Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2014

Obi Ò Siri Gị Ike na Ị Chọtala Eziokwu? N’ihi Gịnị?

Obi Ò Siri Gị Ike na Ị Chọtala Eziokwu? N’ihi Gịnị?

‘Chọpụtanụ n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.’—ROM 12:2.

1. Gịnị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm mere n’oge a na-alụ agha?

CHINEKE ọ̀ chọrọ ka ezigbo Ndị Kraịst gaa agha ma gbuo ndị si mba ọzọ? N’ime otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst emeela otú ahụ. Ndị Katọlik gburu ndị Katọlik, ndị chọọchị ndị ọzọ gbukwara ibe ha. Ndị ụkọchukwu ha na-agọzi ndị agha obodo ha na ngwá agha ha. N’Agha Ụwa nke Abụọ, ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst sụrụ ibe ha akwụ ugboro ugboro.

2, 3. Gịnị ka Ndịàmà Jehova mere n’Agha Ụwa nke Abụọ nakwa n’agha ndị ọzọ e mechara lụọ? N’ihi gịnị?

2 Gịnị ka Ndịàmà Jehova mere n’oge ahụ a na-alụ agha? Ha nọpụrụ iche. Ha esoghị lụọ agha ma ọ bụ tinye aka n’esemokwu mba na mba. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ime ihe Jizọs kwuru ma hụ ndị ọzọ n’anya otú o si hụ ha. O kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ha chetakwara ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt. O nyeere ha aka ịma ihe ha kwesịrị ime.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:3, 4.

3 Ezigbo Ndị Kraịst na-eji Baịbụl ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. N’ihi ya, akọnuche ha anaghị ekwe ha gaa  agha ma ọ bụkwanụ mụwa otú e si alụ agha. E mesiela ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova ike, ma ụmụaka ma ndị agadi, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, n’ihi na ha na-agba mbọ ka ha bie ndụ otú ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi. E chiela ọtụtụ n’ime ha ọnụ n’ala n’ogige ịta ahụhụ na n’ụlọ mkpọrọ. E gbudịrị ụfọdụ n’ime ha mgbe ndị Nazi na-achị Jamanị. N’oge ahụ niile a na-emesi Ndịàmà Jehova ike na Yurop, o nweghị mgbe ha chefuru ozi ọma Alaeze Jehova e nyere ha iwu ka ha kwusaa. Ha ji obi ha niile kwusaa ya, ma n’ụlọ mkpọrọ ma n’ogige ịta ahụhụ ma mgbe a chụgara ha ná mba ọzọ. * Mgbe ọtụtụ afọ gara, ya bụ, n’afọ 1994, Ndịàmà Jehova esoghị lụọ agha e ji gbukpọọ ndị mmadụ na Rụwanda. Ha esoghịkwa lụọ agha mere ka e kewaa ebe bụbu Yugoslavia.

4. Gịnị ka ndị mmadụ na-ekwukarị ma ha mata na Ndịàmà Jehova anaghị alụ agha?

4 Otú a Ndịàmà Jehova na-anaghị eso alụ agha emeela ka ọtụtụ ndị na-ekwu n’ụwa niile na Ndịàmà Jehova hụrụ ma Chineke ma ndị agbata obi ha n’anya n’eziokwu. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-eme nke mere obi ji sie ọtụtụ ndị ike na ọ bụ ha bụ ezigbo Ndị Kraịst.

A KỤZITỤBEREGHỊ NDỊ MMADỤ IHE OTÚ A KEMGBE ỤWA

5. Olee ihe gbanwerenụ n’oge ndịozi Jizọs?

5 Mgbe Jizọs malitere ozi ya n’ụwa, o mere ka o doo anya na ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ ọrụ kacha mkpa n’ụwa a. Ọ họọrọ ndịozi iri na abụọ ka ha soro malite ọrụ a ga-emecha ruo n’ụwa niile. Ka oge na-aga, ọ zụkwara ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ dị iri mmadụ asaa. (Luk 6:13; 10:1) Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma. Ndị mbụ ọ gwara ha ka ha gaa kwusaara ozi ọma bụ ndị Juu ibe ha. O mechara gwa ha ka ha gaa ziwe ndị mba ọzọ ozi ọma. Ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na izi ndị mba ọzọ ozi ọma gosiri na ihe agbanweela.—Ọrụ 1:8.

