Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2014

Ì Ji Ihe Jehova Nyere Gị Kpọrọ Ihe?

Ì Ji Ihe Jehova Nyere Gị Kpọrọ Ihe?

“Anyị natara . . . mmụọ nke si na Chineke, ka anyị wee mara ihe niile Chineke ji obiọma nye anyị.”1 KỌR. 2:12.

1. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-ekwu mgbe ụfọdụ?

Ị̀ NỤTỤLA ebe ndị mmadụ kwuru, sị: ‘Ọ bụ mgbe ihe funahụrụ mmadụ ka ọ na-amata uru ihe ahụ bara’? Ò nwetụla mgbe i kwuru ụdị ihe a? Ọ bụrụ na mmadụ na-enweta ihe niile ọ chọrọ, o nwere ike ọ gaghị eji ha kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ si n’ezinụlọ bara ọgaranya, onye ahụ nwere ike ọ gaghị ama uru ọtụtụ ihe ndị o nwere bara. Ụdị ihe a nwere ike ime ndị na-eto eto. Ebe ọ bụ na ha amabeghị nke ụwa na-akọ, e nwere ike, ha agaghị aghọtacha ihe ndị kacha mkpa ná ndụ.

2, 3. (a) Gịnị ka ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-ekwesịghị ime? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị jiri ihe Jehova nyere anyị kpọrọ ihe?

2 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, olee ihe kacha gị mkpa? Taa, ihe kacha ọtụtụ ndị na-eto eto mkpa bụ akụnụba. Ha chọrọ ịna-arụ ọrụ a ga na-akwụ ha ezigbo ụgwọ, biri n’ụlọ mara ezigbo mma, ma ọ bụkwanụ nweta ihe ọgbara ọhụrụ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ naanị ihe ndị a bụ mkpa anyị, ọ pụtara na e nwere ihe kọrọ anyị, ya bụ, adịm ná mma anyị na Chineke. Ọ dị mwute na ọtụtụ nde mmadụ taa achọghị ya. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ Ndịàmà Jehova, i kwesịrị ilezi anya ka ị ghara  ileghara ihe ndị ha kụziiri gị gbasara Chineke anya. (Mat. 5:3) Ọ bụrụ na i were ha ka ihe ndị na-abaghị uru, o nwere ike ịkpatara gị nsogbu.

3 Ma, i nwere ike ime ka ụdị ihe a ghara ime gị. Gịnị ga-enyere gị aka ka i jiri ihe ndị ị mụtara gbasara Chineke kpọrọ ihe? Ka anyị tụlee gbasara ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ọ ga-eme ka anyị mata ihe mere o ji dị mma ka anyị jiri ihe ndị anyị mụtara gbasara Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụghị naanị ndị na-eto eto ka ihe ndị a anyị ga-atụle ga-abara uru. Kama, ọ ga-enyere Onye Kraịst ọ bụla aka ka o jiri ihe Jehova nyere ya kpọrọ ihe.

NDỊ NA-EJIGHỊ IHE JEHOVA NYERE HA KPỌRỌ IHE

4. Gịnị ka 1 Samuel 8:1-5 kọrọ gbasara ụmụ Samuel?

4 Na Baịbụl, a kọrọ gbasara ụfọdụ ndị ndị mụrụ ha kụziiri gbasara Jehova, ma ha ejighị ihe ha mụtara kpọrọ ihe. Ụdị ihe a mere n’ezinụlọ Samuel onye amụma. Ọ bụ mgbe ọ dị obere ka ọ malitere ife Jehova. O rubekwaara Jehova isi mgbe niile. (1 Sam. 12:1-5) Samuel mere ihe ụmụ ya bụ́ Joel na Abaịja kwesịrị ịgba mbọ mee. Ma, ha ejighị ihe nna ha kụziiri ha kpọrọ ihe. Ha mere ihe ọjọọ. Kama ime ka nna ha, Baịbụl kwuru na ha “na-agbagọ ikpe.”Gụọ 1 Samuel 8:1-5.

5, 6. Gịnị ka ụmụ Josaya na nwa nwa ya mechara mee?

