Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2014

Anyị Kwesịrị Ịdị Nsọ n’Omume Anyị Niile

Anyị Kwesịrị Ịdị Nsọ n’Omume Anyị Niile

“Bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile.”—1 PITA 1:15.

1, 2. (a) Olee otú Chineke chọrọ ka ndị ya si na-eme omume? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

JEHOVA mere ka Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe gosiri na ịdị nsọ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Levitikọs pụtara na anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme omume dị nsọ. (Gụọ 1 Pita 1:14-16.) Jehova, bụ́ “Onye Nsọ,” chọrọ ka ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” gbaa mbọ ka ha dịrị nsọ n’omume ha niile, ọ bụghị n’omume ha ụfọdụ.Jọn 10:16.

2 Ọ bụrụ na anyị elebakwuo anya n’ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Levitikọs, ọ ga-abara anyị ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị mụtara na ya, ọ ga-enyere anyị aka ịna-adị nsọ n’omume anyị niile. Anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele imebi iwu Jehova anya? Gịnị ka Levitikọs na-akụziri anyị gbasara igosi na Jehova bụ Ọkaakaa? Olee ihe anyị ga-amụta n’àjà ụmụ Izrel chụrụ?

LEZIE ANYA KA Ị GHARA IMEBI IWU CHINEKE

3, 4. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji na-erubere iwu Jehova na ụkpụrụ ya isi? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịbọ ọbọ ma ọ bụ buru iwe n’obi?

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka obi dị Jehova ụtọ, anyị kwesịrị ịna-erubere iwu ya na ụkpụrụ ya isi. Anyị ekwesịghị ịna-emebi iwu ya ma ọ bụ were ya ka ihe na-adịghị nsọ. N’agbanyeghị na  a gwaghị Ndị Kraịst ka ha na-edebe Iwu Mozis, Iwu ahụ na-enyere anyị aka ịma ihe dị Jehova mma na ihe na-adịghị ya mma. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara ụmụ Izrel, sị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi; hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị. Abụ m Jehova.”—Lev. 19:18.

4 Jehova achọghị ka anyị na-abọ ọbọ ma ọ bụ buru iwe n’obi. (Rom 12:19) Ọ bụrụ na anyị eleghara iwu Chineke nyere anyị anya, obi ga-adị Ekwensu ụtọ. Anyị nwekwara ike ime ka a kọchaa aha Jehova. Ọ bụrụgodị na mmadụ kpachaara anya mee anyị ihe ọjọọ, anyị ekwesịghị iwebiga iwe ókè. Baịbụl kwuru na anyị bụ “arịa e ji ụrọ kpụọ,” nke e tinyere akụ̀ na ya. Akụ̀ ahụ bụ ozi ọma anyị na-ekwusa. (2 Kọr. 4:1, 7) Ọ bụrụ na anyị eburu iwe n’obi, ọ ga-adị ka ànyị na-etinye asid n’arịa ahụ e tinyere akụ̀ bara ezigbo uru.

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara Erọn na ọnwụ ụmụ ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Levitikọs 10:1-11 kọrọ otu ihe merenụ nke mere ka obi gbawaa ndị nọ n’ezinụlọ Erọn. Ọ ga-abụrịrị na o wutere ha mgbe ọkụ si n’eluigwe regbuo ụmụ Erọn abụọ, ya bụ, Nedab na Abaịhu, mgbe ha nọ n’ụlọikwuu Jehova. Chineke gwara Erọn na ezinụlọ ya ka ha ghara iruru ha uju. Ihe a ọ gwara ha ga-eme ka a mata ma okwukwe ha ò sikwara ike. Ọ bụrụ na a chụọ onye ezinụlọ unu ma ọ bụ onye ọzọ n’ọgbakọ, ị̀ na-egosi na ị dị nsọ ma ghara ikwe ka gị na ya na-akpa?—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:11.

6, 7. (a) Mgbe anyị na-ekpebi ma ànyị ga-aga agbamakwụkwọ a ga-eme na chọọchị, olee ihe ndị dị mkpa anyị kwesịrị ichebara echiche? (Kwuo ihe dị n’isiokwu e dere n’ala ala peeji.) (b) Olee otú anyị nwere ike isi kọwaara onye ikwu anyị na-abụghị Onyeàmà Jehova ihe mere na anyị agaghị abịa agbamakwụkwọ ya na chọọchị?