6. Gịnị nyeere Pita aka ịghọta na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu?

6 Kọnịliọs bụ onye mbụ na-abụghị onye Juu ghọrọ Onye Kraịst. Jehova gwara Pita onyeozi ka ọ gaa zie ya ozi ọma n’ụlọ ya. N’ihi ya, ọ ghọtara na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Jehova chọrọ ka ndị mba ọzọ nụ eziokwu ma nabata ya. N’ihi ya, Pita nyere iwu ka e mee Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya baptizim. (Ọrụ 10:9-48) Malite n’ụbọchị ahụ gawa, Pita na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ziwere ndị mba niile ozi ọma.

7, 8. Gịnị ka Ndịàmà Jehova mere ka ọtụtụ ndị nwee ike ịnụ ozi ọma ha na-ekwusa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 N’oge anyị a, ndị Jehova si n’aka ha na-eduzi nzukọ ya ji obi ha niile na-akwado ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. Taa, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde Ndịàmà Jehova asatọ ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile n’ihe karịrị narị asụsụ isii. Ha ga-ekwusawakwa ya n’asụsụ ndị ọzọ ka oge na-aga. Ihe e ji mara Ndịàmà Jehova bụ ozi ọma ha na-ekwusa n’ụlọ n’ụlọ na n’okporo ámá. Mgbe ụfọdụ, ha na-edowecha akwụkwọ n’ebe ndị na-agafe agafe ga-ahụ ya, ya bụ, n’elu tebụl na n’ihe a na-akwagharị akwagharị.

8 Nzukọ Jehova azụọla ihe karịrị puku mmadụ abụọ na narị itoolu ka ha sụgharịwa Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ọ bụghị naanị n’asụsụ ndị a ma ama ka ha na-asụgharị akwụkwọ anyị. Ha na-asụgharịkwa ya n’ọtụtụ narị asụsụ a na-amachaghị ama, ma ya abụrụ na ọtụtụ nde mmadụ na-asụ ya. Dị ka ihe atụ, na Spen, e nwere otu asụsụ a na-akpọ Katalan.  Ọ bụ ya ka ọtụtụ nde ndị Katalonia na-asụ kwa ụbọchị. N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị bidoro ịsụ asụsụ Katalan n’obodo Valenshia, Alikanti, Andọra nakwa n’agwaetiti ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Spen. Ndịàmà Jehova na-ebipụtazi akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Katalan. Ha na-ejikwa asụsụ a amụ ihe ka ihe a na-amụ nwee ike iru ndị Katalonia n’obi.

9, 10. Olee ihe gosiri na nzukọ Jehova chọrọ ka mmadụ niile mụta eziokwu?

9 N’ụwa niile, a na-esi otú ahụ asụgharị akwụkwọ anyị ma na-akụziri ndị mmadụ ihe n’asụsụ ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụ Spanish ka a na-asụkarị na Meksiko. Ma, ọtụtụ ndị nwere asụsụ ndị ọzọ ha na-asụ. Asụsụ Maya bụ otu n’ime ha. Alaka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ozi ọma a na-ekwusa n’ebe ahụ gwara ụmụnna na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Maya ka ha gaa biri n’ebe ha ga na-asụ asụsụ ahụ ma na-anụ ka ndị ọzọ na-asụ ya kwa ụbọchị. Ihe atụ ọzọ bụ asụsụ Nepali. O so n’asụsụ ndị a na-asụ n’obodo Nepal. Ndị bi na ya karịrị nde mmadụ iri abụọ na itoolu. A na-asụ ihe dị ka otu narị asụsụ na iri abụọ n’obodo ahụ. Ndị nwe asụsụ Nepali karịrị nde mmadụ iri. E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ na-eso asụ ya. Ụmụnna anyị na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Nepali.

10 Nzukọ Jehova anaghị eji ozi ọma Alaeze Chineke a gwara ha kwusaa n’ụwa niile egwu egwu. Otú ha si na-akwado ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ dị iche iche n’ụwa niile gosiri na ọ bụ eziokwu. N’ụwa niile, e nyela ndị mmadụ ọtụtụ nde traktị, broshọ, na Ụlọ Nche na Teta! n’ekwughị ego ole ha ga-enye. Ọ bụ onyinye si Ndịàmà Jehova n’obi ka e ji na-arụ ọrụ a. Ha si otú a na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Mat. 10:8.

Ebe a na-asụgharị akwụkwọ anyị ma na-ahazi otú a ga-esi ebipụta ya n’asụsụ Jaman (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

Ebe e ji akwụkwọ anyị e biri n’asụsụ Jaman na-akụziri mmadụ ihe na Paragụwaị (Leekwa ihe e sere ná mmalite isiokwu a)

11, 12. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-ekwu n’ihi ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile?

