Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2014

A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè

A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè

“Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 KỌR. 15:26.

1, 2. Olee otú ihe dịịrị Adam na Iv mgbe Chineke kere ha? Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

MGBE Chineke kere Adam na Iv, ha enweghị ndị iro. Ha zuru okè, birikwa na paradaịs. Ebe ọ bụ na ha bụ ụmụ Chineke, ha na ya dị n’ezigbo mma. (Jen. 2:7-9; Luk 3:38) Ọrụ Chineke nyere ha gosiri ụdị ndụ ọ chọrọ ka ha bie. (Gụọ Jenesis 1:28.) Ọ gwara ha ka ha ‘jupụta ụwa, meekwa ka ọ dịrị n’okpuru ha.’ Ha nwere ike ime otú ahụ ka oge na-aga. Ma, ha ga-adịrịrị ndụ ebighị ebi tupu ha enwee ike ịna-elekọta ‘ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala.’ Ọ pụtara na ha agaghị anwụ ma hapụrụ ndị ọzọ ọrụ ahụ.

2 Gịnịzi mere ihe ji gbanwee? Gịnị mere e ji nwee ọnwụ bụ́ onye iro anyị kachanụ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme ka anyị ghara inwe obi ụtọ? Olee otú Chineke ga-esi bibie ha niile? Baịbụl zara ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ yiri ha. Ka anyị tụlee otú o si zaa ha.

 CHINEKE JI OBIỌMA DỌỌ ADAM AKA NÁ NTỊ

3, 4. (a) Olee iwu Chineke nyere Adam na Iv? (b) Gịnị mere ha kwesịrị iji rubere iwu ahụ isi?

3 N’agbanyeghị na Adam na Iv nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, e nwere ihe ndị ha ga-emerịrị ka ha nwee ike ịdịrị ndụ na-aga. Ihe ndị ahụ bụ iku ume, ịṅụ mmiri, ihi ụra, na iri nri. Nke kadị mkpa bụ na ha na Jehova kwesịrị ịdị ná mma n’ihi na ọ bụ ya nyere ha ndụ. (Diut. 8:3) Ọ bụrụ na ha ekwe ka Chineke na-eduzi ha, ha ga na-enwe obi ụtọ. Jehova mere ka ihe a doo Adam anya tupu ya ekeedị Iv. Olee otú anyị si mara? Baịbụl kwuru, sị: “Jehova bụ́ Chineke nyekwara mmadụ ahụ iwu, sị: ‘I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.’”—Jen. 2:16, 17.

4 “Osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ” ahụ Baịbụl kwuru okwu ya gosiri na ọ bụ Jehova kwesịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Adam ma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ n’ihi na Chineke kere ya n’oyiyi ya, nyekwa ya akọnuche. Osisi ahụ ga-eme ka Adam na Iv na-echeta na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-eduzi ha mgbe niile. Ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ osisi ahụ, ọ pụtara na ha na-asị Chineke: “Anyị achọghị iwu gị.” Ha mee otú ahụ, ọ ga-akpatara ha na ụmụ ha ga-amụ ọnwụ, otú ahụ Chineke gwara ha.

OTÚ ỤMỤ MMADỤ SI MALITE ỊNWỤ ANWỤ

5. Olee otú e si mee ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi?

5 Mgbe Chineke kechara Iv, Adam gwara ya iwu Chineke nyere ya. Iv ghọtara iwu ahụ nke ọma ma mechaa kwughachi ihe ahụ a gwara ya. (Jen. 3:1-3) Mgbe Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ na-agwa Iv okwu, Iv gwara ya iwu ahụ Chineke nyere. Setan ebula ụzọ chewe otú ọ ga-esi nwetakwuo ike ma kwụsị ịnọ n’okpuru Chineke. (Tụlee Jems 1:14, 15.) Ka o nwee ike ime ihe ọjọọ o bu n’obi, o kwuru na Chineke ghara ụgha. Ọ gwara Iv na ọ bụrụ na o nupụrụ Chineke isi, ọ gaghị anwụ, kama ọ ga-adị ka Chineke. (Jen. 3:4, 5) Iv kweere ihe a ọ gwara ya. O riri mkpụrụ osisi ahụ, si otú ahụ gosi na ya achọghị ka Chineke na-achị ya. O mekwara ka di ya soro ya rie. (Jen. 3:6, 17) Setan tụụrụ ya asị. (Gụọ 1 Timoti 2:14.) Adam ma na ya ekwesịghị iri mkpụrụ osisi ahụ. Ma, o “gere ntị n’olu nwunye [ya].” N’agbanyeghị na agwọ ahụ mere ka ọ̀ bụ enyi Iv, Setan bụ́ onye ji ya kwuo okwu bụ onye iro obi tara mmiri. Ọ ma na ihe ahụ ọ gwara Iv ga-akpatara Iv ọnwụ.

