Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2014

Unu ga-abụ “alaeze nke ndị nchụàjà”

Unu ga-abụ “alaeze nke ndị nchụàjà”

“Unu onwe unu ga-aghọrọ m alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.”—ỌPỤ. 19:6.

1, 2. Gịnị mere e kwesịrị iji chebe mkpụrụ nwaanyị ahụ?

AMỤMA mbụ e dere na Baịbụl ga-eme ka anyị ghọta otú nzube Jehova ga-esi emezu. Mgbe Chineke kwere nkwa ahụ o kwere n’Iden, o kwuru, sị: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị [ya bụ, Setan] na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya.” Olee otú iro ahụ ga-esiru n’ike? Jehova gwara Setan, sị: “[Mkpụrụ nwaanyị ahụ] ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.” (Jen. 3:15) Otú iro dị n’etiti Setan na nwaanyị ahụ ga-esi sie ike ga-eme ka Setan jiri ike ya niile gbalịa ibibi mkpụrụ nwaanyị ahụ.

2 Ọ bụ ya mere otu ọbụ abụ ji gwa Chineke n’ekpere o kpere gbasara ndị Chineke, sị: “Lee! ndị iro gị nọ n’ọgba aghara; ndị kpọrọ gị asị nke ukwuu eweliwo isi ha elu. Ha ji aghụghọ na-agbara ndị gị izu; ha na-agbakwara ndị gị e zobere ezobe izu. Ha asịwo: ‘Bịanụ ka anyị kpochapụ ha ka ha ghara ịbụkwa mba.’” (Ọma 83:2-4) Setan chọrọ ikpochapụ agbụrụ a ga-esi nweta mkpụrụ ahụ ma ọ bụkwanụ mee ka a ghara ịmata nke bụ́ agbụrụ ahụ. Jehova chọrọ ichebe mkpụrụ ahụ ma mee ka obi sie ndị mmadụ ike na Mesaya ga-abụrịrị eze. Ọ bụ ya mere o ji mee ka e nwee ọgbụgba ndụ ndị ọzọ.

 ỌGBỤGBA NDỤ E JI CHEBE MKPỤRỤ AHỤ

3, 4. (a) Olee mgbe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ malitere ịdị irè? Gịnị ka mba Izrel kwetara na ha ga-eme? (b) Gịnị mere e ji nwee ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

3 Mgbe ụmụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb ruru ọtụtụ nde, Jehova mere ka ha ghọọ otu mba, ya bụ, mba Izrel. O si n’aka Mozis mee ka ha na ya gbaa ndụ. O nyere ha Iwu ya, ha ekweta irubere ya isi. Baịbụl kwuru na Mozis “weere akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ gụọ ná ntị ndị Izrel. Ha wee sị: ‘Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.’ Mozis wee were ọbara [oké ehi e ji chụọ àjà] fesa ndị Izrel, sị: ‘Ihe a bụ ọbara nke ọgbụgba ndụ unu na Jehova gbaworo n’okwu a niile.’”—Ọpụ. 24:3-8.

4 Ọgbụgba ndụ iwu ahụ malitere ịdị irè n’Ugwu Saịnaị n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst. Jehova ji ọgbụgba ndụ ahụ họrọ mba Izrel ka ha bụrụ mba ya pụrụ iche. Ọ bụ ya mere Jehova ji bụrụ ‘Onyeikpe ha, Onye na-enye ha iwu, na Eze ha.’ (Aịza. 33:22) Ihe Baịbụl kọrọ gbasara ndị Izrel gosiri ihe na-eme ma ndị mmadụ rubere Jehova isi ma ọ bụ nupụrụ ya isi. Ebe ọ bụ na Iwu ahụ Chineke si n’aka Mozis nye ndị Izrel gwara ha ka ha ghara ịlụ ndị na-ekpere arụsị nakwa ka ha ghara ife arụsị, ọ pụtara na ọ ga-echebe agbụrụ a ga-esi nweta mkpụrụ ahụ Chineke kwere Ebreham ná nkwa.—Ọpụ. 20:4-6; 34:12-16.