6 O nwere ike ụdị ọnwụnwa ga-abịara anyị agaghị ata akpụ ka nke ahụ bịaara Erọn na ezinụlọ ya. Ka e were ya na onye ikwu anyị na-abụghị Onyeàmà Jehova ga-agba akwụkwọ na chọọchị. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ kpọrọ anyị ka anyị bịa, nyekwa anyị ọrụ anyị ga-arụrụ ya? Anyị ma na Baịbụl ekwughị hoo haa na anyị ekwesịghị ịga. Ma, è nwere ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ikpebi ihe anyị kwesịrị ime n’ụdị ihe ahụ? *

7 Ụdị ihe a mee, o nwere ike iju ndị ikwu anyị anya na anyị kpebisiri ike ịdị nsọ n’anya Jehova. (1 Pita 4:3, 4) O doro anya na anyị achọghị ịkpasu ha iwe. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obiọma gwa ha hoo haa ihe mere anyị ji kpebie ihe anyị kpebiri. Anyị nwere ike ịgwa ha ya tupu ụbọchị ahụ eruo. Anyị nwere ike ikele ha ma gwa ha na obi dị anyị ụtọ na ha kpọrọ anyị ka anyị bịa agbamakwụkwọ ha. Anyị nweziri ike ịgwa ha na anyị chọrọ ka obi dị ha ụtọ n’ụbọchị ahụ pụrụ iche nakwa na anyị agaghị eso ha mee ihe ndị a ga-eme na chọọchị n’ụbọchị ahụ. N’ihi ya, anyị agaghị abịa ka anyị ghara imechu ha na ndị ọzọ ihu. Anyị nwere ike isi otú ahụ gbaara nsogbu ọsọ ma ghara ime ihe anyị ma na Onye Kraịst ekwesịghị ime.

GOSI NA JEHOVA BỤ ỌKAAKAA

8. Olee otú akwụkwọ Levitikọs si gosi na Jehova bụ Ọkaakaa?

8 Akwụkwọ Levitikọs mere ka o doo anya na Jehova bụ Ọkaakaa. E kwuru ihe karịrị ugboro iri atọ na ọ bụ Jehova nyere iwu ndị dị n’akwụkwọ Levitikọs. Mozis ma na ọ bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe niile Jehova nyere ya n’iwu. (Lev. 8:4, 5) Anyịnwa kwesịkwara ịna-eme ihe niile Ọkaakaa anyị bụ́ Jehova chọrọ ka anyị mee. Nzukọ Chineke na-enyere anyị aka ime otú ahụ. Ma, ọnwụnwa nwere ike ịbịara anyị mgbe naanị anyị nọ otú ahụ ọ bịaara Jizọs mgbe ọ nọ  n’ala ịkpa. (Luk 4:1-13) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi ma na-egosi na ọ bụ Ọkaakaa, o nweghị onye ga-emeli ka anyị nupụrụ ya isi. Anyị agaghịkwa atụ egwu mmadụ.—Ilu 29:25.

9. Gịnị mere e ji kpọọ ndị Chineke asị n’ụwa niile?

9 Ebe anyị na-eso ụzọ Kraịst, bụrụkwa Ndịàmà Jehova, a na-akpagbu anyị n’ụwa niile. O kwesịghị iju anyị anya n’ihi na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ka a kpagbuo unu, ha ga-egbukwa unu, mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) N’agbanyeghị na a kpọrọ anyị asị, anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-eme omume dị nsọ n’anya Jehova. Ma, gịnị mere e ji kpọọ anyị asị otú a ebe ọ bụkwanụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ, na-ebi ndụ dị ọcha, bụrụkwa ezigbo ụmụ amaala? (Rom 13:1-7) Ọ bụ n’ihi na anyị na-erubere Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova isi. Anyị na-efe “naanị ya.” Anyị agaghịkwa emebi iwu ya na ụkpụrụ ya.—Mat. 4:10.