6, 7. Olee otú Jehova si kpee Adam na Iv ikpe?

6 Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi n’agbanyeghị na ọ bụ ya nyere ha ndụ na ihe niile ha nwere. O doro anya na Jehova ma ihe niile merenụ. (1 Ihe 28:9; gụọ Ilu 15:3.) Ọ hapụrụ Adam na Iv na Setan ka ha gosi otú ha si were ya. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Nna ha, ihe ahụ ha mere wutere ya. (Tụlee Jenesis 6:6.) O kpere ha ikpe ma kwado ihe ahụ o kwuru ga-eme Adam na Iv ma ha mehie.

7 Chineke ebula ụzọ gwa Adam, sị: “N’ụbọchị i riri mkpụrụ si [n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ], ị ga-anwụrịrị.” O nwere ike ịbụ na Adam chere na “ụbọchị” Chineke kwuru okwu ya bụ awa iri abụọ na anọ. Mgbe o nupụchaara Chineke isi, ọ ga-abụ na ọ tụrụ anya na Chineke ga-egbu ya tupu chi ejie. Ma, ọ gwara Adam na Iv okwu tupu ụbọchị ahụ agafee. (Jen. 3:8) O kpere ha ikpe ma were ihe Adam na Iv  zara mee ka nke bụ́ eziokwu doo anya. (Jen. 3:9-13) Ọ mara ha abụọ ikpe ọnwụ maka ihe ahụ ha mere. (Jen. 3:14-19) A sị na o gburu Adam na Iv ozugbo, ihe o bu n’obi gbasara ha na ụmụ ha agaraghị emezu. (Aịza. 55:11) N’agbanyeghị na Jehova mara ha ikpe ọnwụ, mmehie amalitekwa ịkpa ike n’ahụ́ ha ozugbo, Jehova kwere ka ha mụta ụmụ ndị nwere ike irite uru n’ihe ọma ndị ọ ga-emere ha. N’anya Chineke, Adam na Iv nwụrụ n’ụbọchị ahụ ha mehiere. Ebe ọ bụ na otu puku afọ dị ka otu ụbọchị n’anya Chineke, ha anọfeghị otu “ụbọchị.”—2 Pita 3:8.

8, 9. Olee otú mmehie Adam si gbasa ụmụ ya niile? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Ihe ahụ Adam na Iv mere ọ̀ ga-agbasa ụmụ ha? Ee. Ndị Rom 5:12 kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” Onye mbụ nwụrụnụ bụ Ebel onye ezi omume. (Jen. 4:8) Ụmụ ndị ọzọ Adam mụrụ mechakwara kaa nká ma nwụọ. Hà ketara ma mmehie ma ọnwụ? Pọl onyeozi kwuru, sị: “E mere ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị mmehie site ná nnupụisi nke otu onye.” (Rom 5:19) Mmehie na ọnwụ ụmụ mmadụ ketara n’aka Adam ghọrọ ndị iro abụọ obi fere azụ ụmụ mmadụ na-agaghị agbanahụli. Anyị agaghị akọwali ihe niile gbasara otú Adam si bufee ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya mmehie na ọnwụ. Ma, anyị na-ahụ nsogbu ọ kpataara ha.

9 Ọ dabara adaba na Baịbụl ji mmehie na ọnwụ tụnyere “ihe mkpuchi nke kpuchiri ndị niile, na ákwà a kpara akpa nke kpuchiri mba niile.” (Aịza. 25:7) O nweghị onye ga-agbanahụ mmehie na ọnwụ n’ihi na ha yiri blanket e ji kpuchie ụmụ mmadụ, nke na-anaghị ekwe ha kuru ume. Ọ bụ ihe mere Baịbụl ji kwuo na “mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam.” (1 Kọr. 15:22) N’ihi ya, Pọl jụrụ, sị: “Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a?” Ò nwere onye ga-anapụtali ya? *Rom 7:24.