5. (a) Olee ihe ùgwù ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mere ka ụmụ Izrel nwee? (b) Gịnị mere Chineke ji jụ ndị Izrel?

5 N’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, a họpụtara ndị nchụàjà ka ha na-achụ àjà n’Izrel. E ji ọrụ ahụ ha rụrụ gosi ọrụ ndị nchụàjà ọzọ ga-arụ n’ọdịnihu. (Hib. 7:11; 10:1) Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mere ka ndị Izrel nwee ihe ùgwù pụrụ iche, ya bụ na ha ga-abụ “alaeze nke ndị nchụàjà,” ma ọ bụrụ na ha erubere Iwu Jehova isi. (Gụọ Ọpụpụ 19:5, 6.) Ma, ụmụ Izrel erubereghị Jehova isi. Ha anabataghị Jizọs bụ́ isi sekpụ ntị ná mkpụrụ Ebreham. Kama, ha jụrụ ya. Ọ bụ ya mere Jehova ji jụkwa ha.

Isi ụmụ Izrel nupụụrụ Chineke apụtaghị na ọgbụgba ndụ Iwu ahụ adịghị mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo nke 6)

6. Olee ọrụ Iwu ahụ rụrụ?

6 Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel kwụsịrị irubere Jehova isi, ha aghọghị alaeze ndị nchụàjà. Ma, ọ pụtaghị na Iwu ahụ adịghị mma. O chebere mkpụrụ ahụ ma mee ka ndị mmadụ nwee ike ịmata onye bụ́ Mesaya. Ozugbo Kraịst bịara n’ụwa, a mata onye ọ bụ, ọ pụtara na Iwu ahụ arụọla ọrụ ya. Baịbụl kwuru, sị: “Kraịst bụ njedebe Iwu ahụ.” (Rom 10:4) Ma, ajụjụ e kwesịrị ịza bụ: Oleezi ndị ga-abụ alaeze ndị nchụàjà? Jehova Chineke mere ka e nwee ọgbụgba ndụ ọzọ ga-eme ka e nweta mba ọhụrụ.

 OTÚ E SI NWETA MBA ỌHỤRỤ

7. Olee ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo gbasara ọgbụgba ndụ ọhụrụ?

7 Ọtụtụ afọ tupu a kagbuo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma kwuo na ya na mba Izrel ga-agba “ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” (Gụọ Jeremaya 31:31-33.) Ọgbụgba ndụ a agaghị adị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ihi na a gaghị eji ụmụ anụmanụ chụọ àjà tupu e nwee ike ịgbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha. Olee otú ọ ga-esi kwe omume?

8, 9. (a) Olee uru ọbara ahụ Jizọs ji chụọ àjà bara? (b) Olee ihe ùgwù ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, n’afọ 33. Jizọs gwara ndịozi ya iri na otu gbasara mmanya ahụ, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.” (Luk 22:20) Matiu kwuru na mgbe Jizọs na-enye ha mmanya ahụ, ọ sịrị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.”—Mat. 26:27, 28.

9 Ọ bụ ọbara Jizọs ji chụọ àjà mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè. O ji ọbara ahụ chụọ àjà naanị otu ugboro. Ọ bụ ya mere ka e nwee ike ịgbaghara ndị mmadụ mmehie ha ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ebe ọ bụ na ọ bụghị onye mmehie, e nweghị mmehie a ga-agbaghara ya. Ma, Chineke nwere ike iji àjà ahụ Jizọs chụrụ mee ihe ga-abara ụmụ mmadụ uru. O nwekwara ike iji mmụọ nsọ ya tee ụfọdụ ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi mmanụ, ha abụrụ “ụmụ” ya. (Gụọ Ndị Rom 8:14-17.) Jehova ga-ewerezi ha otú ahụ o si were Ọkpara ya bụ́ Jizọs, onye na-emeghị mmehie ọ bụla. Ndị a e tere mmanụ ga-abụ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,” bụrụkwa “alaeze nke ndị nchụàjà.” Ihe ùgwù ndị a mechara kwaa ndị Izrel. Pita onyeozi kwuru gbasara ndị e tere mmanụ, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke, ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) O doro anya na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị ezigbo mkpa. O mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee ike iso ná ndị bụ́ mkpụrụ Ebreham.