10. Gịnị mere otu nwanna kwetara ghọọ onye agha?

10 Ihe ọzọ bụ na anyị “abụghị nke ụwa.” N’ihi ya, anyị anaghị etinye aka n’agha ndị a na-alụ n’ụwa ma ọ bụkwanụ n’ihe gbasara ọchịchị. (Gụọ Jọn 15:18-21; Aịzaya 2:4.) Ụfọdụ ndị nyefere Chineke onwe ha etinyela aka n’ụdị ihe ahụ. Ma, ọtụtụ n’ime ha mechara chegharịa, ha na Nna anyị nke eluigwe bụ́ onye obi ebere adịkwa ná mma. (Ọma 51:17) Mmadụ ole na ole n’ime ha ekweghị echegharị. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, e nwere ọtụtụ ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ n’ebe dị iche iche na Họngeri. N’otu obodo, ndị ọchịchị kpọkọtara otu narị na iri isii n’ime ha ma nye ha iwu ka ha soro gaa agha. Ụmụnna ndị ahụ bụ ndị na-erubeghị afọ iri anọ na ise. Ọtụtụ n’ime ha jụrụ. Mmadụ itoolu kwetara ma ghọọ ndị agha. Mgbe afọ abụọ gara, a gwara otu n’ime ndị ahụ kwetara ghọọ ndị agha ka o soro gbagbuo ụmụnna ndị ahụ na-ekweghị aga agha. Nwanne ya nwoke so n’ụmụnna ndị ahụ. Ma, e mechara e gbughịzi ha.

NYE JEHOVA IHE KACHA MMA I NWERE

11, 12. Gịnị ka Ndị Kraịst taa kwesịrị ịmụta n’àjà ndị Izrel chụụrụ Jehova n’oge ochie?

11 Iwu Mozis kwuru àjà dị iche iche ụmụ Izrel ga na-achụ. (Lev. 9:1-4, 15-21) Anụ ha ga-eji chụọ àjà ndị ahụ agaghị enwe nkwarụ n’ihi na ọ na-anọchite anya àjà zuru okè Jizọs ga-achụ. E kwukwara otú ụmụ Izrel ga-esi achụ ụdị àjà nke ọ bụla ha chọrọ ịchụ. Dị ka ihe atụ, Levitikọs 12:6 kwuru ihe nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Mgbe ụbọchị ime onwe ya ka ọ dị ọcha maka nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị zuru, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nwa ebule na-agafebeghị otu afọ maka àjà nsure ọkụ nakwa nwa kpalakwukwu ma ọ bụ nduru maka àjà mmehie n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” N’agbanyeghị na Chineke kwuru kpọmkwem ihe a ga-eme, iwu ahụ o nyere gosiri na o nwere obiọma nakwa na ọ naghị agwa mmadụ mee ihe ọ na-agaghị emeli. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ agaghị ewetali atụrụ, o nwere ike iweta nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ. (Lev. 12:8) N’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye, Jehova hụrụ ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe otú ahụ ọ hụrụ onye nke wetara ihe dara oké ọnụ n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a?

12 Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha na-achụrụ Chineke “àjà otuto.” (Hib. 13:15) Anyị kwesịrị iji egbugbere ọnụ anyị na-agwa ndị ọzọ banyere aha nsọ Jehova. Ụmụnna anyị ndị ogbi na-eji asụsụ ndị ogbi eto aha Jehova. Ụmụnna ndị ọrịa na-anaghị ekwe pụta èzí na-eji fon ma ọ bụ akwụkwọ ozi eto Jehova. Ha na-ezikwa ndị bịara ileta ha ozi ọma. Otú  anyị si achụrụ Jehova àjà otuto bụ ime ka a mara aha ya na ikwusa ozi ọma. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-eme ya, ọ bụrụgodị na anyị na-arịa ọrịa. Ma, anyị kwesịrị inye Jehova ihe kacha mma anyị nwere.—Rom 12:1; 2 Tim. 2:15.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enye akụkọ ozi anyị?