5 Ụmụ Eze Josaya mekwara ụdị ihe ahụ. Josaya bụ ezigbo eze. Ọ hụrụ Jehova n’anya ma na-efe naanị ya. Mgbe a hụrụ akwụkwọ Iwu Chineke ma gụọrọ ya Josaya, ọ gbara mbọ mee ihe Jehova kwuru na ya. O mere ka a kwụsị ikpere arụsị na ime mgbaasị n’Izrel, gbaakwa ndị Izrel ume ka ha na-erubere Jehova isi. (2 Eze 22:8; 23:2, 3, 12-15, 24, 25) Ọ kụziiri ụmụ ya ihe ndị mara ezigbo mma gbasara Jehova. Ma, mgbe ụmụ ya atọ na otu nwa nwa ya mechara ghọọ eze, o nweghị onye n’ime ha ji ihe a kụziiri ya kpọrọ ihe.

6 Onye nọchiri Eze Josaya bụ nwa ya aha ya bụ Jehoahaz. Ma, o mere “ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.” Mgbe ọ chịrị naanị ọnwa atọ, Fero bụ́ eze Ijipt tụrụ ya mkpọrọ. Ọ nọrọ n’ebe a kpụgara ya nwụọ. (2 Eze 23:31-34) Nwanne ya bụ́ Jehoyakim chịrị afọ iri na otu. O jighịkwa ihe nna ya kụziiri ya kpọrọ ihe. Àgwà ya jọrọ ezigbo njọ. Ọ bụ ya mere Jeremaya ji buo amụma banyere ya, sị: “A ga-eli ya dị ka oké ịnyịnya ibu.” (Jere. 22:17-19) Zedekaya nwa Josaya na Jehoyakin nwa nwa Josaya mekwara ihe ọjọọ. Ha emeghị ihe ziri ezi otú ahụ Josaya mere.2 Eze 24:8, 9, 18, 19.

7, 8. (a) Gịnị ka Sọlọmọn mere, nke gosiri na o meghị ihe a kụziiri ya gbasara Jehova? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere ụfọdụ ndị na-emeghị ihe a kụziiri ha gbasara Jehova?

7 Eze Sọlọmọn mụtara ọtụtụ ihe n’aka nna ya bụ́ Devid. Nna ya kụziiri ya otú o kwesịrị isi fee Jehova. O mekwara ihe ziri ezi ná mmalite. Ma, o mechara mee ihe na-adịghị mma. ‘Mgbe Sọlọmọn na-eme agadi, ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa soro chi ọzọ dị iche iche; obi ya dum adịghịkwa n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ dị ka obi Devid nna ya dịrị.’ (1 Eze 11:4) N’ihi ya, Jehova jụrụ Sọlọmọn.

Ndị a niile anyị kọrọ gbasara ha nwere ohere ha gaara eji mara Jehova ma mee ihe ziri ezi. Ọ dị mwute na ha ejighị ya mee ihe bara uru. N’oge ahụ, ọ bụghị ndị niile na-eto eto ji ohere ọma ha nwere mee ihe na-abaghị uru. Ọ bụghịkwa ha niile na-eme otú ahụ taa. Ka anyị tụlee gbasara ụfọdụ ndị na-eto eto i kwesịrị ime ka ha.

 NDỊ JI IHE JEHOVA NYERE HA KPỌRỌ IHE

9. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ụmụ Noa mere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’ihe ụmụ Noa mere. Jehova nyere nna ha iwu ka ọ rụọ ụgbọ ma kpọrọ ezinụlọ ya baa na ya. O doro anya na ụmụ Noa ji obi ha niile mee uche Jehova. Ha mere ihe nna ha gwara ha. Ka oge na-aga, ha nyeere ya aka rụọ ụgbọ ahụ, mechaakwa baa na ya. (Jen. 7:1, 7) Gịnị mere ha ji mee otú ahụ? Jenesis 7:3 kwuru na ha kpọbara ụmụ anụmanụ n’ụgbọ ahụ “iji chebe ụmụ ha ndụ n’elu ụwa dum.” Jehova chebekwara ụmụ mmadụ. Ụmụ Noa mere ihe nna ha kụziiri ha gbasara Jehova. Ọ bụ ya mere ha ji nwee ike iso mee ka ụmụ mmadụ fọdụ n’ụwa, meekwa ka a malite ife Chineke n’ụwa mgbe Iju Mmiri gachara.Jen. 8:20; 9:18, 19.