MGBE ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ AHỤ MALITERE ỊDỊ IRÈ

10. Olee mgbe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè? Gịnị mere na ọ bụghị tupu mgbe ahụ?

10 Olee mgbe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè? Ọ bụghị mgbe ahụ Jizọs kwuru gbasara ya n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya. Tupu ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ adị irè, Jizọs ga-eji ọbara ya chụọ àjà, laghachi eluigwe, ma gosi Chineke uru àjà ahụ ọ chụrụ bara. Ihe ọzọ bụ na e kwesịrị iji mmụọ nsọ tee “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe” mmanụ. N’ihi ya, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè na Pentikọst afọ 33 mgbe e ji mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ.

11. Olee otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si mee ka ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu nwee ike iso ná ndị e tere mmanụ? Mmadụ ole ga-eso n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?

11 N’agbanyeghị na e nwere ike ikwu na ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ghọrọ ihe ‘oge ya gafere’ mgbe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo na ya na Izrel ga-agba ndụ ọhụrụ, ọgbụgba ndụ ahụ akwụsịghị ịrụ ọrụ ruokwa mgbe ọgbụgba ndụ ọhụrụ  ahụ malitere ịdị irè. (Hib. 8:13) Ozugbo ọ malitere ịdị irè, Chineke ga-ewere Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu otú o si were ndị Juu n’ihi na ‘úgwù e biri ha bụ n’obi site na mmụọ, ọ bụghị site n’iwu e dere ede.’ (Rom 2:29) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-eme ka Chineke tinye iwu ya ‘n’uche ha, deekwa ya n’ime obi ha.’ (Hib. 8:10) Ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Ọ bụ ha bụ mba ọhụrụ a kpọrọ “Izrel nke Chineke,” ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ.—Gal. 6:16; Mkpu. 14:1, 4.

12. Olee otú ọgbụgba ndụ Iwu ahụ na ọgbụgba ndụ ọhụrụ si yie?

12 Olee otú ọgbụgba ndụ Iwu ahụ na ọgbụgba ndụ ọhụrụ si yie? Ọ bụ Jehova na mba Izrel gbara ndụ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. N’ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ bụ Jehova na “Izrel nke Chineke” gbara ndụ. Mozis bụ onye ogbugbo n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Jizọs abụrụ onye ogbugbo n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Ọ bụ ọbara anụmanụ mere ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ dị irè, ma ọ bụ ọbara Jizọs ji chụọ àjà mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị irè. N’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ọ bụ Mozis bụ onye ndú mba Izrel. Ma, Jizọs, bụ́ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ Onye Ndú ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.—Efe. 1:22.

13, 14. (a) Olee otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si gbasa Alaeze Chineke? (b) Gịnị ka a ga-eme ka ndị e tere mmanụ nwee ike iso Kraịst chịa n’eluigwe?

13 Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gbasara Alaeze Chineke n’ihi na o mere ka e nwee mba dị nsọ, ndị ga-abụ eze na ndị nchụàjà n’Alaeze Chineke n’eluigwe. Mba ọhụrụ a bụ ndị so ná mkpụrụ Ebreham. (Gal. 3:29) N’ihi ya, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mere ka obi sie ụmụ mmadụ ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere n’ọgbụgba ndụ Ebreham.