13 Anyị na-eji obi anyị niile achụrụ Jehova àjà otuto n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. (Mat. 22:37, 38) Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a gwa anyị nye akụkọ ozi anyị? Anyị kwesịrị ịgbalị nye ya n’ihi na ọ bụ otu ụzọ anyị si egosi na anyị na-asọpụrụ Chineke. (2 Pita 1:7) Ma, anyị ekwesịghị ịna-eji ọtụtụ awa aga ozi ọma naanị maka na anyị chọrọ inye awa buru ibu. N’ihi ya, ọ bụrụ na nká ma ọ bụ ọrịa emee ka onye nkwusa ghara iji ihe ruru otu awa gaa ozi ọma, o nwere ike inye naanị nkeji iri na ise o ji kwusaa ozi ọma. Obi ga-adị Jehova ụtọ n’ihi na ọ bụ otú ike ya hà. Jehova makwa na ọ hụrụ ya n’anya, chọọkwa ịbụ Onyeàmà ya. Ụdị onye a ka nwere ike inye akụkọ ozi ma nwee obi ụtọ. O yiri onye Izrel dara ogbenye, nke ji ihe na-adaghị oké ọnụ chụọrọ Jehova àjà. Akụkọ ozi ọ bụla anyị nyere na-eso n’akụkọ ozi ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile nyere. Ọ na-enyere nzukọ Jehova aka ịhazi otú a ga-esi na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ọ bụrụ na a gwa anyị ka anyị nye akụkọ ozi anyị, ànyị kwesịrị iche na ọ bụ ihe anyị na-agaghị emeli?

OTÚ ANYỊ NA-ESI AMỤ IHE NA ÀJÀ OTUTO ANYỊ NA-ACHỤRỤ CHINEKE

14. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebara otú anyị si amụ ihe echiche?

14 Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe ndị anyị mụtara n’akwụkwọ Levitikọs, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Aghọtakwuola m ihe mere akwụkwọ a ji soro n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ.’ (2 Tim. 3:16) O nwere ike ịbụ na o meela ka i kpebisikwuo ike na ị ga na-adị nsọ, ọ bụghị naanị maka na Jehova chọrọ ka ị na-eme otú ahụ kama maka na ọ bụ ya ka i kwesịrị ịgbalịsi ike mee ka obi dị ụtọ. Ma eleghị anya, ihe ị mụtara n’isiokwu abụọ a gbasara akwụkwọ Levitikọs emeela ka i kpebisie ike ịna-amụsi Baịbụl ike. (Gụọ Ilu 2:1-5.) Kpee ekpere ma chebara otú i si amụ Okwu Chineke echiche. O doro anya na ị chọrọ ka Jehova nabata àjà otuto ị na-achụrụ ya. Ị̀ na-ekwe ka ile tiivi, igwu egwuregwu vidio ma ọ bụ ụdị egwuregwu ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ i ji atụrụ ndụ mee ka ị ghara iji ike gị niile na-efe Chineke? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abara gị uru ma i chebara ihe ụfọdụ Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ Ndị Hibru echiche.

Ị̀ na-ewere ọmụmụ Baịbụl gị ma ọ bụ Ofufe Ezinụlọ gị ka ihe kacha mkpa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

15, 16. Gịnị mere na Pọl ezoghị ọnụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru?

15 Pọl ezoghị ọnụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya bụ́ ndị Hibru. (Gụọ Ndị Hibru 5:7, 11-14.) Ọ gwara ha hoo haa na ha aghọọla “ndị ntị ike.” Gịnị mere na Pọl ezoghị ọnụ mgbe ọ na-agwa ha okwu? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya otú Jehova si hụ ha. Ọ na-ewute ya na ha na-aṅụ naanị mmiri ara, ya bụ na afọ juru ha maka na ha mụtara naanị ihe na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi. Ọ bụ eziokwu  na ịghọta ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi dị mkpa, anyị kwesịrị ịna-eri “nri siri ike,” ya bụ, ịna-amụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Baịbụl na-akụzi ka anyị nwee ike ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ.

16 Kama ndị Hibru ga na-amụkwu ihe ka ha nwee ike ịkụziri ndị ọzọ ihe, ọ bụ hanwa ka e kwesịrị ịkụziri ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ekweghị eri “nri siri ike.” Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ele eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl anya otú kwesịrị ekwesị? M̀ na-amụ ha? Ka m̀ na-ahapụ ikpe ekpere na ịmụsi Baịbụl ike? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe so kpata ya ọ̀ bụ otú m si amụ ihe?’ Ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị izi ndị mmadụ ozi ọma, anyị kwesịrị ịna-akụziri ha ihe, nyekwara ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Mat. 28:19, 20.