A GA-EME KA MMEHIE NA ỌNWỤ ADAM KPATARA GHARA ỊDỊ IRÈ

10. (a) Olee amaokwu Baịbụl ụfọdụ gosiri na Jehova ga-ewepụ ọnwụ Adam kpatara? (b) Gịnị ka amaokwu Baịbụl ndị ahụ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Ọkpara ya?

10 Jehova ga-anapụtali Pọl. Ozugbo Aịzaya kwuchara gbasara “ihe mkpuchi” ahụ, o kwuru, sị: “Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.” (Aịza. 25:8) Jehova yiri nna nke wepụrụ ihe kpataara ụmụ ya ahụhụ ma hichaa ha anya mmiri. Obi ga-adị ya ezigbo ụtọ iwepụ ọnwụ Adam kpatara. Jizọs ji obi ya niile na-akwado ya. Ndị Kọrịnt nke Mbụ isi iri na ise, amaokwu iri abụọ na abụọ kwuru, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” Mgbe Pọl jụchara, sị: “Ònye ga-anapụta m?” o kwuru, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Rom 7:25) Mgbe Adam na Iv mehiere, o doro anya na Jehova akwụsịghị ịhụ ụmụ mmadụ n’anya. Jizọs emeghịkwa otú ahụ. Cheta na o nyeere Jehova aka kee Adam na Iv. (Ilu 8:30, 31) Ma, olee otú a ga-esi napụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ?

11. Gịnị ka Jehova mere ka o nwee ike inyere ụmụ mmadụ aka?

 11 Mgbe Adam mehiere, Jehova mara ya ikpe ọnwụ. Ọ bụ ya mere mmadụ niile ji keta ezughị okè na ọnwụ. (Rom 5:12, 16) Baịbụl kwuru, sị: “A mara ụdị mmadụ niile ikpe site n’otu njehie.” (Rom 5:18) Gịnị ka Jehova ga-eme ka o nwee ike ịkagbu ikpe ahụ ọ mara ụmụ mmadụ ma ghara imebi iwu ya? Jizọs zara ajụjụ a mgbe o kwuru, sị: ‘Nwa nke mmadụ bịara ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mat. 20:28) Cheta na Jizọs bụ onye mbụ Jehova kere n’eluigwe. Ihe a o kwuru mere ka o doo anya na ọ ga-agbapụta ụmụ mmadụ ebe ọ bụ mmadụ zuru okè mgbe a mụrụ ya n’ụwa. Olee otú ọnwụ Jizọs ga-esi gosi na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?—1 Tim. 2:5, 6.

12. Olee ihe e ji gbapụta anyị nke gosiri na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?

12 Ebe ọ bụ na Jizọs bụ mmadụ zuru okè mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ gaara adị ndụ ebighị ebi otú ahụ Jehova bu n’obi ka Adam dịrị. Jehova chọrọ ka ụmụ zuru okè Adam ga-amụ jupụta ụwa. Jizọs hụrụ ma Nna ya ma ụmụ Adam n’anya. Ọ bụ ya mere o ji were ndụ ya chụọ àjà. Ndụ Jizọs ji chụọ àjà bụ ụdị ndụ ahụ Adam dịrị tupu ya emehie. Jehova mechara kpọlite Ọkpara ya n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ n’eluigwe. (1 Pita 3:18) Àjà ahụ Jizọs chụrụ gosiri na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi n’ihi na o ji ndụ zuru okè kwụọ ụgwọ ndụ zuru okè. Jizọs si otú ahụ gbapụta ụmụ Adam, meekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. E nwere ike ikwu na Jizọs mere ihe Adam gaara eme. Pọl kwuru, sị: “E dere ọbụna otú a, sị: ‘Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ.”—1 Kọr. 15:45.

Ebel bụ onye mbụ nwụrụnụ. Àjà Jizọs chụrụ ga-abara ya uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Gịnị ka “Adam ikpeazụ” ga-emere ndị nwụrụ anwụ?

13 N’oge na-adịghị anya, “Adam ikpeazụ” ga-emere ụmụ mmadụ ihe gosiri na ọ bụ “mmụọ na-enye ndụ.” Ọ ga-akpọlite ọtụtụ ụmụ Adam n’ọnwụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ha adịtụla ndụ ma nwụọ. A ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha ebirikwa n’ụwa.—Jọn 5:28, 29.