10. Olee otú ụmụ okorobịa Hibru anọ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn si gosi na ha ji eziokwu a kụziiri ha kpọrọ ihe?

10 Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, ụmụ okorobịa Hibru anọ gosiri na ha ghọtara ihe ka mkpa. Aha ha bụ Hananaya, Mishel, Azaraya, na Daniel. A dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn n’afọ 617 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ha mara mma, marakwa ihe. N’ihi ya, ọ gaara adịrị ha mfe ịna-ebi ndụ ka ndị Babịlọn. Ma, ha emeghị otú ahụ. Otú ha si kpaa àgwà gosiri na ha chetara ihe a kụziiri ha gbasara Jehova. Jehova gọziri ha anọ maka na ha echefughị ihe ha mụtara mgbe ha dị obere.Gụọ Daniel 1:8, 11-15, 20.

11. Olee otú ndị ọzọ si rite uru n’ihe a kụziiri Jizọs?

11 Ihe anyị na-atụle gbasara ndị kpara ezi àgwà na Baịbụl agaghị ezu ezu ma ọ bụrụ na anyị atụleghị gbasara Jizọs bụ́ Ọkpara Chineke. Jehova kụziiri ya ọtụtụ ihe. O jighịkwa ihe ndị ahụ gwuo egwu. Ihe o kwuru gosiri na o ji ihe ndị ahụ a kụziiri ya kpọrọ ihe. Ọ sịrị: “M na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” (Jọn 8:28) O ji obi ụtọ gwa ndị ọzọ ihe ọ mụtara n’ihi na ọ chọrọ ka ọ baara ha uru. O kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:18, 43) O mere ka ndị na-ege ya ntị ghọta na ha ekwesịghị ịbụ “nke ụwa” n’ihi na ụwa ejighị eziokwu Chineke kpọrọ ihe.Jọn 15:19.

JIRI IHE E NYERE GỊ KPỌRỌ IHE

12. (a) Olee otú ihe e kwuru na 2 Timoti 3:14-17 si gbasa ọtụtụ ndị na-eto eto taa? (b) Olee ajụjụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịjụ onwe ha?

12 N’isiokwu a, anyị ekwuola gbasara ụfọdụ ụmụ okorobịa ndị mụrụ ha fere Chineke. O nwere ike ịbụ na papa gị na mama gị na-efekwa Jehova. Ya bụrụ otú ahụ, ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara Timoti nwere ike ịgbasa gị. (Gụọ 2 Timoti 3:14-17.) Ọ bụ papa gị na mama gị kụziiri gị gbasara Jehova na otú ị ga-esi na-eme ihe ọ chọrọ. O nwere ike ịbụ na ha malitere mgbe ị bụ nwa ọhụrụ kụziwere gị ihe. O doro anya na o meela ka “ị mara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs,” meekwa ka i “ruo eru n’ụzọ zuru ezu” ijere Chineke ozi. Ma, ajụjụ dị mkpa bụ, Ị̀ ga-egosi na i ji ihe ndị a kụziiri gị kpọrọ ihe? Ihe ga-enyere gị aka ịza ajụjụ a bụ ichebara onwe gị echiche. I nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee otú obi na-adị m ma m cheta na m so ná ndị ji obi ha niile na-efe Jehova otú ahụ ndị ohu ya mere n’oge ochie? Olee otú obi na-adị m ma m cheta na m so na mmadụ ole na ole Chineke maara n’ụwa taa? M̀ ghọtara na eziokwu m mụtara bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ?’

Olee otú obi na-adị gị ma i cheta na i so ná ndị ji obi ha niile na-efe Jehova otú ahụ ndị ohu ya mere n’oge ochie? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9, nke 10, na nke 12)

13, 14. Olee ọnwụnwa na-abịara ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst? Gịnị mere na ha ekwesịghị ikwe ka a nwata ha? Nye ihe atụ.