11 Ndịàmà Jehova kwetasiri ike na ha achọtala eziokwu. Ọ bụ ya mere ha ji ahapụ ihe ụfọdụ ka ha nwee ike ikwusara ndị si ná mba niile na agbụrụ niile ozi ọma. Ọtụtụ ndị akwụsịla ibi ndụ okomoko, mụọ asụsụ ọzọ ma kwaga ná mba ọzọ ka ha nwee ike iso rụọ ọrụ a dị mkpa e nyere Ndị Kraịst. Ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile bụ ihe ọzọ mere ka ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ Ndịàmà Jehova bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

12 Ndịàmà Jehova na-eme ihe a niile  n’ihi na ha kwetasiri ike na ha achọtala eziokwu. Ma, olee ihe ọzọ mere obi ji sie ọtụtụ nde mmadụ ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu?—Gụọ Ndị Rom 14:17, 18.

IHE MERE OBI JI SIE HA IKE NA HA ACHỌTALA EZIOKWU

13. Olee otú Ndịàmà Jehova si eme ka nzukọ ha dị ọcha?

13 O nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ihe dị iche iche ụmụnna anyị kwuru mere obi ji sie ha ike na ha achọtala eziokwu. Otu nwanna nwoke na-efe Jehova kemgbe ọtụtụ afọ kwuru, sị: “A na-agbasi mbọ ike ka a hụ na nzukọ Jehova dị ọcha mgbe niile, ka a ghara imerụ ya. Onye ọ sọkwara ya bụrụ, a na-adụ ya ọdụ ma ọ bụ dọọ ya aka ná ntị.” Gịnị na-enyere ndị Jehova aka ime otú ahụ? Onye ọ bụla n’ime ha na-agbalịsi ike eme ihe Jehova kwuru na Baịbụl, na-emekwa ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, n’oge anyị a, ọ bụ Ndịàmà Jehova ole na ole ka a na-achụ n’ọgbakọ. Ihe mere a na-eji achụ ha bụ na ha jụrụ ime ihe Baịbụl kwuru. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eme ihe Jehova kwuru. Ọtụtụ n’ime ha na-emebu ihe Chineke kpọrọ asị. Ma ha agbanweela, na-emezi ihe o kwuru.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

14. Gịnị ka ọtụtụ ndị a chụrụ n’ọgbakọ na-emecha mee? Olee uru ọ na-aba?

14 Gịnị ka ndị a na-achụ n’ọgbakọ otú ahụ Baịbụl kwuru na-emecha mee? Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ puku n’ime ha na-emecha chegharịa, a nabata ha n’ọgbakọ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 2:6-8.) Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova na-eji Baịbụl ama otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà, ọgbakọ ha na-adị ọcha. Ọ na-eme ka obi sie ha ike na ọ bụ nzukọ ha ka Chineke kwadoro. Ọtụtụ chọọchị na-ahapụ ndị òtù ha ka ha na-eme otú sọrọ ha. Ma, Ndịàmà Jehova na-eme ihe Jehova kwuru. O meela ka o doo ọtụtụ ndị anya na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu.

15. Gịnị mere obi ji sie otu nwanna nwoke ike na ya achọtala eziokwu?

15 Gịnị mere ndị ọzọ nọterela aka n’ọgbakọ ji kweta na ha achọtala eziokwu? Otu nwanna nwoke dị iri afọ ise na anọ kwuru, sị: “Kemgbe m bụ onye na-eto eto, e nwere ihe atọ dị mkpa mere obi ji sie m ike na ihe ndị m kweere bụ eziokwu. Nke mbụ bụ na Chineke dị adị. Nke abụọ abụrụ na Baịbụl bụ Okwu ya. Ebe nke atọ bụ na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-eme uche Jehova n’ụwa taa. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ na-abụ m na-amụ ihe, mụ ana-echebara ụzọ ihe atọ a echiche, na-ajụ onwe m ma hà ka bụ eziokwu. Kwa afọ, a na-enwekwu ihe gosiri na ha bụ eziokwu. O meela ka okwukwe m sikwuo ike, meekwa ka m kwetasie ike na ọ bụ anyị na-akụzi eziokwu.”