14 E nwere ihe ọzọ gbasara Alaeze Chineke e kwesịrị ime ka o doo anya. Ọ bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mere ka e nwee “Izrel nke Chineke,” meekwa ka ha nwee ike ịbụ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe.” Ma, e kwesịrị inwe ọgbụgba ndụ ga-eme ka ha nwee ike iso Jizọs bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe.

ỌGBỤGBA NDỤ NKE GA-EME KA NDỊ ỌZỌ SORO KRAỊST CHỊA

15. Olee ndụ Jizọs na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi gbara?

15 Mgbe Jizọs malitechara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ya na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi gbara ndụ. A na-akpọ ya ọgbụgba ndụ Alaeze. (Gụọ Luk 22:28-30.) Ọgbụgba ndụ a adịghị ka ndị nke ọzọ n’ihi na Jehova esoghị gbaa ya. Ọ bụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ gbara ya. Mgbe Jizọs kwuru, sị: “Dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ,” o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu gbasara ndụ ya na Jehova gbara ka ọ bụrụ “onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.”—Hib. 5:5, 6.

16. Olee ihe ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ mere ka ndị e tere mmanụ nwee ike iso Jizọs mee?

16 Jizọs kwuru na ndịozi iri na otu ahụ ‘rapaara ya n’ahụ́ n’ọnwụnwa ya dị iche iche.’ Ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ mere ka obi sie ha ike na ha ga-eso Jizọs gaa eluigwe, nọrọ n’ocheeze, bụrụkwa ndị eze na ndị nchụàjà. Ma, ọ bụghị naanị ha ga-eso Jizọs chịa. Jizọs gwara Jọn onyeozi n’ọhụụ, sị: “M ga-eme ka onye meriri emeri soro m nọdụ ala n’ocheeze m, ọbụna dị ka m meriri wee soro Nna m nọdụ ala n’ocheeze ya.” (Mkpu. 3:21) N’ihi ya, ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha na Jizọs gbara ọgbụgba ndụ Alaeze. Ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpu. 5: 9, 10; 7:4) Ọ bụ ọgbụgba ndụ a ga-eme ka ha nwee ike iso Jizọs chịa n’eluigwe. E nwere ike iji ya tụnyere nwa agbọghọ a họọrọ ka eze lụọ. Ozugbo ha abụọ gbara akwụkwọ, o nwere ike iso di ya chịwa. Baịbụl kpọrọ ndị e tere mmanụ ‘nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ,’ kpọọkwa ha “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ” e kwere nkwa na Kraịst ga-alụ.—Mkpu. 19:7, 8; 21:9; 2 Kọr. 11:2.

NWEE OKWUKWE SIRI IKE N’ALAEZE CHINEKE

17, 18. (a) Ná nkenke, kọwaa ọgbụgba ndụ isii anyị lebarala anya, bụ́ ndị gbasara Alaeze Chineke. (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee okwukwe siri ike n’Alaeze Chineke?

17 N’isiokwu a na nke bu ya ụzọ, anyị elebala anya n’otú ọgbụgba ndụ dị iche iche anyị tụlerela si nwee otu ihe ma ọ bụ karịa jikọrọ ha na Alaeze Chineke. (Gụọ chaatị bụ́ “Otú Chineke Ga-esi Emezu Nzube Ya.”) O doro anya na Alaeze Chineke gbakwasịrị ụkwụ n’ọgbụgba ndụ dị iche iche. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Chineke ga-eji ọchịchị Mesaya mee ka nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ mezuo.—Mkpu. 11:15.

Chineke ga-eji Alaeze Mesaya mee ka nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ mezuo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo nke 18)

18 O doro anya na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe. Obi siri anyị ezigbo ike na ọ ga-eme ihe ga-abara ụmụ mmadụ uru ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ka anyị jiri obi anyị niile na-akọrọ ndị ọzọ eziokwu a.—Mat. 24:14.