 13 E nwere ike ụfọdụ ndị na-eto eto ndị mụrụ ha bụ Ndị Kraịst agaghị aghọta na eziokwu anyị mụtara mara ezigbo mma nakwa na ụwa Setan jọgburu onwe ya. Ọ na-adịdị ụfọdụ n’ime ha ka ha gaa mara otú ụwa Setan na-atọ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ahụ ụgbọala na-abịanụ, ọ̀ ga-aga nọchiere ya ụzọ ka ọ mara ma ọ̀ ga-emerụ ya ahụ́ ma ọ bụ gbuo ya? Mbanụ. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị ekwesịghị ‘ibi ndụ ịla n’iyi’ n’ụwa ochie a ka anyị mara ma ọ̀ ga-akpatara anyị nsogbu.1 Pita 4:4.

14 E nwere otu nwanna nwoke bi n’Eshia aha ya bụ Gener. A mụrụ ya n’ọgbakọ, meekwa ya baptizim mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. N’oge ahụ ọ ka na-eto eto, ọ malitere ibi ndụ ihu abụọ. O chere na ọ ga-eme ka o nwere onwe ya. Tupu ya eruo afọ iri na ise, ọ malitela iso ndị enyi ya biwe ndụ ọjọọ ha na-ebi. O so ha na-aṅụ mmanya, na-akpọkwa ndị mmadụ iyi. Ọ na-alọtakarị n’abalị, mgbe ya na ndị enyi ya ji kọmputa gwuchaa egwuregwu a na-eme ihe ike na ya. Ma ka oge na-aga, ọ ghọtara na ihe ndị a ọ na-eme anaghị eme ya obi ụtọ n’eziokwu nakwa na o nweghị uru ha ga-abara ya. Ọ lọghachila n’ọgbakọ ugbu a. O kwuru, sị: “A ka nwere ọtụtụ nsogbu mụ na ha na-alụ. Ma, ihe ọma Jehova na-emere m karịrị ha niile.”

15. Gịnị ka anyị niile kwesịrị ichebara echiche ma à mụrụ anyị n’ọgbakọ ma ọ bụ na a mụghị anyị n’ọgbakọ?

15 N’eziokwu, e nwere ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ, ma ndị mụrụ ha abụghị Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, echefula uru ịmara Onye kere gị na ijere ya ozi na-abara gị ugbu a. N’ụwa taa, e nwere ọtụtụ ijeri mmadụ. N’ihi ya, ọ bụ ihe ùgwù na i so ná ndị Jehova dọtara ma mee ka ha ghọta eziokwu Baịbụl. (Jọn 6:44, 45) E kee ndị niile bi n’ụwa taa otu puku ụzọ, ọ bụ naanị otu ụzọ ma eziokwu gbasara Chineke. Ebe ọ bụ na anyị so ná ndị a ma eziokwu, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe obi ụtọ n’agbanyeghị otú anyị si mụta ya? (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:12.) Gener kwuru, sị: “Akpata oyi na-awụ m n’ahụ́ ma m cheta na erughị eru ka Jehova bụ́ Onye Nwe eluigwe na ụwa mara onye m bụ.” (Ọma 8:4) Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Ụmụ akwụkwọ na-akpa nganga ma ọ bụrụ na ndị nkụzi ha  ma ndị ha bụ. Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ ma ọ bụrụ na Jehova, bụ́ Onye Ozizi Ukwu, amara onye mmadụ bụ.”

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

16. Olee ihe ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ikpebi ime?

16 Ebe ọ bụ na i nwere ihe ùgwù magburu onwe ya, ọ́ gaghị adị mma ka i kpebisikwuo ike iso ná mmadụ ole na ole jirila ndụ ha mee ihe bara uru? I mee otú ahụ, ị ga-eso n’ọtụtụ ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. I kwesịrị ime otú ahụ kama iso ọtụtụ ndị na-eto eto ibe gị na-amaghị nke a na-akọ na-eme ihe na-enweghị isi na ọdụ, nke ga-eme ka ha laa n’iyi.2 Kọr. 4:3, 4.