16. Gịnị mere obi ji sie otu nwanna nwaanyị ike na ya achọtala eziokwu?

16 Otu nwanna nwaanyị na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Niu Yọk kwuru banyere  nzukọ Jehova, sị: “Ọ bụ naanị ya na-akọrọ ndị mmadụ gbasara aha Jehova. Ihe e kwuru n’Ihe E Mere nke Abụọ, isi iri na isii, amaokwu itoolu, na-agba m ume. Ọ dabara adaba, nke ka nke, ma anyị cheta na aha Chineke pụtara na Baịbụl ihe dị ka ugboro puku asaa. Ebe ahụ sịrị: ‘Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.’” Nwanna nwaanyị ahụ kwukwara, sị: “Eziokwu Baịbụl emeela ka m mata otú m ga-esi jiri obi m niile na-ejere Jehova ozi, nke ga-eme ka Jehova gosi ike ya maka m. Ihe kacha m mkpa bụ adịm ná mma mụ na Jehova. Obi dịkwa m ụtọ n’otú Jizọs si mee ka a mata Chineke nke ọma. Ọ bụ ya bụ ihe na-enyere m aka.”

17. Gịnị ka otu nwanna ghọtara n’agbanyeghị na o kwebughị na Chineke dị? Ọ̀ bụ maka gịnị?

17 Otu nwanna nwoke na-ekwebughị na Chineke dị kwuru, sị: “Ihe ndị e kere eke mere ka m ghọta na Chineke chọrọ ka obi na-adị ụmụ mmadụ ụtọ. N’ihi ya, ọ gaghị ekwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na n’agbanyeghị na ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu n’ụwa, okwukwe ndị Jehova na ịhụnanya ha na-esikwu ike. Ha na-anụkwukwa ọkụ n’obi. Ọ bụ naanị mmụọ nsọ Jehova ga-arụli ụdị ọrụ ebube a n’oge anyị a.”—Gụọ 1 Pita 4:1-4.

18. Gịnị mere ụmụnna abụọ ji kweta na ha achọtala eziokwu? Olee otú obi dị gị gbasara ihe ha kwuru?

18 Nwanna ọzọ nọterela aka n’ọgbakọ kwuru ihe mere o ji kwere na ihe anyị na-akụzi bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ihe ndị m na-amụ kemgbe ọtụtụ afọ emeela ka o doo m anya na Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike ka ha na-eme ka Ndị Kraịst oge mbụ. Agaala m ebe dị iche iche n’ụwa ma jiri anya m hụ ihe gosiri na Ndịàmà Jehova dị n’otu n’ụwa niile. Eziokwu m mụtara na Baịbụl emeela ka m nwee obi ụtọ na ọṅụ.” Mgbe a jụrụ otu nwanna nwoke karịrịla iri afọ isii ihe mere obi ji sie ya ike na ya achọtala eziokwu, o kwuru gbasara Jizọs, sị: “Anyị asaala anya na mmiri mụọ gbasara otú Jizọs si bie ndụ na otú o si jee ozi ya ma ghọta ihe ọ kụziri. Anyị agbanweela otú anyị si ebi ndụ ka anyị nwee ike isi n’aka Kraịst Jizọs bịarukwuo Chineke nso. Anyị aghọtala na ọ bụ àjà Jizọs chụrụ ga-eme ka a zọpụta ndị mmadụ. Anyị makwa na a kpọlitere ya n’ọnwụ. E nwere ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ya mgbe a kpọlitechara ya. Ihe ndị ha kwuru gosiri na ọ bụ eziokwu.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:3-8.

GỊNỊ KA ANYỊ KWESỊRỊ IJI EZIOKWU ANYỊ MỤTARA MEE?

19, 20. (a) Gịnị ka Pọl gwara ọgbakọ dị na Rom mee? (b) Olee ihe ndị niile na-efe Jehova kwesịrị ime?

19 Ezigbo Ndị Kraịst hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji akọrọ ndị ọzọ gbasara eziokwu Baịbụl anyị mụtara. Pọl gwara ụmụnna ya nọ n’ọgbakọ dị na Rom, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-eji ‘ọnụ gị’ kwusaa ‘okwu ahụ’ n’ihu ọha, na Jizọs bụ Onyenwe anyị, ma na-enwe okwukwe n’obi gị na Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, a ga-azọpụta gị. N’ihi na mmadụ na-eji obi enwe okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.”—Rom 10:9, 10.

20 Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, obi siri anyị ike na anyị achọtala eziokwu, marakwa na anyị kwesịrị ịna-akụziri ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke. Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, ka anyị gbalịsie ike mee ka ndị ọzọ mara ihe anyị ji Baịbụl na-akụziri ha. Ka anyị gbalịakwa na-akpa àgwà dị mma, si otú ahụ mee ka ha ghọta na obi siri anyị ike na anyị achọtala eziokwu.

^ para. 3 Gụọ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 191-198, 448-454.