ha nwekwara ike iji ekwentị na-egere ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe otú ahụ e si emere ndị ọrịa na-anaghị ekwe pụta èzí.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, a na-agba anyị ume n’Ozi Alaeze Anyị ka anyị selatatụ aka n’otú anyị si agba sent ma anyị gawa mgbakọ ukwu. A gwara anyị ka anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ebe ọ bụ na ọ gaghị ekwe omume inwe ebe pụrụ iche ndị ísì sent na-enye nsogbu ga na-anọ ná mgbakọ. Ma, ihe mere e ji nye ntụziaka a abụghị ka e jiri ya mere iwu n’ọgbakọ. E kwesịghịkwa isi otú ahụ kọwaa ya.

N’ụwa ochie a anyị bi, anyị niile na-ata ahụhụ ezughị okè anyị ketara kpataara anyị. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ agbalịa ime ihe ga-eme ka nsogbu anyị belatatụ. O nwere ike isitụrụ ụfọdụ ndị ike ịkwụsị ịgba sent ma ha gawa ọmụmụ ihe. Ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, anyị nwere ike ime otú ahụ ka o wee dịrị ndị ísì sent na-enye nsogbu mfe ịbịa ọmụmụ.

 E wezụga Baịbụl, è nwere akwụkwọ ndị ọzọ kwuru ihe gosiri na e nwere onye bụ́ Pọntiọs Paịlet?

Nkume e ji asụsụ Latịn dee aha Pọntiọs Paịlet n’elu ya

Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl ma Pọntiọs Paịlet n’ihi na o so kpee Jizọs ikpe, maakwa ya ikpe ọnwụ. (Mat. 27:1, 2, 24-26) Ma, aha ya pụtakwara ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ndị ọzọ kọrọ gbasara ihe ndị mere n’oge ahụ. Otu akwụkwọ na-akọwa ihe ndị dị na Baịbụl kwuru na e nwere ọtụtụ akwụkwọ kọrọ gbasara Paịlet karịa otú ha si kọọ gbasara ndị Rom ndị ọzọ chịrị Judia.

Aha Paịlet kacha pụta ọtụtụ ugboro n’ihe ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs dere. O dere gbasara nsogbu atọ Paịlet nwere mgbe ọ na-achị Judia. Onye Juu ọzọ aha ya bụ Faịlo dere banyere nsogbu nke anọ Paịlet nwere mgbe ọ na-achị Judia. Onye Rom aha ya bụ Tasitọs, bụ́ onye dere banyere ndị eze Rom, kwuru na Pọntiọs Paịlet nyere iwu ka e gbuo Jizọs n’oge Taịbiriọs na-achị.

N’afọ 1961, mgbe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie na-achọ ihe n’ebe ndị Rom oge ochie na-eme ihe nkiri n’obodo Sesaria dị n’Izrel, ha hụrụ otu nkume e jibu rụọ ụlọ, nke e ji asụsụ Latịn dee aha Paịlet n’elu ya. Ihe e dere na ya (nke dị n’ihe osise a) ezughị ezu, ma o yiri ka ihe e dere na ya bụ: “Ihe a bụ ụlọ Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye na-achị Judia, rụụrụ chi Taịbiriọs.” Ọ dị ka ụlọ ahụ ọ̀ bụ ụlọ nsọ a rụrụ iji kwanyere Taịbiriọs, bụ́ eze ukwu Rom, ùgwù.

Nwanna nwaanyị ò kwesịrị ike ákwà isi mgbe nwanna nwoke nọ n’ebe ọ na-amụrụ mmadụ ihe?

‘N’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke gbara n’Ụlọ Nche July 15, 2002, e kwuru na nwanna nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-amụrụ mmadụ Baịbụl ma ọ bụrụ na onye nkwusa bụ́ nwoke nọ ebe ahụ, ma nwoke ahụ ò meela baptizim ma ọ bụ na o mebeghị. Mgbe e lebakwuuru okwu a anya, a chọpụtara na e kwesịrị ịgbanwe ihe ahụ e kwuru.

Ọ bụrụ na onye so nwanna nwaanyị ahụ gaa ịmụrụ mmadụ ihe bụ nwanna nwoke e mere baptizim, nwanna nwaanyị ahụ kwesịrị ike ákwà isi. Nwanna nwaanyị ahụ ga-esi otú ahụ gosi na ya na-akwanyere ndokwa Jehova mere maka ịbụisi n’ọgbakọ ùgwù n’ihi na ihe ahụ ọ na-amụrụ onye ahụ bụ ọrụ nwanna nwoke kwesịrị ịrụ. (1 Kọr. 11:5, 6, 10) Ọ bụrụ na ọ gaghị ekpuchi isi ya, o nwere ike ịgwa nwanna nwoke ahụ ka o duzie ọmụmụ Baịbụl ahụ ma ọ bụrụ na nwanna nwoke ahụ ruru eru, nweekwa ike iduzi ya.

Ma, ọ bụrụ na onye nkwusa so nwanna nwaanyị gaa ịmụrụ mmadụ ihe bụ nwoke a na-emebeghị baptizim, ya abụrụkwa na ọ bụghị di nwanna nwaanyị ahụ, ọ bụghị iwu na ọ ga-eke ákwà isi. Ma, ụfọdụ ụmụnna nwaanyị nwere ike ikpebi ike ákwà isi n’ihi akọnuche ha.

^ para. 4 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru isiokwu a, gụọ isiokwu kwuru gbasara inyere ndị ísì sent ma ọ bụ kemikal na-enye nsogbu aka, na Teta! Bekee nke August 8, 2000, peeji nke 8-10.