Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) Febụwarị 2015

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Eprel 6 ruo Mee 3, 2015.

Onyinye Pụrụ Iche E Nyere Ndị Japan

Na Japan, e wepụtara otu akwụkwọ a kpọrọ ‘The Bible—The Gospel According to Matthew.’ Olee ihe ndị mere ka ọ pụọ iche? Gịnị mere e ji bipụta ya?

Na-eṅomi Otú Jizọs Si Dị Umeala n’Obi na Otú O Si Nwee Ọmịiko

Pita nke Mbụ isi abụọ amaokwu iri abụọ na otu gwara anyị ka anyị sochie nzọụkwụ Jizọs anya. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, olee otú anyị ga-esi ṅomie ya?

Na-eṅomi Otú Jizọs Si Gosi na O Nwere Obi Ike na Nghọta

Ihe e dere na Baịbụl na-enyere anyị aka ịmata ụdị onye Jizọs bụ. Isiokwu a kọwara otú anyị ga-esi na-enwe obi ike na nghọta iji gosi na anyị na-esochi nzọụkwụ ya anya.

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma

Anyị ma na ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa taa. Olee otú anyị ga-esi jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

Ịkwadebe Mba Niile Maka “Ozizi Jehova”

Olee uru ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara bara? Olee ihe ụfọdụ mere ka ọ dịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe ikwusa ozi ọma?

Jehova Na-eduzi Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa n’Ụwa Niile

Olee ihe ndị merela n’oge anyị na-enyere ndị ohu Jehova aka ikwusa ozi ọma n’ụwa niile?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka e nwere ike ime iji nyere ụmụnna ísì sent na-enye nsogbu aka? Olee mgbe nwanna nwaanyị kwesịrị ike ákwà isi?

FROM OUR ARCHIVES

“Oge Pụrụ Iche”

Ụlọ Nche kpọrọ oge e ji echeta ọnwụ Jizọs “oge pụrụ iche,” gwakwa ndị na-agụ ya ka ha na-eme ya. Olee otú e si na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na oge ochie?