17-19. Gịnị mere ime ihe dị iche n’ihe ndị ụwa na-eme ji dị mma?

17 Ọ pụtaghị na ọ bụ mgbe niile ka ọ na-adịrị mmadụ mfe ikpebi na ya agaghị akpa àgwà ka ndị ụwa. Ma, ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma, anyị ga-aghọta na anyị kwesịrị ime otú ahụ. Ka anyị were onye chọrọ ịga gbaa ọsọ n’egwuregwu Olimpik dị ka ihe atụ. Ka o nwee ike iso gbaa ọsọ n’Olimpik, ọ gaghị na-eme ka ndị ọgbọ ya. Ọ gaghị na-eme ọtụtụ ihe ga na-eri ya oge ma ọ bụ ihe ndị ga-eme ka ọ ghara ịkwado nke ọma. Ma, ọ bụrụ na o soghị ndị ọgbọ ya na-eme ihe ha na-eme, ọ ga-enwe ike ịna-amụkwu ọsọ ahụ ọ chọrọ ịgba, sorokwa gbaa ya.

18 Tupu ọtụtụ ndị n’ụwa taa emee ihe, ha anaghị echebara ihe ọjọọ o nwere ike ịkpata echiche. Ma, Ndịàmà Jehova anaghị eme ka ha. Ọ bụrụ na anyị adịrị iche n’ụwa ma ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma, anyị ‘ga-ejidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’ (1 Tim. 6:19) Nwanna nwaanyị ahụ anyị kwuburu okwu ya kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị nọsie ike n’ihe ndị i kweere, obi ga-emecha dị gị ụtọ. Ọ ga-egosi na obi akaala gị ịlụso ụwa Setan ọgụ. Nke ka nke bụ na ọ ga-adị gị ka ị̀ na-ahụ ebe Jehova Chineke ji gị na-eme ọnụ ma na-ekwe n’isi. Ọ bụ mgbe ahụ ka obi ga-adị gị ụtọ na i soghị ndị ọgbọ gị mee ihe ha na-eme.”

19 Ọ bụrụ na mmadụ na-eche naanị gbasara uru ndị ọ ga-erite ugbu a, onye ahụ agaghị eji ndụ ya mee ihe bara uru. (Ekli. 9:2, 10) Ọ bụrụ na ị ghọta ihe mere e ji kee gị nakwa na i nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi, ọ ga-enyere gị aka ikpebi ime ihe dị mma ma ghara ‘ịna-eje ije dị ka ndị mba ọzọ na-eje.’ Ị ga-ejikwa ndụ gị mee ihe bara uru.Efe. 4:17; Mal. 3:18.

20, 21. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe dị mma, olee uru ọ ga-abara anyị? Ma gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee?

20 Ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe ziri ezi, anyị ga na-ebi ụdị ndụ ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ ugbu a. Anyị “ga-eketa ụwa,” ya bụ, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Jehova ga-agọzi anyị otú anyị na-atụghịdị anya ya. (Mat. 5:5; 19:29; 25:34) Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka Jehova na-emere ihe ndị a. Ọ na-emere ha ndị na-erubere ya isi. (Gụọ 1 Jọn 5:3, 4.) Ma, mbọ niile anyị na-agba ugbu a ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere Jehova ozi agaghị aghọ anyị ahịa.

21 Jehova enyela anyị ọtụtụ ihe. Anyị ma Okwu ya nke ọma, marakwa eziokwu gbasara ya na nzube ya. Anyị nwere ihe ùgwù ịza aha ya na ịbụ Ndịàmà ya. Chineke kwere anyị nkwa na ọ nọnyeere anyị. (Ọma 118:7) Ka anyị niile, ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị agadi, gosi na anyị ji eziokwu a kụziiri anyị gbasara Jehova kpọrọ ihe. Ka anyị gosikwa na anyị chọsiri ike inye Jehova otuto “ruo mgbe ebighị ebi.”Rom 11:33-36; Ọma 33:12.