17, 18. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eri “nri siri ike”? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya tupu a gawa ọmụmụ ihe?

17 Ịmụ Baịbụl nwere ike ịna-esiri ọtụtụ ndị ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova achọghị ịmanye anyị amanye ka anyị na-amụ ihe. Ma, anyị kwesịrị ịna-eri “nri siri ike” ma ọ̀ dịla anya anyị batara n’ọgbakọ ma ànyị ka batara abata. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịdị nsọ mgbe niile.

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị nsọ, anyị ga-amụ Baịbụl nke ọma ma mee ihe Chineke chọrọ ka anyị mee. Nedab na Abaịhu bụ́ ụmụ Erọn nwụrụ n’ihi na ha surere “ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị.” O nwere ike ịbụ mgbe mmanya na-egbu ha. (Lev. 10:1, 2) Chegodị ihe Chineke gwara Erọn mgbe ihe a mechara. (Gụọ Levitikọs 10:8-11.) Ihe e kwuru ebe a ọ̀ pụtara na anyị ekwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya tupu anyị agawa ọmụmụ ihe? Chegodị gbasara ihe ndị a: A gwaghị anyị ka anyị na-edebe Iwu Mozis. (Rom 10:4) Ná mba ụfọdụ, ụmụnna anyị na-aṅụtụ mmanya na-aba n’anya mgbe ha na-eri nri tupu ha agawa ọmụmụ ihe. Ndị Izrel na-eji iko mmanya anọ eme Ememme Ngabiga. Mgbe Jizọs na-amalite Ncheta Ọnwụ ya, o bunyere ndịozi ya mmanya nke nọchiri anya ọbara ya. (Mat. 26:27) Baịbụl kwuru na ịṅụ oké mmanya na ịṅụbiga mmanya ókè adịghị mma. (1 Kọr. 6:10; 1 Tim. 3:8) E nwere ọtụtụ Ndị Kraịst akọnuche ha na-anaghị ekwe ṅụọ mmanya na-aba n’anya tupu ha emewe ihe ọ bụla gbasara ofufe Chineke. Ma, otú e si eme ihe n’otu mba nwere ike ịdị iche n’otú e si eme ihe ná mba ọzọ. Ihe ọzọ bụ na Ndị Kraịst kwesịrị ‘ịkpa ókè n’agbata ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa n’agbata ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha’ ka ha nwee ike ịna-eme omume dị nsọ, nke ga-eme Chineke obi ụtọ.

19. (a) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ofufe ezinụlọ anyị nakwa mgbe naanị anyị na-amụ ihe? (b) Olee otú ị ga-esi gosi na i kpebisiri ike ịna-adị nsọ?

19 Ọ bụrụ na anyị amụọ Okwu Chineke nke ọma, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe bara uru Baịbụl na-akụzi. Jiri akwụkwọ anyị na ihe ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ na-eme nchọnchọ n’ofufe ezinụlọ unu nakwa mgbe naanị gị na-amụ ihe n’ihi na ọ ga-eme ka ị mụta ọtụtụ ihe. Mụkwuo gbasara Jehova na nzube ya. Mee ka gị na ya dịkwuo ná mma. (Jems 4:8) Kpee ụdị ekpere ahụ ọbụ abụ kpere. Ọ rịọrọ Chineke, sị: “Meghee anya m, ka m hụ ihe dị ebube ndị dị n’iwu gị.” (Ọma 119:18) Ekwekwala ka i mebie iwu Chineke na ụkpụrụ ya. Jiri obi gị niile na-erubere iwu ọ bụla “Onye Nsọ” bụ́ Jehova nyere isi. Jirikwa ịnụ ọkụ n’obi “na-arụ ọrụ dị nsọ nke ozi ọma banyere Chineke.” (1 Pita 1:15; Rom 15:16) Na-adị nsọ n’oge ikpeazụ a tara akpụ. Ka anyị niile na-eme omume dị nsọ, si otú ahụ gosi na Jehova, bụ́ Chineke anyị dị nsọ, bụ Ọkaakaa anyị.

^ para. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” n’Ụlọ Nche May 15, 2002.