14. Olee otú Jehova ga-esi mee ka ụmụ mmadụ bụrụ ndị zuru okè?

14 Olee otú a ga-esi napụta ụmụ mmadụ n’aka ezughị okè ha na ya na-alụ? Jehova hiwere otu ọchịchị ọ ga-eji mee ya. Ọ bụ “Adam ikpeazụ” na ụfọdụ ụmụ mmadụ Chineke họọrọ ga-achị na ya. (Gụọ Mkpughe 5:9, 10.) Ndị ahụ ha na Jizọs ga-achị bụ ndị na-ezughị okè mgbe ha nọ n’ụwa. N’ihi ya, ha ga-aghọta nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe. Ha na Jizọs ga-eji otu puku afọ nyere ụmụ mmadụ aka ka ha zuo okè, nke bụ́ ihe ha na-enweghị ike ime n’onwe ha.—Mkpu. 20:6.

15, 16. (a) Olee ọnwụ Baịbụl kpọrọ “onye iro ikpeazụ?” Olee mgbe a ga-eme ka ọ ghara ịdị irè? (b) Gịnị ka 1 Ndị Kọrịnt 15:28 kwuru na Jizọs ga-emecha mee?

15 Mgbe Jizọs ga-achịcha otu puku afọ ahụ, ọ ga-anapụta ụmụ mmadụ na-erubere Chineke isi n’aka mmehie na ọnwụ ahụ Adam kpatara. Baịbụl kwuru, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst. Ma onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa, ndị nke Kraịst [ya bụ, ndị ha na ya ga-achị] n’oge ọnụnọ ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọgwụgwụ ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya, mgbe o meworo ka ọchịchị niile na ikike  na ike niile ghara ịdị irè. N’ihi na ọ ghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debere ndị iro ya niile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Kọr. 15:22-26) A ga-emecha wepụ ọnwụ ahụ e ketara n’aka Adam, nke Baịbụl kpọrọ ihe “mkpuchi” nke kpuchiri ụmụ mmadụ. Ọ gaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi.—Aịza. 25:7, 8.

16 Ihe Pọl onyeozi ji pịachie okwu ya banyere ọchịchị Jizọs bụ: “Mgbe a ga-edoworị ihe niile n’okpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.” (1 Kọr. 15:28) N’oge ahụ, Jizọs emechaala ihe niile ọchịchị ya kwesịrị ime. Ọ ga-ejizi obi ụtọ nyeghachi Jehova ọchịchị ma nyefee ya ụmụ mmadụ o mere ka ha zuo okè.

17. Gịnị ka a ga-emecha mee Setan?

17 Gịnịzi ga-eme Setan, bụ́ onye kpatara ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata? Mkpughe 20:7-15 zara ajụjụ a. N’ule ikpeazụ Setan ga-ele ụmụ mmadụ zuru okè, Chineke ga-ahapụ ya ka ọ gbalịa iduhie ha. A ga-ebibizi ma Ekwensu ma ndị niile na-akwado ya ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl kpọrọ mbibi ahụ a ga-ebibi ha “ọnwụ nke abụọ.” (Mkpu. 21:8) O nweghị mgbe a ga-eme ka “ọnwụ nke abụọ” “ghara ịdị irè” n’ihi na ndị nwụrụ ụdị ọnwụ ahụ agaghị adị ndụ ọzọ. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma na-ejere ya ozi, anyị ekwesịghị ịtụwa “ọnwụ nke abụọ” ụjọ.

18. Olee otú a ga-esi rụchaa ọrụ ahụ Chineke nyere Adam?

18 Mmadụ niile ga-ezu okè mgbe ahụ, ruokwa eruo n’anya Jehova inweta ndụ ebighị ebi. Ha agaghịzi enwe onye iro ọ bụla. A ga-arụcha ọrụ ahụ Chineke nyere Adam n’agbanyeghị na ọ gaghị anọ ya. Ụmụ ya ga-ejupụta ụwa. Obi ga-adịkwa ha ụtọ ịna-elekọta ma ụwa ma ụmụ anụmanụ. Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ maka otú Jehova ga-esi wepụ onye iro ikpeazụ bụ́ ọnwụ.

^ para. 9 Akwụkwọ Insight on the Scriptures kwuru na mgbe ndị ọkà mmụta sayensị na-agba mbọ ka ha mara ihe mere anyị ji na-aka nká ma na-anwụ anwụ, ha na-echefu otu eziokwu dị mkpa, ya bụ, na ọ bụ Chineke mara Adam na Iv ikpe ọnwụ. Ọ bụ ya mere ha enweghị ike ịghọta ihe kpatara ya.—Mpịakọta nke 2, peeji nke 247.